Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ASAA

A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ

A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ

1-3. Gịnị ji anyị niile eji ka ndị a tụrụ mkpọrọ, oleekwa otú Jehova ga-esi atọhapụ anyị?

WEREGODỊ ya na a tụrụ gị nga mkpụrụ ọka mgbe ọ na-enweghị ihe ọjọọ i mere. I nwetụdịghị olileanya na a ga-atọhapụ gị. O nwekwanụghị ihe i nwere ike ime ka i nwere onwe gị. Ma, mgbe i chere na olileanya adịkwaghị, gị achọpụta na o nwere onye ga-atọhapụli gị, nụkwa na o kwere nkwa inyere gị aka. Olee otú obi ga-adị gị?

2 E nwere ike ikwu na ọnwụ ji anyị niile eji ka ndị a tụrụ mkpọrọ. Ihe ọ sọkwara anyị mee, anyị agaghị apụtali. Ma, Jehova nwere ikike ịtọhapụ anyị n’aka ọnwụ. O kwere anyị nkwa na ọ ga-eme ka “onye iro ikpeazụ,” bụ́ ọnwụ, “ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrịnt 15:26.

3 Chegodị otú obi ga-esi ruo gị ala mgbe ị na-agakwaghị na-atụ ụjọ na ị ga-anwụ. Ọ bụghị naanị na Jehova ga-ewepụ ọnwụ, ọ ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O kwere nkwa na “ndị na-adịghị ndụ” ga-adị ndụ ọzọ. (Aịzaya 26:19) Ọ bụ ya ka Baịbụl kpọrọ mbilite n’ọnwụ.

MGBE MMADỤ NWỤNAHỤRỤ ANYỊ

4. (a) Gịnị ga-akasi anyị obi ma onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ enyi anyị nwụọ? (b) Olee mmadụ atọ bụ́ ezigbo ndị enyi Jizọs?

4 Ọ bụrụ na onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị anwụọ, ọ na-ewute anyị nke ukwuu. Anyị anaghịkwa ama ihe anyị ga-eme eme. O nweghị ihe  anyị nwere ike ime ka onye ahụ dịghachi ndụ. Ma, Baịbụl na-akasi anyị obi. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) Ka anyị leba anya n’ihe mere n’oge Jizọs nke gosiri na ọ na-agụsi Jehova na Jizọs agụụ ike ime ka ndị nwụnahụrụ anyị dịghachi ndụ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-agakarị n’ụlọ Lazarọs na ụmụnne ya nwaanyị abụọ, bụ́ Meri na Mata. Ha atọ bụ ezigbo ndị enyi Jizọs. Baịbụl sịrị na “Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya.” Otu ụbọchị, Lazarọs nwụrụ.—Jọn 11:3-5.

5, 6. (a) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ka ụmụnne Lazarọs na ndị ọzọ na-ebe ákwá? (b) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike ma anyị mata na otú obi na-adị anyị ma mmadụ nwụnahụ anyị bụkwa otú ọ na-adị Jizọs?

5 Jizọs gawara ịkasi Meri na Mata obi. Mgbe Mata nụrụ na Jizọs na-abịa, ọ gawara izute ya. Obi dị ya ụtọ mgbe ọ hụrụ Jizọs. Ma, ọ gwara Jizọs, sị: “A sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Mata chere na Jizọs bịara mgbe ihe mebicharala. Mgbe Jizọs hụrụ ka Meri na ndị ọzọ na-ebe ákwá, o wutere ya, anya mmiri gbakwara ya. (Jọn 11:21, 33, 35) O wutere ya otú ahụ o si ewute anyị ma mmadụ nwụnahụ anyị.

6 Ịmata na otú obi na-adị anyị ma mmadụ nwụnahụ anyị bụkwa otú ọ na-adị Jizọs na-eme ka obi sie anyị ike. Jizọs dị nnọọ ka Nna ya. (Jọn 14:9) Jehova nwere ike ọ ga-eji wepụ ọnwụ kpamkpam. Ọ ga-emekwa ya n’oge na-adịghị anya.

“LAZARỌS, PỤTA!”

7, 8. Gịnị mere Mata achọghị ka a kwapụ nkume a dọchiri n’ọnụ ili Lazarọs, ma gịnị ka Jizọs mere?

