Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 111

Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama

Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama

MATIU 24:3-51 MAK 13:3-37 LUK 21:7-38

  • NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS ANỌ AJỤỌ YA MAKA IHE ỊRỊBA AMA

  • OTÚ HA SI MEZUO N’OGE NDỊOZI NA OTÚ HA SI EMEZU N’OGE A

  • ANYỊ GA-AMỤRỤ ANYA

Ụbọchị ahụ bụ ehihie Tuzdee, abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan. Chi jikwa nwayọọ na-eji. Ihe ọzọkwa bụ na ọ fọrọ abalị ole na ole ka Jizọs jechaa ozi ya n’ụwa. Kemgbe ụtụtụ, Jizọs nọ na-ezi ihe n’ụlọ nsọ. Mgbe chi jiri, o si na Jeruselem pụọ gaa hie ụra ebe ọzọ. Ma, ndị mmadụ nwere nnọọ mmasị ịnụ ihe ọ na-ezi, n’ihi ya, ha ‘na-abịakwute ya n’ụlọ nsọ n’isi ụtụtụ ịnụrụ okwu ya.’ (Luk 21:37, 38) Ugbu a, Jizọs agazighị apụta n’ụlọ nsọ. Ya na ndịozi ya anọ nọzi n’Ugwu Oliv. Aha ha bụ Pita, Andru, Jems, na Jọn.

Mmadụ anọ a bịakwutere Jizọs iche. Ihe mere ha ji bịakwute ya bụ na ha na-echegbu onwe ha banyere ụlọ nsọ ahụ Jizọs ka kwupụrụ okwu ya na a gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya. Ma, ha ka nwere ọtụtụ ihe na-echegbu ha. Jizọs agwabuola ha, sị: “Dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.” (Luk 12:40) Ọ gwakwara ha banyere “ụbọchị ahụ mgbe a gaje ikpughe Nwa nke mmadụ.” (Luk 17:30) Ò nwere otú ihe ndị ahụ ọ gwara ha si gbasa ihe ndị o kwuru banyere ụlọ nsọ ahụ? Ndịozi ya chọrọ ịma ihe ihe ndị ahụ o kwuru pụtara. N’ihi ya, ha jụrụ ya, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?”—Matiu 24:3.

O nwere ike ịbụ na ihe ha bu n’obi jụọ ajụjụ a bụ maka mbibi Jizọs kwuru a ga-ebibi ụlọ nsọ ahụ ha na-ahụ anya. Ha jụkwara Jizọs banyere oge ọnụnọ ya. Ọ ga-abụ na ha chetara ihe atụ Jizọs mere banyere “otu nwoke nke si n’ezinụlọ eze” bụ́ onye ‘jere n’ala dị anya ka ọ gaa nweta ike ọchịchị ma lọta.’ (Luk 19:11, 12) Ihe ikpeazụ ha nọ na-eche bụ ihe ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe a’ pụtara.

Jizọs gwara ha ihe àmà ndị ha ga-eji amata mgbe a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Ma, ọ gwakwara ha ihe àmà ọzọ. Ihe àmà a ga-enyere ndị ga-abụ Ndị Kraịst n’ọdịnihu aka ịmata na ha nọ n’oge “ọnụnọ” Kraịst, nyekwara ha aka ịmata na oge Chineke ga-ebibi ụwa Setan eruwela.

Ka afọ na-aga, ndịozi Jizọs ji anya ha hụ ka ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma na-emezu. Ọtụtụ n’ime ha malitere imezu n’ihu ha. N’ihi ya, ihe mere mgbe afọ iri atọ na asaa gachara, ya bụ n’afọ 70, emeghị Ndị Kraịst mụ anya n’oge ahụ na mberede. Ọ bụ n’afọ ahụ ka e bibiri obodo ndị Juu na ụlọ nsọ ha. Ma, ọ bụghị ihe niile Jizọs buru n’amụma mezuru n’afọ 70 ma ọ bụ tupu mgbe ahụ. N’ihi ya, olee ihe ndị a ga-eji ama oge ọnụnọ ya, ya bụ, oge ọ ga-anọ n’ocheeze na-achị n’Alaeze Chineke? Jizọs gwara ndịozi ya azịza ya.

