Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 88

Ọnọdụ Ọgaranya ahụ na Lazarọs Agbanwee

Ọnọdụ Ọgaranya ahụ na Lazarọs Agbanwee

LUK 16:14-31

  • IHE ATỤ ỌGARANYA NA LAZARỌS

Jizọs nọ kemgbe na-enye ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ gbasara ihe mmadụ kwesịrị iji akụ̀ ya na-eme. Ma, ọ bụghị naanị ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ege ya ntị. Ndị Farisii nọkwa ebe ahụ. Ha kwesịkwara ịmụta ihe na ndụmọdụ a Jizọs na-enye ha. N’ihi gịnị? N’ihi na ha “hụrụ ego n’anya.” Mgbe ha nụrụ ihe Jizọs na-ekwu, ‘ha malitere ịkwa ya emo.’—Luk 15:2; 16:13, 14.

Ma, emo ha na-akwa Jizọs emeghị ka ọ kwụsị ikwu ihe ọ na-ekwu. Jizọs gwara ha, sị: “Unu bụ ndị na-akpọ onwe unu ndị ezi omume n’ihu ụmụ mmadụ, ma Chineke maara obi unu; n’ihi na ihe dị elu n’etiti ụmụ mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke.”—Luk 16:15.

Ọ dịla anya e weere ndị Farisii ka ndị “dị elu n’etiti ụmụ mmadụ.” Ma, oge eruola ka ihe gbanwee. A ga-eweda ndị a na-ebuli elu ala, ya bụ, ndị bara ọgaranya na ndị nọ n’ọchịchị na ndị ndú okpukpe. Ma, a ga-ebuli ndị nkịtị elu, ya bụ, ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Jizọs kwuziri ihe gosiri na ihe ebidola ịgbanwe. Ọ sịrị:

“Iwu ahụ na ihe ndị amụma kụziri dị ruo n’oge Jọn. Site n’oge ahụ gaa n’ihu, a na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke, ụdị mmadụ niile na-agbalịsi ike ịbanye n’ime ya. N’ezie, ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịgabiga karịa otu akụkụ mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu ahụ ịghara imezu.” (Luk 3:18; 16:16, 17) Olee otú ihe a Jizọs kwuru si gosi na ihe agbanwewala?

Ndị ndú okpukpe ndị Juu na-etu ọnụ na ha na-edebe Iwu Mozis. Cheta na mgbe Jizọs meghere anya otu nwoke kpuru ìsì na Jeruselem, ndị Farisii kwuru, sị: “Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mozis. Anyị maara na Chineke gwara Mozis okwu.” (Jọn 9:13, 28, 29) Ma, otu ihe mere Chineke ji nye ụmụ Izrel Iwu ahụ bụ ka o mee ka ndị dị umeala n’obi mata Mesaya ahụ bụ́ Jizọs. Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuru na ọ bụ Jizọs bụ Nwa Atụrụ Chineke. (Jọn 1:29-34) Kemgbe Jọn bidoro izi ndị Juu ozi ọma, ndị dị umeala n’obi n’ime ha, karịchaa ndị ogbenye, na-anụ banyere “alaeze Chineke.” N’eziokwu, e nwere “ozi ọma” a ga-ezi ndị niile chọrọ ka Alaeze Chineke chịwa ha nakwa ka ọ baara ha uru.

Iwu Mozis mezuru ihe mere e ji nye ya ụmụ Izrel. O meela ka a mata Mesaya ahụ. Ma, oge a ga-akwụsị idebe ya eruwela. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ihe Iwu ahụ kwuru nwere ike ime ka mmadụ gbaa nwunye ya alụkwaghịm. Ma, Jizọs kwuru na “onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ nwaanyị ọzọ na-akwa iko, onye lụkwara nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm na-akwa iko.” (Luk 16:18) Ihe a Jizọs kwuru kpasuru ndị Farisii iwe, bụ́ ndị na-achọkarị imere ihe niile iwu.

Jizọs meziri ihe atụ gosiri na ihe na-agbanwe n’ike n’ike. Ihe atụ ahụ kwuru banyere ụmụ nwoke abụọ ọnọdụ ha gbanwere na mberede. Ka anyị na-eleba anya n’ihe atụ a, buru n’obi na ụfọdụ n’ime ndị na-ege ihe Jizọs na-ekwu bụ ndị Farisii ahụ hụrụ ego n’anya, ndị ndị mmadụ na-ebulikwa elu.

