Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 63

Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịkpata Ihe Ịsụ Ngọngọ na Ime Mmehie

Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịkpata Ihe Ịsụ Ngọngọ na Ime Mmehie

MATIU 18:6-20 MAK 9:38-50 LUK 9:49, 50

  • NDỤMỌDỤ GBASARA IME KA MMADỤ SỤỌ NGỌNGỌ

  • Ọ BỤRỤ NA NWANNA EMEE MMEHIE

Jizọs akụzierela ndị na-eso ụzọ ya otú ha kwesịrị isi na-ele onwe ha anya. Ha kwesịrị iwere onwe ha ka ụmụaka bụ́ ndị na-eweda onwe ha ala. Ha kwesịkwara ‘ịna-anabata ụmụntakịrị dị otú a n’aha Jizọs.’ Ọ bụrụ na ha ana-eme otú ahụ, ọ pụtara na ha ‘na-anabatakwa Jizọs.’—Matiu 18:5.

Ọ dịbeghị anya ndịozi Jizọs nọ na-arụrịta ụka gbasara onye kacha ukwuu n’etiti ha. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ha weere ihe ahụ Jizọs gwara ha ka ịdọ aka ná ntị. Jọn onyeozi kwuliteziri ihe ọzọ mere n’oge na-adịbeghị anya. Ọ sịrị: “Onye Ozizi, anyị hụrụ otu nwoke nke ji aha gị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, anyị gbalịkwara igbochi ya, n’ihi na ọ dịghị eso anyị.”—Luk 9:49.

O nwere ike ịbụ na Jọn weere ya na ọ bụ naanị ya na ndịozi ndị ọzọ ka e nyere ikike iji aha Jizọs agwọ ọrịa ma ọ bụ achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ọ bụrụ otú ahụ, oleezi otú nwoke onye Juu ahụ si nwee ike iji aha Jizọs na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ? Ọ ga-abụ na Jọn chere na nwoke ahụ ekwesịghị iji aha Jizọs na-arụ ọrụ ebube ndị ahụ ebe ọ bụ na o soghị ha na Jizọs na-aga.

Ma, ihe Jizọs kwuru tụrụ Jọn n’anya. Jizọs sịrị: “Unu anwala igbochi ya, n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla nke ga-arụ ọrụ dị ike n’aha m nke ga-enwe ike ikwujọ m ọsọ ọsọ; n’ihi na onye na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị. N’ihi na onye ọ bụla nke kunyere unu otu iko mmiri ka unu ṅụọ n’ihi na unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya.”—Mak 9:39-41.

N’oge ahụ, ọ dịghị mkpa ka nwoke ahụ soro Kraịst na-aga tupu e were ya na ọ dịnyeere Kraịst. E hiwebeghị ọgbakọ Ndị Kraịst mgbe ahụ. N’ihi ya, na nwoke ahụ esoghị Jizọs na-aga apụtaghị na ọ na-emegide Jizọs ma ọ bụkwanụ na-akwado okpukpe ụgha. O doro anya na nwoke ahụ nwere okwukwe na Jizọs. Ihe Jizọs kwuziri gosiri na nwoke ahụ ga-enweta ụgwọ ọrụ.

Ma, ọ gaara ajọgbu onwe ya ma a si na ihe ndịozi Jizọs kwuru ma ọ bụ mee mere ka nwoke ahụ sụọ ngọngọ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke mere ka otu n’ime ndị a dị nta kwere ekwe sụọ ngọngọ, ọ ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na e konye nkume igwe nri, dị ka nke ịnyịnya ibu na-akwagharị, n’olu ya wee tụba ya nnọọ n’ime oké osimiri.” (Mak 9:42) Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbupụ aka ha ma ọ bụ ụkwụ ha, ma ọ bụkwanụ ghụpụ anya ha ma ọ bụrụ na ihe ndị ahụ ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. Ọ gwara ha na ọ ga-akara ha mma ma ha gbara aka ihe ndị ahụ banye n’Alaeze Chineke, kama ha ga-ejiri ha banye na Gehena (ya bụ, Ndagwurugwu Hinọm). Ndagwurugwu a dị nso na Jeruselem. Ọ bụ ebe a na-akpọ ihe ndị e kpofuru ekpofu ọkụ. Ọ ga-abụ na ndịozi Jizọs ma ya nke ọma. Ha ghọtakwara na Gehena Jizọs na-ekwu okwu ya pụtara mbibi ebighị ebi.

Jizọs dọkwara ha aka ná ntị, sị: “Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.” Olee otú Nna Jizọs si were “ndị a dị nta”? Jizọs kọọrọ ha na e nwere otu nwoke nke nwere otu narị atụrụ, ma otu n’ime ha kpafuru. Nwoke ahụ hapụrụ iri itoolu na itoolu fọrọ afọ gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu. Mgbe ọ chọtara ya, ọ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị. Jizọs gwaziri ha, sị: “Ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.”—Matiu 18:10, 14.

Jizọs gwakwara ndịozi ya, sị: “Nweenụ nnu n’ime onwe unu, unu na ibe unu dị n’udo.” Ọ ga-abụ n’ihi ụka ahụ ndịozi ya nọ na-arụrịta gbasara onye ga-akacha ukwuu n’etiti ha mere o ji gwa ha ihe a. (Mak 9:50) Nnu na-eme ka nri dị ụtọ ma kwe oriri. Otú ahụkwa ka ọ dị ma a bịa n’okwu anyị na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị emee ka okwu anyị dị ụtọ, ndị ọzọ ga-enwe mmasị ịnabata ihe anyị kwuru, ya emeekwa ka udo dịrị. Ma, arụmụka anaghị eme ka udo dịrị.—Ndị Kọlọsi 4:6.

Ihe ọzọ Jizọs kwuru bụ ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na okwu siri ike adapụta. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emehie, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị n’uru.” Ma, ọ bụrụkwanụ na o geghị gị ntị? Jizọs sịrị: “Kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ, ka e wee site n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu.” Ọ bụrụkwa na o kweghị ka unu dozie esemokwu ahụ, kọọrọ ya “ọgbakọ,” ya bụ, ndị okenye ruru eru n’ọgbakọ. Ma, ọ bụrụkwanụ na e mechaa ihe ndị a niile ma onye ahụ ekweghị? “Ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọnaụtụ.” Ndị mba ọzọ na ndị ọnaụtụ bụ ndị ha na ndị Juu na-anaghị emekọrịta ihe.—Matiu 18:15-17.

Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịna-eme ihe Okwu Chineke kwuru. Ọ bụrụ na ha achọpụta na mmadụ mere mmehie ma kpebie na a ga-adọ onye ahụ aka ná ntị, ihe ha kpebiri “bụ ihe e kere agbụ n’eluigwe.” Ma ọ bụrụ na ha ekpebie na aka onye ahụ dị ọcha, ihe ha kpebiri bụ “ihe a tọpụrụ n’eluigwe.” Ihe a Jizọs kwuru ga-aba uru ma e hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst. Jizọs kwuziri ihe ga-eme mgbe a na-eleba anya n’ụdị okwu a. Ọ sịrị: “N’ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara n’aha m, anọ m n’ebe ahụ n’etiti ha.”—Matiu 18:18-20.