Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 97

Ihe Atụ Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ubi Vaịn

Ihe Atụ Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ubi Vaịn

MATIU 20:1-16

  • “NDỊ IKPEAZỤ” A KPỌRỌ ỊBỊA RỤỌ ỌRỤ N’UBI VAỊN AGHỌỌ “NDỊ MBỤ”

Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị na Peria na “ọtụtụ ndị bụ́ ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị mbụ.” (Matiu 19:30) O jizi otu ihe atụ gbasara ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn mee ka ihe ahụ o kwuru dokwuo anya.

Ọ sịrị: “N’ihi na alaeze eluigwe dị ka otu onye nke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya. Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego dinarịọs maka otu ụbọchị, o zigara ha n’ubi vaịn ya. Mgbe ọ pụkwara n’ihe dị ka n’awa nke atọ, ọ hụrụ ndị ọzọ ka ha guzo n’ọma ahịa n’enweghị ọrụ; o wee sị ha, ‘Unu onwe unu, gaanụ n’ubi vaịn m, ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị ka m ga-enye unu.’ Ha wee gawa. Ọ pụrụ ọzọ n’ihe dị ka n’awa nke isii nakwa n’awa nke itoolu wee mee otu ihe ahụ. N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’ihe dị ka n’awa nke iri na otu wee hụ ka ndị ọzọ guzo, o wee sị ha, ‘Gịnị mere unu ji guzo n’ebe a ụbọchị dum n’enweghị ọrụ?’ Ha sịrị ya, ‘N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.’ O wee sị ha, ‘Unu onwe unu, gaanụ n’ubi vaịn m.’”—Matiu 20:1-7.

Mgbe ndị mmadụ nụrụ ka Jizọs kwuru banyere “alaeze eluigwe” na “onyeisi ezinụlọ,” ọ ga-abụ na onye gbatara ha n’obi bụ Jehova Chineke. Akwụkwọ Nsọ kwuru na Jehova nwere ubi vaịn. Ubi vaịn ahụ bụkwanụ mba Izrel. (Abụ Ọma 80:8, 9; Aịzaya 5:3, 4) E ji ndị nọ n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ tụnyere ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn. Ma, ihe Jizọs na-ekwu abụghị gbasara ihe mere n’oge gara aga. Ọ na-ekwu ihe na-eme n’oge ahụ ọ nọ n’ụwa.

E nwere ike ikwu na ndị ndú okpukpe ahụ na-agbasi mbọ ike n’ozi Chineke otú ahụ ndị Farisii ahụ jí okwu ịgba alụkwaghịm lee Jizọs ule na-eme. Ha dị ka ndị rụrụ ọrụ si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ndị na-atụkwa anya ka a kwụọ ha dinarịọs ole a na-akwụ ndị ọrụ ụbọchị.

Ndị nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị ndú okpukpe a na-ele ndị Juu ndị ọzọ anya ka ndị na-anaghị eferu Chineke otú hanwa na-eferu ya, ya bụ, ha na-ele ha anya ka ndị na-enweghị ezigbo ihe ha na-arụ n’ubi vaịn Chineke. N’ihe atụ ahụ Jizọs mere, ndị Juu ndị ọzọ a bụ ndị ahụ e goro ọrụ “n’awa nke atọ” (ya bụ, n’elekere itoolu nke ụtụtụ) ma ọ bụkwanụ ndị ahụ e goro ọrụ n’awa nke isii, nke itoolu, nakwa nke iri na otu (ya bụ, n’elekere ise nke mgbede).

A na-ele ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eso ụzọ Jizọs anya ka “ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:49) Tupu ha ebido sowe Jizọs, ha bụ ndị ọ́kụ̀ azụ na ndị ọrụ ngo. Ma, n’afọ 29, “onye nwe ubi vaịn ahụ” zitere Jizọs ka ọ bịa kpọkọta ndị a a na-eleda anya ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst ma rụwara Chineke ọrụ. Ọ bụ ha bụ “ndị ikpeazụ” Jizọs sịrị na e goro ọrụ n’awa nke iri na otu.

Jizọs kwuziri ihe mere mgbe ọrụ ụbọchị ahụ gwụrụ. Ọ sịrị: “Mgbe o ruru uhuruchi, onye nwe ubi vaịn ahụ gwara onye na-elekọtara ya ọrụ, sị, ‘Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha, malite n’onye ikpeazụ ruo n’onye mbụ.’ Mgbe ndị awa nke iri na otu bịara, onye ọ bụla n’ime ha natara otu mkpụrụ ego dinarịọs. Ya mere, mgbe ndị mbụ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka ukwuu; ma ha natakwara ụgwọ ọrụ nke bụ́ otu mkpụrụ ego dinarịọs. Mgbe ha natara ya, ha malitere ịtamu ntamu megide onyeisi ezinụlọ ahụ wee sị, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa; n’agbanyeghị nke ahụ, i mere ka anyị na ha hara nhata, anyị ndị nọ na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ kemgbe ụtụtụ n’anwụ!’ Ma ọ zara otu onye n’ime ha, sị, ‘Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. I kwere na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs, ka ọ̀ bụ na i kweghị? Nara ihe bụ́ nke gị lawa. Achọrọ m inye onye ikpeazụ a otu ihe ahụ m nyere gị. Iwu ọ́ kwadoghị ka m jiri ihe ndị bụ́ nke m mee ihe m chọrọ? Ka ị̀ na-emere m anyaụfụ maka na m bụ ezi mmadụ?’ Otú a, ndị ikpeazụ ga-abụ ndị mbụ, ndị mbụ ga-abụkwa ndị ikpeazụ.”—Matiu 20:8-16.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere ike ịna-eche ihe ihe ikpeazụ a Jizọs kwuru pụtara. Olee otú ndị ndú okpukpe ndị Juu, ndị na-ewere onwe ha ka “ndị mbụ,” ga-esi bụrụzie “ndị ikpeazụ”? Oleekwa otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi bụrụzie “ndị mbụ”?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị ndị Farisii na-ewere ka “ndị ikpeazụ,” ga-abụzi “ndị mbụ” n’ihi na a ga-akwụzu ha ihe a na-akwụ ndị ọrụ ụbọchị. Ọnwụ Jizọs ga-eme ka Chineke jụ ofufe ahụ a na-efe na Jeruselem ma họpụtaziere onwe ya mba ọhụrụ, ya bụ, “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galeshia 6:16; Matiu 23:38) Ọ bụ ndị só ‘n’Izrel nke Chineke’ ka Jọn Onye Na-eme Baptizim na-ekwu banyere ha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị a ga-eji mmụọ nsọ mee baptizim. Ndị ahụ e weere ka “ndị ikpeazụ” ga-abụ ndị mbụ a ga-eme ụdị baptizim a, ha ga-abụkwa ndịàmà Jizọs ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ Ndịozi 1:5, 8; Matiu 3:11) Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara ihe Jizọs gwara ha nke ọma, o nwere ike ime ka ha mara na ndị ndú okpukpe ahụ e kwuru na ha ga-abụ “ndị ikpeazụ” agaghị na-ele ha anya ọma.