Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?

Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?

EZIOKWU banyere gịnị? Banyere ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị kasị mkpa ụmụ mmadụ jụtụrụla. Ikekwe, i chetụla banyere ajụjụ ndị dị ka ndị a:

  • Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị n’ezie?
  • Ọ̀ dị mgbe agha na ahụhụ ga-akwụsị?
  • Olee ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?
  • Ọ̀ dị olileanya ndị nwụrụ anwụ nwere?
  • Olee otú m ga-esi kpee ekpere Chineke anụ ya?
  • Olee otú m ga-esi nwee obi ụtọ ná ndụ?

Olee ebe ị ga-ahụ azịza nke ajụjụ ndị a? Ọ bụrụ na ị gaa n’ọ́bá akwụkwọ na n’ebe ndị a na-ere akwụkwọ, i nwere ike ịhụ ọtụtụ puku akwụkwọ ndị na-ekwu na ha ga-azali ha. Ma, ihe otu akwụkwọ kwuru na-adịkarị iche n’ihe ibe ya kwuru. Ndị ọzọ na-eyi ka hà bara uru ugbu a ma ka oge na-aga, a naghịzi eji ha akpọrọ ihe, a na-edezigharịkwa ha ma ọ bụ were ọzọ dochie ha.

Ma, e nwere otu akwụkwọ nwere azịza ndị ị pụrụ ịdabere na ha. Akwụkwọ ahụ na-ekwu eziokwu. N’ekpere Jizọs Kraịst kpegaara Chineke, o kwuru, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Taa, ihe anyị ji mara Okwu ahụ bụ Baịbụl Nsọ. Na peeji ndị ga-eso nke a, ị ga-ahụpere otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị ahụ a jụrụ n’elu n’ụzọ doro anya, azịza ndị ahụ bụkwa eziokwu.

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?

Nwoke ndị mmadụ gbara gburugburu

IHE MERE E JI AJỤ AJỤJỤ A: Anyị bi n’ụwa obi ọjọọ na ikpe na-ezighị ezi juru. Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ahụhụ ndị anyị na-ata bụ uche Chineke.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Chineke anatụghị akpata ihe ọjọọ. Job 34:10 kwuru, sị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, Ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi!” O nwere ezi ihe Chineke zubeere ụmụ mmadụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere anyị ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka .  . . alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Chineke na-eche nnọọ banyere anyị nke na o mere ihe dị ukwuu iji hụ na nzube ya ga-emezu.—Jọn 3:16.

Gụọkwa Jenesis 1:26-28; Jems 1:13; na 1 Pita 5:6,  7.

Ọ̀ Dị Mgbe Agha na Ahụhụ Ga-akwụsị?

Ndị agha

IHE MERE E JI AJỤ AJỤJỤ A: Agha ka nọ na-egbu nde kwuru nde mmadụ. Ọ dịghị onye n’ime anyị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata na-emetụtabeghị.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Chineke kwere nkwa na oge ga-abịa mgbe ya ga-eme ka udo dịrị n’ụwa niile. N’Alaeze ya, nke bụ́ ọchịchị ga-achị site n’eluigwe, ụmụ mmadụ “agaghị amụkwa otú e si alụ agha.” Kama nke ahụ, ha ‘ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè.’ (Aịzaya 2:4) Chineke ga-eme ka ikpe na-ezighị ezi na ahụhụ niile kwụsị. Baịbụl kwere nkwa, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile [nke gụnyere ikpe na-ezighị ezi na ahụhụ ndị dị taa] agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Gụọkwa Abụ Ọma 37:10, 11; 46:9; na Maịka 4:1-4.

Olee Ihe Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?

Ebe a na-eli ozu

IHE MERE E JI AJỤ AJỤJỤ A: Ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị e nwere n’ụwa taa na-akụzi na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ dị ihe na-esi n’ime ya apụ ma nọgide na-adị ndụ. Ụfọdụ kweere na ndị nwụrụ anwụ nwere ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́ ma ọ bụ na Chineke na-ata ndị mere ihe ọjọọ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi site n’ịtụba ha n’ọkụ ala mmụọ.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-akwụsị ịdị adị. Ekliziastis 9:5 kwuru, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha enweghị ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́ ma ọ bụ nyere ha aka.—Abụ Ọma 146:3, 4.

Gụọkwa Jenesis 3:19 na Ekliziastis 9:6,  10.

Ọ̀ Dị Olileanya Ndị Nwụrụ Anwụ Nwere?

Nwatakịrị na-ebe ákwá n’ihi na onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ

IHE MERE E JI AJỤ AJỤJỤ A: Anyị chọrọ ịdị ndụ, anyị chọkwara ka ndị anyị hụrụ n’anya soro anyị dịrị ndụ. Ọ bụ ihe kwesịrị nnọọ ekwesị na ọ na-agụ anyị agụụ ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: A ga-akpọlite ihe ka ọtụtụ ná ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Jizọs kwere nkwa na ‘ndị nọ n’ili ncheta ga-apụta.’ (Jọn 5:28, 29) Dị ka Chineke zubere na mbụ, ụmụ mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-enwe ohere ịdị ndụ n’ụwa paradaịs. (Luk 23:43) Nkwa a Chineke kwere maka ọdịnihu pụtakwara na ụmụ mmadụ na-erube isi ga-enwe ahụ́ ike zuru okè ma dị ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

Gụọkwa Job 14:14, 15; Luk 7:11-17; na Ọrụ 24:15.