7 Mgbe Jizọs rutere n’ebe e liri Lazarọs, ọ hụrụ na e ji nkume buru ibu dọchie ọnụ ili ya. Jizọs sịrị: “Kwapụnụ  nkume ahụ.” Ma, Mata achọghị ka ha kwapụ ya n’ihi na o meela abalị anọ Lazarọs nọ n’ili. (Jọn 11:39) Ọ maghị na Jizọs chọrọ ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ.

Chegodị otú obi si tọọ ụmụnne Lazarọs na ndị enyi ha ụtọ mgbe a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ.—Jọn 11:38-44

8 Jizọs sịrị Lazarọs: “Pụta!” Ihe Meri na Mata hụrụ juru ha anya. “Nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee buru ákwà e kere ya n’ụkwụ na n’aka pụta.” (Jọn 11:43, 44) Lazarọs malitekwara ịdị ndụ. Ya na ụmụnne ya na ndị enyi ya amalitekwa imekọrịta ihe. Ha nweziri ike ịmakụ ya, imetụ ya aka, na ịgwa ya okwu. Mkpọlite Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ bụ nnukwu ọrụ ebube.

“NWATA NWAANYỊ, ANA M ASỊ GỊ, BILIE!”

9, 10. (a) Ònye nyere Jizọs ike o ji kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? (b) Gịnị mere ihe Baịbụl kọrọ gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ ji baara anyị uru?

9 Jizọs ò ji ike nke ya kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Mba. Tupu Jizọs akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, o kpegaara Jehova ekpere, Jehova enye ya ike o ji kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. (Gụọ Jọn 11:41, 42.) Ọ bụghị naanị Lazarọs ka Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Baịbụl gwara anyị banyere nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ ahụ́ na-adịghị. Nna ya, bụ́ Jeirọs, chọsiri ike ka nwa ya gbakee. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jizọs ka ọ gwọọ nwa ya. Ọ bụ naanị nwa o nwere. Ka ọ nọ na-agwa Jizọs okwu, ụfọdụ ụmụ nwoke bịara sị ya: “Nwa gị nwaanyị anwụọla! Gịnị mere ị ka ji na-enye onye ozizi nsogbu?” Ma Jizọs gwara Jeirọs, sị: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe, a ga-azọpụta ya.” Ya na Jeirọs gawaziri n’ụlọ Jeirọs. Ka ha na-erute nso, Jizọs hụrụ ka ndị mmadụ na-akwa ákwá. Jizọs gwara ha, sị: “Kwụsịnụ ịkwa ákwá, n’ihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ na-ehi ụra.” Nne na nna nwa ahụ nwere ike ịna-eche ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara. Jizọs chụpụrụ ndị niile nọ ebe ahụ n’èzí ma  kpọrọ nne na nna nwa ahụ banye n’ebe nwa ahụ dina. Jizọs seere nwatakịrị ahụ n’aka, sị ya: “Nwata nwaanyị, ana m asị gị, Bilie!” Chegodị otú obi dị ndị mụrụ nwa ahụ ozugbo nwa ha biliri ma malite ịga ije. Jizọs akpọlitela nwa ha nwaanyị n’ọnwụ. (Mak 5:22-24, 35-42; Luk 8:49-56) Malite n’ụbọchị ahụ gawa, ha hụ nwa ha nwaanyị, ha echeta ihe Jehova si n’aka Jizọs meere ha. *

10 Ndị niile Jizọs kpọlitere n’ọnwụ mechara nwụọ. Ma, ihe Baịbụl kọrọ gbasara ha baara anyị uru n’ihi na o mere ka anyị nwee olileanya. Ọ na-egosi na ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ, ọ ga-emekwa ya.

IHE AKỤKỌ NDỊ A KPỌLITERE N’ỌNWỤ NA-AKỤZIRI ANYỊ

Pita onyeozi kpọlitere otu Onye Kraịst aha ya bụ Dọkas n’ọnwụ.—Ọrụ Ndịozi 9:36-42

Ịlaịja kpọlitere nwa otu nwaanyị di ya nwụrụ.—1 Ndị Eze 17:17-24

11. Gịnị ka ihe e dere n’Ekliziastis 9:5 na-akụziri anyị banyere Lazarọs?

11 Baịbụl kwuru hoo haa na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Lazarọs mgbe ọ nwụrụ. (Ekliziastis 9:5) Ọ dị ka onye nọ n’ụra otú ahụ Jizọs kwuru. (Jọn 11:11) Mgbe Lazarọs nọ n’ili, ọ ‘maghị ihe ọ bụla ma ọlị.’

