Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ISE

“Ezigbo Nwaanyị”

“Ezigbo Nwaanyị”

1, 2. (a) Olee ụdị ọrụ Rut rụrụ mgbe ha lọtara? (b) Olee iwu Chineke nyere ụmụ Izrel nke Rut nụrụ akụkọ ya, oleekwa ihe ọ hụrụ ndị Izrel na-eme?

RUT gbusara ikpere n’ala n’ebe ọ chịsara okporo ọka bali ndị ọ tụtụkọtara n’ụbọchị ahụ. Chi ejiwela na Betlehem, ọtụtụ ndị ọrụ alawakwala. Ọtụtụ n’ime ha eruwela n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem. O doro anya na ahụ́ agwụla Rut n’ihi na ọ nọ na-arụ ọrụ kemgbe ụtụtụ. N’agbanyeghị ya, ọ ka na-arụ ọrụ. O ji obere osisi na-eticha okporo ọka ndị ahụ ka mkpụrụ ha dapụtasịa. Ọ bụ eziokwu na ọrụ a adịghị mfe, ọka ọ tụtụkọtara taa buru ibu karịa otú ọ tụrụ anya ya.

2 Ọ̀ ga-abụ na ihe adịwarala nwaanyị a di ya nwụrụ mma? Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, o so nne di ya bụ́ Neomi lọta n’obodo a, o kpebisikwara ike na o nweghị ihe ga-eme ka ya hapụ nne di ya nakwa Jehova, bụ́ Chineke ya na Neomi. Ụmụ nwaanyị abụọ a na-eru uju si n’obodo Rut bụ́ Moab lọta Betlehem. Obere oge ha lọtara, Rut nụrụ na iwu Jehova nyere ụmụ Izrel kwuru otú a ga-esi na-enyere ndị ogbenye na ndị mbịarambịa bi n’Izrel aka. Ugbu a, ọ hụkwala na ụfọdụ ndị Izrel na-akpa àgwà ọma ma na-enyere ndị ọzọ aka. Nke a gosiri na ha ma iwu Chineke ma na-erubere Chineke isi. Ihe ndị a mere ka obi ruo Rut ala.

3, 4. (a) Olee otú Boaz si gbaa Rut ume? (b) Olee otú ihe Rut mere nwere ike isi nyere anyị aka n’oge a ihe siri ike?

3 Otu onye n’ime ndị ahụ na-enyere ndị ọzọ aka bụ otu nwoke bara ọgaranya nke aha ya bụ Boaz. Ọ bụ n’ubi ya ka Rut tụtụrụ ọka taa. Boaz hụkwara ya. Rut mụmụrụ ọnụ ọchị mgbe o chetara otú Boaz si gwa ya okwu. Boaz jara ya mma maka otú o si na-elekọta nne di ya bụ́ agadi nwaanyị nakwa otú o si kpebie ife ezi Chineke bụ́ Jehova.—Gụọ Rut 2:11-14.

4 Ma o nwere ike ịbụ na Rut ka na-eche otú ụwa ga-emecha dịrị ya n’obodo a. Ebe ọ na-abụghị onye obodo a, o nwekwanụghị di ma ọ bụkwanụ nwa, ọ̀ ga na-akpa afọ ya na Neomi ruo ole mgbe? Ọ̀ bụ naanị ịtụtụ ọka ka ọ ga-eji na-akpa afọ ya na Neomi? Ònye ga-elekọtakwanụ yanwa ma ọ kaa nká? O doro anya na ihe ndị a ọ na-eche na-enye ya nsogbu n’obi. Ihe ndị ahụ Rut nọ na-eche na-echegbukwa  ọtụtụ ndị n’oge a ihe siri ezigbo ike. Ma anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka Rut ma ọ bụrụ na anyị eleba anya n’otú okwukwe Rut si nyere ya aka imeri nsogbu ndị o nwere.

Gịnị Bụ Ezinụlọ?

5, 6. (a) Olee otú ihe si gaara Rut n’ụbọchị mbụ ahụ ọ gara tụtụọ ọka n’ubi Boaz? (b) Olee ihe Neomi kwuru mgbe ọ hụrụ Rut?

