Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

O nwere ike ịbụ na ịnụ akụkọ ọma ma ọ bụ ozi ọma na-amasị gị. E nwekwara akụkọ ma ọ bụ ozi ọma dị otú ahụ maka gị na ndị ị hụrụ n’anya.

Ozi ọma ahụ dị na Baịbụl. Ọ bụkwa Jehova Chineke, Onye Kere Eluigwe na Ụwa, mere ka e dee ya ogologo oge gara aga. N’akwụkwọ a, anyị ga-elekwasị anya n’anọ n’ime akwụkwọ niile dị na Baịbụl. Akwụkwọ ndị a nwere ozi ọma maka anyị niile. Ha zara aha ndị Chineke ji dee ha. Ha bụ Matiu, Mak, Luk, na Jọn.

Ihe ọtụtụ ndị na-akpọ ha bụ Oziọma anọ. Ha kọrọ akụkọ gbasara Jizọs, na ọ bụ ya ka Chineke ga-esi n’aka ya zọpụta anyị. Ha kọkwara na ebe ọ bụ ya bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga-agọzi ndị niile nwere okwukwe na ya ruo mgbe ebighị ebi.—Mak 10:17, 30; 13:13.

GỊNỊ MERE HA JI DỊRỊ ANỌ?

O nwere ike ịbụ na i chetụla ihe mere Chineke ji nye mmadụ anọ mmụọ nsọ, ha edee otú Jizọs si bie ndụ na ihe ndị ọ kụziri.

E nwere uru ọ bara mmadụ anọ ide akụkọ banyere ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mmadụ anọ na onye nkụzi a ma ama nọ. Onye nke nọ ya n’ihu bụ onye ọnaụtụ. Onye nke nọ ya n’aka nri bụ dọkịta. Onye nke nọ ya n’aka ekpe ma na-ege ihe ọ na-ekwu bụ onye na-akụ azụ̀ na ezigbo enyi ya. Onye nke nọ́ ya n’azụ ma na-ege ihe ọ na-ekwu bụ ya kacha nta n’ime ha niile. Ha anọ na-ekwucha eziokwu. Onye nke ọ bụla n’ime ha nwekwara ihe ndị kacha amasị ya n’ebe onye nkụzi ahụ nọ, nweekwa ebe o lekwasịrị anya. Ọ bụrụ na ha edee ihe onye nkụzi ahụ na-akụzi na ihe ndị ọ na-eme, onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ike ịkọ ihe kacha amasị ya gbasara onye nkụzi ahụ na ihe ndị ọ na-akụzi. Ọ bụrụ na mmadụ eburu ebe onye nke ọ bụla lekwasịrị anya n’obi gụọ ihe ha dere, ọ ga-aghọta ihe niile onye nkụzi ahụ kụziri na ihe o mere. Ihe atụ a gosiri uru ọ baara anyị na Chineke mere ka mmadụ anọ dee akụkọ gbasara Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ.

N’ihe atụ ahụ, onye ọnaụtụ chọrọ ide ihe ga-eru ndị Juu n’obi. N’ihi ya, ọ chịkọtara ihe ahụ onye nkụzi ahụ kụziri nakwa ihe ndị ọzọ merenụ ma dee ha otú ọ ga-amasị ndị Juu. Onye nke bụ́ dọkịta  kwuru karịchaa otú onye nkụzi ahụ si gwọọ ndị ọrịa na ndị ngwọrọ. Ọ hapụrụ ihe ụfọdụ onye ọnaụtụ ahụ dere ma ọ bụkwanụ dee ha n’usoro nke ya. Ezigbo enyi onye nkụzi ahụ dere karịchaa otú obi na-adị onye nkụzi ahụ nakwa otú o si akpa àgwà. Onye nke kacha nta n’ime ha gburu nke ya nkenke. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe onye nke ọ bụla n’ime ha dere bụ eziokwu. Ihe atụ a gosiri otú ihe mmadụ anọ ahụ dere banyere Jizọs si baara anyị uru. Ha mere ka anyị ghọtakwuo ihe ndị o mere, ihe ndị ọ kụziri, na ụdị onye ọ bụ.

Ndị mmadụ nwere ike ịna-ekwu banyere ‘Oziọma Matiu’ ma ọ bụ ‘Oziọma Jọn.’ Ọ dịghị njọ ịkpọ ha aha ndị a n’ihi na ha nwechara “ozi ọma banyere Jizọs Kraịst.” (Mak 1:1) Ma, a chịkọta ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere, e nwere ike ikwu na ha bụ otu Oziọma banyere Jizọs, nke e dere ụzọ anọ.

