Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 26

“A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”

“A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”

MATIU 9:1-8 MAK 2:1-12 LUK 5:17-26

  • JIZỌS AGBAGHARA OTU NWOKE AHỤ́ YA KPỌNWỤRỤ AKPỌNWỤ MMEHIE YA, GWỌỌKWA YA

Ndị nọ ebe dị iche iche anụla gbasara Jizọs. Ọtụtụ n’ime ha na-achọdị ya aga ebe ndị siri ike ọgịga ka ha nwee ike ịnụ ihe ọ na-akụzi nakwa ịhụ ọrụ ebube ndị ọ na-arụ. Ma, mgbe ụbọchị ole na na ole gachara, ọ laghachiri Kapaniọm, bụ́ ebe ọ nọrọla rụọ ọtụtụ ọrụ. Ozugbo ahụ, akụkọ zuru ebe niile n’obodo a dị n’akụkụ Oké Osimiri Galili na ọ lọghachila. N’ihi ya, ọtụtụ ndị bịara n’ụlọ ebe ọ nọ. Ụfọdụ n’ime ndị bịaranụ bụ ndị Farisii na ndị na-akụzi Iwu. Ha si ebe dị iche iche dị na Galili na Judia, ma na Jeruselem, bịa.

‘Ọtụtụ ndị gbakọrọ nke na ohere adịkwaghị, ọbụnadị n’akụkụ ọnụ ụzọ, o wee malite ịgwa ha okwu Chineke.’ (Mak 2:2) E nwere otu ihe pụrụ iche na-aga imenụ. Ihe a ga-enyere anyị aka ịghọta na Jizọs nwere ikike iwepụ ihe mere ụmụ mmadụ ji na-ata ahụhụ ma mee ka ahụ́ dị ndị niile ọ chọrọ ịgwọ.

Ka Jizọs nọ na-akụzi ihe n’ime otu ụlọ ndị mmadụ juru, ụmụ nwoke anọ bubatara otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha chọrọ ka Jizọs gwọọ enyi ha. Ma, n’ihi ìgwè mmadụ juru ebe ahụ, ha enwelighị ike “ibute ya n’ebe Jizọs nọ kpọmkwem.” (Mak 2:4) O doro anya na ihe a ga-ewute ha. Ihe ha meziri bụ ịrị elu ụlọ ahụ ma chọọ otu ebe meghee. Ha si ebe ahụ budata nwoke ahụ n’ime ụlọ.

Iwe ò were Jizọs n’ihi ihe a ha mere nke mere ka ọ kwụsịtụ ihe ọ na-akụzi? Mba, iwe eweghị ya. Kama nke ahụ, ụdị okwukwe ha nwere masịrị Jizọs. Ọ sịrị nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “A gbagharawo gị mmehie gị.” (Matiu 9:2) Ma, Jizọs ò nwere ikike ịgbaghara mmehie n’eziokwu? Ihe a were ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii iwe. Ha gwawara ibe ha sị: “Gịnị mere nwoke a ji na-ekwu okwu otú a? Ọ na-ekwulu Chineke. Ònye pụrụ ịgbaghara mmehie ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke?”—Mak 2:7.

Jizọs ma ihe ha nọ na-eche. N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-atụgharị ihe ndị a n’obi unu? Olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharawo gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie bulite ihe ndina gị gawa ije’?” (Mak 2:8, 9) N’eziokwu, àjà Jizọs ga-emecha chụọ mere ka o nwee ike ịgbaghara nwoke ahụ mmehie ya.

Ihe ọzọ Jizọs kwuru meziri ka ìgwè mmadụ ahụ na ndị ahụ na-akatọ ya mata na ya nwere ikike ịgbaghara mmehie n’ụwa. O lere nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ anya ma gwa ya, sị: “Ana m asị gị, Bilie, buru ihe ndina gị, lawa n’ụlọ gị.” Ozugbo ahụ, nwoke ahụ mere ihe ọ gwara ya. O buuru ihe ndina ya n’ihu ha niile, si ebe ahụ pụọ. Ihe a tụrụ mmadụ niile nọ ebe ahụ n’anya. Ha malitere inye Chineke otuto. Ha sịrị: “Anyị ahụtụbeghị ụdị ya.”—Mak 2:11, 12.

Ị̀ chọpụtara na Jizọs kwutere okwu mmehie mgbe ọ na-ekwu okwu gbasara ọrịa, kwuokwa na ịgbaghara mmehie dị ka ịgwọ mmadụ ọrịa na-arịa ya? Baịbụl kwuru na nna anyị mbụ, bụ́ Adam, mehiere. O kwukwara na anyị niile na-ata ahụhụ ihe mmehie ya ahụ kpatara, ya bụ, ọrịa na ọnwụ. Ma, mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, Jizọs ga-agbaghara ndị niile hụrụ Chineke n’anya ma na-efe ya ofufe mmehie ha. Mgbe ahụ, ọrịa agaghịzi adị.—Ndị Rom 5:12, 18, 19.

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ò Nwere Ike Ịgbaghara Anyị Mmehie Anyị?

Chineke ọ̀ na-agbaghara mmehie ndị dị oké njọ? Gịnị ka anyị ga-eme ka Chineke hụ anyị n’anya?