Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 84

Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Chọrọ Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs

Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Chọrọ Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs

LUK 14:25-35

  • IHE ONYE CHỌRỌ ỊBỤ ONYE NA-ESO ỤZỌ JIZỌS GA-EME

Jizọs akụziela ihe ndị bara uru n’oge ọ na-eri ihe n’ụlọ onyeisi ndị Farisii. Ka Jizọs nọ na-aga Jeruselem, ìgwè mmadụ so ya na-aga. Gịnị mere ha ji soro ya? Ọ̀ bụ n’ihi na ha chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya n’eziokwu n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha?

Ka ha nọ na-aga, Jizọs kwuru ihe nwere ike ịwụ ụfọdụ n’ime ha akpata oyi n’ahụ́. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m ma ọ kpọghị nna ya na nne ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom asị, ee, kpọọkwa ọbụna mkpụrụ obi ya asị, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Luk 14:26) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

Jizọs anaghị ekwu na Ndị Kraịst ga-akpọ ndị ikwu ha asị. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na ha ga-ahụ yanwa n’anya karịa ha. Ha ekwesịghị ịdị ka nwoke ahụ o ji mee ihe atụ gbasara nri anyasị, bụ́ onye jụrụ ịza òkù a kpọrọ ya n’ihi na ọ ka lụrụ nwaanyị ọhụrụ. (Luk 14:20) Baịbụl kwuru na nna ochie ndị Juu aha ya bụ Jekọb “kpọrọ Lia asị” ma hụ Rechel nwanne ya n’anya. Nke a pụtara na ọ hụrụ Rechel n’anya karịa Lia.—Jenesis 29:31.

Buru n’obi na Jizọs kwuru na onye na-eso ụzọ ya ga-akpọ “ọbụna mkpụrụ obi ya [ma ọ bụ ndụ ya] asị.” Nke a pụtara na ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs ga-ahụ Jizọs n’anya karịa otú ọ hụrụ ndụ nke ya n’anya. Ọ ga-adịdị njikere ịnwụ n’ihi Jizọs. O doro anya na mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs abụghị obere ihe. Mmadụ kwesịrị iche ya eche tupu ya abụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs.

Mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs nwere ike ime ka ihe siere ya ike ma ọ bụkwanụ ka a kpagbuo ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị eburu osisi ịta ahụhụ ya ma na-eso m apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Luk 14:27) N’eziokwu, ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs ga-adị njikere idi mkparị otú ahụ Jizọs diri. Jizọs kwudịrị na ndị iro ya ga-egbu ya.

N’ihi ihe ndị a, ìgwè mmadụ ahụ só Jizọs na-eme njem kwesịrị ịtụle nke ọma ihe mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst pụtara. Jizọs meere ha ihe atụ gosiri na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Dị ka ihe atụ, ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya? Ma ọ́ bụghị ya, o nwere ike ịtọ ntọala ya ma ọ gaghị enwe ike iwucha ya.” (Luk 14:28, 29) N’ihi ya, tupu ndị ahụ ha na Jizọs so aga Jeruselem aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha kwesịrị ibu ụzọ kpebisie ike na ha ga-ebu ibu dị na ya. Jizọs mekwaara ha ihe atụ ọzọ gosiri na ọ dị mkpa ka ha mee otú ahụ. Ọ sịrị:

“Olee eze nke na-aga ibuso eze ọzọ agha, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbaa izu ma ò nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye ji puku ndị agha iri abụọ na-abịa imegide ya ọgụ? N’ezie, ọ bụrụ na ọ pụghị ime otú ahụ, mgbe onye ahụ ka nọ n’ebe dị anya, ọ na-ezipụ ìgwè ndị nnọchiteanya wee rịọ ya ka ya na ya mee udo.” Jizọs kwuziri, sị: “N’ụzọ dị otú ahụ, n’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime unu nke na-ahapụghị ihe niile o nwere nke pụrụ ịbụ onye na-eso ụzọ m.”—Luk 14:31-33.

Ọ bụghị naanị ndị ahụ só Jizọs na-aga Jeruselem ka ihe a o kwuru gbasara. Ndị niile mụtara gbasara Kraịst kwesịrị ịdị njikere ime ihe a o kwuru. Nke a pụtara na ha chọọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya, ha ga-adị njikere ịhapụ ihe niile ha nwere, ya bụ, ihe onwunwe ha, kwetakwa ịnwụ n’ihi Kraịst. Mmadụ kwesịrị ichebara ya echiche ma kpee ekpere gbasara ya.

Jizọs kwughachiri ihe o kwutụrụ okwu ya mgbe ọ nọ n’elu ugwu na-ezi ìgwè mmadụ ihe. O kwuru na ndị na-eso ụzọ ya bụ “nnu nke ụwa.” (Matiu 5:13) Ọ ga-abụ na ihe Jizọs na-ekwu bụ na otú ahụ nnu na-eme ka ihe ghara imebi bụ otú ndị na-eso ụzọ ya ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka ka ha ghara imebi omume ọma ha nakwa ka ha na Chineke nọgide na-adị ná mma. Ugbu a Jizọs jechawara ozi ya, o kwuru, sị: “N’ezie, nnu dị mma. Ma ọ bụrụ na nnu adịkwaghị atọ ụtọ, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ dị ụtọ?” (Luk 14:34) Ụfọdụ ndị nụrụ ihe a o kwuru maara na ụfọdụ nnu ndị e nwere n’oge ahụ adịghị ọcha n’ihi na ájá na ihe ndị ọzọ si n’ala na-adị na ya. Ọ bụrụ na ụtọ ya apụọ, e nweghịzi ihe a ga-eji ya mee.

Jizọs ji ihe atụ a gosi na ndị bụ́ ndị na-eso ụzọ ya kemgbe ekwesịghị ịkwụsị iso ya. Ọ bụrụ na ha akwụsị, e nweghịzi ihe a ga-eji ha eme, otú ahụ a na-enweghịzi ihe e ji nnu ụtọ ya pụrụ eme. Ndị mmadụ ga-eji ha mere ihe ọchị. Nke ọzọ bụ na Chineke agaghịzi eji ha arụ ọrụ, ha nwedịrị ike ime ka e kwuluo Chineke. Jizọs mere ka a ghọta na anyị ekwesịghị ikwe ka ụdị ihe a mee. Ọ sịrị: “Onye nwere ntị ige ntị, ya gee ntị.”—Luk 14:35.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?

Ọ̀ bụ naanị otu ezigbo okpukpe ka e nwere taa? Gụọ ihe ise eji ama ezigbo Ndị Kraịst.