5 Mgbe Rut tichasịrị ọka ndị ahụ ma chịkọta ha, ọ chọpụtara na ọka o nwetara ga-eju ihe dị ka otu obere bezin. O nwere ike ịdị ihe dị ka kilogram iri na anọ n’ịdị arọ. Ọ ga-abụ na o ji ákwà kechie ọka ahụ ma buru ya n’isi lawa Betlehem. N’oge ahụ, chi ejiwela.—Rut 2:17.

6 Obi tọrọ Neomi ụtọ mgbe ọ hụrụ Rut bụ́ nwunye nwa ya ọ hụrụ n’anya. O nwere ike ịbụ na o juru ya anya mgbe ọ hụrụ nnukwu ọka bali Rut bu lọta. Rut welatakwara ihe o rifọrọ ná nri Boaz nyere ndị ọrụ ya. Rut na Neomi rikwara ya. Neomi jụrụ ya, sị: “Olee ebe ị gara tụtụkọta ihe taa, oleekwa ebe ị rụrụ ọrụ? Ka onye anya ya ruru n’ebe ị nọ bụrụ onye a gọziri agọzi.” (Rut 2:19) Anya ruru Neomi ala. Nnukwu ọka ahụ Rut bu lọta gosiri ya na o nwere onye nyeere Rut aka.

7, 8. (a) Ònye ka Neomi ghọtara na ọ bụ ya mere ka Boaz meere ha ihe ọma, gịnịkwa mere o ji chee otú ahụ? (b) Olee otú ọzọ Rut si gosi Neomi ịhụnanya na-adịgide adịgide?

7 Ha abụọ malitere ịkparịta ụka, Rut akọọrọ Neomi otú Boaz si nyere ya aka. Ihe Rut kọọrọ Neomi mere ka obi tọọ Neomi ụtọ, ya ekwuo, sị: “Ka Jehova, bụ́ onye na-ewepụghị obiọma ya n’ebe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ nọ, gọzie ya.” (Rut 2:20) Neomi ghọtara na ọ bụ Jehova mere ka Boaz meere ha ihe ọma ahụ. Ọ bụ Jehova na-emetụ ndị ohu ya aka n’obi ka ha na-emesapụ aka, o kwekwara nkwa na ya ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere. *Gụọ Ilu 19:17.

8 Neomi gwara Rut ka o mee ihe ahụ Boaz gwara ya, ya bụ, ka ọ na-atụtụ ọka n’ubi ya, nakwa ka ọ na-anọ ụmụ agbọghọ ya nso ka ụmụ nwoke na-aghọrọ Boaz ọka ghara inye ya nsogbu. Rut mere ihe ahụ nne di ya gwara ya. Rut na “nne di ya bikwa,” ọ hapụghị nne di ya. (Rut 2:22, 23) Nke a gosiri na Rut ahapụbeghị àgwà ọma ahụ o nwere, nke bụ́ ịhụnanya na-adịgide adịgide. Àgwà ọma a o nwere kwesịrị ime ka anyị jụọ onwe anyị ma ànyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya ma na-enyere ha aka mgbe niile. Jehova agaghị echefu anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ.

Anyị na-amụta n’aka Rut na Neomi na anyị ekwesịghị iji ezinụlọ anyị egwuri egwu

9. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Rut na Neomi banyere ezinụlọ?

 9 È kwesịrị ikwu na Rut na Neomi abụghị ezinụlọ? N’obodo ụfọdụ, a naghị ewere naanị mmadụ abụọ bi n’ụlọ ka ezinụlọ. Ọ bụ naanị mgbe e nwere di, nwunye, ụmụ, na nne na nna ochie ka e nwere ike ikwu na e nweela ezinụlọ. Ma akụkọ Rut na Neomi na-echetara anyị na mmadụ abụọ na-efe Jehova nwere ike ịbụ ezinụlọ, ọ sọgodị ya ya bụrụ naanị ha abụọ bi. Ha nwekwara ike ịhụ ibe ha n’anya ma na-enyere ibe ha aka. Ị̀ hụrụ ndị ezinụlọ gị n’anya? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọgbakọ Ndị Kraịst ga-aghọrọ ndị niile nọ na ya ezinụlọ, ma ndị nwere ezinụlọ nke ha ma ndị na-enweghị.—Mak 10:29, 30.