Olee Otú M Ga-esi Kpee Ekpere Chineke Anụ Ya?

Nwoke na-ekpe ekpere

IHE MERE E JI AJỤ AJỤJỤ A: Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ndị nọ n’okpukpe niile na-ekpe ekpere. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-eche na a naghị aza ekpere ha.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Jizọs kụziiri anyị ịghara ịdị na-ekwughachi otu ihe mgbe niile n’ekpere anyị. O kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.” (Matiu 6:7) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nụ ekpere anyị, anyị aghaghị ikpe ya otú ọ chọrọ. Iji mee nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmụta ihe bụ́ uche Chineke ma mee ka ekpere anyị kwekọọ na ya. Jọn nke Mbụ 5:14 kọwara, sị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche [Chineke] si dị, ọ na-anụ olu anyị.”

Gụọkwa Abụ Ọma 65:2; Jọn 14:6, 14; na 1 Jọn 3:22.

Olee Otú M Ga-esi Nwee Obi Ụtọ ná Ndụ?

Nwaanyị na-achọ inwe obi ụtọ site n’ịgụ Baịbụl

IHE MERE E JI AJỤ AJỤJỤ A: Ọtụtụ ndị kweere na ha ga-enwe obi ụtọ ma ha nwee ego, bụrụ ndị a ma ama, ma ọ bụkwanụ maa mma. N’ihi ya, ha na-achụso ihe ndị dị otú ahụ—ma mesịa chọpụta na ha enweghị obi ụtọ.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Jizọs kwuru ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ mgbe o kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee ezi obi ụtọ bụ anyị ịmalite igbo mkpa kasị ukwuu anyị nwere—ya bụ, agụụ ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke na nzube ya maka anyị. Eziokwu ahụ dị na Baịbụl. Ịmata eziokwu ahụ ga-enyere anyị aka ịmata ihe dị mkpa n’ezie na ihe na-adịghị mkpa. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka eziokwu Baịbụl na-eduzi mkpebi ndị anyị na-eme na ihe ndị anyị na-eme, nke ahụ ga-eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ ná ndụ.—Luk 11:28.

Gụọkwa Ilu 3:5, 6, 13-18 na 1 Timoti 6:9, 10.

Ihe anyị tụlere ebe a bụ azịza Baịbụl maka naanị ajụjụ isii. Ị̀ chọrọ ịma karịa ole ahụ? Ọ bụrụ na i so ná ndị “maara mkpa ime mmụọ ha,” o doro anya na ị ga-achọ. O nwere ike ịbụ na ị na-eche banyere ajụjụ ndị ọzọ, dị ka: ‘Ọ bụrụ na Chineke na-eche banyere anyị, olee ihe mere o ji kwere ka ihe ọjọọ niile merela n’ụwa mee, kwekwa ka ụmụ mmadụ taa ahụhụ niile ha tarala? Olee otú m nwere ike isi mee ka ezinụlọ m dịkwuo mma?’ Baịbụl zara ajụjụ ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ otú ga-eju onye ọ bụla chọrọ azịza ha afọ.

Ma, ọtụtụ ndị taa na-ala azụ ịgụ Baịbụl. Ha na-ele ya anya dị ka nnukwu akwụkwọ na-esi ike nghọta mgbe ụfọdụ. Ị̀ ga-achọ ka e nyere gị aka inweta azịza nke ajụjụ ndị a na Baịbụl? Ndịàmà Jehova nwere ngwá ọrụ abụọ nwere ike inyere gị aka.

A haziri nke mbụ, bụ́ akwụkwọ aha ya bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? iji nyere ndị na-anaghị enwe ohere aka ịtụle otú doro anya Baịbụl si zaa ajụjụ ndị dị oké mkpa. Nke abụọ bụ ndokwa ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’ebe obibi ha n’efu. Onyeàmà Jehova bi n’ógbè gị nwere ike ịbịa n’ụlọ gị ma ọ bụ n’ebe ọzọ ị chọrọ ma jiri nkeji ole na ole kwa izu kụziere gị Baịbụl n’anaghị gị ego. Ndokwa a enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka gburugburu ụwa. O meela ka ọtụtụ n’ime ha nwee obi ụtọ ma sị onwe ha: “Achọtala m eziokwu!”

Ọ bụ akụ̀ kasị dị oké ọnụ ahịa mmadụ nwere ike ịchọta. Eziokwu Baịbụl na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ na nkwenkwe ụgha, mgbagwoju anya, na egwu na-enweghị isi. Ọ na-eme ka anyị nwee olileanya, nwee nzube ná ndụ, nweekwa ọṅụ. Jizọs kwuru, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:32.

1. Nwoke a na-akuziri Baịbụl; 2. Nwaanyị a na-akụziri Baịbụl

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?

Chineke Ọ̀ Dị Adị n’Eziokwu?

Baịbụl kwuru na Chineke dị, ma è nwere ihe ndị anyị ji n’aka gosiri na ọ dị n’eziokwu?

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

Ndị nwụrụ anwụ hà ma ihe na-emenụ?

Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?

O nwere ike ịtụ gị n’anya ma ị nụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ọdịnihu.

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịna-ekpe Ekpere? M Kpee Ekpere Chineke Ọ̀ Ga-aza M?

Ikpe ekpere otú Chineke chọrọ ga-eme ka ọ za ekpere gị.