Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 33

Imezu Amụma Aịzaya

Imezu Amụma Aịzaya

MATIU 12:15-21 MAK 3:7-12

  • ÌGWÈ MMADỤ ANA-ADAGIDE JIZỌS

  • O MEZURU AMỤMA AỊZAYA

Mgbe Jizọs matara na ndị Farisii na ndị òtù Herọd na-eme atụmatụ igbu ya, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gawa n’Oké Osimiri Galili. Ìgwè mmadụ sí ebe dị iche iche sooro ha, ma ndị si Galili, ndị si obodo Taya na Saịdọn dị n’akụkụ osimiri, ndị si ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, na ndị si Jeruselem na Idumia dị n’ebe ndịda. Jizọs gwọrọ ọtụtụ ndị ahụ́ na-adịghị. N’ihi ya, ndị ọzọ na-arịa ọrịa dị oké njọ nuuru na-abịa Jizọs nso. Ha echeghị ka ọ bịa metụ ha aka, kama, ha bịawara n’onwe ha ka ha metụ ya aka.—Mak 3:9, 10.

Ìgwè mmadụ ahụ buru ibu nke na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha wetere ya obere ụgbọ mmiri ka ya nwee ike ịbanye ná mmiri ka ìgwè mmadụ ahụ ghara ịna-adagide ya. O nwekwara ike ịnọ n’ụgbọ ahụ na-akụziri ha ihe, ma ọ bụkwanụ ya agaa n’akụkụ ikpere mmiri ọzọ nyere ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ aka.

Matiu onye na-eso ụzọ kwuru na ọrụ a Jizọs na-arụ na-emezu “ihe e kwuru site n’ọnụ Aịzaya onye amụma.” (Matiu 12:17) Olee amụma ihe a Jizọs na-arụ na-emezu?

Ọ bụ amụma a: “Lee! Ohu m nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m! M ga-eme ka mmụọ m dịkwasị ya, ọ ga-eme ka ihe bụ́ ikpe ziri ezi doo mba niile anya. Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghịkwa etisi mkpu ike, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá. Ọ dịghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ọ ga-egwepịa, ọ dịghịkwa owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ ọ ga-emenyụ, ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi nwee mmeri. N’ezie, n’aha ya ka mba niile ga-enwe olileanya.”—Matiu 12:18-21; Aịzaya 42:1-4.

N’eziokwu, Jizọs bụ ohu Chineke. Chineke hụrụ ya n’anya, ihe ya masịkwara ya. Omenala okpukpe ụgha emeela ka a ghara ịma ihe ikpe ziri ezi bụ, ma Jizọs mere ka ihe ikpe ziri ezi bụ doo anya. Ndị Farisii na-akọwa Iwu Chineke otú dị ha mma. Ha anaghịdị enyere onye ahụ́ na-adịghị aka n’Ụbọchị Izu Ike. Ma, Jizọs mere ka ndị mmadụ nwere onwe ha pụọ n’agbụ nke omenala ndị na-echi ha ọnụ n’ala, si otú a mee ka a mara ikpe ziri ezi Chineke, gosikwa na ya nwere mmụọ Chineke. Ọ bụ ya mere ndị ndú okpukpe ji chọọ igbu ya. Àgwà ha jọgburu onwe ya.

Gịnị ka okwu ahụ bụ́ na “ọ gaghị ese okwu, ọ gaghịkwa etisi mkpu ike, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá” pụtara? Mgbe Jizọs gwọrọ ndị mmadụ, ọ naghị ekwe ka ha ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ mee “ka a mata ya.” (Mak 3:12) Ọ chọghị ka a na-akọ gbasara ya ka ebe a na-akpọsa ngwá ahịa, ọ chọghịkwa ka ndị mmadụ na-etinye ihe merenụ nnu na ose ma ha na-akọrọ ya ndị ọzọ.

Jizọs jikwa ozi ya na-akasi obi gakwuru ndị dị ka ahịhịa amị e chihịara echihịa, ndị dara mbà n’obi. Ha dị ka owu oriọna nke ọkụ ya na-achọzi ịnyụ anyụ. Jizọs egwepịaghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ma ọ bụ menyụọ owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ. Kama, o ji obiọma na ịhụnanya bulie ndị dị umeala n’obi elu. N’eziokwu, Jizọs bụ onye ahụ mba niile ga-enwe olileanya na ya.