Rut na Neomi nyeere ibe ha aka, gbaakwa ibe ha ume

“Ọ Bụ Otu n’Ime Ndị Ga-agbara Ihe Anyị”

10. Olee otú Neomi chọrọ isi nyere Rut aka?

10 Rut malitere ịtụtụ ọka n’ubi Boaz n’ọnwa Eprel, bụ́ mgbe a na-ewe ọka bali. Ọ tụtụrụ ya ruo n’ọnwa Jun, bụ́ mgbe a na-ewe ọka wit. Ugbu a izu ole na ole gaferela, o doro anya na Neomi echekwuola echiche banyere ihe o nwere ike imere nwunye nwa ya a ọ hụrụ n’anya. Mgbe ha ka nọ na Moab, Neomi chere na ya agaghị enwe ike ịchọtara Rut di. (Rut 1:11-13) Ma ugbu a, echiche ya agbanwewala. Neomi bịakwutere Rut ma gwa ya, sị: “Nwa m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịchọtara gị ebe izu ike?” (Rut 3:1) N’oge ahụ, ọ bụ ndị nne na nna na-achọtara ụmụ ha di ma ọ bụ nwunye. Rut aghọọrọla Neomi nwa. N’ihi ya, Neomi chọrọ ịchọtara Rut “ebe izu ike,” nke bụ́ na ọ chọrọ ịchọtara ya di n’ihi na ọ ma na ọ bụrụ na Rut alụọ di, ahụ́ ga-eru ya ala n’ụlọ di ya. Ma olee otú Neomi ga-esi achọtara ya di?

11, 12. (a) Olee iwu Chineke nyere ndị Izrel nke Neomi bu n’obi kwuo na Boaz bụ otu n’ime ndị ‘ga-agbara ihe ha’? (b) Gịnị ka Rut kwuru mgbe Neomi gwara ya ihe ọ ga-eme?

11 Oge mbụ Rut kọọrọ Neomi banyere Boaz, Neomi gwara ya, sị: “Nwoke ahụ bụ onye ikwu anyị. Ọ bụ otu n’ime ndị ga-agbara ihe anyị.” (Rut 2:20) Gịnị ka ihe a Neomi kwuru pụtara? Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru na Chineke chọrọ ka a na-enyere ezinụlọ ndị ihe siiri ike aka, bụ́ ndị ihe siiri ike maka na ha dara ogbenye ma ọ bụ maka na onye na-akpa afọ ha anwụọla. Ọ bụrụ na nwaanyị amụtabeghị nwa di ya anwụọ, obi ga na-ajọ ya njọ, nke ka nke, maka na aha di ya ga-efu, ámá di ya echiekwa. Ma Iwu ahụ kwuru ihe a ga-eme. O kwuru na ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye  ya ka ọ mụta nwa nwoke ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka aha ya ghara ifu. Ọ bụkwa nwa ahụ a mụrụ ga-eketa ala nna ya. *Diut. 25:5-7.

12 Neomi gwara Rut ihe ọ chọrọ ka o mee. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Rut na-ele Neomi anya ka ọ na-akọrọ ya ihe ahụ ọ chọrọ ka o mee. Rut amatachabeghị iwu Chineke nyere mba Izrel nakwa omenala ndị Izrel. O doro anya na ihe niile ka na-aga ya aka ekpe aka ekpe. Ma, ebe ọ na-ejighị Neomi egwu egwu, o gere ya ntị nke ọma. Rut kwetara ime ihe Neomi gwara ya n’agbanyeghị na ihe ahụ ọ gwara ya mee nwere ike ime ya ihere ma ọ bụ butere ya mkparị. O ji olu ọma gwa Neomi, sị: “M ga-eme ihe niile ị gwara m.”—Rut 3:5.

13. Gịnị ka ihe Rut mere na-akụziri anyị banyere ime ihe ndị okenye ma ọ bụ ndị tọrọ anyị gwara anyị mee? (Gụọkwa Job 12:12.)

