Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 133

A Kwadebere Ozu Jizọs ma Buru Ya Gaa Lie

A Kwadebere Ozu Jizọs ma Buru Ya Gaa Lie

MATIU 27:57–28:2 MAK 15:42–16:4 LUK 23:50–24:3 JỌN 19:31–20:1

  • E BUDARA OZU JIZỌS N’OSISI

  • A KWADEBERE OZU JIZỌS MAKA OLILI

  • ỤMỤ NWAANYỊ ACHỌPỤTA NA ILI JIZỌS TỌGBỌ CHAKOO

O ruwela mgbede Fraịdee, abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan ga-amalite ná mgbede ya ma anyanwụ daa. Ọ bụkwa Ụbọchị Izu Ike. Jizọs anwụọla kemgbe, ma ndị omekome abụọ ahụ a kpọgidere ha na ya n’osisi anwụbeghị. Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru na ozu “agaghị adị n’elu osisi abalị dum,” kama, a ga-eli ya “n’ụbọchị ahụ.”—Diuterọnọmi 21:22, 23.

Ihe ọzọ bụ na Fraịdee bụ ụbọchị Nkwadebe, n’ihi na ọ bụ oge ndị mmadụ ji akwadebe ihe oriri ma rụọ ọrụ ndị a na-agaghị edebe edebe ka Ụbọchị Izu Ike gachaa. Anyanwụ daa, a ga-abanye n’Ụbọchị Izu Ike “nke ukwu.” (Jọn 19:31) Abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan bụ ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. Ememme a na-ewe ụbọchị asaa. Ụbọchị mbụ ya na-abụ Ụbọchị Izu Ike. (Levitikọs 23:5, 6) N’afọ ahụ, ụbọchị mbụ nke ememme a dabara n’ụbọchị nke asaa n’izu, nke na-abụkwa Ụbọchị Izu Ike. Ọ bụ ya mere abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan afọ ahụ ji bụrụ Ụbọchị Izu Ike nke ukwu.

N’ihi ya, ndị Juu gwara Paịlet ka o mee ka Jizọs na ndị omekome abụọ ahụ a kpọgburu ha na ya nwụọ ngwa ngwa. Olee otú ha ga-esi mee ya? Ọ bụ ịkụjisi ha ụkwụ. Nke a ga-eme ka ha ghara iji ụkwụ ha bulie onwe ha elu ka ha nwee ike ịna-ekuru ume. Ndị agha ahụ bịaghachiri kụjisie ndị omekome abụọ ahụ ụkwụ. Ma ha akụjisịghị Jizọs ụkwụ, n’ihi na o yiri ka Jizọs ọ̀ nwụọla mgbe ahụ. Ihe a mezuru ihe e dere n’Abụ Ọma 34:20. Ọ sịrị: “Ọ na-eche ọkpụkpụ niile nke onye ahụ nche; e nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.”

Ka o doo onye ukwu na onye nta anya na Jizọs anwụọla n’eziokwu, otu n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ, ube ahụ amapuo akụkụ ebe obi ya dị. “Ozugbo ahụ, ọbara na mmiri gbapụtara.” (Jọn 19:34) Nke a mezukwara amụma ọzọ nke sịrị: “Ha ga-elegide anya n’Onye ahụ ha mara ube.”—Zekaraya 12:10.

Otu onye Arimatia nke “bara ọgaranya” aha ya bụ Josef nọ ebe ahụ mgbe a na-egbu Jizọs. Nwoke a bụ onye a ma ama na Sanhedrin. (Matiu 27:57) Baịbụl kwuru na ‘ọ bụ ezi mmadụ na nwoke ezi omume,’ onye nọ “na-echere alaeze Chineke.” Ọ kwadoghị ikpe ahụ ndị Sanhedrin kpere Jizọs n’ihi na ọ bụ “onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ na nzuzo, n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu.” (Luk 23:50; Mak 15:43; Jọn 19:38) Josef katara obi gwa Paịlet ka o bunye ya ozu Jizọs. Paịlet kpọrọ onyeisi ndị agha ahụ hụrụ maka ogbugbu Jizọs jụọ ya ma Jizọs ọ̀ nwụọla, ya asị na ọ nwụọla. Ozugbo Paịlet matara na Jizọs anwụọla, o kwetara ka Josef buru ozu Jizọs.

Josef zụtara ákwà linin mara mma nke dị ọcha ma butuo ozu Jizọs n’elu osisi. O ji ákwà linin ahụ fụọ ozu Jizọs iji kwadebe ya maka olili. Nikọdimọs, bụ́ “nwoke ahụ bịakwutere [Jizọs] na mbụ n’abalị,” nyekwara aka. (Jọn 19:39) O wetara mea a gwakọtara ya na alo. Ọ dị ihe dị ka otu narị paụnd n’ịdị arọ, dịrịkwa oké ọnụ. E ji mea ahụ a gwakọtara ya na alo tee n’ákwà ozu ma jiri ya fụọ Jizọs. Ọ bụ otú a ka ndị Juu si akwadebe ozu ha chọrọ ili.

Josef nwere ili a wapụtara na nkume dị nso ebe ahụ. E litụbeghị mmadụ na ya. Ọ bụ ebe ahụ ka e liri Jizọs. Ha kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ili ahụ. Ha mere ya ọkụ ọkụ tupu Ụbọchị Izu Ike amalite. O nwere ike ịbụ na Meri Magdalin na Meri nne Jems nke Nta nọ na-enye aka akwadebe ozu Jizọs. Ha lawara ngwa ngwa ịga “kwadebe ihe na-esi ísì ụtọ na mmanụ na-esi ísì ụtọ” ha ga-eji kwadebekwuo ozu Jizọs mgbe Ụbọchị Izu Ike gachara.—Luk 23:56.

N’echi ya, bụ́ Ụbọchị Izu Ike, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii gakwuuru Paịlet ma gwa ya, sị: “Nna anyị ukwu, anyị chetara na onye nduhie ahụ kwuru mgbe ọ ka nọ ndụ, sị, ‘Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, a ga-akpọlite m.’ Ya mere, nye iwu ka a na-eche ili ahụ nche ruo n’ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbịa zuru ya wee gwa ndị mmadụ, sị, ‘E mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie!’ nduhie nke ikpeazụ a ga-akakwa nke mbụ njọ.” Paịlet wee sị ha: “Unu nwere ndị nche. Gaanụ chee ya nche otú ọ bụla unu maara unu ga-esi chee ya.”—Matiu 27:63-65.

N’isi ụtụtụ Sọnde, Meri Magdalin, Meri nne Jems na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ wetara ihe na-esi ísì ụtọ n’ili ahụ iji tee ozu Jizọs. Ha gwara ibe ha, sị: “Ònye ga-akwapụrụ anyị nkume n’ọnụ ụzọ ili ncheta ahụ?” (Mak 16:3) Mgbe ha ruru, ha chọpụtara na ala ọma jijiji emeela ebe ahụ, nakwa na mmụọ ozi Chineke akwapụla nkume ahụ. Ndị nche anọghịzi ebe ahụ, ili ahụ dịkwa ka ọ̀ tọgbọrọ chakoo.