Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 59

Ònye Ka Nwa nke Mmadụ Bụ?

Ònye Ka Nwa nke Mmadụ Bụ?

MATIU 16:13-27 MAK 8:22-38 LUK 9:18-26

  • JIZỌS AGWỌỌ NWOKE ONYE ÌSÌ

  • PITA ANATA MKPỊSỊ UGODI NKE ALAEZE

  • JIZỌS EKWUO GBASARA ỌNWỤ NA MBILITE N’ỌNWỤ YA

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya rutere Betseida, ndị mmadụ kpọtaara ya otu nwoke onye ìsì ma na-arịọ ya ka o metụ nwoke ahụ aka ka ahụ́ dị ya mma.

Jizọs seere nwoke ahụ n’aka pụọ n’obodo nta ahụ, gbụsa ya ọnụ mmiri n’anya ma jụọ ya, sị: “Ò nwere ihe ị na-ahụ?” Nwoke ahụ zara ya, sị: “Ana m ahụ ndị mmadụ, n’ihi na ana m ahụ ihe yigasịrị osisi, ma ha na-ejegharị ejegharị.” (Mak 8:23, 24) Jizọs bikwasịkwara ya aka n’anya ọzọ ma mee ka ọ hụwa ụzọ nke ọma, sịzie ya lawa. Ma, ọ gwara ya ka ọ ghara ịbanye n’obodo nta ahụ.

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gawaziri n’ebe ugwu, ya bụ, n’ebe a na-akpọ Sesaria Filipaị. Ha ga-agacha ihe dị ka kilomita iri anọ tupu ha eruo ebe ahụ. Ebe ahụ dị n’elu ugwu dị́ ihe dị ka narị mita atọ na iri ise n’ịdị elu. Otu ugwu a na-akpọ Ugwu Hemọn dịkwa n’ebe ahụ, snoo kpuchikwara elu ya. Ọ ga-abụ na o were Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya abalị abụọ ma ọ bụ karịa iji ruo ebe ahụ.

O nwere ebe ha ruru, Jizọs agaa n’otu akụkụ ka o kpee ekpere. Ọ fọziri ihe dị ka ọnwa itoolu ma ọ bụ iri tupu e gbuo ya, ihe banyere ndị na-eso ụzọ ya na-echekwa ya uche. Ọtụtụ ndị na-esobu ya ahapụla ya, ọ ga-abụkwa na obi esichaghịzi ndị nke fọrọ afọ ike ma ọ bụkwanụ na obi adịghị ha mma maka na ihe ha tụrụ anya ya emeghị. Ha nwere ike ịna-eche ihe mere Jizọs ekweghị ka ndị mmadụ mee ya eze ma ọ bụkwanụ ihe mere o gosighị ndị mmadụ ihe ịrịba ama ga-eme ka ha kweta na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya ebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere, ọ jụrụ ha, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke mmadụ bụ?” Ha sịrị ya: “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim, ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa na-asị na ị bụ Jeremaya ma ọ bụ otu n’ime ndị amụma.” Ihe ahụ ha kwuru bụ eziokwu. Ndị mmadụ nọ na-eche na Jizọs bụ otu n’ime ndị a nwụrụ anwụ, nke a kpọlitere n’ọnwụ. Ma, Jizọs chọrọ ịmata ihe hanwa chere. N’ihi ya, ọ jụrụ ha, sị: “Ma, unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara ya ozugbo, sị: “Ị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”—Matiu 16:13-16.

Jizọs gwara Pita ka o nwee obi ụtọ n’ihi na ọ bụ Chineke mere ka ọ mata na ya bụ Kraịst. Ọ gwaziri ya, sị: “Ana m asịkwa gị, Ị bụ Pita, ọ bụkwa n’oké nkume a ka m ga-ewukwasị ọgbakọ m, ọnụ ụzọ ámá nke Hedis agaghịkwa aka ya ike.” Ihe Jizọs na-ekwu bụ na o nwere ọgbakọ ọ ga-ewu, nakwa na onye ọ bụla nke nọgidere n’ọgbakọ ahụ ruo ọnwụ ga-adị ndụ ọzọ. Jizọs kweziri Pita nkwa, sị: “M ga-enye gị mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe.”—Matiu 16:18, 19.

Ma, ihe a Jizọs kwuru apụtaghị na o meela Pita onyeisi ndịozi ya niile, ọ pụtaghịkwa na o meela Pita ntọala ọgbakọ ya. Ọ bụ Jizọs n’onwe ya bụ nkume isi nkuku nke a ga-ewukwasị ọgbakọ ya n’elu ya. (1 Ndị Kọrịnt 3:11; Ndị Efesọs 2:20) Ma, e nwere mkpịsị ugodi atọ a ga-enye Pita. Pita ga-eji mkpịsị ugodi ndị a mepeere ndị dị iche iche ụzọ ịbanye n’Alaeze eluigwe.

Mgbe Pita ji mkpịsị ugodi nke mbụ mepeere ndị mmadụ ụzọ bụ na Pentikọst afọ 33. O mere ka ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu mata ihe ha ga-eme ka a zọpụta ha. O ji mkpịsị ugodi nke abụọ mepeere ndị Sameria kwere ekwe ụzọ ịbanye n’Alaeze Chineke. N’afọ 36, o jizi nke atọ mee ka ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù, dị ka Kọnịliọs na ndị ọzọ, nwee ohere ịbanye n’Alaeze Chineke.—Ọrụ Ndịozi 2:37, 38; 8:14-17; 10:44-48.

Ka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-akparịta ụka, ọ gwara ha na a ga-ata ya ahụhụ na Jeruselem ma mechaakwa gbuo ya. Ihe a ọ gwara ha nyere ha ezigbo nsogbu n’obi. Pita aghọtaghị na a ga-emecha kpọlite Jizọs n’ọnwụ, ya agaa eluigwe. N’ihi ya, ọ gwawara Jizọs, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.” Ma, Jizọs gbanyeere ya azụ, sị ya: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Matiu 16:22, 23.

Jizọs kpọziri ìgwè mmadụ ndị nọ ebe ahụ na ndịozi ya ma gwa ha na ọ gaghị adị mfe mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile. N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma ahụ ga-azọpụta ya.”—Mak 8:34, 35.

O doro anya na onye ọ bụla chọrọ ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs ga-enwe obi ike, dịkwa njikere ịhapụ ihe ụfọdụ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla ihere m na ihere okwu m na-eme n’ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emekwa mmehie, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịarute n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.” (Mak 8:38) N’eziokwu, mgbe Jizọs ga-abịa, “ọ ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka omume ya si dị.”—Matiu 16:27.