Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 14

Jizọs Amalite Ịchọ Ndị Ga-abụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya

Jizọs Amalite Ịchọ Ndị Ga-abụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya

JỌN 1:29-51

  • JIZỌS ENWETA NDỊ MBỤ GHỌRỌ NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA

Mgbe Jizọs nọchara ụbọchị iri anọ n’ala ịkpa, nakwa tupu ya alaghachi Galili, ọ gaghachiri ịhụ Jọn onye mere ya baptizim. Ka Jizọs nọ na-abịa, Jọn gosiri ya ndị nọ ebe ahụ ma jiri olu dara ụda gwa ha, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa! Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, sị, ‘Otu nwoke na-abịa n’azụ m, bụ́ onye gafeworo n’ihu m, n’ihi na ọ dị adị tupu mụ onwe m.’” (Jọn 1:29, 30) Ọ bụ eziokwu na Jọn ji obere ihe tọọ Jizọs, ọ ma na Jizọs adịla ndụ ka mmụọ n’eluigwe tupu a mụọ yanwa.

Mgbe Jizọs bịara n’izu ole na ole bu ụzọ ka e mee ya baptizim, o yiri ka Jọn ejichaghị n’aka na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Jọn sịrị: “Mụ onwe m amadịghị ya, ma ihe mere m ji bịa were mmiri na-eme baptizim bụ ka e mee ka onye ahụ pụtara Izrel ìhè.”—Jọn 1:31.

Jọn kọọrọ ndị na-ege ya ntị ihe mere mgbe o mere Jizọs baptizim. Ọ sịrị: “Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efedata dị ka nduru, ọ dịgidekwara n’isi ya. Mụ onwe m amadịghị ya, ma Onye ahụ nke zitere m ka m jiri mmiri na-eme baptizim sịrị m, ‘Onye ọ bụla nke ị hụrụ ka mmụọ nsọ bịakwasịrị ma dịgide n’isi ya, ọ bụ onye a bụ onye ji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’ Ahụwo m ya, agbawokwa m àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.”—Jọn 1:32-34.

N’echi ya, Jọn na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ mgbe Jizọs bịara ọzọ. Jọn sịrị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke!” (Jọn 1:36) Ozugbo o kwuru ihe a, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya sooro Jizọs. Aha otu n’ime ha bụ Andru. O yiri ka onye nke ọzọ bụ onye dekọrọ ihe ndị a merenụ. Aha ya bụ Jọn. Ọ dị ka ọ̀ bụ Jọn a bụ nwa nwanne nne Jizọs, nwa Salomi. O nwere ike ịbụ na Salomi bụ nwanne Meri. Aha di Salomi bụ Zebedi.

Mgbe Jizọs lere anya n’azụ hụ ka Andru na Jọn na-eso ya, ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu na-achọ?”

Ha jụrụ ya, sị: “Rabaị, olee ebe i bi?”

Jizọs zara ha, sị: “Bịanụ, unu ga-ahụ ya.”—Jọn 1:37-39.

Ọ bụ ihe dị ka elekere anya anọ nke ehihie na-akụ mgbe ahụ. Andru na Jọn na Jizọs nọgidere chi ejie. Ihe a tọrọ Andru ụtọ nke mere ka ọ gaa chọọ Saịmọn nwanne ya nwoke, onye a na-akpọkwa Pita. Ọ sịrị ya: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ.” (Jọn 1:41) Andru kpọ Pita bịakwute Jizọs. Ihe ndị mechara mee gosiri na Jọn gakwara chọọ Jems nwanne ya nwoke ma kpọrọ ya bịakwute Jizọs. Ma, Jọn edenyeghị ihe a o mere mgbe ọ na-ede ihe ndị merenụ.

N’echi ya, Jizọs hụrụ Filip, onye Betseida. Betseida dị n’ebe mgbago ụsọ Oké Osimiri Galili. Ọ bụkwa ebe ahụ ka Andru na Pita si. Jizọs gwara Filip, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”—Jọn 1:43.

Filip hụkwara Nataniel, onye a na-akpọkwa Batọlọmiu, sị ya: “Anyị ahụwo onye ahụ Mozis dere banyere ya n’Iwu ahụ, onye Ndị Amụma dekwara banyere ya, ya bụ, Jizọs, nwa Josef, onye Nazaret.” Ihe a o kwuru siiri Nataniel ike ikweta, ya asị Filip: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?”

Filip sịrị ya, “Bịa hụrụ.” Mgbe Jizọs hụrụ Nataniel ka ọ na-abịa, ọ sịrị: “Lee onye Izrel n’ezie, onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị n’ime ya.”

Nataniel jụrụ ya, sị: “Olee otú i si mara m?”

Jizọs azaa ya, sị: “Tupu Filip akpọọ gị, mgbe ị nọ n’okpuru osisi fig, ahụrụ m gị.”

O juru Nataniel anya. Ya asị ya: “Rabaị, ị bụ Ọkpara Chineke, ị bụ Eze Izrel.”

Jizọs ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ maka na m gwara gị na m hụrụ gị n’okpuru osisi fig mere i ji kwere?” Jizọs kweziri ya nkwa, sị: “Ị ga-ahụ ihe ka ihe ndị a ukwuu. N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, unu ga-ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka ndị mmụọ ozi Chineke na-arịgo ma na-arịdakwute Nwa nke mmadụ.”—Jọn 1:45-51.

Obere oge ihe a mechara, Jizọs na ndị mbụ ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya si na ndagwurugwu Jọdan gawa Galili.