Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 27

Jizọs Akpọọ Matiu

Jizọs Akpọọ Matiu

MATIU 9:9-13 MAK 2:13-17 LUK 5:27-32

  • JIZỌS AKPỌỌ MATIU ONYE ỌNAỤTỤ

  • KRAỊST NA NDỊ MMEHIE EMEKỌỌ IHE KA O NWEE IKE INYERE HA AKA

Obere oge Jizọs gwọchara nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, Jizọs nọgidere na Kapaniọm n’akụkụ Oké Osimiri Galili. Ìgwè mmadụ bịakwutekwara ya ọzọ, ya amalite izi ha ihe. Mgbe e mechara, ka ọ nọ na-aga n’ụzọ, ọ hụrụ Matiu, onye a na-akpọkwa Livaị, ka ọ nọ ọdụ n’ụlọ ọrụ ndị ọnaụtụ. Jizọs gwara ya, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”—Matiu 9:9.

O nwere ike ịbụ na Matiu ma banyere ihe Jizọs na-akụzi na ọrụ ebube ndị ọ rụrụla na Kapaniọm, otú ahụ Pita, Andru, Jems na Jọn ma. O sowekwara Jizọs ozugbo otú ahụ ha mere. Matiu kọwara ihe a n’Oziọma ahụ o dere. Ọ sịrị: “O [ya bụ, Matiu n’onwe ya] wee bilie soro” Jizọs. (Matiu 9:9) Ihe ọ pụtara bụ na Matiu hapụrụ ọrụ ya dị ka onye ọnaụtụ ma ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs.

Obere oge ka Matiu ghọchara onye na-eso ụzọ Jizọs, ọ kpọrọ nnukwu oriri n’ụlọ ya. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kpọọ oriri a bụ n’ihi na obi dị ya ụtọ na Jizọs kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ ya. E wepụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, olee ndị ọzọ Matiu kpọrọ ka ha bịa oriri ahụ? Ọtụtụ ndị ha na Matiu na-akpabu, ya bụ, ndị ọnaụtụ ndị ọzọ, bịara oriri ahụ. Ha na-anakọtara ndị ọchịchị Rom, bụ́ ndị ndị Juu kpọrọ asị, ụtụ. Ha na-ana ụtụ maka ụgbọ mmiri ndị na-abata n’ọdụ ụgbọ mmiri, na-ana ndị ahịa na-aga n’okporo ụzọ ụtụ, na-anakwa ụtụ maka ihe ndị e si esi ebubata n’obodo. Olee otú ndị Juu si ele ndị ọnaụtụ anya? Ha kpọrọ ha asị n’ihi na ha na-eji aghụghọ anara ndị mmadụ ụtụ karịrị ihe ha kwesịrị ịkwụ. ‘Ndị mmehie’ bịakwara oriri ahụ, ya bụ, ndị a ma na ha na-eme ihe na-adịghị mma.—Luk 7:37-39.

Mgbe ndị Farisii, ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha, hụrụ na Jizọs na ụdị ndị a na-erikọ ihe, ha jụwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gịnị mere onye ozizi unu ji na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?” (Matiu 9:11) Mgbe Jizọs nụrụ ihe ha na-ekwu, ọ zara ha, sị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu. Ya mere, gaanụ mata ihe ihe a pụtara, ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’ N’ihi na ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” (Matiu 9:12, 13; Hosia 6:6) Ọkpụkpọ ndị Farisii na-akpọ Jizọs “onye ozizi” anaghị esi ha n’obi. Ma ọ bụrụ na ha egee ya ntị, ha ga-amụta ihe ziri ezi n’ọnụ ya.

Ọ ga-abụ na ihe mere Matiu ji kpọọ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie n’ụlọ ya bụ ka ha nụ ihe Jizọs na-akụzi ma si otú ahụ bụrụ ndị a gwọrọ ọrịa ime mmụọ ha. Baịbụl gosiri na ‘ọtụtụ n’ime ha amalitedịla iso ya.’ (Mak 2:15) Jizọs chọrọ inyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ dịghị ka ndị Farisii ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha. Ọ kpọghị ụdị ndị ahụ asị. Ọmịiko na obi ebere o nwere n’ebe ha nọ kpaliri ya inyere ha aka. Jizọs dị ka dọkịta ọrụ ya bụ ịgwọ ndị niile na-arịa ọrịa ime mmụọ.

Ihe mere Jizọs ji metere ndị ọnaụtụ na ndị mmehie ebere abụghị n’ihi na ọ kwadoro ihe ha na-eme. Kama, ọ bụ n’ihi na ọnọdụ ha na-emetụ ya n’ahụ́ otú ahụ ọnọdụ ndị na-arịa ọrịa nkịtị sikwa emetụ ya n’ahụ́. Otu ihe atụ bụ mgbe ahụ o meteere onye ekpenta ahụ ebere ma metụ ya aka, sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.” (Matiu 8:3) Ọ̀ bụ na anyịnwa ekwesịghị ịna-emetere ndị nọ ná mkpa ebere, karịchaa ịna-enyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma?