Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 86

Nwa Furu Efu Alọta

Nwa Furu Efu Alọta

LUK 15:11-32

  • IHE ATỤ NWA FURU EFU

Ọ ga-abụ na Jizọs ka nọ na Peria, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, mgbe o mere ihe atụ atụrụ furu efu na mkpụrụ ego drakma. Ihe atụ abụọ a na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ ma onye mmehie chegharịa ma lọghachikwute Chineke. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ na-akatọ Jizọs n’ihi na ọ na-anabata ndị mmehie chegharịrị echegharị. Ma, ò nwere ihe ha mụtara n’ihe atụ abụọ a Jizọs mere? Hà ghọtara otú Nna anyị nke eluigwe si ewere ndị mmehie chegharịrị echegharị? Jizọs mere ihe atụ ọzọ nke mere ka a ghọtakwuo otú obi na-adị Chineke ma ndị mmehie chegharịa.

N’ihe atụ ahụ, Jizọs kọrọ gbasara otu nna nke nwere ụmụ nwoke abụọ. Ọ bụ nwa ya nke nta ka a kacha kwuo gbasara ya n’ihe atụ a. Ndị Farisii, ndị odeakwụkwọ, na ndị ọzọ nụrụ ihe Jizọs kwuru kwesịrị ịmụta ihe n’ihe ọ kọrọ banyere nwa ya nke nta a. Ma, anyị ekwesịghị ileghara ihe Jizọs kwuru gbasara nwanne ya nke okenye na nna ha anya n’ihi na ihe ha mere ga-akụzikwara anyị ihe. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji chebara mmadụ atọ a echiche ka Jizọs na-akọ akụkọ a.

Jizọs sịrị: “Otu nwoke nwere ụmụ ndị ikom abụọ. Nke nta n’ime ha wee sị nna ya, ‘Nna m, kee ihe i nwere, nye m nke ruuru m.’ Ya mere, o keere ha ihe o ji biri.” (Luk 15:11, 12) Ị̀ hụrụ na ọ bụghị na nna ha anwụọla mere nwa ya nke nta ji sị ka e kee akụ̀ nna ha? Nna ha ka nọ ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, nwa ahụ chọrọ òkè nke ya ozugbo ka o nwee ike ịnọrọ onwe ya ma mewe ihe dị ya mma. Olee ihe ọ chọrọ ịga mewe?

Jizọs sịrị: “E mesịa, mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwa ya nwoke nke nta chịkọtara ihe niile gawa mba ọzọ nke dị anya. O mefusịrị ihe o nwere n’ebe ahụ site n’ibi ndụ ịla n’iyi.” (Luk 15:13) Kama ịnọ n’ụlọ ha bụ́ ebe nna ya na-elebara ya na nwanne ya anya ma na-egboro ha mkpa ha, ọ gawara mba ọzọ. N’ebe ahụ, o ji ihe niile o ketara bie ndụ ịla n’iyi ma mefusịa ha niile. Jizọs kwuru na mgbe o mefusịrị ha niile, ihe siiri ya ezigbo ike. Jizọs sịrị:

“Mgbe o mefusịrị ihe niile, oké ụnwụ dara ná mba ahụ dum, ọ malitekwara ịnọ n’ụkọ. Ọ gara ọbụna binyere otu n’ime ụmụ amaala mba ahụ, onye ahụ wee ziga ya n’ubi ya ka ọ na-azụ ézì. Ọ na-agụkwa ya agụụ ka o were ụgbụgbọ mkpụrụ osisi karọb nke ézì na-eri, rijuo afọ, ma ọ dịghị onye na-enye ya ihe ọ bụla.”—Luk 15:14-16.

N’agbanyeghị na Iwu Chineke kwuru na ézì bụ anụ na-adịghị ọcha, ọ gara na-elekọta ha. Otú agụụ si nyụọ ya ịkpakwụ meziri ka nri a na-enye ézì ndị ọ na-azụ gụwa ya agụụ. Ọ bụ n’oge ahụ ihe siiri ya ezigbo ike ka “anya doro ya.” Oleezi ihe o mere? Ọ gwara onwe ya, sị: “Lee ọtụtụ ndị nna m goro ọrụ, bụ́ ndị nwejuru ihe oriri enweju, ma ụnwụ na-achọ igbu m ebe a! M ga-ebili gakwuru nna m, sị ya: ‘Nna m, emehiewo m Chineke, mehiekwa gị. Erukwaghị m eru ka a kpọọ m nwa gị. Mee ka m bụrụ otu n’ime ndị i goro ọrụ.’” O biliri lakwuru nna ya.—Luk 15:17-20.

Olee ihe nna ya ga-eme? Ọ̀ ga-eji iwe bakasịara ya mba ahụ́ maka na o zuzuuru hapụ ụlọ ha pụọ? Ọ̀ ga-ajụ ịnabata ya? Ọ bụrụ gị bụ nna ahụ, olee ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ na ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị mere ihe a, gịnị ka ị ga-eme?

 A CHỌTARA NWA AHỤ FURU EFU

Jizọs kwuru otú obi dị nna ahụ na ihe o mere mgbe nwa ya lọtara. Ọ sịrị: “Mgbe [nwa ahụ] ka nọ n’ebe dị anya, nna ya hụrụ ya ma nwee ọmịiko. O wee gbara ọsọ gaa dakwasị ya n’olu ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.” (Luk 15:20) N’agbanyeghị na nna ahụ anụla na nwa ya biri ndụ rụrụ arụ, ọ nabatara ya. Ndị ndú ndị Juu, ndị na-ekwu na ha ma Jehova, na-efekwa ya, hà ga-esi n’ihe atụ a mata otú Nna anyị nke eluigwe si ewere ndị mmehie chegharịrị echegharị? Hà ga-aghọta na Jizọs na-anabatakwa ndị mmehie chegharịrịnụ otú Nna ya si eme?

