Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 50

A Zụrụ Ha Otú Ha Ga-enwe Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma Ọ Bụrụgodị na A Kpagbuwe Ha

A Zụrụ Ha Otú Ha Ga-enwe Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma Ọ Bụrụgodị na A Kpagbuwe Ha

MATIU 10:16–11:1 MAK 6:12, 13 LUK 9:6

  • JIZỌS NYERE NDỊOZI YA ỌZỤZỤ MA ZIPỤ HA

Mgbe Jizọs kechara ndịozi ya abụọ abụọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma, o nyere ha ezigbo ntụziaka gbasara otú ha ga-esi ekwusa ya. Ma nke ahụ abụghị naanị ihe o mere. Ọ dọrọ ha aka ná ntị banyere ndị mmegide. Ọ sịrị ha: “Lee! M na-eziga unu dị ka atụrụ n’etiti anụ ọhịa wolf . . . Lezienụ anya maka ụmụ mmadụ; n’ihi na ha ga-enyefe unu n’ụlọikpe obodo, ha ga-apịakwa unu ihe n’ụlọ nzukọ ha. N’ezie, a ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m.”—Matiu 10:16-18.

N’eziokwu, e nwere ike ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụzọ na-enweghị atụ. Ma, o kwere ha nkwa iji mesie ha obi ike. Ọ sịrị ha: “Mgbe ha na-enyefe unu, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu; n’ihi na a ga-enye unu ihe unu ga-ekwu n’oge awa ahụ; n’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.” O kwukwara, sị: “Nwanne ga-enyefekwa nwanne ya n’aka ọnwụ, nna ga-enyefekwa nwa ya, ụmụ ga-ebilikwa megide nne na nna ha, ha ga-emekwa ka e gbuo ha. Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m; ma onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 10:19-22.

Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwusie okwu ike na ọ dị mkpa ka ndị na-eso ụzọ ya na-akpa àgwà ka ndị maara ihe ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma a n’enweghị ihe ga-egbochi ha. Ọ sịrị: “Mgbe ha kpagburu unu n’otu obodo, gbalaganụ n’obodo ọzọ; n’ihi na n’ezie, ana m asị unu, Unu agaghị agazu obodo ndị dị n’Izrel ma ọlị ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.”—Matiu 10:23.

Ịdọ aka ná ntị, agbamume, na ntụziaka ndị a Jizọs nyere ndịozi iri na abụọ ya magburu onwe ha. Ma, anyị kwesịrị ịghọta na ihe ndị a Jizọs kwuru gbasakwara ndị niile ga-ekwusa ozi ọma mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gachara. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ ihe ahụ Jizọs kwuru na ‘mmadụ niile ga-akpọ’ ndị na-eso ụzọ ya asị, ya bụ, na ọ bụghị naanị ndị ahụ e zigara ndịozi Jizọs ka ha gaa zie ozi ọma ga-akpọ ha asị. Ihe ọzọkwa bụ na ọ dịghị mgbe anyị gụtara na n’obere oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara ozi ọma na Galili, na a kpụpụrụ ha n’ihu ndị gọvanọ na n’ihu ndị eze. Ọ dịghịkwa mgbe anyị gụtara na ndị ezinụlọ ha nyefere ha n’aka ndị ga-egbu ha.

O doro anya na ọ bụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ka Jizọs bu n’obi gwa ndịozi ya okwu ndị a. Otu ihe mere anyị ji mara bụ ihe ahụ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha agaghị agazu obodo niile ha kwesịrị ikwusa ozi ọma “ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.” Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị na-eso ụzọ ya agaghị ekwusacha ozi ọma banyere Alaeze Chineke tupu Eze ahụ dị ebube bụ́ Jizọs Kraịst abịarute dị ka onyeikpe Chineke.

O kwesịghị iju ndịozi Jizọs anya na a ga-emegide ha mgbe ha na-ekwusa ozi ọma, n’ihi na Jizọs sịrị: “Onye na-eso ụzọ mmadụ adịghị aka onye nkụzi ya, ohu adịghịkwa aka onyenwe ya.” Ihe Jizọs kwuru doro anya. E megidere Jizọs, kpagbuokwa ya n’ihi na ọ nọ na-ekwusa banyere Alaeze Chineke. Ọ bụkwa otú ahụ ka a ga-eme ndị na-eso ụzọ ya. Ma Jizọs gwara ha, sị: “Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi; kama na-atụnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.”—Matiu 10:24, 28.

Jizọs mere ihe anyị kwesịrị iṅomi. Ọ tachiri obi nwụọ n’atụghị egwu kama ọ ga-enupụrụ Jehova isi, bụ́ onye nwere ike niile. Ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ikike ibibi “mkpụrụ obi” mmadụ (ya bụ olileanya onye ahụ nwere ịdị ndụ ebighị ebi), ọ bụkwa ya nwere ike ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ ka ọ dị ndụ ebighị ebi. Ihe a mere ka obi sie ndịozi ahụ ike.

Jizọs mere otu ihe atụ iji gosi na Chineke ga-elekọta ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma. . . . Ya mere, unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29, 31.

Ozi ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwusa ga-ekewa ezinụlọ. Ụfọdụ ndị n’ezinụlọ ga-anabata ozi ha, ụfọdụ agaghịkwa anabata ya. Jizọs sịrị: “Unu echela na m bịara iweta udo n’elu ụwa.” N’eziokwu, tupu onye ndị ezinụlọ ya na-anaghị efe Jehova anabata eziokwu, ọ ga-enwerịrị obi ike. Jizọs sịkwara: “Onye hụrụ nna ya ma ọ bụ nne ya n’anya nke ukwuu karịa otú ọ hụrụ m ekwesịghị m, onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya nke ukwuu karịa otú ọ hụrụ m ekwesịghị m.”—Matiu 10:34, 37.

Ma, ụfọdụ ndị ga-anabata ndị na-eso ụzọ Jizọs nke ọma. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke nyere otu n’ime ndị a dị nta naanị otu iko mmiri jụrụ oyi ka ọ ṅụọ n’ihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, n’ezie, ana m asị unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”—Matiu 10:42.

Ịdọ aka ná ntị, agbamume, na ntụziaka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mere ka ha dị ezigbo njikere, nke mere ka ha “gazuo ókèala ahụ malite n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ezisa ozi ọma, na-agwọkwa ọrịa n’ebe niile.”—Luk 9:6.