Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 28

Gịnị Mere Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ebughị Ọnụ?

Gịnị Mere Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ebughị Ọnụ?

MATIU 9:14-17 MAK 2:18-22 LUK 5:33-39

  • NDỊ NA-ESO ỤZỌ JỌN AJỤỌ JIZỌS AJỤJỤ GBASARA IBU ỌNỤ

Kemgbe ahụ a tụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim mkpọrọ obere oge ka Jizọs gachara Ememme Ngabiga nke afọ 30, ọ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ. Jọn chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma, ọ bụghị ha niile mere otú ahụ ozugbo a tụrụ ya mkpọrọ.

Ugbu a, ka Ememme Ngabiga nke afọ 31 na-eru nso, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jọn bịakwutere Jizọs jụọ ya, sị: “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?” (Matiu 9:14) Ndị Farisii na-ebu ọnụ n’ihi na o so n’ihe a chọrọ ka onye na-ekpe okpukpe ha na-eme. O nwedịrị mgbe Jizọs mere otu ihe atụ ebe otu onye Farisii bụ́ onye ezi omume n’anya onwe ya nọ na-ekpegara Chineke ekpere. Ọ sịrị: “Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ . . . Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu.” (Luk 18:11, 12) Ọ ga-abụkwa na ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ n’ihi na ọ bụ omenala ndị Juu. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-ebu ọnụ n’ihi na obi adịghị ha mma maka mkpọrọ a tụrụ Jọn. Ndị ọzọ nọ ya mgbe ha bịara nọkwa na-eche ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs anaghị ebu ọnụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ha emee ya iji gosi na ihe e mere Jọn na-ewute ha.

Jizọs meere ha ihe atụ iji zaa ha ihe ha jụrụ. Ọ sịrị ha: “Ndị enyi nke nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ enweghị ihe mere ha ga-eji ruo uju mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ, ka hà nwere? Ma ụbọchị na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ n’ebe ha nọ, ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.”—Matiu 9:15.

E nwere mgbe Jọn n’onwe ya kpọrọ Jizọs nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. (Jọn 3:28, 29) N’ihi ya, ebe Jizọs ka nọ ya, ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghị ibuwe ọnụ. Ma, mgbe Jizọs ga-anwụ, ndị na-eso ụzọ ya ga na-eru uju, nri agaghịkwa ekwe ha oriri. Mana, nke ahụ ga-agbanwe ma a kpọlite ya n’ọnwụ. Mgbe ahụ, o nweghịzi ihe ga-eme ka ha na-ebu ọnụ ka ndị na-eru uju.

Jizọs mekwaara ha ihe atụ abụọ ọzọ. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye na-adụnye ibé ákwà ọhụrụ n’uwe elu mere ochie; n’ihi na ike ya dum ga-eme ka uwe elu ahụ dọkaa, ọ ga-adọwa wee ka njọ. Ndị mmadụ adịghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya mere ochie; ma ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, karama akpụkpọ mmanya ahụ na-agbawa, mmanya ahụ na-awụfukwa, karama akpụkpọ mmanya ahụ ebibiekwa. Kama ndị mmadụ na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ.” (Matiu 9:16, 17) Olee ihe Jizọs na-ekwu ebe a?

Jizọs nọ na-agbalị ime ka ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim ghọta na o nweghị onye kwesịrị ịtụ anya ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme omenala ochie nke okpukpe ndị Juu, nke ibu ọnụ so na ya. Ọ bịaghị imezi okpukpe merela ochie e kwesịrịla ịhapụ. Ụdị okpukperechi Jizọs na-akwado abụghị ụdị nke ndị Juu e nwere n’oge ya, bụ́ nke hiwere isi n’omenala ụmụ mmadụ chepụtara. Mba, ọ bịaghị iji ibé ákwà ọhụrụ dụchie uwe merela ochie, ma ọ bụkwanụ ịgbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya merela ochie.