Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 125

A Kpọọrọ Jizọs Gakwuru Anas, Mechaa Kpọrọ Ya Gakwuru Keyafas

A Kpọọrọ Jizọs Gakwuru Anas, Mechaa Kpọrọ Ya Gakwuru Keyafas

MATIU 26:57-68 MAK 14:53-65 LUK 22:54, 63-65 JỌN 18:13, 14, 19-24

  • A KPỌỌRỌ JIZỌS GAKWURU ANAS, ONYE BỤBU NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ

  • IKPE NA-EKWESỊGHỊ EKWESỊ NDỊ SANHEDRIN KPERE JIZỌS

Ozugbo e kechara Jizọs agbụ ka onye omekome, a kpọọrọ ya gakwuru Anas. Anas bụ nnukwu onye nchụàjà n’oge Jizọs dị obere, bụ́ mgbe o mere ihe juru ndị nkụzi nọ n’ụlọ nsọ anya. (Luk 2:42, 47) Ụfọdụ ụmụ Anas mechara bụrụ nnukwu ndị nchụàjà. Ma ugbu a, ọ bụ ọgọ ya nwoke aha ya bụ Keyafas bụ nnukwu onye nchụàjà.

Mgbe Jizọs ka nọ na nke Anas, Keyafas kpọkọtara ndị Sanhedrin. Ha dị mmadụ iri asaa na otu. Ndị so na ha bụ nnukwu onye nchụàjà na ndị bụtụrụla nnukwu ndị nchụàjà.

Anas jụrụ Jizọs ajụjụ “banyere ndị na-eso ụzọ ya na ozizi ya.” Jizọs zara ya, sị: “Agwara m ụwa okwu n’ihu ọha. M kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nzukọ nakwa n’ụlọ nsọ, bụ́ ebe ndị Juu niile na-ezukọta; ọ dịghịkwa ihe m kwuru na nzuzo. Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ? Jụọ ndị nụrụ ihe m gwara ha.”—Jọn 18:19-21.

Mgbe Jizọs kwuchara ihe a, otu n’ime ndị ọrụ nche mara ya ụra ma baara ya mba, sị: “Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si aza onyeisi nchụàjà?” Ebe Jizọs ma na o nweghị ihe ya mere, ọ jụrụ ya, sị: “Ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ m kwuru, gbaa akaebe na o nwere ihe ọjọọ m kwuru; ma ọ bụrụ na ihe m kwuru ziri ezi, gịnị mere i ji tie m ihe?” (Jọn 18:22, 23) Anas nyeziri iwu ka a kpọga Jizọs na nke ọgọ ya nwoke, bụ́ Keyafas.

Ka ọ dị ugbu a, ndị niile nọ na Sanhedrin ezukọtala, ya bụ, nnukwu onye nchụàjà, ndị okenye, na ndị odeakwụkwọ. Ha zukọtara na nke Keyafas. Iwu akwadoghị ka ha kpee mmadụ ikpe n’abalị ụbọchị Ememme Ngabiga. Ma nke a emeghị ka ha ghara ikpe Jizọs ikpe.

Ọtụtụ n’ime ndị Sanhedrin a zukọtaranụ ka ha kpee Jizọs ikpe kpọrọ ya asị. Mgbe Jizọs kpọlitechara Lazarọs n’ọnwụ, ha kpebiri na Jizọs ga-anwụ. (Jọn 11:47-53) Ụbọchị ole na ole gara aga, ndị ndú okpukpe gbara izu ijide Jizọs ma gbuo ya. (Matiu 26:3, 4) Nke a gosiri na tupudị ha ebido ikpe Jizọs ikpe, ha amaala ya ikpe ọnwụ n’obi ha.

E wezụga izukọta kpee Jizọs ikpe n’oge iwu na-akwadoghị, ndị isi nchụàjà na ndị Sanhedrin ndị ọzọ nọ na-achọ ndị ga-agbagide Jizọs akaebe ụgha ka ha nwee ike ịma ya ikpe. Ha chọtara ọtụtụ ndị akaebe. Ma, akaebe ha ekwekọrịtaghị. N’ikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara kwuo, sị: “Anyị nụrụ ka ọ na-asị, ‘M ga-akwatu ụlọ nsọ a nke e ji aka mee, n’ime ụbọchị atọ, m ga-ewu ọzọ nke a na-ejighị aka mee.’” (Mak 14:58) Ma, ihe ha abụọ kwuru abụchaghị otu.

Keyafas jụrụ Jizọs, sị: “Ó nweghị ihe ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu n’akaebe a ndị a na-agbagide gị?” (Mak 14:60) O nweghị ihe Jizọs kwuru n’akaebe ụgha a a na-agbagide ya, bụ́kwanụ nke ndị na-agba ya na-ekwekọrịtaghị. N’ihi ya, Keyafas si ụzọ ọzọ mee ka Jizọs kwuo okwu.

Keyafas ma na ndị Juu anaghị achọ iji anya ahụ onye ọ bụla kwuru na ya bụ Ọkpara Chineke. N’oge Jizọs kwuru na Chineke bụ Nna ya, ndị Juu chọrọ igbu ya maka na ha chere na ọ “na-eme ka ya na Chineke hara.” (Jọn 5:17, 18; 10:31-39) Ebe Keyafas ma ihe ndị a, o ji akọ jụọ Jizọs, sị: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke!” (Matiu 26:63) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs ekwubuola ihe ndị gosiri na o kwetara na ya bụ Ọkpara Chineke. (Jọn 3:18; 5:25; 11:4) Ọ bụrụ na o kwughị ya ugbu a, e nwere ike iche na ọ na-agọ agọ na ya abụghị Ọkpara Chineke nakwa na ya abụghị Kraịst. N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ m; unu onwe unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”—Mak 14:62.

Ozugbo Jizọs kwuru ihe a, Keyafas dọwara uwe ya ma kwuo, sị: “O kwuluwo Chineke! Ọ̀ ka dị anyị mkpa ịchọ ndị akaebe? Lee! Ugbu a, unu anụwo nkwulu ahụ. Gịnị bụ uche unu?” Ndị Sanhedrin maziri ya ikpe arụrụala. Ha zara, sị: “O kwesịrị ọnwụ.”—Matiu 26:65, 66.

Ha malitere ịkwa Jizọs emo na ịkụ ya ihe. Ndị ọzọ mara ya ụra ma bụọ ya asọ mmiri n’ihu. Mgbe ha kpuchichara ya ihu ma maa ya ụra, ha jụrụ ya, sị: “Buo amụma. Ọ̀ bụ onye tiri gị ihe?” (Luk 22:64) Onye a ha na-akparị ma na-ekpe ikpe abalị a iwu na-akwadoghị, bụdị Ọkpara Chineke.