Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 70

Jizọs Agwọọ Otu Nwoke Kpuru Ìsì Malite Mgbe A Mụrụ Ya

Jizọs Agwọọ Otu Nwoke Kpuru Ìsì Malite Mgbe A Mụrụ Ya

JỌN 9:1-18

  • JIZỌS EMEE KA ONYE ARỊRỊỌ KPURU ÌSÌ MALITE MGBE A MỤRỤ YA HỤWA ỤZỌ

Jizọs ka nọ na Jeruselem n’Ụbọchị Izu Ike. Ka ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agagharị na Jeruselem, ha hụrụ otu onye arịrịọ kpuru ìsì kemgbe a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: “Rabaị, ònye mehiere, ọ̀ bụ nwoke a ka ọ̀ bụ ndị mụrụ ya, nke mere o ji kpuo ìsì mgbe a mụrụ ya?”—Jọn 9:2.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs ma na nwoke a enweghị mkpụrụ obi a na-anaghị ahụ anya, nke dị adị tupu amụọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere ike ịna-eche ma mmadụ ò nwere ike imehie mgbe ọ ka nọ n’afọ nne ya. Jizọs zara ha, sị: “Ma nwoke a ma ndị mụrụ ya emehieghị, kama ọ bụ ka e wee mee ka ọrụ Chineke pụta ìhè n’ebe ọ nọ.” (Jọn 9:3) N’ihi ya, enweghị mmehie a ga-akpọ aha nwoke ahụ ma ọ bụ ndị mụrụ ya mere nke mere o ji kpuo ìsì. N’ihi mmehie Adam, anyị niile bụ ndị na-ezughị okè, anyị nwekwara ike inwe nkwarụ, dị ka ikpu ìsì. Ma, ìsì nwoke ahụ kpuru bụ ohere Jizọs ga-eji eme ka ọrụ Chineke pụta ìhè, otú ahụ o mere n’oge ndị ọzọ ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa.

Jizọs kwuru ihe gosiri na e kwesịrị ịrụ ọrụ Chineke ngwa ngwa. Ọ sịrị: “Anyị aghaghị ịrụ ọrụ nke onye zitere m mgbe ìhè ka dị; abalị na-abịa, mgbe mmadụ ọ bụla na-apụghị ịrụ ọrụ. N’oge niile m nọ n’ụwa, abụ m ìhè nke ụwa.” (Jọn 9:4, 5) N’eziokwu, Jizọs ga-anwụ n’oge na-adịghị anya ma banye n’ili yiri ọchịchịrị, bụ́ ebe ọ na-enweghị ike ịrụ ọrụ ọ bụla. Ma ugbu a ọ ka nọ ndụ, ọ bụ ìhè nke ụwa.

Jizọs ọ̀ ga-agwọnụ nwoke ahụ kpuru ìsì? Ọ bụrụkwa na ọ ga-agwọ ya, olee otú ọ ga-esi agwọ ya? Jizọs gbụsara ọnụ mmiri n’ala, jiri ya gwọọ ụrọ ma nyakwasị ya nwoke ahụ n’anya wee sị ya: “Gaa saa anya gị n’ọdọ mmiri Siloam.” (Jọn 9:7) Nwoke ahụ mere ihe a Jizọs gwara ya ma hụwa ụzọ. Obi ga-atọgbu ya atọgbu ịhụ ụzọ nke mbụ ya kemgbe a mụrụ ya.

Ihe a merenụ tụrụ ndị agbata obi ya na ndị ọzọ maara ya n’anya. Ha jụrụ onwe ha, sị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ nke na-anọ ala arịọ arịrịọ?” Ụfọdụ sịrị: “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ ekwetaghị. Ha sịrị: “Ọ bụghị ya ma ọlị, kama o yiri ya.” Nwoke ahụ sịrị: “Ọ bụ m.”—Jọn 9:8, 9.

N’ihi ya, ha jụrụ ya, sị: “Oleezi otú e si meghee anya gị?” Ọ gwara ha, sị: “Nwoke ahụ a na-akpọ Jizọs gwọrọ ụrọ tee m n’anya, sị m, ‘Gaa na Siloam saa anya gị.’ M wee gaa saa anya m, hụwa ụzọ.” Ha jụziri ya, sị: “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị ha: “Amaghị m.”—Jọn 9:10-12.

Ndị Juu kpọgaara ya ndị Farisii. Ndị Farisii chọkwara ịma otú o si hụwa ụzọ. N’ihi ya, ọ gwara ha ihe Jizọs mere ya. Ọ sịrị: “Ọ nyakwasịrị m ụrọ n’anya, m wee saa ya, hụwa ụzọ.” Mmadụ nwere ike iche na ndị Farisii ga-aṅụrị ọṅụ na a gwọọla nwoke ahụ na-arịọ arịrịọ. Kama ha ga-aṅụrị ọṅụ, ụfọdụ n’ime ha katọrọ Jizọs. Ha sịrị: “Onye a esighị n’ebe Chineke nọ bịa, n’ihi na ọ dịghị edebe Ụbọchị Izu Ike.” Ma, ndị ọzọ sịrị: “Olee otú onye bụ́ onye mmehie pụrụ isi na-eme ụdị ihe ịrịba ama ahụ?” (Jọn 9:15, 16) N’ihi ya, ha enweghị otu olu.

Ebe ọ bụ na ha enweghị otu olu, ha jụrụ nwoke ahụ kpuburu ìsì, sị: “Olee ihe i chere banyere ya, ebe ọ bụ na o meghere anya gị?” Nwoke ahụ enweghị obi abụọ ọ bụla n’onye Jizọs bụ. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ onye amụma.”—Jọn 9:17.

Ndị Farisii ahụ ekwetaghị n’ihe a nwoke a kwuru. Ha nwere ike ịna-eche na Jizọs na nwoke ahụ kpara nkata imegharị ndị mmadụ anya. Ha kpebiri na otú ha ga-esi eme ka okwu a bie bụ ịjụ nne na nna nwoke a ma ò kpuburu ìsì.