Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 78

Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị Njikere

Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị Njikere

LUK 12:35-59

  • ONYE AHỤ NA-ELEKỌTA ỤLỌ, ONYE KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI, KWESỊRỊ ỊDỊ NJIKERE

  • JIZỌS BỊARA IWETA NKEWA

Jizọs kwuru na ọ bụ naanị “ìgwè atụrụ nta” ga-eso ya chịa n’Alaeze eluigwe. (Luk 12:32) Ma, onye nwere olileanya ịga eluigwe ekwesịghị iji ya gwuo egwu. Jizọs mere ka o doo anya na onye ga-eketa Alaeze eluigwe ga na-akpa àgwà ọma.

Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha dịrị njikere maka mgbe ọ ga-abịaghachi. O kwuru, sị: “Keenụ ájị̀ n’úkwù, ka oriọna unu na-enwukwa enwu, unu onwe unu, dịrịnụ ka ndị na-echere nna ha ukwu mgbe o si ịlụ nwaanyị na-alọta, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ lọtara kụọ aka, ha ga-emeghere ya ụzọ ozugbo. Obi ụtọ na-adịrị ndị ohu ahụ bụ́ ndị nna ha ukwu lọtara wee hụ na ha na-eche nche!”—Luk 12:35-37.

Ọ gaghị esiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ike isi n’ihe atụ a ghọta ihe Jizọs chọrọ ka ha mee. Ndị ohu a Jizọs kwuru okwu ha dị njikere, na-echere ka nna ha ukwu lọta. Jizọs kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na ọ lọta n’oge nche nke abụọ [ya bụ, malite n’ihe dị ka elekere anya itoolu nke abalị ruo n’etiti abalị], ọ bụrụgodị na nke atọ [ya bụ, malite n’etiti abalị ruo n’ihe dị ka elekere anya atọ nke isi ụtụtụ], ma hụ ha otú ahụ, obi ụtọ na-adịrị ha!’—Luk 12:38.

Ihe Jizọs ji ihe atụ a na-akụzi abụghị naanị ka ndị na-eso ụzọ ya na-arụsi ọrụ ike ka ohu na-elekọta ụlọ. Ihe gosiri nke a bụ otú Jizọs, bụ́ Nwa nke mmadụ, si malite ikwu gbasara onwe ya n’ihe atụ a. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu onwe unu kwa, dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.” (Luk 12:40) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ ga-abịa n’ọdịnihu. Ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya dịrị njikere, karịchaa ndị nke so ‘n’ìgwè atụrụ nta.’

Pita chọrọ ịghọta ihe a Jizọs kwuru nke ọma. Nke a mere ka ọ jụọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị ka ị na-enye ihe atụ a ka ọ̀ bụ mmadụ niile?” Jizọs azaghị Pita ajụjụ ahụ kpọmkwem. Kama, o mere ihe atụ ọzọ yiri nke ahụ o meburu. Ọ sịrị: “Ònye n’ezie bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwere uche, onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ìgwè ndị na-ejere ya ozi, ka ọ na-enye ha ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ, ma ọ bụrụ na nna ya ukwu erute hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’eziokwu ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.”—Luk 12:41-44.

N’ihe atụ nke mbụ Jizọs mere, o doro anya na ọ bụ ya bụ ‘nna ukwu’ ahụ. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi” so ná ndị bụ́ “ìgwè atụrụ nta” a ga-enye Alaeze Chineke. (Luk 12:32) Ihe Jizọs na-ekwu ugbu a bụ na ụfọdụ ndị so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ahụ ga na-enye “ìgwè ndị na-ejere ya ozi” “ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị.” Ebe ọ bụ na Jizọs nọ mgbe ahụ na-akụziri Pita na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ okwu Chineke, si otú ahụ na-enye ha ihe oriri, Pita na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ga-eji ya ghọta na a ga-enwe mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ọdịnihu. N’oge ahụ, a ga-enwe ohu nọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ Jizọs okwu Chineke. Ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka a kpọrọ “ìgwè ndị na-ejere ya ozi.”

Jizọs sikwa ụzọ ọzọ mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na ha kwesịrị ịmụrụ anya ma kpachara anya n’otú ha si akpa àgwà. Ihe mere ha kwesịrị iji eme otú ahụ bụ na ha nwere ike ileghara ihe ndị ha kwesịrị ime anya. Ha nwedịrị ike megidewe ụmụnna ha. Jizọs sịrị: “Ma ọ bụrụ na ohu ahụ ekwuo mgbe ọ bụla n’obi ya, sị: ‘Nna m ukwu na-egbu oge ịbịa,’ wee malite iti ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi ihe, nakwa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya ókè, nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya nakwa n’oge awa ọ na-amaghị, ọ ga-enyekwa ya oké ahụhụ ma kenye ya òkè n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ.”—Luk 12:45, 46.

Jizọs kwuziri na ya bịara “ịmụnye ọkụ n’elu ụwa.” Ọ mụnyekwara ọkụ ahụ n’eziokwu. Ihe ndị ọ na-akụzi mere ka ndị mmadụ rụọ ụka kpụ ọkụ n’ọnụ nke mere ka a kụghasịa ozizi ụgha na omenala ndị na-adịghị mma. O medịrị ka ndị e lere anya na ha kwesịrị ịdị n’otu kewaa. Nke a mere ka “nna megide nwa ya nwoke na nwa nwoke megide nna ya, nne megide nwa ya nwaanyị na nwa nwaanyị megide nne ya, nne di megide nwunye nwa ya na nwunye nwa megide nne di ya.”—Luk 12:49, 53.

Ndị ihe a Jizọs kwuru kacha gbasa bụ ndị na-eso ụzọ ya. Jizọs bidoziri ịgwa ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ okwu. Ọtụtụ n’ime ha achọghị ikweta n’ihe ndị gosiri na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu hụrụ ígwé ojii ka ọ na-ebili n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ, unu na-ekwu ozugbo ahụ, sị, ‘Oké ifufe mmiri na-abịa,’ ọ na-emekwa otú ahụ. Mgbe unu hụrụ na ifufe nke si n’ebe ndịda na-efe, unu na-asị, ‘Oké okpomọkụ ga-adị,’ o wee dị. Ndị ihu abụọ, unu maara otú e si enyocha otú ụwa dị na ihu ígwé, ma olee otú o si bụrụ na unu amaghị otú e si enyocha oge a?” (Luk 12:54-56) O doro anya na ha adịghị njikere.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Kraịst Ga-eji Abịa Ọzọ?

Gịnị mere Kraịst ga-eji abịa ọzọ? Ọ̀ ga-abụ mmadụ ka ọ̀ ga-abụ mmụọ mgbe ọ ga-abịa ọzọ, oleekwa ihe ọ ga-eme mgbe ahụ?