13 Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ụmụ agbọghọ na ụmụ okoro ike ime ihe ndị okenye na ndị ka ha mara ihe gwara ha. Ọ na-adịrị ha mfe iche na ndị okenye anaghị aghọta ụdị nsogbu ndị ha na-enwe. Ihe Rut mere na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ige ndị okenye ntị bụ́ ndị hụrụ anyị n’anya ma na-achọ ka ihe dịrị anyị ná mma. Ige ha ntị ga-abara anyị uru. (Gụọ Abụ Ọma 71:17, 18.) Ma gịnị bụ ihe Neomi gwara Rut ka o mee, oleekwa otú o si baara Rut uru mgbe o mere ya?

 Rut Gara n’Ebe A Na-azọcha Mkpụrụ

14. Olee otú ebe a na-azọcha mkpụrụ na-adị, oleekwa ihe a na-anọ na ya eme?

14 Ná mgbede ụbọchị ahụ, Rut gara n’ebe a na-azọcha mkpụrụ. Ebe a na-azọcha mkpụrụ na-adị larịị ma sie ezigbo ike. Ọtụtụ ndị ọrụ ugbo na-ebute ọka ha n’ebe ahụ ma nọrọ na ya zọchaa ya ma fụchaa ya. Ọ na-abụkarị n’elu ugwu ma ọ bụkwanụ n’akụkụ ya ka a na-anọ azọcha ọka n’ihi na ikuku na-ekusi ike n’ebe ahụ ná mgbede. Ọ na-abụ ndị ọrụ ugbo chọọ ịfụcha ọka ha zọchara azọcha, ihe ha na-eme bụ iji fọk ma ọ bụ shọvel na-ekuli ọka ha elu. Ha kulie ya, ifufe na-eburu igbogbo ọka ha na ifuru ya, ebe nke bụ́ ọka na-ada n’ala.

15, 16. (a) Kọwaa ihe mere n’ebe a na-azọcha mkpụrụ mgbe Boaz rụchara ọrụ ná mgbede. (b) Olee otú Boaz si mata na Rut dina n’akụkụ ụkwụ ya?

15 Rut zooro ezoro gaa otu ebe na-ekiri ka ndị ọrụ na-afụchara Boaz ọka. Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe ha mechiri ọrụ. Boaz nọkwa ebe ahụ na-ahụ ka ọrụ ahụ si na-aga. Ọka a fụchaara ya ebuola ezigbo ibu. Mgbe Boaz richara nri, obi atọọ ya ụtọ, o dinaara ala n’akụkụ ebe e kpokọtara ọka ya. O yiri ka ọ̀ bụ ihe ndị mmadụ na-emekarị n’oge ahụ. Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji eme ya bụ ka ndị ohi ma ọ bụ ndị ọ lụọ ọ gbalaga ghara ịbịa kporo ọka ha. Rut hụrụ ka Boaz na-edinara ala n’abalị ahụ. Ọ bụ ugbu a ka ọ ga-eme ihe Neomi gwara ya mee.

16 Rut heere ehere gaa nso n’ebe ahụ Boaz dina, obi na-akụkwa ya kpum kpum. Ọ chọpụtara na Boaz nọ n’ezigbo ụra. N’ihi ya, o mere ihe Neomi gwara ya. Ọ gara n’ebe Boaz nọ na-ehi ụra kpughee ákwà Boaz ji kpuchie ụkwụ ya, jiri ya dinara ala ma chere ihe ga-emenụ. Ka Rut nọ na-eche, ọ dị ya ka oge anaghị aga aga. Ma  n’etiti abalị, Boaz malitere imegharị ahụ́. Ahụ́ nọ na-ama ya jijiji n’ihi oyi, ya ebilie ka o were ákwà kpuchie ụkwụ. Ma ọ chọpụtara na o nwere onye dina n’akụkụ ya. Baịbụl kwuru, sị: “Lee! otu nwaanyị dina n’akụkụ ụkwụ ya!”—Rut 3:8.