O nwere ike ịbụ na nna a esila n’otú ihu nwa ya si gbarụọ mata na nwa ya echegharịala. Ma, otú o si jiri obi ya niile gaa nabata ya mere ka ọ dịrị nwa ahụ mfe ikwupụta mmehie ya. Jizọs kwuru, sị: “Nwa ya nwoke wee sị ya, ‘Nna m, emehiewo m Chineke, mehiekwa gị. Erukwaghị m eru ka a kpọọ m nwa gị.’”—Luk 15:21.

Nna ya gwara ndị ohu ya, sị: “Ngwa! chịpụtanụ uwe mwụda nke kasị mma, chịrịkwanụ ya yiwe ya, gbanyenụ ya ọla n’aka, yiwekwa ya akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ. Kpụtanụ nwa oké ehi mara abụba, gbuo ya ka anyị rie ma mee onwe anyị obi ụtọ, n’ihi na nwa m nwoke a nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ; o furu efu, e wee chọta ya. Ha wee malite ime onwe ha obi ụtọ.”—Luk 15:22-24.

Mgbe ihe a niile na-eme, nwa ya nwoke nke okenye nọ n’ubi. Jizọs kọrọ banyere ya, sị: “Mgbe ọ na-alọta ma rute ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwú a na-eti na ụda egwú a na-agba. Ya mere, ọ kpọrọ otu n’ime ndị na-eje ozi ma jụọ ya ihe ihe ndị a pụtara. O wee sị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtawo, nna gị gbukwara nwa oké ehi mara abụba, n’ihi na ọ lọtara n’ahụ́ ike.’ Ma o were iwe, o kweghịkwa abanye n’ụlọ. Nna ya wee pụta ma malite ịrịọsi ya arịrịọ ike. Ọ zara nna ya, sị, ‘Agbaworo m gị ohu ruo ọtụtụ afọ ugbu a, ọ dịbeghị mgbe m mebiri ihe i nyere n’iwu, ma ọ dịbeghị mgbe i nyere m nwa ewu ka mụ na ndị enyi m mee onwe anyị obi ụtọ. Ma ozugbo  nwa gị nwoke a nke ya na ụmụ nwaanyị akwụna richara ihe i ji biri lọtara, i gbuuru ya nwa oké ehi mara abụba.’”—Luk 15:25-30.

Ole ndị ka obi na-adịghị mma otú ọ na-adịghị nwa nke okenye ahụ maka na Jizọs meere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị mmehie ebere? Ọ bụ ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ. Ọ bụ nkatọ ha na-akatọ Jizọs maka na ọ na-anabata ndị mmehie mere o ji mee ihe atụ a. N’eziokwu, onye ọ bụla na-akatọ Chineke maka na ọ na-emere ndị mmadụ ebere kwesịrị ịmụta ihe n’ihe atụ a.

Jizọs kwuziri na nna ahụ rịọrọ nwa ya nke okenye, sị: “Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile bụ́ nke m bụkwa nke gị; ma anyị kwesịrị ime onwe anyị obi ụtọ, ṅụrịakwa ọṅụ, n’ihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma dịrị ndụ ọzọ, o fukwara efu, e wee chọta ya.”—Luk 15:31, 32.

Jizọs ekwughị ihe nwa nke okenye ahụ mechara mee. Ma, mgbe Jizọs nwụrụ ma si n’ọnwụ bilie, “oké ìgwè ndị nchụàjà malitekwara irube isi n’okwukwe Ndị Kraịst.” (Ọrụ Ndịozi 6:7) Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ndị nọ mgbe Jizọs mere ihe atụ nwa ahụ furu efu. Ọ ga-abụ na ihe atụ a ruru ha n’obi nke mere ka anya doo ha, ha echegharịa ma lọghachikwute Chineke.

O nwere ike ịbụ na malite n’ụbọchị ahụ gawa, ndị na-eso ụzọ Jizọs echefughị ihe Jizọs ji ihe atụ a kụziere ha, ha ekwesịghịkwa ichefu ya. Ihe mbụ o ji ya kụziere anyị bụ na anyị ekwesịghị ịhapụ ndị Chineke ma chọrọ ihe ụtọ dị n’ụwa “gawa mba ọzọ nke dị anya.” Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ịnọgide n’ọgbakọ Chineke bụ́ ebe Nna anyị nke eluigwe, Onye hụrụ anyị n’anya, na-egboro anyị mkpa anyị ma na-echebe anyị.

Ihe ọzọ Jizọs ji ihe atụ a kụziere anyị bụ na ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị ahapụ ofufe Chineke, onye ahụ kwesịrị igosi na ọ dị umeala n’obi ma lọghachikwute Nna anyị ka ya na ya dịghachi ná mma.

Ihe ọzọ ihe atụ a na-akụziri anyị bụ ọdịiche dị n’ihe nna ahụ mere na ihe nwa ya nke okenye mere. Nna ahụ ji obiọma nabata nwa ya ma gbaghara ya, ma nwa ya nke okenye achọghị ịnabata nwanne ya ma gbaghara ya. Ọ bụrụ na onye mere mmehie ejiri obi ya niile chegharịa ma lọghachi ‘n’ụlọ Nna ya,’ ndị Chineke kwesịrị ịgbaghara ya ma nabata ya. Ka anyị ṅụrịa ọṅụ na nwanna anyị ahụ ‘nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ, o fukwara efu, a chọta ya.’

GỤKWUO GBASARA YA

Ị̀ ‘Ghọtara Ihe Ọ Pụtara’?

Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ nke hiri ụra, ụgbụ, na nwa mmefu pụtara?