Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ANỌ

“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”

“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”

1, 2. (a) Kọwaa otú Rut na Neomi si jiri mwute laa Betlehem. (b) Olee otú njem Rut si dịrị iche na nke Neomi?

RUT na Neomi nọ na-aga n’okporo ụzọ dị n’ọzara Moab. Ọ bụzi naanị ha abụọ ka a na-ahụ n’ọzara ahụ niile. Ugbu a chi ejiwela. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Rut lere Neomi anya ma na-eche n’obi ya na oge eruola ka ha chọta ebe ha ga-ehi ụra. Ọ hụrụ Neomi n’anya nke ukwuu, ọ ga-emekwa ihe ọ bụla o nwere ike ime iji lekọta ya.

2 Ụmụ nwaanyị abụọ a na-eru uju. Ọ dịla anya di Neomi nwụrụ, ma ugbu a ọ na-eru uju ọnwụ ụmụ ya abụọ bụ́ Kilịọn na Malọn. Rut na-erukwa uju ọnwụ di ya bụ́ Malọn. Rut na Neomi na-aga otu ebe, ha na-aga obodo Betlehem nke dị n’Izrel. Ọ bụ eziokwu na ha abụọ na-aga otu ebe, ma Neomi na-alaghachi n’obodo ya, ebe Rut na-aga ebe ọ na-amaghị. Rut ahapụla ndị ikwu ya, obodo ya, omenala ha, hapụkwa chi ndị a na-efe n’obodo ya.—Gụọ Rut 1:3-6.

3. Olee ajụjụ ndị ọ ga-abụ anyị mata azịza ha ha enyere anyị aka iṅomi okwukwe Rut?

3 Gịnị mere nwa agbọghọ a ji hapụ obodo ya ma gawa ebe ọ na-amaghị? Olee otú Rut ga-esi nwee ike ibi n’ebe a ọ na-aga ma lekọta Neomi? Ka anyị na-aza ajụjụ ndị a, anyị ga-ahụ na e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka Rut, bụ́ nwaanyị Moab. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Obere Akwụkwọ nke Mara Ezigbo Mma.”) Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe mere ụmụ nwaanyị abụọ a ji si Moab na-ala Betlehem.

Ezinụlọ Ọnwụ Kpara Aka Ọjọọ

4, 5. (a) Gịnị mere ezinụlọ Neomi ji gaa biri na Moab? (b) Gịnị bụ nsogbu ndị Neomi nwere n’ebe ahụ?

4 Rut toro na Moab. Moab bụ obere mba dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ala ya dị larịị, e nwekwara ọtụtụ ndagwurugwu na ya, ma e nweghị ọtụtụ osisi na ya. ‘Ala Moab’ na-eme nri nke ọma. O mekwara nri nke ọma n’oge ụnwụ  dara n’ala Izrel. Ọ bụ ụnwụ ahụ dara n’ala Izrel mere ka Rut mata Malọn.—Rut 1:1.

5 Mgbe ụnwụ ahụ dara n’ala Izrel, Elimelek, bụ́ di Neomi, kpọọrọ nwunye ya na ụmụ ya nwoke abụọ gaa biri na Moab. Ọ ga-abụ na ebe a ha bizi mere ka o siere ha ike ịga na-efe Jehova n’ebe dị nsọ Jehova kwuru ka ndị Izrel niile na-abịa efe ya. (Diut. 16:16, 17) Neomi jisiri ike na-efe Jehova n’obodo Moab. N’agbanyeghị na ọ na-efe Jehova, ọnwụ di ya gbawara ya obi.—Rut 1:2, 3.

6, 7. (a) Gịnị mere o ji bụrụ na o nwere ike ịna-ewute Neomi na ụmụ ya lụrụ ụmụ nwaanyị Moab? (b) Gịnị mere Neomi ji na-akpaso ndị nwunye ụmụ ya àgwà ọma?

6 Ọ ga-abụkwa na obi gbawara Neomi mgbe ụmụ ya nwoke abụọ lụrụ ụmụ nwaanyị Moab. (Rut 1:4) Neomi maara na nna nna ndị Izrel bụ́ Ebreham gbara ezigbo mbọ gaa lụtara Aịzik nwaanyị n’ezinụlọ nna ya bụ́ ndị na-efe Jehova. (Jen. 24:3, 4) Jehova mechara nye ndị Izrel iwu ka ha ghara ikwe ka ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwaanyị lụọ ndị mba ọzọ, ka ndị ahụ ghara ime ka ha fewe arụsị.—Diut. 7:3, 4.

7 N’agbanyeghị iwu ahụ e nyere ndị Izrel, Malọn na Kilịọn lụrụ ụmụ nwaanyị Moab. Ọ bụrụgodị na o wutere Neomi na ha lụrụ ndị Moab, o doro anya na Neomi hụrụ Rut na Ọpa, bụ́ ndị nwunye ụmụ ya, n’anya ma na-akpaso ha àgwà ọma. O nwere ike ịbụ na ọ na-atụ anya na otu ụbọchị, ha ga-eso ya fewe Jehova. Ma otu ihe doro anya bụ na Rut na Ọpa ejighị Neomi egwuri egwu. Otú a ha si hụ ibe ha n’anya nyeere ha aka mgbe ọnwụ kpara ezinụlọ ha aka ọjọọ. Di Rut na di Ọpa nwụrụ mgbe ha na-amụtabeghị nwa.—Rut 1:5.

8. Ọ̀ ga-abụ gịnị mere Rut ji nwewe mmasị ife Jehova?

8 Chi ndị Moab hà kasiri Rut obi mgbe di ya nwụrụ? O doro anya na ha akasighị ya obi. Ndị Moab na-efe ọtụtụ chi, nke kacha n’ime ha bụ Kimọsh. (Ọnụ Ọgụ. 21:29) O yiri ka ndị Moab hà na-emekwa ihe ọjọọ dị iche iche ndị ọzọ na-efe chi ụgha n’oge ahụ na-eme, dị ka iji ụmụaka achụ àjà. O doro anya na ihe Malọn ma ọ bụ Neomi kọọrọ Rut banyere Jehova bụ́ Chineke Izrel mere ka Rut ghọta na Jehova dị iche na chi ndị a na-efe n’obodo ya. Ọ mụtara na Jehova hụrụ ndị ya n’anya ma na-eme ebere. Obi ataghị Jehova mmiri otú ọ tara chi ndị ahụ. (Gụọ Diuterọnọmi 6:5.) Mgbe di Rut nwụrụ, o yiri ka ya na Neomi ọ̀ dịwakwuru ná mma, ya ana-egekwa ntị mgbe Neomi na-akọrọ ya banyere Jehova bụ́ Chineke pụrụ ime ihe niile, banyere ọrụ ebube niile Chineke rụrụ, nakwa otú o si hụ ndị ya n’anya ma na-emere ha ebere.

Rut ahapụghị Neomi n’oge niile ha na-eru uju

9-11. (a) Gịnị ka Neomi, Rut, na Ọpa kpebiri ime? (b) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ọdachi ahụ dakwasịrị Neomi, Rut, na Ọpa?

 9 Ka ihe a niile na-eme, ọ na-agụ Neomi agụụ ịnụ otú ihe si kwụrụ n’obodo ya. Otu ụbọchị, ozi ruru ya ntị. O nwere ike ịbụ na otu onye ahịa nke si Izrel bịa kọọrọ ya na ụnwụ adịkwaghị n’ala Izrel. Jehova enyewerela ndị ya aka. Nri ejukwala na Betlehem otú ọ na-adịbu. Betlehem aghọọkwala ihe aha ya pụtara nke bụ́ “Ụlọ Nri.” Neomi kpebiri na ya ga-alaghachi n’obodo ya.—Rut 1:6.

10 Gịnị ka Rut na Ọpa ga-eme? (Rut 1:7) Ha na Neomi bụ nnu na mmanụ kemgbe ahụ ọnwụ kpara ha aka ọjọọ. O yiri ka ọ̀ bụ Rut kacha hụ Neomi n’anya n’ihi otú Neomi si na-akpaso ha àgwà ọma ma nwee okwukwe na Jehova. Ụmụ nwaanyị atọ a gawara Juda.

11 Ihe e dere n’akwụkwọ Rut na-eme ka anyị ghọta na ọdachi na-adakwasị ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. (Ekli. 9:2, 11) Ọ na-akụzikwara anyị na mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ ma ọ bụ mgbe nnukwu ọdachi ọzọ dakwasịrị anyị, anyị kwesịrị ịgakwuru ndị ọzọ ka ha kasie anyị obi. Ndị anyị kwesịrị ịgakwuru, karịchaa, bụ ndị na-efe Jehova, bụ́ Chineke ahụ Neomi fere.—Ilu 17:17.

Ịhụnanya Na-adịgide Adịgide Rut Nwere

12, 13. Gịnị mere Neomi ji gwa Rut na Ọpa ka ha laghachi n’ụlọ ndị mụrụ ha kama iso ya laa Betlehem, gịnịkwa ka ụmụ nwaanyị abụọ ahụ mere?

12 Mgbe ụmụ nwaanyị atọ ahụ gaterela aka, o nwere ihe malitere inye Neomi nsogbu n’obi. O chewere banyere ụmụ nwaanyị abụọ a ya na ha so na otú ha si hụ ya na ụmụ ya ndị nwoke nwụrụ anwụ n’anya. Ọ chọghị ihe ọ bụla ga-eme ka ha bịa tawakwa ahụhụ n’elu nke ha tarala ata. Ọ bụrụ na ha ahapụ obodo ha soro ya laa Betlehem, olee ihe ọ ga-emere ha n’ebe ahụ?

13 Neomi gwaziri ha, sị: “Lawanụ, laghachinụ, onye nke ọ bụla n’ụlọ nne ya. Ka Jehova gosi unu obiọma, dị nnọọ ka unu gosiri ya ndị ikom ahụ nwụrụ anwụ nakwa mụ onwe m.” O kwukwara na ya nwere olileanya na Jehova ga-agọzi ha, mee ka ha nweta di, meekwa ka ihe dịrị ha ná mma. Akwụkwọ Rut kwuru, sị: “O wee susuo ha ọnụ, ha wee malite ịkwa ákwá n’olu dara ụda.” Ị̀ hụrụ ihe mere Rut na Ọpa ji hụ Neomi n’anya? Ọ bụ nwaanyị obiọma, nke  na-anaghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru. Ma, ha abụọ nọgidere na-asị ya: “Ee e, anyị ga-eso gị laghachikwuru ndị gị.”—Rut 1:8-10.

14, 15. (a) Olee ndị Ọpa lakwuuru? (b) Olee ihe Neomi kwuru iji mee ka Rut hapụ ya?

14 Ma ihe a ha na-ekwu emeghị ka Neomi gbanwee obi ya. Ọ gwara ha hoo haa na o nweghị ezigbo ihe ya ga-emere ha ma ha soro ya laa n’ihi na ya enwekwaghị di ga-elekọta ya ma ọ bụ ụmụ ga-alụ ha, nakwa na ya enweghị olileanya ịlụ di ma ọ bụ ịmụta nwa. O kwuru na ọ na-ewute ya nke ukwuu na ya agaghị enyeliri ha aka. Ọpa ghọtara ozugbo na ihe a Neomi na-ekwu bụ eziokwu. Nne ya na ndị ezinụlọ ha ndị ọzọ bi na Moab, o nwekwara ebe ọ ga-ebi n’ebe ahụ. O chere na ọ ga-akara ya mma ịnọrọwa na Moab. N’ihi ya, o ji anya mmiri susuo Neomi ọnụ ma lawa.—Rut 1:11-14.

15 Oleekwanụ maka Rut? Ihe ahụ Neomi kwuru gbasakwara ya. Ma Baịbụl kwuru, sị: “Rut rapaara ya n’ahụ́.” O nwere ike ịbụ na Neomi hapụrụ ụmụ nwaanyị ahụ gawa. Ma mgbe ọ gatụrụ, ọ chọpụtara na Rut ka na-eso ya. Neomi gwara Rut, sị: “Lee! Nwunye nwanne di gị nke di ya nwụrụ alakwuruwo ndị ya na chi ya. Soro nwunye nwanne di gị lawa.” (Rut 1:15) Ihe a Neomi kwuru mere ka anyị ghọtakwuo otu ihe dị mkpa n’akụkọ a. Ọ bụghị naanị na Ọpa lakwuuru ndị ya, ọ lakwukwaara “chi ya.” Ọ dị ya mma ịga fewe Kimọsh na chi ụgha ndị ọzọ. Oleekwanụ maka Rut?

16-18. (a) Olee otú Rut si gosi na ya hụrụ Neomi n’anya? (b) Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Rut banyere ịhụnanya na-adịgide adịgide? (Lee foto ụmụ nwaanyị abụọ ahụ.)

16 Ka Rut na Neomi nọ na-ele ibe ha anya n’okporo ụzọ ahụ, ihe Rut chọrọ ime doro ya anya. Ọ hụrụ Neomi n’anya, hụkwa  Chineke ahụ Neomi na-efe n’anya. N’ihi ya, Rut gwara Neomi, sị: “Arịọla m ka m hapụ gị, ka m kwụsị iso gị; n’ihi na ebe ị gara ka m ga-aga, ebe ị ga-arahụ ka m ga-arahụ. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m. Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Jehova mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.”—Rut 1:16, 17.

“Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m”

17 Ihe a Rut kwuru magburu onwe ya. A ka na-echeta ya n’agbanyeghị na o ruola ihe dị ka puku afọ atọ o kwuru ya. Ihe a o kwuru gosiri na ịhụnanya ya bụ nke ezigbo ya, ọ bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide. Rut hụrụ Neomi n’anya nke ukwuu nke na o kpebiri iso Neomi gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Ọ bụ naanị ọnwụ nwere ike ikewa ha. Ebe ọ bụ na Rut ekpebiela ịhapụ Moab bụ́ obodo ya, hapụkwa chi ndị obodo ya, ndị obodo Neomi ga-abụzi ndị obodo ya. Rut emeghị ka Ọpa, kama o ji obi ya niile kwuo na ya chọrọ ka Jehova, bụ́ Chineke ahụ Neomi na-efe, bụrụ Chineke ya. *

18 N’ihi ya, ha abụọ sooro gawa Betlehem. Otu akwụkwọ kwuru na o nwere ike ịbụ na o were ha ihe dị ka otu izu tupu ha eruo. Ma, o doro anya na mgbe ha na-aga, onye nke ọ bụla kasiri ibe ya obi.

19. Olee otú i chere anyị nwere ike isi nwee ụdị ịhụnanya ahụ Rut nwere n’ezinụlọ anyị nakwa n’ọgbakọ, oleekwa otú ndị enyi nwere ike isi nwee ya?