17. Olee ụzọ ihe abụọ ndị na-ekwu na ihe Rut mere adịghị mma na-aghọtaghị?

17 Boaz jụrụ nwaanyị ahụ, sị, “Ònye ka ị bụ?” Rut ejiri ụjọ gwa ya, sị: “Abụ m Rut ohu gị nwaanyị, gbasaa uwe mwụda gị kpuchie ohu gị nwaanyị, n’ihi na ọ bụ gị ga-agbara m.” (Rut 3:9) Ụfọdụ ndị na-akọwa Baịbụl n’oge a na-ekwu na ihe ahụ Rut mere na ihe ahụ ọ gwara Boaz gosiri na ọ chọrọ ka ya na Boaz nwee mmekọahụ. Ma, o nwere ụzọ ihe abụọ ha na-aghọtaghị. Nke mbụ bụ na ihe ahụ Rut mere bụ omenala ndị Izrel. O so n’omenala ndị a na-anaghị emekwa n’oge a. N’ihi ya, mmadụ ekwesịghị ikwo na omume rụrụ arụ juru ebe niile ugbu a kwuo na ihe ahụ Rut mere adịghị mma. Nke abụọ abụrụ na ihe Boaz mere mgbe Rut gwachara ya okwu gosiri na o doro ya anya na Rut ebughị ihe ọjọọ n’obi, kama na Rut mere ihe o kwesịrị ime.

Rut ebughị ihe ọjọọ n’obi gakwuru Boaz

18. Gịnị ka Boaz gwara Rut iji mee ka obi ruo ya ala, oleekwa ihe abụọ Rut mere bụ́ ndị mere ka Boaz kwuo na Rut gosiri ha obiọma ya?

18 Boaz gwara Rut okwu. O doro anya na otú o si jiri olu ọma gwa ya okwu mere ka obi ruo Rut ala. Boaz gwara ya, sị: “Ka Jehova gọzie gị, nwa m. I gosiwo obiọma gị n’ụzọ dị mma n’ihe a i mere ugbu a karịa nke mbụ i mere, ebe ị na-achụrụghị ụmụ okorobịa gawa, ma hà bụ ogbenye ma hà bụ ọgaranya.” (Rut 3:10) Ihe Boaz bu n’obi mgbe ọ sịrị ‘ihe mbụ Rut mere’ bụ otú Rut si hụ Neomi n’anya ma soro ya lọta n’Izrel ma na-elekọta ya. Mgbe ọ gwara Rut “ihe a i mere ugbu a,” ihe ọ na-ekwu bụ ọbịbịa a Rut bịara ka ya gbara ya. Boaz ma na ebe ọ bụ na Rut ka bụ nwa agbọghọ, ọ gaara adịrị ya mfe ịga chọrọ nwa okorobịa ga-alụ ya, ma ọ̀ bụ ogbenye ma ọ̀ bụ ọgaranya. Kama ime otú ahụ, o kpebiri imere ma Neomi ma di Neomi nwụrụ anwụ ihe ọma, ya bụ, na ọ chọghị ka aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ fuo. Ka a sịkwa ihe mere ihe a Rut mere ji masị Boaz.

19, 20. (a) Gịnị mere Boaz ejighị ọsọ gaa lụọ Rut? (b) Olee otú Boaz si gosi Rut obiọma, oleekwa ihe gosiri na ọ chọghị ihe ga-emebi aha ọma Rut?

19 Boaz kwukwara, sị: “Nwa m, atụla egwu. M ga-emere gị ihe niile i kwuru, n’ihi na mmadụ niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá nke ndị m  maara na ị bụ ezigbo nwaanyị.” (Rut 3:11) Ọ ga-abụ na o juchaghị Boaz anya mgbe Rut gwara ya ka ọ gbara ya n’ihi na o nwere mmasị ịlụ Rut. Ma ebe Boaz bụ ezigbo mmadụ, ọ chọghị ịlụ Rut naanị n’ihi na o nwere mmasị ịlụ ya. Ọ gwara Rut na e nwere onye ọzọ ga-agbara ya nke bụ́ onye ikwu ndị ezinụlọ di Neomi nwụrụ anwụ karịa yanwa. Boaz kwuru na ya ga-agwa nwoke ahụ okwu ka ọ mara ma nwoke ahụ ọ̀ ga-alụ Rut.

