Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 128

Paịlet na Herọd Achọpụta na Aka Jizọs Dị Ọcha

Paịlet na Herọd Achọpụta na Aka Jizọs Dị Ọcha

MATIU 27:12-14, 18, 19 MAK 15:2-5 LUK 23:4-16 JOHN 18:36-38

  • PAỊLET NA HERỌD EKPEE JIZỌS IKPE

Jizọs achọghị izochiri Paịlet na ya bụ eze. Ma eze Jizọs bụ enweghị ihe ọ ga-emebiri ndị Rom. Jizọs kwuru, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.” (Jọn 18:36) N’eziokwu, Jizọs nwere Alaeze, ma Alaeze ahụ esighị n’ụwa.

Paịlet ahapụghị okwu ahụ otú ahụ. Ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ọ dị mma, ị̀ bụ eze?” Jizọs mere ka Paịlet mara na o kwutere ya. Ọ sịrị ya: “Gị onwe gị na-ekwu na m bụ eze. Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege ntị n’olu m.”—Jọn 18:37.

Jizọs agwabuola Tọmọs, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.” Ugbu a, Paịlet anụla na ihe mere e ji zite Jizọs n’ụwa bụ ka ọ gbaara “eziokwu” àmà, karịchaa, eziokwu gbasara Alaeze ya. Jizọs kpebisiri ike na ya ga-agba àmà banyere eziokwu ahụ, ọ bụrụgodị na ọ ga-anwụ maka ya. Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” Ma, o chereghị ka Jizọs kọwakwuoro ya ihe eziokwu bụ. O chere na ihe ọ nụrụ ezuola ikpe Jizọs ikpe.—Jọn 14:6; 18:38.

Paịlet gaghachikwuuru ndị Juu nọ n’èzí. Ọ ga-abụ na Jizọs nọ n’akụkụ Paịlet mgbe ọ gwara ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ nọ ebe ahụ, sị: “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere.” Ihe a Paịlet kwuru were ndị Juu iwe, ha asị ya: “Ọ na-akpasu ndị mmadụ ime aghara site n’izi ihe n’ime Judia dum, malite na Galili ruo ebe a.”—Luk 23:4, 5.

Ọ ga-abụ na ọnwụ a ndị Juu na-esi juru Paịlet anya. Ka ndị isi nchụàjà na ndị okenye nọ na-eti mkpu ka e gbuo Jizọs, Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Ị́ naghị anụ ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị?” (Matiu 27:13) Jizọs gbara ya nkịtị. Otú Jizọs si nọrọ jii n’agbanyeghị ebubo dị iche iche a na-ebo ya juru Paịlet anya.

Ndị Juu kwuru na Jizọs na-ezi ihe “malite na Galili.” Ihe a ha kwuru mere ka Paịlet mata na Jizọs bụ onye Galili. O mekwara ka Paịlet mata otú o nwere ike isi sere aka ya n’ikpe Jizọs ikpe. Ọ bụ Herọd Antipas (nwa Herọd Onye Ukwu) na-achị Galili mgbe ahụ. Ọ nọkwa na Jeruselem n’oge ahụ a na-eme Ememme Ngabiga. N’ihi ya, Paịlet zigaara ya Jizọs. Ọ bụ Herọd Antipas a kwuru ka e gbupụ Jọn Onye Na-eme Baptizim isi. Mgbe o mechara nụ na Jizọs na-arụ ọrụ ebube, o bidoro iche na Jizọs nwere ike ịbụ Jọn ahụ a sịrị na o si n’ọnwụ bilie.—Luk 9:7-9.

Mgbe Herọd hụrụ Jizọs, obi tọrọ ya ụtọ. Ọ bụghị n’ihi na ọ chọrọ inyere Jizọs aka ma ọ bụkwanụ na ọ chọrọ ịmara ma ebubo a na-ebo ya hà bụ eziokwu. Ihe bụ́ mkpa Herọd bụ ịhụ Jizọs, “ọ nọkwa na-enwe olileanya ịhụ ihe ịrịba ama ụfọdụ ọ ga-eme.” (Luk 23:8) Ma, Jizọs emeghị ihe ịrịba ama ọ bụla n’ihu Herọd. Mgbe Herọd na-ajụ ya ajụjụ, Jizọs atụpụrụghị ya ọnụ. Ihe ndị a mere ka Herọd na ndị agha ya ‘kparịa Jizọs.’ (Luk 23:11) Ha yiwere ya uwe mara mma, jirikwa ya mee ihe ọchị. Herọd zighachiri Jizọs na nke Paịlet. Herọd na Paịlet nọ n’iro tupu mgbe ahụ, ma ha bịaziri ghọọ ezigbo ndị enyi.

Mgbe a kpọghachiri Jizọs na nke Paịlet, Paịlet kpọkọtara ndị isi nchụàjà, ndị na-achị ndị Juu, na ndị Juu, ma gwa ha, sị: “Lee! agbara m ya ajụjụ n’ihu unu ma ahụghị m ihe ọ bụla nwoke a mere nke gosiri na ebubo ndị unu na-ebo ya bụ eziokwu. N’eziokwu, Herọd ahụghịkwa, n’ihi na o zighachiteere anyị ya; ma, lee! ọ dịghị ihe kwesịrị ọnwụ o mere. Ya mere, m ga-apịa ya ihe ma hapụ ya.”—Luk 23:14-16.

Paịlet chọsiri ike ịhapụ Jizọs n’ihi na ọ ma na ọ bụ anyaụfụ mere ndị isi nchụàjà ji nyefee ya n’aka ya. Ka Paịlet na-agbalị ịhapụ Jizọs, ọ nụrụ ihe ọzọ mere o kwesịrị iji mee otú ahụ. Mgbe ọ nọ n’oche ikpe ya, nwunye ya ziteere ya ozi, sị: “Etinyela aka n’okwu onye ezi omume ahụ, n’ihi na ahụsiri m anya nke ukwuu taa ná nrọ n’ihi ya.” Ọ ga-abụ Chineke mere ka nwunye ya rọọ nrọ ahụ.—Matiu 27:19.

Oleezi otú Paịlet ga-esi hapụ nwoke a aka ya dị ọcha, nke bụ́kwanụ ihe o kwesịrị ime?