Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 24

Jizọs Ezisakwuo Ozi Ọma na Galili

Jizọs Ezisakwuo Ozi Ọma na Galili

MATIU 4:23-25 MAK 1:35-39 LUK 4:42, 43

  • JIZỌS NA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA ANỌ EJEE OZI GBURUGBURU GALILI

  • ỌTỤTỤ NDỊ AMATA GBASARA OZI ỌMA Ọ NA-EKWUSA NA ỌRỤ EBUBE NDỊ Ọ NA-ARỤ

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọ ahụ ezughị ike ụbọchị ahụ ha nọ na Kapaniọm. Ná mgbede ya, ndị Kapaniọm kpọtaara ya ndị ahụ́ na-adịghị ka ọ gwọọ ha. Jizọs enweghị ohere mee ihe ndị ọzọ dị ya mkpa.

Ma, n’isi isi ụtụtụ echi ya, Jizọs biliri pụọ èzí naanị ya. Ọ chọtara ebe o nwere ike ịnọ naanị ya kpegara Nna ya ekpere. Ma Jizọs anọteghị aka ebe ahụ naanị ya. Mgbe “Saịmọn na ndị ya na ha so” chọpụtara na ọ nọghị ya, ha chọsiwere ya ike. O yiri ka ọ̀ bụ Pita butere ụzọ n’ihi na ọ bụ n’ụlọ ya ka Jizọs nọbu.—Mak 1:36; Luk 4:38.

Mgbe ha chọtara Jizọs, Pita sịrị ya: “Mmadụ niile na-achọgharị gị.” (Mak 1:37) O doro anya ihe mere ndị Kapaniọm achọghị ka Jizọs si n’obodo ha pụọ. Ihe ndị ọ na-eme tọgburu ha atọgbu. N’ihi ya, ha gbalịrị “igbochi ya ka ọ ghara isi n’ebe ha nọ pụọ.” (Luk 4:42) Ma, ihe bụ́ isi mere Jizọs ji bịa n’ụwa ọ̀ bụ ịna-agwọ ndị mmadụ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube? Ọ̀ bụkwa sọọsọ n’ebe a ka ọ ga-eje ozi ya? Gịnị ka o kwuru banyere nke a?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo nta ndị dị nso, ka m wee kwusaakwa ozi ọma n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.” Jizọs gwadịrị ndị ahụ chọrọ ka ọ nọgide ebe ahụ, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”—Mak 1:38; Luk 4:43.

N’eziokwu, ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ otu n’ime isi ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa. Alaeze ahụ ga-edo aha Nna ya nsọ, meekwa ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ niile ha na-ata. Jizọs gwọrọ ndị mmadụ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube iji gosi na ọ bụ Chineke zitere ya. Mozis mekwara ihe yiri nke ahụ ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa. Ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche iji gosi na ọ bụ Chineke zitere ya.—Ọpụpụ 4:1-9, 30, 31.

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọ ahụ hapụziri Kapaniọm gawa izi ozi ọma n’obodo ndị ọzọ. Ha anọ bụ Pita na nwanne ya nwoke bụ́ Andru, tinyere Jọn na nwanne ya nwoke bụ́ Jems. O ruola otu izu ugbu a Jizọs kpọrọ ha ka ha bụrụ ndị mbụ so ya na-ezisa ozi ọma.

Ozi ọma mbụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya zisara na Galili gara nnọọ nke ọma. Akụkọ gbasara Jizọs zuru ebe niile. “Akụkọ banyere ya gazuru Siria dum,” ruo n’ógbè ahụ dị obodo iri a na-akpọ Dikapọlis, ruokwa n’ofe Osimiri Jọdan. (Matiu 4:24, 25) Oké ìgwè mmadụ ndị si ebe ndị ahụ, nakwa ndị si Judia, sooro Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Ọtụtụ ndị kpọtaara ya ndị chọrọ ka a gwọọ ha ihe na-arịa ha. Jizọs mekwaara ha ihe ha chọrọ. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ndị ha ji.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Chọpụta otú Alaeze Chineke si ka ọchịchị ụmụ mmadụ mma.