Ebe ọ bụ na Rut na-emere ndị ọzọ ihe ọma ma na-akwanyere ha ùgwù, ndị mmadụ bịara mara na ọ bụ ezigbo nwaanyị

20 Boaz gwara Rut ka o dinakwara ala hitụ ụra ruo mgbe chi bọwara. Chi bọwa, ya alawa ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ bịara ebe ahụ. Ọ chọghị ka ndị mmadụ lewe ya na Rut anya ọjọọ ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị nwere ike iche na o nwere ihe ha mere. Rut dinaara n’akụkụ ụkwụ Boaz. Ugbu a, obi eruola ya ala n’ihi otú Boaz si gwa ya okwu. Mgbe chi na-abọchabeghị, Rut biliri, Boaz ekpojuo ọka bali n’ákwà Rut, Rut eburu ya lawa Betlehem.—Gụọ Rut 3:13-15.

21. Gịnị na gịnị mere ndị mmadụ ji mara na Rut bụ “ezigbo nwaanyị,” oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ka ya?

21 Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Rut ụtọ mgbe o chebaara ihe Boaz gwara ya echiche, ya bụ, na mmadụ niile ma na ọ bụ “ezigbo nwaanyị.” O doro anya na ihe mere o ji nwee aha ọma otú a bụ maka na ọ na-enu ya enu n’obi ịmata Jehova na ife ya. Ihe ọzọkwa bụ na Rut na-enyere Neomi aka ma na-akwanyere ya na ndị obodo ya ùgwù, o jikwa obi ya niile na-erubere iwu ndị Izrel isi, ọ bụ eziokwu na iwu ha na omenala ha edochabeghị ya anya. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe ka Rut, anyị ga na-akwanyere ndị mmadụ na omenala ha ùgwù. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwekwa aha ọma ka Rut.

Otú Rut Si Nweta Ebe Izu Ike

22, 23. (a) Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya ka onyinye ahụ Boaz nyere Rut na-egosi? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.) (b) Olee ihe Neomi gwara Rut mee?

22 Mgbe Rut lọtara, Neomi jụrụ ya, sị: “Ònye ka ị bụ, nwa m?” Ọ ga-abụ otú ahụ chi na-abọchabeghị mere Neomi ji jụọ Rut ajụjụ a. Ma Neomi chọkwara ịma ma Rut ò nwetala onye ga-alụ ya ka ọ̀ bụ na o nwetabeghị. Ozugbo ahụ, Rut gwara nne di ya otú ya na Boaz si jee. O bunyekwara ya ọka bali ahụ Boaz gwara ya ka o bunye ya. *Rut 3:16, 17.

23 Ebe ọ bụ na Neomi ma ihe, ọ gwara Rut ka ọ nọrọ n’ụlọ ma hapụ ịga tụtụọ ọka n’ụbọchị ahụ. Ọ gwara Rut, sị: “Nwoke ahụ  agaghị ezu ike ọ̀ gwụla ma ò mere ka okwu a bie taa.”—Rut 3:18.

24, 25. (a) Olee otú Boaz si gosi na ya bụ ezigbo mmadụ nke na-anaghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru? (b) Olee otú e si gọzie Rut?

24 Ihe Neomi kwuru banyere Boaz bụ eziokwu. Boaz gara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, bụ́ ebe ndị okenye obodo ahụ na-ezukọtakarị. Ọ nọ ebe ahụ na-eche mgbe onye ahụ kacha bụrụ onye ikwu ndị ezinụlọ di Neomi ga-agafewa. Boaz gwara nwoke ahụ n’ihu ndị akaebe nọ n’ebe ahụ ka ọ gbara Rut, ya bụ, ka ọ lụọ ya. Ma nwoke ahụ jụrụ. Ọ sịrị na ịgbara Rut ga-emebiri ya ihe nketa ya. Boaz nọzi n’ihu ndị akaebe ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ kwuo na ya ga-agbara Rut, ya bụ, na ya ga-azụrụ ala di Neomi nwụrụ anwụ, bụ́ Elimelek, ma lụọ Rut bụ́ nwunye Malọn, nwa Elimelek. Boaz kwuru na ihe a ya chọrọ ime ga-eme ka “aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ dịgide n’ihe nketa ya.” (Rut 4:1-10) N’eziokwu, Boaz bụ ezigbo mmadụ, ọ naghịkwa achọ ihe ga-abara naanị ya uru.

