Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 109

Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya

Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya

MATIU 22:41–23:24 MAK 12:35-40 LUK 20:41-47

  • NWA ÒNYE KA KRAỊST BỤ?

  • JIZỌS AGBAA NDỊ IHU ABỤỌ NA-EMEGIDE YA N’ANWỤ

Ndị na-emegide Jizọs emebilighị aha ya ma ọ bụ mee ka o kwuo ihe ha ga-eji jide ya ma nyefee ya n’aka ndị Rom. (Luk 20:20) Ma, mgbe ha na Jizọs ka nọ n’ụlọ nsọ ahụ n’abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan, Jizọs meziri ka egwú dagharịa ma mee ka ha mata onye ọ bụ. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu chere banyere Kraịst? Nwa ònye ka ọ bụ?” (Matiu 22:42) Ndị Juu niile ma na Kraịst ma ọ bụ Mesaya ga-esi n’agbụrụ Devid. N’ihi ya, ha sịrị ya na ọ bụ nwa Devid.—Matiu 9:27; 12:23; Jọn 7:42.

Jizọs jụrụ ha, sị: “Oleezi otú o si bụrụ na Devid si n’ike mmụọ nsọ kpọọ ya ‘Onyenwe m,’ sị, ‘Jehova gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị”’? Ya mere, ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe m,’ olee otú o si bụrụ nwa ya?”—Matiu 22:43-45.

Ndị Farisii azaghị Jizọs ajụjụ a n’ihi na ha na-atụ anya na a ga-enwe otu onye si n’agbụrụ Devid nke ga-anapụta ha n’aka ndị Rom na-achị ha. Jizọs ji ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 110:1, 2 mee ka ha mata na Mesaya ahụ abụghị naanị mmadụ nkịtị na-achị achị. Ọ bụ Onyenwe Devid. Ọ bụrụkwa na ọ nọdụ ala n’aka nri Chineke, ọ ga-eji ike Chineke nyere ya rụwa ọrụ. Ihe a Jizọs kwuru enyeghị ha ọnụ okwu.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs na ndị ọzọ nọ na-ege Jizọs ntị kemgbe. N’ihi ya, Jizọs gwara ha okwu ma dọọ ha aka ná ntị gbasara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. Ọ sịrị ha: “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii anọdụwo n’oche Mozis” ka ha kụzie Iwu Chineke. Jizọs gwaziri ha, sị: “Ihe niile ha na-agwa unu, meenụ ha, debekwanụ ha, kama unu emela ihe ha na-eme, n’ihi na ha na-ekwu ma ha adịghị eme.”—Matiu 23:2, 3.

Jizọs kwuru ihe ha na-eme nke gosiri na ha bụ ndị ihu abụọ. Ọ sịrị: “Ha na-eme ka mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị ha na-eyi dị ka ihe nchebe bukwuo ibu.” Ndị Juu ụfọdụ na-eyi obere mkpọ̀ ha tinyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ n’egedege ihu ha ma ọ bụ n’aka ha. Ma, ndị Farisii na-eme ka nke ha bukwuo ibu ka ọ́ dị ka hà ji Iwu Chineke kpọrọ ihe. Ha “na-emekwa ka ọnụ ọnụ uwe ha sakwuo mbara.” Ụmụ Izrel na-adụnye ihe n’ọnụ ọnụ uwe mwụda ha. Ma, ndị Farisii na-eme ka ọnụ ọnụ uwe ha gbadaa karịa nke ndị ọzọ. (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-40) Ihe mere ha ji eme ihe niile a bụ “ka ndị mmadụ hụ ha.”—Matiu 23:5.

Ndị na-eso ụz Jizọs nwedịrị ike chọwa ka a na-anụ aha ha. N’ihi ya, Jizọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ, Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.” Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi na-ele onwe ha anya ma na-akpa àgwà? Jizọs gwara ha, sị: “Onye kasị ukwuu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Matiu 23:8-12.

Jizọs kwuziri na ahụhụ na-aga ịdịrị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ. O kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu ndị mmadụ; n’ihi na unu onwe unu adịghị abanye, unu adịghịkwa ekwe ka ndị chọrọ ịbanye banye.”—Matiu 23:13.

Jizọs katọrọ ndị Farisii n’ihi na ha ejighị ihe Jehova weere ka ihe ka mkpa kpọrọ ihe. Ihe gosiri na ha ejighị ya kpọrọ ihe bụ ụdị ókè na-enweghị isi ha na-akpa. Dị ka ihe atụ, ha na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ejiri ụlọ nsọ ṅụọ iyi, ọ dịghị ihe ọ bụ; ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ejiri ọlaedo dị n’ụlọ nsọ ṅụọ iyi, iwu ji ya.” Ihe a ha kwuru gosiri na ha kpuru ìsì n’ihi na ha ji ọlaedo dị n’ụlọ nsọ kpọrọ ihe karịa ụlọ nsọ ahụ a na-anọ efe Jehova. Ha na-elegharakwa “ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.”—Matiu 23:16, 23; Luk 11:42.

Jizọs kpọrọ ndị Farisii “ndị ndú kpuru ìsì, ndị na-azapụ anwụnta ma na-eloda kamel!” (Matiu 23:24) Ha na-azapụ anwụnta ná mmanya ha n’ihi na e weere anwụnta ka ihe na-adịghị ọcha. Ma, otú ha si eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya yiri iloda kamel. Kamel bụkwa anụ na-adịghị ọcha, ma ha na-eloda ya n’ihi na ọ ka buo ibu.—Levitikọs 11:4, 21-24.