Jizọs kwuru na ‘a ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha’ nakwa na “mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha.” (Matiu 24:6, 7) O kwukwara na ‘a ga-enwe oké ala ọma jijiji, nakwa na ọrịa na-efe efe na ụkọ nri ga-adị n’ebe dị iche iche.’ (Luk 21:11) Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo unu.” (Luk 21:12) Ndị amụma ụgha ga-ebili, ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị. Mmebi iwu ga-aba ụba, ọtụtụ ndị agaghịkwa ahụ ibe ha n’anya. Jizọs kwukwara na ‘a ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’—Matiu 24:14.

 Ụfọdụ amụma ndị ahụ Jizọs buru mezuru tupu ndị Rom ebibie Jeruselem nakwa n’oge ha na-ebibi ya. Ma, ọ̀ ga-abụ na Jizọs bu n’obi na amụma ndị ahụ ga-emezu nke ugboro abụọ ya karịa otú o si mezuo na nke mbụ ya? Ị̀ na-ahụ ihe ndị na-egosi na amụma ndị ahụ na-emezu n’oge anyị a karịa otú ha mezuru n’oge gara aga?

Otu ihe ọzọ Jizọs kwuru a ga-eji mara oge ọnụnọ ya bụ na a ga-enwe “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Matiu 24:15) N’afọ 66, ihe arụ a bụ ndị agha Rom bú ọkọlọtọ arụsị ha ma ‘maa ụlọikwuu’ gburugburu Jeruselem. Ha kụtukwara ebe ụfọdụ ná mgbidi ya. (Luk 21:20) N’ihi ya, ‘ihe arụ a’ nọ n’ebe ọ na-ekwesịghị ịnọ, ya bụ, n’ebe ndị Juu weere na ọ bụ “ebe nsọ.”

Jizọs kwukwara, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” Ndị Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70. Mbibi a e bibiri ‘obodo nsọ’ ndị Juu na ụlọ nsọ ya, bụ oké mkpagbu. E gbukwara ọtụtụ puku ndị Juu n’oge ahụ. (Matiu 4:5; 24:21) E bibitụbeghị Jeruselem otú ahụ e si bibie ya, ndị Juu ahụtụbeghị ụdị mbibi a. O mere ka a kwụsị otú ndị Juu si na-efe ofufe kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ebe ọ dị otú ahụ, ebelebe ga-egbu mgbe amụma a Jizọs buru ga-emezu nke nnukwu ya.

IHE GA-EME KA HA NWEE OBI IKE MGBE IHE NDỊ AHỤ GA-EMEZU

Jizọs agwachabeghị ndịozi ya ihe ndị a ga-eji mara oge ọnụnọ ya na oge Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ n’ụwa. N’ihi ya, ọ gwara ha ka ha zere ‘Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha.’ Jizọs kwuru na ha ga-achọ ‘iduhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.’ (Matiu 24:24) Ma a gaghị eduhie ndị a họọrọ. A ga na-ahụ ndị bụ́ Kraịst ụgha anya mgbe ha ga-apụta, ma a gaghị ahụ Jizọs anya n’oge ọnụnọ ya.

Jizọs kwuru na n’oge Chineke ga-ebibi ụwa Setan a, a ga-enwe oké mkpagbu karịrị nke e nwere n’oge ndị Juu. Ọ sịrị: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ike nke eluigwe maa jijiji.” (Matiu 24:29) Ndịozi ahụ Jizọs gwara ihe a aghọtachaghị otú ihe ndị ahụ ga-esi eme. Ma, ihe ndị ahụ ga-adị egwu.

Olee otú ihe ndị ahụ dị egwu ga-emenụ ga-esi akpa ndị mmadụ aka? Ihe Jizọs kwuru zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi; n’ihi na a ga-eme ka ike nke eluigwe maa jijiji.” (Luk 21:26) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na oge ahụ bụ oge ihe ga-akacha siere ndị mmadụ ike kemgbe ndị mmadụ malitere ịdị ndụ n’ụwa.