25 Boaz lụrụ Rut. Baịbụl mechara kwuo, sị: “Jehova wee mee ka ọ tụrụ ime, o wee mụọ nwa nwoke.” Ụmụ nwaanyị Betlehem gọziri Neomi ma jaa Rut mma, kwuo na o meere Neomi ihe ụmụ nwoke asaa na-agaghị emeliri ya. Baịbụl gwara anyị na nwa ahụ Rut mụrụ mechara bụrụ nna ochie Eze Devid. (Rut 4:11-22) Devid mechakwara bụrụ nna ochie Jizọs Kraịst.—Mat. 1:1. *

Jehova gọziri Rut, nke mere o ji bụrụ nne ochie Mesaya ahụ

26. Gịnị ka ihe mere ná ndụ Rut na Neomi na-akụziri anyị?

26 N’eziokwu, Chineke gọziri Rut, gọziekwa Neomi. Neomi nyeere Rut aka zụọ nwa ahụ ka à ga-asị na ọ bụ nwa yanwa mụrụ. Ihe mere ná ndụ ụmụ nwaanyị abụọ a na-akụziri anyị na Jehova Chineke na-ahụ ndị niile ji obi ha niile na-agbalị ka ha kpaa afọ ezinụlọ ha ma soro ndị hụrụ Chineke n’anya na-efe ya mgbe niile. O doro anya na Chineke na-agọzi ndị ji obi ha niile na-efe ya, otú ọ gọziri Boaz, Neomi, na Rut.

^ para. 7 Dị ka Neomi kwuru, Jehova na-enwe obiọma ma n’ebe ndị dị ndụ ma n’ebe ndị nwụrụ anwụ nọ. Di Neomi na ụmụ ya abụọ anwụọla. Di Rut bụ otu n’ime ụmụ abụọ ahụ. O doro anya na Rut na Neomi hụrụ ndị ikom atọ ahụ nwụrụ anwụ n’anya nke ukwuu. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ihe ọma ọ bụla mmadụ meere Neomi na Rut, onye ahụ meere ya ndị ikom atọ ahụ nwụrụ anwụ n’ihi na ha gaara achọ ka a na-elekọta Neomi na Rut.

^ para. 11 Iwu ahụ kwuru na ọ bụ nwoke nne ji ya na onye ahụ nwụrụ anwụ ga-alụrụ nwunye ya. Ọ bụrụ na o nweghị nwoke nne ji ya na ya, ọ bụ onye kacha bụrụ nwanne ya n’ezinụlọ ya ga-alụrụ nwunye ya, ọ bụkwa ya ga-eketa ihe o nwere.—Ọnụ Ọgụ. 27:5-11.

^ para. 22 Boaz bunyere Rut ọka bali dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia isii. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji dịrị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii bụ iji gosi na ebe ọ bụ na a na-arụ ọrụ ụbọchị isii ma zuo ike n’ụbọchị nke asaa, oge Rut dọgburu onwe ya n’ọrụ agwụwala, nakwa na oge ọ ‘ga-ezu ike’ n’ụlọ di ya eruwela. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụ naanị ọka dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii, ya bụ, ihe dị ka shọvel isii, ka Rut nwere ike ibuli.

^ para. 25 Rut so n’ụmụ nwaanyị ise Baịbụl kpọrọ aha mgbe a na-ekwu agbụrụ ma ọ bụ ezinụlọ Jizọs si. Nwaanyị ọzọ ọ kpọrọ aha bụ Rehab, nne Boaz. (Mat. 1:3, 5, 6, 16) Rehab abụghị onye Izrel, otú ahụ Rut na-abụghịkwa onye Izrel.