Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 91

Jizọs Akpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

Jizọs Akpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

JỌN 11:38-54

  • A KPỌLITE LAZARỌS N’ỌNWỤ

  • NDỊ SANHEDRIN AGBAA IZU IGBU JIZỌS

Mgbe Jizọs hụchara Mata na Meri n’ebe dị nso na Betani, ya na ha sooro gawa n’ili Lazarọs. Ili ahụ bụ ọgba, e jikwa nkume dọchie ọnụ ya. Mgbe ha rutere, Jizọs sịrị: “Kwapụnụ nkume ahụ.” Ebe ọ bụ na Mata amaghị ihe Jizọs chọrọ ime, o kwuru ihe gosiri na e kwesịghị imepewe ili ahụ. Ọ sịrị: “Onyenwe anyị, ka ọ dị ugbu a, ọ ghaghị ịbụ na o siwela ísì, n’ihi na o meela ụbọchị anọ.” Ma, Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?”—Jọn 11:39, 40.

Ha kwapụziri nkume ahụ, Jizọs elelie anya elu ma kpee ekpere, sị: “Nna, ana m ekele gị na ị nụwo olu m. N’eziokwu, amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile; ma ekwuru m okwu n’ihi ìgwè mmadụ a ndị guzo gburugburu, ka ha wee kwere na ọ bụ gị zitere m.” Ekpere a Jizọs kpere n’ihu ọha gosiri ndị nọ n’ebe ahụ na ọ bụ ike Chineke ka ọ ga-eji eme ihe ọ chọrọ ime. Jizọs tiziri mkpu, sị: “Lazarọs, pụta!” Lazarọs eburu ákwà e kere ya n’ụkwụ na n’aka nakwa nke e kere ya n’ihu pụta. Jizọs gwaziri ndị nọ ebe ahụ, sị: “Tọpụnụ ya ákwà ma hapụ ya ka ọ laa.”—Jọn 11:41-44.

Ọtụtụ ndị Juu bịara ịkasi Meri na Mata obi hụrụ ọrụ ebube a ma nwee okwukwe na Jizọs. Ma, ụfọdụ n’ime ha pụwara gaa gwa ndị Farisii ihe Jizọs mere. Ndị Farisii na ndị isi nchụàjà kpọkọtara ndị so na Sanhedrin bụ́ ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu. Keyafas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, so ná ndị zukọtaranụ. Ụfọdụ n’ime ha kwara arịrị, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama? Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, ha niile ga-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ, ndị Rom ga-abịakwa were ma ụlọ nsọ anyị ma mba anyị.” (Jọn 11:47, 48) N’agbanyeghị na ndị hụrụ “ọtụtụ ihe iriba ama” Jizọs mere agwala ndị Sanhedrin ahụ ihe ha hụrụ, ihe Chineke si n’aka Jizọs na-eme emeghị ka ha nwee obi ụtọ. Ihe ka ha mkpa bụ ọkwá ha.

Ọ bụ ndị Sadusii ka mkpọlite a kpọlitere Lazarọs kacha mebiere ihe n’ihi na ha ekwetaghị ná mbilite n’ọnwụ. Keyafas, bụ́ onye Sadusii, kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe unu maara ma ọlị, unu echeghịkwa na ọ kaara unu mma ka otu onye nwụchitere mmadụ niile ọnwụ, kama a ga-ebibi mba a dum.”—Jọn 11:49, 50; Ọrụ 5:17; 23:8.

Keyafas ekwughị ihe a “n’echiche nke onwe ya,” kama ọ bụ Chineke mere ka o kwuo ya ebe ọ bụ nnukwu onye nchụàjà. Ihe Keyafas na-ekwu bụ na e kwesịrị igbu Jizọs ka ọ ghara ime ka ndị mmadụ kwụsị ịna-akwanyere hanwa bụ́ ndị isi okpukpe ndị Juu ùgwù. N’agbanyeghị na Keyafas buuru Jizọs ihe ọjọọ n’obi, okwu a o kwuru bụ amụma nke gosiri na ọnwụ Jizọs ga-agbapụta ma ndị Juu ma ndị niile bụ́ “ụmụ Chineke ndị gbasasịrị agbasasị.”—Jọn 11:51, 52.

Ihe a Keyafas kwuru mere ka ndị Sanhedrin malite ịgba izu otú ha ga-esi gbuo Jizọs. Ọ̀ ga-abụ na Nikọdimọs, onye Sanhedrin ya na Jizọs dị ná mma, kọọrọ Jizọs ihe a a chọrọ ime ya? Ma, ọ̀ kọọrọ ya ma ọ̀ bụ na ọ kọrọghị ya, Jizọs si n’ógbè Jeruselem pụọ. Ọpụpụ a ọ pụrụ mere ka a ghara igbu ya mgbe oge Chineke kara aka na-erubeghị.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?

O nwere ike ịtụ gị n’anya ma ị nụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ọdịnihu.

Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, Ọ Pụtaghị na nke Ya Agaala

Gịnị mere Jizọs ji sị na onye nwụrụ anwụ na-ehi ụra? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ?