Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 73

Onye Sameria Emee Ihe Gosiri na Ọ Bụ Ezigbo Onye Agbata Obi

Onye Sameria Emee Ihe Gosiri na Ọ Bụ Ezigbo Onye Agbata Obi

LUK 10:25-37

  • IHE MMADỤ GA-EME KA O KETA NDỤ EBIGHỊ EBI

  • ONYE SAMERIA NKE BỤ́ EZIGBO ONYE AGBATA OBI

Mgbe Jizọs ka nọ n’ebe dị nso na Jeruselem, ọtụtụ ndị Juu bịakwutere ya. Ụfọdụ n’ime ha chọrọ ịmụta ihe n’aka ya, ndị ọzọ achọọ ịnwa ya. Otu n’ime ha, bụ́ onye maara Iwu, jụrụ ya, sị: “Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”—Luk 10:25.

Jizọs chọpụtara na ihe nwoke a chọrọ abụghị naanị ka ọ gwa ya ihe ọ ga-eme ka o keta ndụ ebighị ebi. O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ ka Jizọs kwuo ihe ga-akpasu ndị Juu iwe. Jizọs ghọtara na o nwere ihe nwoke a na-eche. N’ihi ya, ọ zara ya ajụjụ ahụ otú ga-eme ka o kwuo ihe ọ na-eche.

Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị ka e dere n’Iwu? Gịnị ka ị gụtara?” Nwoke a amụọla Iwu Chineke. N’ihi ya, o si na ya zaa Jizọs ajụjụ ahụ. O kwuru ihe e dere na Diuterọnọmi 6:5 na Levitikọs 19:18, sị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum na uche gị dum hụ Jehova Chineke gị n’anya,’ hụkwa ‘onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” (Luk 10:26, 27) Ihe a nwoke a zara ọ̀ bụ ihe ọ ga-eme ka o keta ndụ ebighị ebi?

Jizọs gwara nwoke ahụ, sị: “Ị zara nke ọma; na-eme nke a, ị ga-enwetakwa ndụ.” Ihe a Jizọs gwara nwoke ahụ ejughị ya afọ. Mkpa ya abụghị naanị ka Jizọs gwa ya ihe ọ ga-eme ka o keta ndụ ebighị ebi. Ọ chọrọ “igosi na ya bụ onye ezi omume.” Ọ chọkwara ka Jizọs mee ka obi sie ya ike na ihe ọ na-eche ziri ezi nakwa na otú o si akpaso ndị ọzọ àgwà dị mma. N’ihi ya, ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” (Luk 10:28, 29) Ajụjụ a yiri ka ọ̀ dị mfe. Ma, e nwere ọtụtụ ihe nwoke a bu n’obi jụọ ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Ndị Juu chere na ndị bụ́ ‘ndị agbata obi’ ha bụ ndị na-eme omenala ndị Juu. Mmadụ gụọkwa ihe dị na Levitikọs 19:18 elu elu, o nwere ike iche na ọ bụ ihe ebe ahụ na-ekwu. Onye Juu nwedịrị ike iche na “iwu akwadoghị” ka ya na ndị na-abụghị ndị Juu na-emekọ ihe. (Ọrụ Ndịozi 10:28) N’ihi ya, nwoke a chere na ya ga-abụ onye ezi omume ma ya na-emere ndị Juu ibe ya ihe ọma. Ọ ga-abụkwa na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs chere otú ahụ. Ha chere na ha nwere ike ime onye na-abụghị onye Juu ihe ọjọọ n’ihi na n’anya ha, ọ bụghị “onye agbata obi” ha.

Olee otú Jizọs ga-esi wepụ ụdị echiche a n’obi nwoke a ma ghara ịkpasu ya na ndị Juu ndị ọzọ iwe? Otú o si wepụ ya bụ na ọ kọọrọ ya otu akụkọ. Ọ sịrị ya: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị gbara ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma.” Jizọs sịkwara ya: “Ọ dabara na otu onye nchụàjà nọ na-agbada n’okporo ụzọ ahụ, ma, mgbe ọ hụrụ ya, o si n’akụkụ nke ọzọ gafere. N’otu aka ahụ, mgbe onye Livaị rutere ebe ahụ hụ ya, o si n’akụkụ nke ọzọ gafere. Ma otu onye Sameria nke si n’ụzọ ahụ na-agafe rutere n’ebe ọ nọ na mberede, mgbe ọ hụrụ ya, o nwere ọmịiko.”—Luk 10:30-33.

Nwoke ahụ Jizọs na-akọrọ akụkọ a ma na ọtụtụ ndị nchụàjà na ndị Livaị, bụ́ ndị na-enyere ha aka n’ụlọ nsọ, bi na Jeriko. Ha rụchaa ọrụ chọọ ịlaghachi Jeriko, ha ga-eji ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita iri abụọ na atọ n’okporo ụzọ. Ụjọ na-atụ ndị na-aga n’ụzọ a n’ihi na ndị ohi na-anọkarị na ya. Onye nchụàjà na onye Livaị nke hụrụ onye Juu ibe ha nọ́ ná nsogbu kwesịrị inyere ya aka. Ma, n’akụkọ a Jizọs kọrọ, ha emeghị otú ahụ. Onye nyeere onye Juu ahụ aka bụ onye Sameria, n’agbanyeghị na ndị Juu kpọrọ ndị obodo ya asị.—Jọn 8:48.

Gịnị ka onye Sameria ahụ meere onye Juu ahụ? Jizọs kwuru, sị: “Ọ gakwuuru ya wee kechie ọnyá ya, wụkwasị ha mmanụ na mmanya. O wee kukwasị ya n’anụ ụlọ nke ya ma bute ya n’ụlọ ndị njem wee lekọta ya. N’echi ya kwa, o wepụtara mkpụrụ ego dinarịọs abụọ, nye ya onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ, sị ya, ‘Lekọtawa ya, m ga-akwụ gị ihe ọ bụla i mefuru n’elu nke a mgbe m ga-abịaghachi n’ebe a.’”—Luk 10:34, 35.

Mgbe Jizọs, bụ́ Ọkà n’Izi Ihe, kọchaara nwoke ahụ akụkọ a, Jizọs jụrụ ya ajụjụ ga-eme ka o chee echiche. Ọ jụrụ ya, sị: “Ònye n’ime mmadụ atọ a yiri gị ka onye gosiri na ya bụ onye agbata obi nke nwoke ahụ dabara n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe?” Ọ ga-abụ na o siiri nwoke ahụ ike ikwu na ọ bụ “onye Sameria,” n’ihi ya, ọ sịrị: “Ọ bụ onye ahụ nke mesoro ya ihe n’obi ebere.” Jizọs meziri ka ihe ọ chọrọ ka nwoke ahụ mụta n’akụkọ ahụ doo anya. Ọ sịrị ya: “Gawa, gị onwe gị, na-emekwa otú ahụ.”—Luk 10:36, 37.

Otú a Jizọs si kụzie ihe magburu onwe ya. A sị na Jizọs gwara nwoke ahụ na ndị na-abụghị ndị Juu sokwa ná ndị agbata obi ya, ọ gaara esiri ya na ndị Juu ndị ọzọ nọ ebe ahụ ike ikweta ihe o kwuru. Ma akụkọ a dị́ mfe Jizọs kọrọ, nke o ji ihe ndị nwoke ahụ ma nke ọma kọọ, mere ka nwoke ahụ mata azịza ajụjụ ya, nke bụ́, “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Onye bụ́ ezigbo onye agbata obi bụ onye hụrụ ndị ọzọ n’anya, na-emekwara ha ihe ọma, otú ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru ka anyị na-eme.

GỤKWUO GBASARA YA

“Hụ Onye Agbata Obi Gị n’Anya Dị Ka Onwe Gị”

Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Olee otú anyị nwere ike isi hụ ndị agbata obi anyị n’anya?