19 E nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ndị mmadụ na-eru uju n’ụwa a. N’oge anyị a nke Baịbụl kpọrọ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ,” e nwere ọtụtụ nsogbu na-abịara anyị, ndị anyị hụrụ n’anya na-anwụkwa. (2 Tim. 3:1) N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị nwee ụdị ịhụnanya ahụ Rut nwere nke bụ́ ịhụnanya na-adịgide adịgide. Ọ bụ ya ga-eme ka anyị ghara ịgbakụta ndị anyị hụrụ n’anya azụ, ihe ọ sọkwara ya ya mee. Ọ dị mkpa ka ndị bụ́ di na nwunye nwee ụdị ịhụnanya a. Ọ dịkwa mkpa n’ezinụlọ. Ndị enyi kwesịrị inwe ya, e kwesịkwara inwe ya n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Gụọ 1 Jọn 4:7, 8, 20.) Ọ bụrụ na anyị amụta ịhụ ndị ọzọ n’anya otú a, anyị na-eme ka Rut.

Rut na Neomi Eruo Betlehem

20-22. (a) Olee otú Neomi dị mgbe o si Moab lọta? (b) Olee onye Neomi chere kpataara ya ahụhụ niile ọ tara, oleekwa ihe mere o ji bụrụ na ihe ahụ o chere abụghị eziokwu? (Gụọ Jems 1:13.)

20 Mmadụ ikwu n’ọnụ na ya hụrụ ndị ọzọ n’anya abụghị ebe  okwu biri. Ihe dị mkpa bụ onye ahụ ime ihe gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụ ugbu a ka Rut ga-egosi n’eziokwu na ya hụrụ Neomi n’anya, hụkwa Jehova n’anya bụ́ Chineke ahụ o kpebiri ife.

21 Ụmụ nwaanyị abụọ ahụ mechara rute Betlehem. Betlehem dị ihe dị ka kilomita iri ma e si n’ebe ndịda Jeruselem gawa ya. O yiri ka à ma Neomi na ezinụlọ ya ama n’obere obodo ahụ n’ihi na ozugbo Neomi rutere, akụkọ gazuru obodo ahụ niile na ọ lọtala. Ụmụ nwaanyị obodo ahụ lere ya anya, jụọ, sị, “Onye a ọ̀ bụ Neomi?” Ọ ga-abụ na ahụhụ niile Neomi tara na Moab emeela ka ọ ghara ịdịkwa otú ọ dịbu; otú ihu ya na ahụ́ ya dịzi gosiri na ọ taala ezigbo ahụhụ, ruokwa uju.—Rut 1:19.

22 Neomi kọọrọ ụmụ nwaanyị ndị ahụ na ndị agbata obi ya ụwa ya. Ọ gwadịrị ha ka ha ghara ịkpọzi ya Neomi, nke pụtara “Ihe Obi Ụtọ M,” kama ka ha kpọwazie ya Mera nke pụtara “Ihe Ilu.” N’eziokwu, Neomi atagbuola onwe ya n’ahụhụ. O chedịrị na ọ bụ Jehova Chineke kpataara ya ahụhụ niile ahụ ọ tara, otú Job chekwara.—Rut 1:20, 21; Job 2:10; 13:24-26.

23. Olee ihe Rut malitere iche, oleekwa ihe iwu Jehova nyere ndị Izrel kwuru banyere ndị ogbenye? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

23 Mgbe Rut na Neomi biwere na Betlehem, Rut malitere iche ihe ọ ga na-arụ ka o nwee ike ịkpa afọ ya na Neomi. Ọ nụrụ na n’iwu Jehova nyere ndị ya bụ́ Izrel, e nwere nke kwuru otú a ga-esi na-enyere ndị ogbenye aka. Iwu ahụ kwuru na ndị ogbenye nwere ike ịga n’ubi mmadụ n’oge a na-ewe ihe ubi soro ndị na-ewe ihe ubi n’azụ na-atụtụkọrọ ihe ha wefọrọ n’ubi nakwa ndị nke dị n’ọnụ ọnụ ubi ha. *Lev. 19:9, 10; Diut. 24:19-21.

24, 25. Gịnị ka Rut mere mgbe o rutere n’ubi Boaz, oleekwa otú ọrụ iwere ọka e wefọrọ ewefọ na-adị?