Jizọs meere ha ihe atụ, sị: “Otu nwoke bara ọgaranya. Ọ na-ejikwa ákwà na-acha odo odo na ákwà linin achọ onwe ya mma, na-emekwa onwe ya obi ụtọ n’ụzọ okomoko site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Ma e nwere onye arịrịọ aha ya bụ Lazarọs nke a na-ebute n’ọnụ ụzọ ámá ya. Ọnyá jukwara ya n’ahụ́. Ọ na-agụkwa ya agụụ iri ihe si na tebụl ọgaranya ahụ na-adapụ. Ee, nkịta na-abịakwa aracha ọnyá ya.”—Luk 16:19-21.

O doro anya na ọ bụ ndị Farisii a hụrụ ego n’anya bụ ‘nwoke ahụ bara ọgaranya’ Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ya. Ọ na-amasịkwa ha iyi ọmarịcha uwe ndị na-ada oké ọnụ. E wezụgakwa na ha bara ọgaranya, ọkwá ndị ha nọ na ya n’okpukpe ndị Juu mere ka ha yie ndị ukwu. N’ihe atụ ahụ, Jizọs kwuru na ọgaranya ahụ yi ákwà na-acha odo odo. Nke a na-egosi ọnọdụ ọma ndị ndú okpukpe a nọ na ya. Jizọs kwukwara na ọgaranya ahụ yi ákwà linin. Ákwà linin a dị́ ọcha na-egosikwa na ndị ndú okpukpe ahụ bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha.—Daniel 5:7.

Olee otú ndị ndú okpukpe a bara ọgaranya ma dị okomoko si were ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha? Ha na-elelị ha, na-akpọkwa ha am ha·’aʹrets, ya bụ, ndị dị ala, ndị na-amaghị Iwu  Mozis na ndị a na-ekwesịghị ịkụziri Iwu ahụ. (Jọn 7:49) Otú a e si were ha mere ka ha yie ‘onye arịrịọ ahụ aha ya bụ Lazarọs,’ bụ́ onye ọ na-agụ agụụ iri ụmụ irighiri “ihe si na tebụl ọgaranya ahụ na-adapụ.” Otú ahụ ọnyá si ju Lazarọs ahụ́, a na-eledakwa ya anya, ka e sikwa na-eleda ndị nkịtị anya, na-ele ha anya ka ndị Chineke jụrụ ajụ.

O teela e lewere ndị nkịtị anya otú a. Ma, Jizọs ma na oge eruola mgbe ọnọdụ ndị ahụ yiri ọgaranya ahụ na nke ndị ahụ yiri Lazarọs ga-agbanwe.

OTÚ ỌNỌDỤ ỌGARANYA AHỤ NA LAZARỌS SI GBANWEE

Jizọs kọwara otú ọnọdụ ọgaranya ahụ na Lazarọs si gbanwee. O kwuru, sị: “Ma, ka oge na-aga, onye arịrịọ ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi wee buru ya gaa n’ebe ọ dabeere n’obi Ebreham. Ọgaranya ahụ nwụkwara, e wee lie ya. Ọ nọ n’ime Hedis lelie anya. Ọ nọkwa ná mmekpa ahụ́. O wee hụ Ebreham n’ebe dị anya, hụkwa Lazarọs ka ọ dabeere n’obi ya.”—Luk 16:22, 23.

Ndị Jizọs na-agwa okwu ma na ọ dịla anya Ebreham nwụrụ nakwa na ọ nọ n’ili. Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na Ebreham na ndị ọzọ niile nọ n’ili ma ọ bụ na Shiol enweghị ike ịhụ ụzọ ma ọ bụ ikwu okwu. (Ekliziastis 9:5, 10) Gịnịzi ka ndị ndú okpukpe ahụ chere Jizọs ji ihe atụ a na-akọwa? Gịnị ka ihe atụ a na-eme ka a ghọta banyere ndị nkịtị na ndị ndú okpukpe ahụ hụrụ ego n’anya?

Jizọs agwabuola ha na ‘Iwu ahụ na ihe ndị amụma kụziri dị ruo n’oge Jọn, ma site n’oge ahụ gaa n’ihu, a na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.’ Ihe a ọ gwara ha gosiri na ihe agbanweela. Ọ bụ ozi ọma Jọn na Jizọs Kraịst zisara mere ka ọnọdụ ọgaranya ahụ na Lazarọs gbanwee ma a bịa n’otú Chineke si ele ha anya.

