Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 57

Jizọs Agwọọ Otu Nwata Nwaanyị na Nwoke Ntị Chiri

Jizọs Agwọọ Otu Nwata Nwaanyị na Nwoke Ntị Chiri

MATIU 15:21-31 MAK 7:24-37

  • JIZỌS AGWỌỌ NWA NWAANYỊ ONYE FINISHIA

  • JIZỌS AGWỌỌ NWOKE NTỊ CHIRI NKE NWEKWARA NSOGBU IKWU OKWU

Mgbe Jizọs katọchara ndị Farisii maka ọdịnala ndị ha na-edebe naanị maka abamuru ha, ya na ndị na-eso ụzọ ya gawara n’ógbè ndị dị gburugburu Taya na Saịdọn nke dị na Finishia.

Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jizọs chọtara ụlọ ọ ga-anọ na ya. Ọ chọghịkwa ka ndị mmadụ mata na ọ nọ ebe ahụ. Ma, ndị mmadụ matara. Otu nwaanyị onye Grik a mụrụ n’ebe ahụ chọtara Jizọs ma bido rịọwa ya arịrịọ, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid. Mmụọ ọjọọ ji nwa m nwaanyị aka ọjọọ.”—Matiu 15:22; Mak 7:26.

Obere oge, ndị na-eso ụzọ Jizọs gwawara Jizọs, sị: “Sị ya lawa; n’ihi na ọ na-ebe ákwá na-esogharị anyị.” Ma, Jizọs gwara ha ihe mere o ji gba nwaanyị ahụ nkịtị. Ọ gwara ha, sị: “E ziteghị m ijekwuru ndị ọ bụla ma ọ́ bụghị atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” Ma, nwaanyị ahụ akwụsịghị ịrịọ Jizọs arịrịọ. Ọ bịakwutere Jizọs ma daa n’ala na-arịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, nyere m aka!”—Matiu 15:23-25.

Jizọs gwaziri ya, sị: “O zighị ezi iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.” Ọ ga-abụ na Jizọs gwara ya ihe a iji lee ma ò nwere okwukwe. Ihe a ọ gwara ya gosikwara otú ndị Juu si eleda ndị na-abụghị ndị Juu anya. (Matiu 15:26) Ọkpụkpọ Jizọs kpọrọ ndị na-abụghị ndị Juu “ụmụ nkịta” gosiri na ọ na-emetara ha ebere. Ọ ga-abụkwa na otú ihu ya dị mgbe o kwuru ihe a na olu o ji kwuo ya gosiri na ọ na-emetara ha ebere.

Ma, ihe a Jizọs kwuru akpasughị nwaanyị ahụ iwe. Kama nke ahụ, o medara obi gwa Jizọs, sị: “Ee, Onyenwe anyị; ma n’ezie, ụmụ nkịta na-eri irighiri ihe na-esi na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.” Jizọs bịaziri chọpụta na nwaanyị ahụ bụ ezigbo mmadụ. Ọ gwaziri ya, sị: “Nwaanyị, i nwere okwukwe dị ukwuu; ya meere gị dị ka i si chọọ.” (Matiu 15:27, 28) N’agbanyeghị na nwa nwaanyị ahụ anọghị ebe ahụ, a gwọrọ ya. Mgbe nwaanyị ahụ laruru, ọ hụrụ nwa ya nwaanyị ka o dina n’elu ihe ndina. Ahụ́ adịla ya mma, “mmụọ ọjọọ ahụ apụwokwa.”—Mak 7:30.

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya sizi n’ógbè ndị ahụ dị na Finishia gawa ebe mgbago Osimiri Jọdan. Ọ ga-abụ na ha si n’ebe ugwu Osimiri Galili gafere Osimiri Jọdan, gawazie Dikapọlis. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha rịgooro n’elu ugwu. Ma, ìgwè mmadụ chọkwa ha bịa ebe ahụ. Ha kpọtaara Jizọs ndị ngwọrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, na ndị ogbi, Jizọs agwọọ ha. Otú Jizọs si gwọọ ndị ahụ juru ha anya, ha amalite ito Chineke Izrel.

O nwere otu nwoke ntị chiri nke nwekwara nsogbu ikwu okwu Jizọs kpọpụrụ iche gwọọ. Ìgwè mmadụ juru ebe ahụ nwere ike ime ka ahụ́ ghara iru nwoke a ala. Ọ ga-abụ na Jizọs chọpụtara na ahụ́ erughị ya ala, mere o ji kpọpụ ya iche ebe ndị mmadụ na-anọghị. Mgbe ya na naanị nwoke ahụ nọ, ọ rụnyere mkpịsị aka ya n’ime ntị abụọ nwoke ahụ, gbụpụ ọnụ mmiri, metụkwa ya aka n’ire. Jizọs leliziri anya n’eluigwe, sị: “Efata,” ya bụ, “Meghee.” Ozugbo ahụ, nwoke ahụ bidoro nụwa ihe, kwuwekwa okwu nke ọma. Jizọs achọghị ka ndị mmadụ mara gbasara ihe a o mere. Ọ chọghị ka ndị mmadụ jiri ihe a kọọrọ ha akọọrọ nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Kama, ọ chọrọ ka ọ bụrụ ihe ha ji anya ha hụ na ihe ha nụrụ n’onwe ha ga-eme ka ha nwee okwukwe.—Mak 7:32-36.

Ọrụ ndị a dị ebube Jizọs rụrụ metụrụ ndị mmadụ n’ahụ́ nke na “ọ nọ na-eju ha anya nke ukwuu.” Ha nọkwa na-asị: “O mewo ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ndị ntị chiri nụ ihe, na-emekwa ka ndị dara ogbi kwuo okwu.”—Mak 7:37.

GỤKWUO GBASARA YA

Ọ Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

Gịnị ka otú Jizọs si rụọ ọrụ ebube na-egosi banyere ụdị obi o nwere?