Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 94

Ekpere na Ịdị Umeala n’Obi Dị Ezigbo Mkpa

Ekpere na Ịdị Umeala n’Obi Dị Ezigbo Mkpa

LUK 18:1-14

  • IHE ATỤ NWAANYỊ DI YA NWỤRỤ NKE NỌGIDERE NA-ARỊỌ

  • ONYE FARISII NA ONYE ỌNAỤTỤ

O nwebuola mgbe Jizọs meere ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ gosiri na ọ dị mkpa ịnọgidesi ike n’ekpere. (Luk 11:5-13) O nwere ike ịbụ na ọ nọ na Sameria ma ọ bụ na Galili. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ọzọ gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ịnọgide na-ekpe ekpere. O meere ha ihe atụ, sị:

“N’otu obodo, e nwere otu ọkàikpe nke na-adịghị atụ egwu Chineke, nke na-adịghịkwa akwanyere mmadụ ùgwù. Ma e nwere otu nwaanyị di ya nwụrụ n’obodo ahụ, ọ nọgidekwara na-agakwuru ọkàikpe ahụ, na-asị, ‘Hụ na m nwetara ikpe ziri ezi n’ikpe mụ na onye iro m.’ O kweghịkwa ná mmalite, ma e mesịa ọ gwara onwe ya, sị, ‘Ọ bụ ezie na adịghị m atụ egwu Chineke ma ọ bụ na-akwanyere mmadụ ùgwù, ka o sina dị, n’ihi nsogbu nwaanyị a di ya nwụrụ na-enye m mgbe niile, m ga-ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka o wee ghara ịnọgide na-abịa enyegbu m ná nsogbu.’”—Luk 18:2-5.

Jizọs kwuziri ihe ihe atụ ahụ pụtara. Ọ sịrị: “Nụrụnụ ihe ọkàikpe ahụ kwuru, ọ bụ ezie na ọ bụ onye ajọ omume! Ya mere, ọ̀ bụ na Chineke agaghị eme ka ndị ọ họọrọ, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị, nweta ikpe ziri ezi, ọ bụ ezie na ọ na-enwe ogologo ntachi obi n’ihi ha?” (Luk 18:6, 7) Gịnị ka Jizọs na-ekwu banyere Nna ya?

O doro anya na ihe Jizọs na-ekwu abụghị na Jehova Chineke bụ onye ajọ omume otú ahụ ọkàikpe ahụ bụ onye ajọ omume. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụrụ na ọkàikpe ahụ bụ́ onye ajọ omume nwere ike imere nwaanyị ahụ ihe ọ chọrọ n’ihi otú nwaanyị ahụ si na-arịọsi ya ike, o doro anya na Chineke ga-emekwara anyị ihe anyị na-arịọ ya. Ebe ọ bụ onye ezi omume, ọ ga-anụ ekpere ndị ohu ya ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ekpesi ekpere ike. Ihe Jizọs kwuru gosiri na Chineke ga-anụ ekpere anyị. Ọ sịrị: “Ana m asị unu, [Chineke] ga-eme ka ha nweta ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ?”—Luk 18:8.

A na-ekpekarị ndị dị ala na ndị ogbenye ikpe mkpegbu, ma na-ekpelara ndị ọgaranya ikpe. Ma, Chineke anaghị eme otú ahụ. Mgbe oge ya ruru, ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ ga-ata ndị ọjọọ ahụhụ ma nye ndị na-efe ya ndụ ebighị ebi.

Olee ndị nwere okwukwe ka nwaanyị ahụ di ya nwụrụ? Mmadụ olekwa kweere n’eziokwu na Chineke “ga-eme ka ha nweta ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ?” Ọ dịbeghị anya Jizọs mere ihe atụ na-egosi na anyị kwesịrị ịnọgidesi ike n’ekpere. Ugbu a, ọ jụziri ajụjụ banyere ndị ga-enwe okwukwe na Chineke ga-aza ekpere ha. Ọ jụrụ, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?” (Luk 18:8) Ihe ajụjụ a ọ jụrụ pụtara bụ na o nwere ike ndị ga-enwe ụdị okwukwe a mgbe Kraịst ga-abịa agaghị adị ọtụtụ.

Obi siri ụfọdụ n’ime ndị na-ege ihe Jizọs na-ekwu ike na ha nwere okwukwe. Ha na-ewere onwe ha ka ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya. Jizọs meere ụdị ndị a ihe atụ, sị:

“Ndị ikom abụọ gbagoro n’ụlọ nsọ ikpe ekpere, otu bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ. Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ wee malite ikpe ekpere n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko ma ọ bụ ọbụna dị ka onye ọnaụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu, ana m enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’”—Luk 18:10-12.

A ma ndị Farisii ama na ha na-eme ka hà bụ ndị ezi omume n’ihu ndị mmadụ ka e nwee ike ito ha. Ha na-apụtakarị n’ụbọchị nnukwu ahịa na-azụ, ya bụ, na Mọnde nakwa na Tọzdee, na-ebu ọnụ ka ọtụtụ ndị hụ ha. Ha na-elezi anya na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ụmụ irighiri mkpá akwụkwọ dị iche iche. (Luk 11:42) Ọnwa ole na ole tupu Jizọs akụzie ihe a, ndị Farisii kwuru ihe gosiri otú ha si ele ndị nkịtị anya. Ha sịrị: “Ma ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu ahụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.”—Jọn 7:49.

Jizọs gara n’ihu n’ihe atụ ahụ ọ na-eme. Ọ sịrị: “Ma onye ọnaụtụ ahụ guzo n’ebe dị anya, ọ chọghị ọbụna ileli anya ya lee eluigwe, kama ọ nọ na-eti aka n’obi, na-asị, ‘Chineke, meere mụ onwe m bụ́ onye mmehie amara.’” Onye ọnaụtụ ahụ kwetara na ya bụ onye mmehie. Jizọs kwuziri, sị: “Ana m asị unu, Nwoke a laruru n’ụlọ ya wee bụrụ onye ezi omume karịa nwoke ahụ; n’ihi na onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, ma onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Luk 18:13, 14.

Jizọs si otú a gosi na ịdị umeala n’obi dị mkpa. Ihe atụ a o mere baara ndị na-eso ụzọ ya uru n’ihi na ha toro n’obodo ebe ndị Farisii a, bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha, na-azọ onye ka ibe ya ukwuu. Ihe atụ a ga-abakwara ndị Kraịst niile uru.

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ọ̀ Na-anụ Ekpere Niile Ndị Mmadụ Na-ekpe?

Gịnị mere Chineke anaghị anụ ekpere ụfọdụ? Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka Chineke na-anụ ekpere anyị?

Olee Ihe Abụọ Na-eme Ka Chineke Ghara Ịza Ekpere Ụfọdụ?

Gụọ ihe a ka ị mata ụdị ekpere Chineke na-anaghị aza, na ụdị ndị Chineke na-anaghị aza ekpere ha.