Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 96

Jizọs Azaa Otu Onye Ọchịchị Ajụjụ Ọ Jụrụ Ya

Jizọs Azaa Otu Onye Ọchịchị Ajụjụ Ọ Jụrụ Ya

MATIU 19:16-30 MAK 10:17-31 LUK 18:18-30

  • OTU NWOKE BARA ỌGARANYA AJỤỌ AJỤJỤ BANYERE NDỤ EBIGHỊ EBI

Jizọs ka sikwa na Peria na-agafe ka ọ na-aga Jeruselem. Otu nwoke bara ọgaranya gbaara ọsọ gbakwute ya, gbuo ikpere n’ala n’ihu ya. Nwoke a bụ “onye na-achị achị.” Ọ ga-abụ na ọ bụ onyeisi oche n’ụlọ nzukọ ma ọ bụ onye so ná nzukọ Sanhedrin. Ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ezi Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”—Luk 8:41; 18:18; 24:20.

Jizọs zara ya, sị: “Gịnị mere i ji akpọ m ezi onye? Ọ dịghị onye bụ́ ezi onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.” (Luk 18:19) Ọ ga-abụ na “ezi onye” nwoke a kpọrọ Jizọs bụ aha ka ọ na-etu ya otú ahụ ndị rabaị si etu onwe ha aha. Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma akụzi ihe nke ọma, ma o mere ka nwoke ahụ mata na ọ bụ naanị Chineke ka e kwesịrị ịkpọ “ezi Onye.”

Jizọs gwaziri ya, sị: “Ma ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ndụ, na-edebe ihe ndị e nyere n’iwu.” Nwoke ahụ jụrụ ya, sị: “Olee ndị ọ bụ?” Jizọs gwara ya iwu ise n’ime Iwu Iri ahụ, ya bụ, egbula ọchụ, akwala iko, ezula ohi, agbala akaebe ụgha, sọpụrụ nna gị na nne gị. Jizọs gwaziri ya iwu ka iwu ndị nke ahụ mkpa. Ọ sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 19:17-19.

Ma, nwoke ahụ sịrị Jizọs: “M na-edebe ihe a niile; gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” (Matiu 19:20) Ọ ga-abụ na o chere na e nwere otu nnukwu ihe ọma ọ ka ga-eme iji nweta ndụ ebighị ebi. Jizọs bịara “nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ” n’ihi na ọ chọpụtara na nwoke ahụ chọsiri ike ịma ihe ọ ga-eme iji nweta ndụ ebighị ebi. (Mak 10:21) Ma, e nwere otu ihe ga-esiri nwoke ahụ ike ime.

Nwoke a ejighị akụnụba ya egwu egwu. Jizọs gwara ya, sị: “Ọ dị otu ihe ị ka ga-eme: Gaa, ree ihe ndị i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Nwoke a ga-emeli ihe a a sịrị ya mee. Ọ ga-enyeli ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ego ya ma ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ma, ọ ga-abụ na Jizọs nọ na-emetere nwoke a ebere ka nwoke a biliri, lawa ná mwute. Otú obi nwoke a si dịrị “n’ọtụtụ ihe onwunwe” ya mere ka ọ ghara ịhụ nke bụ́ ezigbo akụ̀. (Mak 10:21, 22) Jizọs kwuru, sị: “Lee ka ọ ga-esi siere ndị nwere ego ike ịba n’alaeze Chineke!”—Luk 18:24.

Ihe a Jizọs kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. Ihe ọzọ o kwukwara tụrụ ha n’anya bụ: “Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga e ji akwa ákwà gafere karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.” Ihe a mere ka ndị na-eso ụzọ ya jụọ ya, sị: “Ònyezi ka a pụrụ ịzọpụta?” Ihe a ga-eji zọpụta mmadụ ò siri oké ike nke na o nweghị onye ga-emeli ya? Jizọs legidere ha anya n’ihu ma sị ha: “Ihe na-ekweghị omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ kwere omume n’ebe Chineke nọ.”—Luk 18:25-27.

Pita kwuziri ihe gosiri na ihe ha mere dị iche n’ihe ahụ nwoke ahụ bara ọgaranya mere. Ọ sịrị: “Lee! Anyị ahapụwo ihe niile, soro gị; gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?” Jizọs gwara ha ihe ha ga-enweta n’ihi mkpebi ọma a ha mere. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu, Mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube, unu onwe unu ndị sowooro m ga-anọdụkwa ala n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.”—Matiu 19:27, 28.

O doro anya na mgbe Jizọs na-ekwu na ihe a ga-eme bụ n’ọdịnihu, mgbe a ga-eme ka ihe dịghachi mma n’ụwa otú ahụ ọ dịbu n’ogige Iden. Ihe a ga-eji kwụọ Pita na ndịozi ndị ọzọ ụgwọ bụ na ha ga-eso Jizọs nọrọ n’eluigwe na-achị ụwa mgbe a ga-eme ka ọ ghọọ Paradaịs. Ihe ọ bụla ha mere iji nweta ụgwọ ọrụ a efughị ọhịa.

Ma, o nwere ụgwọ ọrụ ndị ha nwetara mgbe ha ka nọ n’ụwa. Jizọs gwara ha, sị: “Ọ dịghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ nne na nna ma ọ bụ ụmụ n’ihi alaeze Chineke, bụ́ onye na-agaghị enweta ihe ka ya okpukpu okpukpu n’oge a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ime usoro ihe na-abịanụ.”—Luk 18:29, 30.

N’eziokwu, ebe ọ bụla ndị na-eso ụzọ ya gara, ha na ndị ọzọ na-efe Chineke na-adị ná mma, na-emekọkwa ihe ọnụ karịadị ndị si n’otu ezinụlọ. Ma, ọ dị mwute na onye ọchịchị ahụ bara ọgaranya nwere ike ọ gaghị enweta ụdị ngọzi a, ọ gaghịkwa eso Jizọs chịa n’eluigwe.

Jizọs kwukwara, sị: “Ma ọtụtụ ndị bụ́ ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị mbụ.” (Matiu 19:30) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

Onye ọchịchị a bara ọgaranya so ná “ndị mbụ” ebe ọ bụ na o so ná ndị ndú ndị Juu. Ebe ọ bụ na ọ na-edebe iwu Chineke, e lere anya na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ịzọpụta ya, a na-elekwa ya anya ka onye ezi omume. Ma, o gosila na akụnụba bụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Ma, ndị nkịtị ghọtara na ihe Jizọs na-akụzi bụ eziokwu, nakwa na ọ bụ ihe ahụ ọ na-akụzi ga-eme ka ha nweta ndụ. E nwere ike ikwu na ha bụ “ndị ikpeazụ.” Ma ugbu a, ọ bụzi ha bụ “ndị mbụ.” Ha nwere olileanya iso Jizọs nọrọ n’ocheeze n’eluigwe na-achị ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.