Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 92

Jizọs Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri, ma Naanị Otu n’Ime Ha Bịara Kelee Ya

Jizọs Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri, ma Naanị Otu n’Ime Ha Bịara Kelee Ya

LUK 17:11-19

  • JIZỌS AGWỌỌ NDỊ EKPENTA IRI

Jizọs gawara n’otu obodo a na-akpọ Ifrem nke dị nso n’ebe ugwu Jeruselem. Ebe a ọ gawara mere ka nkata ndị Sanhedrin kpara igbu ya kụọ afọ n’ala. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọtụrụ n’Ifrem ka ndị iro ya ghara ịkpara ya aka. (Jọn 11:54) Ma, oge Ememme Ngabiga nke afọ 33 eruwela. N’ihi ya, Jizọs malitere njem ọzọ. O si Sameria banye Galili. Ihe a bụ nke ikpeazụ ọ gara ebe ahụ tupu ya anwụọ.

Ka Jizọs si n’otu obodo nta na-aga n’obodo nta ọzọ, ọ hụrụ ụmụ nwoke iri bụ́ ndị ekpenta. E nwere ụdị ọrịa ekpenta ndị na-eji ntakịrị ntakịrị eribisi ahụ́ onye na-arịa ya, dị ka mkpịsị aka onye ahụ, mkpịsị ụkwụ ya ma ọ bụ ntị ya. (Ọnụ Ọgụgụ 12:10-12) Iwu Chineke kwuru na onye ekpenta ga na-eti mkpu, sị: “Adịghị m ọcha, adịghị m ọcha.” Iwu ahụ kwukwara na ọ ga-ebipụ iche.—Levitikọs 13:45, 46.

Ndị ekpenta iri ahụ mere ihe iwu ahụ kwuru. Ha abịaghị Jizọs nso, kama ha nọ n’ebe dị anya tie mkpu, sị: “Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!” Mgbe Jizọs hụrụ ha, ọ sịrị ha: “Gaanụ gosi ndị nchụàjà onwe unu.” (Luk 17:13, 14) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ kwanyeere Iwu Chineke ùgwù n’ihi na Iwu Chineke kwuru na ọ bụrụ na onye ekpenta agbakee, ọ bụ ndị nchụàjà ga-ekwu na ahụ́ adịla ya mma. Malite mgbe ahụ, ya na ndị mmadụ nweziri ike ibikọta.—Levitikọs 13:9-17.

Obi siri ndị ekpenta iri ahụ ike na Jizọs ga-agwọli ha. N’ihi ya, ha gawara ịhụ ndị nchụàjà n’agbanyeghị na ha agbakebeghị. Mgbe ha ka nọ n’ụzọ, ha chọpụtara na ahụ́ adịla ha mma. Ọ bụ maka na ha nwere okwukwe na Jizọs mere ahụ́ ji dị ha mma.

Otu onye Sameria nke so ná ndị ekpenta iri ahụ a gwọrọ laghachiri ka ọ hụ Jizọs. Ma, mmadụ itoolu ndị ọzọ alaghachighị. Gịnị mere nwoke Sameria ahụ ji gawa ịhụ Jizọs? Ọ chọrọ ikele ya maka ihe o meere ya. O ji “oké olu na-enye Chineke otuto” n’ihi na ọ ghọtara na ọ bụ Chineke mere ka a gwọọ ya. (Luk 17:15) Mgbe ọ hụrụ Jizọs, ọ dara n’ụkwụ ya, na-ekele ya.

Jizọs gwara ndị nọ ebe ahụ, sị: “Ọ́ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ? È nwere onye a hụrụ lọghachitere inye Chineke otuto ma ọ́ bụghị nwoke a bụ onye mba ọzọ?” Ọ gwaziri nwoke Sameria ahụ, sị: “Bilie lawa; okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.”—Luk 17:17-19.

Ọgwụgwọ Jizọs gwọrọ ndị ekpenta iri ahụ gosiri na Jehova Chineke nọnyeere ya. Ma, uru onye ekpenta nke a lọghachirinụ ritere abụghị naanị na a gwọrọ ya, kama o yikwara ka Jizọs ò nyeere ya aka ịbanye n’ụzọ ga-eduba ya ná ndụ. N’oge anyị a, Chineke ejighị Jizọs na-agwọ ndị mmadụ ọrịa otú o mere n’oge ochie. Ma, ọ bụrụ na anyị e nwee okwukwe na Jizọs, anyị ga-enwe ike inweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Ànyị na-ekele Chineke maka ndụ ebighị ebi ọ ga-enye anyị n’ọdịnihu, otú nwoke Sameria ahụ kelere Jizọs?