24 Oge ahụ bụ oge e ji ewe ọka bali n’ubi. O nwere ike ịbụ n’ọnwa Eprel na kalenda oge anyị a. Rut gaziri ka ọ mara ma ò nwere onye  ga-ekwe ya were ọka e wefọrọ n’ubi ya. Ọ dabara na ọ bụ n’ubi Boaz ka Rut banyere. Boaz bụ nwoke bara ọgaranya, nweekwa ala, ọ bụkwa onye ikwu Elimelek, bụ́ di Neomi. Ọ bụ eziokwu na iwu ahụ kwuru na ndị ogbenye nwere ike ịbanye n’ubi ọ bụla were ọka e wefọrọ ewefọ, Rut abanyeghị n’ubi Boaz n’ajụghị ase. O bu ụzọ rịọ nwa okorobịa na-elekọta ndị na-aghọrọ Boaz ọka ma ọ̀ ga-ekwe ya were ọka e wefọrọ ewefọ. Nwa okorobịa ahụ kwetara, Rut amalitezie iwere ọka.—Rut 1:22–2:3, 7.

25 Weregodị ya na ị na-ahụ Rut ka ọ na-eso ndị ahụ na-ewe ihe ubi n’azụ. Ha jiri mma na-achabi ọka bali, ya ana-atụtụkọta ndị nke dapụrụ n’ala ma ọ bụ ndị nke ha hapụrụ. Ya na-atụtụ, ya ana-eke ha n’ùkwù n’ùkwù, e mechazie ya eburu ha gaa n’ebe ọ ga-etichapụta mkpụrụ ha. Ọrụ a ọ na-arụ adịghị mfe. Ọ na-akacha esi ike ma anwụ chawa. N’agbanyeghị ihe ndị a, ike agwụghị Rut. Naanị mgbe ọ kwụsịtụrụ bụ oge o hichara ọsụsọ na-agba ya n’ihu na mgbe ọ gara rie nri ehihie n’ebe ndị ọrụ na-anọ ezurutụ ike.

Rut rụrụ ọrụ ndị mmadụ na-eleda anya ka o nwee ike ịkpa afọ ya na Neomi

26, 27. Olee ụdị onye Boaz bụ, oleekwa otú o si kpaso Rut àgwà?

26 Mgbe Rut na-arụ ọrụ a, ọ tụghị anya na o nwere onye ga-elewe ya anya. Ma, o nwere onye nọ na-ele ya. Boaz hụrụ Rut ma jụọ nwa okorobịa ahụ na-elekọta ndị ọrụ ya onye Rut bụ. Boaz bụ nwoke nwere okwukwe na Chineke. Mgbe o rutere n’ebe ndị ọrụ ya nọ, o kelere ha niile, ma ndị nke na-abụghị ndị Izrel. Otú o si kelee ha bụ: “Ka Jehova nọnyere unu.” Ha azaa ya, sị: “Ka Jehova gọzie gị.” Nwoke a katarala ahụ́, nke hụrụ Jehova n’anya, bịara nwee mmasị n’ebe Rut nọ otú nna si enwe mmasị n’ebe nwa ya nọ.—Rut 2:4-7.

 27 Boaz kpọrọ Rut “nwa m” mgbe ọ na-agwa ya okwu. Ọ gwara ya ka ọ na-abịa n’ubi ya na-atụtụkọta ọka nakwa ka ọ na-eso ụmụ agbọghọ ndị na-arụrụ ya ọrụ ka a ghara inwe nwa okorobịa na-arụrụ ya ọrụ nke ga-enye ya nsogbu. Boaz nyekwara ya nri ehihie. (Gụọ Rut 2:8, 9, 14.) Ma nke kachanụ bụ na ọ jara ya mma ma gbaa ya ume. Olee otú o si mee ya?