Ọtụtụ ndị na-amụ Okwu Chineke ejirila ihe ndị a kọrọ akụkọ ha na Matiu, Mak, Luk, na Jọn tụnyere ibe ha ma dee akwụkwọ ndị mere ka a ghọta na ha na-ekwu otu ihe. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka afọ 170, onye Siria aha ya bụ Teshan, nke na-ede akwụkwọ, mere otú ahụ. Ọ ghọtara na ihe ndị e dere n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn bụ eziokwu nakwa na e ji ike mmụọ nsọ dee ha. N’ihi ya, o si na ha dee akwụkwọ a na-akpọ Diatessaron. Akwụkwọ a kọrọ gbasara Jizọs na otú o si jee ozi ya.

Akwụkwọ a bụ́ Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ mekwara otú ahụ. Ma ọ ka Diatessaron mma n’ihi na o nweghị ihe dị n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn ọ na-akọghị. Ihe ndị ọ kọrọ zikwara ezi karịa nke Diatessaron. Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na anyị aghọtakwuola otú ọtụtụ amụma Jizọs buru na ihe atụ ndị o mere si mezuo. Mmezu ha mezuru mere ka ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere dokwuo anyị anya. O mekwara ka anyị ghọta usoro ha si mee. Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie achọpụtakwala ihe ndị mere ka anyị ghọtakwuo ihe ụfọdụ a kọrọ na Matiu, Mak, Luk, na Jọn nakwa ebe uche ndị dere ha kacha dịrị. E nweghị onye kwesịrị isi ọnwụ na ọ bụ usoro e si kọọ ihe ndị dị n’akwụkwọ a bụ́ Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ bụ usoro ha si mee. Ma akwụkwọ a gbara mbọ ịkọ ha n’usoro o yikarịrị ka ọ̀ bụ usoro ha si mee.

ỤZỌ, EZIOKWU, NA NDỤ

Ka ị na-agụ akwụkwọ a, ya ana-atọ gị ụtọ, buru n’obi isi ihe akwụkwọ a na-akụziri gị na ndị ị hụrụ n’anya. Cheta na Jizọs Kraịst gwara Tọmọs onyeozi, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—Jọn 14:6.

Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịghọta n’eziokwu na Jizọs bụ “ụzọ.” Ọ bụ naanị site na ya ka anyị nwere ike ikpegara Jehova Chineke ekpere. Ihe ọzọ bụ na Jizọs bụ naanị onye nwere ike ime ka anyị na Chineke dịghachi ná mma. (Jọn 16:23; Ndị Rom 5:8) N’ihi ya, ọ bụ naanị n’aka ya ka anyị nwere ike isi bụrụ enyi Chineke.

Jizọs bụ “eziokwu.” Ọ kụziiri ndị mmadụ eziokwu dị n’Okwu Chineke, meekwa ihe ndị ọ kụziiri ha. O mezuru ọtụtụ amụma e buru n’Okwu Chineke. Nke a mere ka amụma ndị ahụ bụrụ “ee site na ya.” (2 Ndị Kọrịnt 1:20; Jọn 1:14) Amụma ndị ahụ na-enyere anyị aka ịmata ọrụ dị́ mkpa Jizọs na-arụ ka nzube Chineke mezuo.—Mkpughe 19:10.

Jizọs Kraịst bụkwa “ndụ.” Àjà o ji ndụ ya zuru okè na ọbara ya chụọ ga-eme ka anyị nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, “ndụ ebighị ebi.” (1 Timoti 6:12, 19; Ndị Efesọs 1:7; 1 Jọn 1:7) Ọ ga-abụkwara ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ anwụ “ndụ,” ya bụ, ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ ha enwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs.—Jọn 5:28, 29.

Anyị niile kwesịrị ịghọta ọrụ Jizọs na-arụ ka nzube Chineke mezuo, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ka akwụkwọ a ị na-agụ, nke kọrọ banyere Jizọs, onye bụ́ “ụzọ na eziokwu na ndụ” tọọ gị ụtọ.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụwa Anyị A?

Baịbụl kwuru ihe mere Chineke ji kee ụwa, mgbe nsogbu ga-akwụsị, otú ụwa ga-esi ghọọ paradaịs na ndị ga-ebi na ya.