Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 2

A Kwanyeere Jizọs Ùgwù Tupu A Mụọ Ya

A Kwanyeere Jizọs Ùgwù Tupu A Mụọ Ya

LUK 1:34-56

  • MERI AGAA LETA ONYE IKWU YA BỤ́ ELIZABET

Mgbe mmụọ ozi Gebriel gwachara nwa agbọghọ ahụ bụ́ Meri na ọ ga-amụ nwa, gụọkwa ya Jizọs, nakwa na Jizọs ga-abụ Eze ruo mgbe ebighị ebi, Meri jụrụ ya, sị: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?”—Luk 1:34.

Gebriel zara ya, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.”—Luk 1:35.

Gebriel gwara Meri ihe ga-eme ka o kweta ozi a o ziri ya. Ọ sịrị ya: “Lee! Elizabet onye ikwu gị atụrụwokwa ime nwa nwoke n’agadi ya, bụ́ onye a sị na ọ bụ nwaanyị aga, nke a bụkwa ọnwa nke isii ya; n’ihi na, n’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.”—Luk 1:36, 37.

Ihe Meri zaghachiri Gebriel gosiri na o kwetala ihe Gebriel kwuru. Meri ji obi ụtọ kwuo, sị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova! Ka o mee dị ka i kwuru.”—Luk 1:38.

Ozugbo Gebriel pụrụ, Meri jikeere ịga leta Elizabet na di ya bụ́ Zekaraya. Ha bi ebe dị nso na Jeruselem, n’ebe ugwu Judia. Isi ebe Meri bi na Nazaret gaa Judia nwere ike iwe ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ.

Meri mechara rute n’ụlọ Zekaraya. Mgbe Meri banyere n’ime ụlọ, o kelere Elizabet. Ozugbo ahụ, Elizabet jupụtara na mmụọ nsọ. Ọ sịrị Meri: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ n’etiti ndị inyom, ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị bụkwa! Ya mere, olee otú o si bụrụ na m nwetara ihe ùgwù a, na nne nke Onyenwe m bịakwutere m? N’ihi na, lee! ka m nụrụ ụda ekele gị, nwa nọ m n’afọ maliri n’obi ụtọ.”—Luk 1:42-44.

Obi dị Meri ezigbo ụtọ maka ihe ọma a Chineke meere ya. O kwuru, sị: “Mkpụrụ obi m na-eto Jehova, mmụọ m apụghịkwa ịkwụsị inwe oké ọṅụ n’ebe Chineke bụ́ Onye Nzọpụta m nọ; n’ihi na o lekwasịwo anya n’ọnọdụ dị ala nke ohu ya nwaanyị. N’ihi na, lee! site ugbu a gaa n’ihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye obi ụtọ; n’ihi na Onye ahụ nke dị ike emeworo m oké ihe dị iche iche.” Ị̀ chọpụtara na ihe a e meere Meri emeghị ka isi buwe ya, kama o nyere Chineke otuto niile? Ọ sịrị: “Aha ya dịkwa nsọ; sitekwa n’ọgbọ ruo n’ọgbọ ebere ya na-adịkwasị ndị na-atụ egwu ya.”—Luk 1:46-50.

Meri gara n’ihu na-eto Chineke. E nyekwara ya ike mmụọ nsọ ibu amụma. Ọ sịrị: “O jiriwo ogwe aka ya rụọ oké ọrụ, ọ chụsasịwo ndị dị mpako n’ihe ha bu n’obi. Ọ kwatuwo ndị nwere ike n’ocheeze, buliekwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha elu; o werewo ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ, o mewokwa ka ndị nwere akụ̀ gbara aka laa. Ọ gbataworo Izrel bụ́ ohu ya ọsọ enyemaka, iji cheta ebere ọ ga-emere Ebreham na mkpụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka ọ gwara nna nna anyị hà.”—Luk 1:51-55.

Meri nọnyeere Elizabet ruo ihe dị ka ọnwa atọ. O nyekwaara Elizabet ezigbo aka ugbu a o ruwerela oge Elizabet ga-amụ nwa. Ọ magburu nnọọ onwe ya na ụmụ nwaanyị abụọ a na-efe Chineke, bụ́ ndị Chineke mekwara ka ha dịrị ime, nọkọtara ọnụ n’oge a dị ezigbo mkpa ná ndụ ha.

Ị̀ chọpụtara na a kwanyeere Jizọs ùgwù tupu a mụọ ya? Elizabet kpọrọ ya “Onyenwe m.” Nwa nọ ya n’afọ ‘malikwara n’obi ụtọ’ mgbe Meri batara n’ụlọ ha. Nke a dị nnọọ iche n’otú ndị ọzọ si mesoo Meri na nwa a ọ ga-amụ. Anyị ga-ahụ otú e si mesoo ha.

GỤKWUO GBASARA YA

Meri—“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

Olee otú ihe Meri gwara mmụọ ozi Gebriel si gosi na o nwere okwukwe? Olee àgwà ndị ọzọ Meri kpara?