28, 29. (a) Olee ụdị akụkọ a na-akọ banyere Rut? (b) Olee otú i nwere ike isi gbaba n’okpuru nku Jehova otú Rut mere?

28 Mgbe Rut jụrụ Boaz ihe mere o ji meso ya omume ọma otú a n’agbanyeghị na ya abụghị onye Izrel, Boaz gwara ya na ya nụrụ ihe niile o meere nne di ya bụ́ Neomi. O nwere ike ịbụ na Neomi akọọrọla ụmụ nwaanyị Betlehem akụkọ ọma banyere Rut, akụkọ ahụ efeba Boaz ntị. Boaz makwaara na Rut amalitela ife Jehova n’ihi na Boaz kwuru, sị: “Ka Jehova kwụọ gị ụgwọ dị ka omume gị si dị, ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye ị gbabaworo n’okpuru nku ya, nye gị ụgwọ ọrụ zuru okè.”—Rut 2:12.

29 O doro anya na okwu ndị ahụ Boaz gwara Rut gbara Rut ume. N’eziokwu, Rut gbabara n’okpuru nku Jehova Chineke otú nwa ọkụkọ si agbaba n’okpuru nku nne ya. Rut kelere Boaz maka ịgwa ya okwu gbara ya ume. Rut maliteghachikwara ọrụ ya, rụgide ya ruo mgbede.—Rut 2:13, 17.

30, 31. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Rut banyere ịrụsi ọrụ ike, ikele ndị meere anyị ihe ọma, na inwe ịhụnanya na-adịgide adịgide?

30 E nwere ọtụtụ ihe anyị niile ndị ihe na-esiri ike n’oge a ga-amụta n’ụdị okwukwe Rut nwere. Rut echeghị na ọ bụ ndị ọzọ kwesịrị ịkpa afọ ya, n’ihi ya, mgbe ọ bụla mmadụ nyeere ya aka, ọ na-ekele onye ahụ. Ihere emeghị ya ịrụsi ọrụ ike ka o nwee ike inweta ihe ọ ga-eji lekọta Neomi, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya, n’agbanyeghị na ọrụ ahụ bụ ọrụ ndị mmadụ na-eleda anya. Mgbe a gwara ya otú ọ ga-esi rụọ ọrụ na ndị ọ ga-eso na-arụ ọrụ, o mere ihe a gwara ya. Nke ka nke bụ na o chefughị na ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ Nna ya, bụ onye na-enyere ya aka.

31 Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị ọzọ n’anya otú Rut hụrụ Neomi, dị umeala n’obi ma na-arụsi ọrụ ike, ọ bụrụkwa na anyị egosi na obi dị anyị ụtọ na anyị amatala Jehova, okwukwe anyị ga-abụkwa nke e ji ama atụ. Ọ ga-abakwara ndị ọzọ uru. Ma, olee otú Jehova si gbooro Rut na Neomi mkpa ha? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 17 Ị̀ hụrụ na ihe Rut kpọrọ Chineke abụghị naanị “Chineke” otú ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel na-eme? Ọ kpọkwara ya aha ya bụ́ Jehova. Akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible kwuru, sị: “Onye dere akwụkwọ Rut si otú a gosi na nwaanyị a na-abụghị onye Izrel na-efe ezi Chineke.”

^ para. 23 Iwu a e nyere ụmụ Izrel magburu onwe ya. E nweghị ụdị ya n’obodo Rut hà. Ná mba ndị gbara Izrel gburugburu n’oge ahụ, a na-emesikarị ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ike. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na di nwaanyị anwụọ, ọ bụzi ụmụ ya ga na-elekọta ya; ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa, ihe o nwere ike ime bụ ịgbawara ndị ọzọ ohu, ịgbawa akwụna ma ọ bụkwanụ ịga nwụfuo.”

[Foto dị na peeji nke 36, 37]

“Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m”