Ọ dịla anya e gbochiri ndị dị umeala n’obi ma ọ bụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ife Chineke. Ma ugbu a, a na-enyeziri ha aka ife Chineke. Ha nabatara ozi ọma Alaeze Jọn Onye Na-eme Baptizim ziri ha, na-anabatakwa nke Jizọs na-ezi ha. N’oge mbụ, ihe ha na-enweta bụ naanị irighiri ‘ihe si na tebụl na-adapụ,’ ya bụ, ihe ndị na-erijughị afọ ndị ndú okpukpe na-akụziri ha. Ma ugbu a, a na-akụziri ha eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, karịchaa, ihe ndị magburu onwe ha Jizọs na-akụziri ha. Ihe a na-akụziri ha ugbu a emeela ka ha na Jehova Chineke dịrị ná mma.

Ma, ndị ndú okpukpe a a ma ama bara ọgaranya jụrụ ịnabata ozi ọma Jọn zisaara ha, jụkwa nke Jizọs na-ezisa kemgbe n’ebe dị iche iche. (Matiu 3:1, 2; 4:17) Ozi a Jọn na Jizọs zisara were ha iwe ma ọ bụ mekpaa ha ahụ́. Ozi a bụ banyere mbibi Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ.  (Matiu 3:7-12) Ahụ́ ga-eru ndị ndú okpukpe ndị a hụrụ ego n’anya ala ma a sị na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ga-akwụsị ikwusa ozi ọma. Ndị ndú okpukpe ndị a yiri ọgaranya ahụ Jizọs kọrọ gbasara ya n’ihe atụ o mere. Ọgaranya ahụ kwuru, sị: “Nna m Ebreham, meere m ebere ma zie Lazarọs ka o detụ ọnụ ọnụ mkpịsị aka ya ná mmiri ma mee ka ire m jụọ oyi, n’ihi na anọ m ná nhụjuanya n’ọkụ a nke na-enwusi ike.”—Luk 16:24.

Ma, a gaghị emere ha ihe a n’ihi na ọtụtụ ndị ndú okpukpe ahụ echegharịghị. Ha “egeghị Mozis na Akwụkwọ Ndị Amụma ntị.” A sị na ha gere ha ntị, ha gaara ekweta na Jizọs bụ Mesaya na Eze Chineke họpụtara. (Luk 16:29, 31; Ndị Galeshia 3:24) Ha jụkwara iweda onwe ha ala ka ndị ogbenye ndị ahụ nabatarala Jizọs, ha na Chineke dị ná mma, nyere ha aka. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs akwụsịghị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ kwụsị ikwu nke bụ́ eziokwu iji mee ka ahụ́ ruo ndị ndú okpukpe ala. Jizọs mere ka ihe a doo anya n’ihe atụ ahụ o mere. Ọ sịrị na “Ebreham” gwara ọgaranya ahụ, sị:

“Nwa m, cheta na ị natazuru ihe ọma gị n’oge ị nọ ndụ, ma Lazarọs natara ihe ọjọọ. Otú ọ dị, ugbu a, a na-akasi ya obi n’ebe a ma ị nọ ná nhụjuanya. E wezụgakwa ihe ndị a niile, e mewo ka oké olulu dị n’agbata anyị na unu, ka ndị chọrọ isi n’ebe a gakwuru unu ghara inwe ike ịgafe, ndị mmadụ agaghịkwa esi n’ebe ahụ gafeta n’ebe anyị nọ.”—Luk 16:25, 26.

Otú a ọnọdụ ndị ndú okpukpe na ndị nkịtị si gbanwee magburu nnọọ onwe ya. E wetuola ndị ndú okpukpe ahụ dị mpako ala ma bulie ndị ahụ dị umeala n’obi kwere nyara yok Jizọs elu. A na-akụzikwara ndị a dị umeala n’obi okwu Chineke ugbu a. (Matiu 11:28-30) Ọtụtụ ndị ga-amatakwu banyere mgbanwe a n’ọnwa ole na ole na-abịanụ mgbe a ga-eji ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie ọgbụgba ndụ Iwu. (Jeremaya 31:31-33; Ndị Kọlọsi 2:14; Ndị Hibru 8:7-13) Mgbe Chineke ga-awụkwasị ndị ya mmụọ nsọ ya n’ụbọchị Pentikọst afọ 33, ọ ga-edokwu anya na ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka Chineke nabatara, ọ bụghị ndị Farisii na ndị òtù ha.