12. Olee ihe gosiri na a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’eziokwu?

12 Ọtụtụ ndị hụrụ mgbe Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. Ndị iro Jizọs makwa na Jizọs rụrụ ọrụ ebube a. Lazarọs malitekwara ịdị ndụ, ya edoo onye  ọ bụla anya na a kpọlitere ya n’ọnwụ n’eziokwu. (Jọn 11:47) Ọtụtụ ndị gakwara hụ Lazarọs ma kweta na ọ bụ Chineke zitere Jizọs. Ihe a merenụ adịghị ndị iro Jizọs mma, n’ihi ya, ha kpara nkata igbu Jizọs na Lazarọs.—Jọn 11:53; 12:9-11.

13. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?

13 Jizọs kwuru na a ga-akpọlite “ndị niile nọ n’ili ncheta.” (Jọn 5:28) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova ga-akpọlite ndị niile ọ na-echeta. Ma, tupu Jehova akpọlite mmadụ, ọ ga-echeta ihe niile gbasara onye ahụ. Jehova ò nwerenụ ike icheta ihe niile gbasara ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ? Cheta na e nwere ọtụtụ ijeri kpakpando n’eluigwe. Ma, Baịbụl kwuru na Jehova maara aha kpakpando niile. (Gụọ Aịzaya 40:26.) Ebe o nwere ike icheta aha kpakpando nke ọ bụla, o doro anya na ọ ga-echetali ihe niile gbasara ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ. Nke ka nke bụ na ọ bụ Jehova kere ihe niile, n’ihi ya, o doro anyị anya na o nwere ike ọ ga-eji kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

14, 15. Gịnị ka ihe Job kwuru na-akụziri anyị banyere mbilite n’ọnwụ?

14 Otu nwoke fere Jehova n’oge ochie aha ya bụ Job kwetara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” Ọ gwaziri Jehova, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” N’eziokwu, Job ma na ọ dị Jehova ka oge ruwe eruwe ka ọ kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Job 14:13-15.

15 Olee otú obi dị gị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ? I nwere ike na-eche, sị, ‘Oleekwanụ  maka ndị ikwu na ibe m nwụrụ anwụ? À ga-akpọlite ha?’ Obi dị anyị ụtọ ịmara na Jehova chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ka anyị hụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ na ebe ha ga-ebi ma a kpọlite ha.

HA “GA-ANỤ OLU YA WEE PỤTA”

16. Olee otú ihe ga-adị n’ụwa mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?

16 Ndị niile a kpọlitere n’ọnwụ n’oge ochie mechara gakwuru ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha n’ụwa ebe a. Ọ bụkwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma nke ga-eme n’ọdịnihu ga-aka mma. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’oge ahụ ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi, gharazie ịnwụ ọzọ. Ha ga-ebi n’ụwa na-adịghị ka nke a anyị bi na ya taa. Agha, ime mpụ, na ọrịa agakwaghị adị.

17. Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

17 Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ? Jizọs sịrị na “ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya.” (Jọn 5:28, 29) Mkpughe 20:13 gwara anyị, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis [ya bụ, ili] hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” N’eziokwu, a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ. Pọl onyeozi kwuru na a ga-akpọlite “ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15.) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

Na paradaịs, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ha na ndị ikwu na ibe ha anọwakwa

18. Ole ndị bụ “ndị ezi omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ?

18 Ụfọdụ n’ime “ndị ezi omume” ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ bụ ndị fere Jehova tupu Jizọs abịa n’ụwa. A ga-akpọlite ndị dị ka Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Rut, na Esta ka ha dịrị ndụ n’ụwa. I nwere ike ịgụ gbasara ụfọdụ n’ime ha ná Ndị Hibru isi iri na otu.  Oleekwanụ maka ndị fere Jehova nwụrụ n’oge anyị a? Ha bụkwa “ndị ezi omume,” n’ihi ya, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.

19. Ole ndị bụ “ndị ajọ omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ? Olee ohere Jehova ga-enye ha?

19 “Ndị ajọ omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ bụ ọtụtụ ijeri mmadụ nwụrụ anwụ bụ́ ndị na-enweghị ohere  ịmata onye Jehova bụ. N’agbanyeghị na ha anwụọla, Jehova echefubeghị ha. Ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha enwee ohere ịmụta banyere ya ma na-efe ya.