Jizọs mere ka ndịozi ya ghọta na ọ bụghị mmadụ niile ga-akwa ákwá mgbe ‘Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ike na ebube dị ukwuu.’ Ihe a ọ gwara ha gbara ha ume. (Matiu 24:30) Ọ gwaburu ha na Chineke ga-eme ihe “n’ihi ndị a họọrọ.” (Matiu 24:22) N’ihi ya, olee ihe ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime n’ihi ihe ndị ahụ dị egwu Jizọs kwuru ga-emenụ? Ọ gwara ha, sị: “Mgbe ihe ndị a niile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:28.

Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị ga-anọ ndụ mgbe ihe ndị ahụ ga na-eme, ga-esi mara na ọgwụgwụ eruola nso? Jizọs gwara ha otú ha ga-esi mara. O ji osisi fig meere ha ihe atụ. Ọ sịrị: “Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee na-epupụta akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso. Otú ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ. N’ezie, ana m asị unu na ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.”—Matiu 24:32-34.

Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ahụ ka ọtụtụ ihe àmà ndị ahụ na-emezu, ha ga-ama n’ọgwụgwụ dị nso. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ga-anọ ndụ n’oge ahụ, sị:

 “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara. N’ihi na dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:36-39) Jizọs na-echetara ndị ọ na-agwa okwu banyere Iju Mmiri ụbọchị Noa, bụ́ nke kpara ike dị egwu n’ụwa niile.

O doro anya na ndịozi ahụ ha na Jizọs nọ n’Ugwu Oliv ghọtara na ha kwesịrị ịmụrụ anya. Jizọs gwara ha, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile. Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:34-36.

Jizọs ji ihe a ọ gwara ndịozi ya mee ka ha matakwuo na ihe ndị a o kwuru ga-emenụ agaghị eme naanị otu ebe. O kwughị na ha ga-eme naanị n’ihe dị ka afọ iri abụọ ma ọ bụ afọ iri atọ o kwuchara ha. O kwukwanụghị na ha ga-eme naanị na Jeruselem ma ọ bụ n’obodo ndị Juu. Kama, o kwuru na ha “ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile.”

Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịmụrụ anya ma dị njikere. O meere ha ihe atụ ọzọ iji mesie ihe a o kwuru ike. Ọ sịrị: “Maranụ otu ihe, na a sị na onyeisi ezinụlọ maara oge nche nke onye ohi ji abịa, ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a waba n’ụlọ ya. N’ihi nke a, unu onwe unu, dịrịnụ njikere, n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Matiu 24:43, 44.

Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ihe mere ha kwesịrị iji nwee olileanya. O mere ka obi sie ha ike na mgbe amụma ndị o buru ga-emezu, a ga-enwe “ohu” mụ anya ma na-arụsi ọrụ ike. Jizọs ji ihe ndịozi ya ma nke ọma mee ka ha ghọta ihe ọ na-ekwu. Ọ sịrị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’ezie, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.” Ma, ọ bụrụ na “ohu” ahụ echewe ihe ọjọọ n’obi ya ma malite imekpọ ndị ohu ibe ya ọnụ, nna ya ukwu ‘ga-enye ya oké ahụhụ.’—Matiu 24:45-51; tụlee Luk 12:45, 46.

Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ga-echewe ihe ọjọọ n’obi ha. Oleezi ihe Jizọs chọrọ iji ihe a o kwuru kụziere ndị na-eso ụzọ ya? Ọ chọrọ ka ha mụrụ anya ma na-arụsi ọrụ ike. N’ihi ya, o meere ha ihe atụ ọzọ ka ha ghọta ihe ọ na-ekwu.

GỤKWUO GBASARA YA

“Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”

Olee ihe ọhụrụ anyị ghọtara banyere mgbe ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma na Matiu isi iri abụọ na anọ na iri abụọ na ise ga-emezu?