20. Gịnị mere na ọ bụghị ndị niile nwụrụ anwụ ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

20 Nke a ọ̀ pụtara na a ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ n’ọnwụ? Mba. Jizọs kwuru na a gaghị akpọlite ụfọdụ ndị n’ọnwụ. (Luk 12:5) Ònye ga-ekpebi ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ na ndị a na-agaghị akpọlite? Ọ bụ Jehova bụ Onyeikpe ga-ekpebi ihe niile. Ma, o nyere Jizọs ikike ka ọ bụrụ “onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” (Ọrụ Ndịozi 10:42) A gaghị akpọlite onye ajọ omume ọ bụla e kpebiri na o nweghị nchegharị.—Gụọ ihe nke 19 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

NDỊ A GA-AKPỌLITE N’ỌNWỤ HA AGAA ELUIGWE

21, 22. (a) Gịnị ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ga-abụ? (b) Ònye bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe?

21 Baịbụl gwakwara anyị na a ga-akpọlite ụfọdụ ndị n’ọnwụ ha agaa eluigwe. A kpọlite mmadụ n’ọnwụ ya agaa eluigwe, ọ gakwaghị enwe ahụ́ mmadụ. Ọ ga-abụzi mmụọ.

22 Ọ bụ Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe. (Jọn 3:13) Abalị atọ e gbuchara Jizọs, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ Ndịozi 13:34, 35) Jizọs abụkwaghị mmadụ mgbe a kpọlitere ya. Pita onyeozi kwuru na “e mere ka [Jizọs] nwụọ n’anụ ahụ́, ma e mere ka ọ dị ndụ na mmụọ.” (1 Pita 3:18) Jizọs ghọrọ mmụọ dị ike mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:3-6) Ma,  Baịbụl kwuru na ọ bụghị naanị ya ka a ga-akpọlite n’ọnwụ ya aghọọ mmụọ.

23, 24. Ole ndị bụ “ìgwè atụrụ nta” Jizọs kwuru okwu ha? Ole ka ha dị?

23 Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ezigbo ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M na-aga ịkwadebere unu ebe.” (Jọn 14:2) Nke a pụtara na a ga-akpọlite ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya n’ọnwụ ka ha soro ya biri n’eluigwe. Ole ka ha ga-adị? Jizọs gosiri na ha ga-adị ntakịrị. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ha “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) E gosiri Jọn onyeozi ole ha dị n’ọhụụ. O kwuru na ọ hụrụ ka Jizọs “guzo n’Ugwu Zayọn [nke dị n’eluigwe], ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.”—Mkpughe 14:1.

24 Olee mgbe a ga-akpọlite otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ n’ọnwụ? Baịbụl gwara anyị na ọ ga-abụ mgbe Kraịst malitechara ịchị n’eluigwe. (1 Ndị Kọrịnt 15:23) Ọ bụ n’oge anyị a ka Kraịst malitere ịchị n’eluigwe. A kpọlitekwala ọtụtụ n’ime otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ n’ọnwụ ha agaa eluigwe. Ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha ka nọ́ n’ụwa anwụọ n’oge anyị a, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ozugbo ha nwụrụ, ha agaa eluigwe. Ma, a ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ha ebiri na paradaịs a ga-enwe n’ụwa ebe a.

25. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

25 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-atọhapụ mmadụ niile n’aka ọnwụ, ọnwụ alaa kpamkpam. (Gụọ Aịzaya 25:8.) Ma, gịnị ka ndị ga-aga eluigwe ga-eme n’eluigwe? Baịbụl kwuru na ha na Jizọs ga-achị n’Alaeze Chineke. Anyị ga-amụ gbasara Alaeze Chineke n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 9 E nwere ebe ndị ọzọ Baịbụl kọrọ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ, ma ụmụaka ma ndị torola eto, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ma ndị Izrel ma ndị na-abụghị ndị Izrel. I nwere ike ịgụ banyere ha ná 1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37; 13:20, 21; nakwa na Matiu 28:5-7; Luk 7:11-17; 8:40-56; Ọrụ Ndịozi 9:36-42; 20:7-12.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

E nwere mmadụ asatọ Baịbụl kọrọ na ha si n’ọnwụ bilie. Gụọ ihe a ka ị mara ma ò nwere ihe ha kọrọ mere mgbe ha nwụrụ?