Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI ABỤỌ NA ABỤỌ

Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya

Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya

1, 2. Gịnị ka i chere Pita na-atụ anya ya mgbe Jizọs na-agwa ndị bi na Kapaniọm okwu, ma olee ihe merenụ?

PITA legidere ndị Jizọs na-agwa okwu anya n’ihu. Ha nọ n’ụlọ nzukọ ndị Juu nke dị n’obodo Kapaniọm. Ọ bụ n’obodo a ka Pita bi. Ọ bụkwa n’ebe a ka ọ na-akụ azụ̀ n’Oké Osimiri Galili. Ọtụtụ n’ime ndị enyi ya, ndị ikwu ya, na ndị ya na ha na-achụ nta ego bikwa n’obodo a. O doro anya na Pita nọ na-atụ anya na ndị obodo ya ga-ewere Jizọs otú yanwa si were ya nakwa na obi ga-adị ha ụtọ na onye ozizi a kacha ukwuu na-akụziri ha banyere Alaeze Chineke. Ma, ihe a ọ tụrụ anya ya emeghị taa.

2 Ọtụtụ ndị akwụsịla ige Jizọs ntị. Ụfọdụ nọ na-atamu ntamu maka na ha ekwetaghị ihe Jizọs na-akụziri ha. Ma, ihe kacha enye Pita nsogbu n’obi bụ na ụfọdụ n’ime ndị ahụ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ihu gbarụrụ ha, obi jọkwara ha njọ n’agbanyeghị eziokwu Jizọs kụziiri ha. Iwe jizi ha, obi chọkwara ịgbawa ha. Ụfọdụ kwuru otú obi dị ha. Ha kwuru na ozizi Jizọs na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Ha kwụsịrị ige Jizọs ntị ma si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ, kwụsị iso Jizọs.—Gụọ Jọn 6:60, 66.

3. Olee uru okwukwe Pita baara ya n’oge dị iche iche?

3 Oge ahụ adịrịghị Pita na ndịozi ibe ya mfe. Pita aghọtachaghị ihe Jizọs kwuru n’ụbọchị ahụ. O doro anya na ọ ghọtara ihe mere okwu Jizọs nwere ike iji kpasuo mmadụ iwe ma onye ahụ lee ya anya elu elu. Ma, olee ihe Pita ga-eme? Nke ahụ abụghị nke mbụ a nwara Pita ma ọ̀ ga-akwụsi ike n’ebe Nna ya ukwu nọ. Ọ gakwanụghị abụ nke ikpeazụ. Ka anyị hụ otú okwukwe Pita si nyere ya aka imeri ọnwụnwa ndị bịaara ya ma kwụsie ike n’ebe Jizọs nọ.

Ọ Hapụghị Jizọs Mgbe Ndị Ọzọ Hapụrụ Ya

4, 5. Olee ihe ndị Jizọs mere nke ndị mmadụ na-atụghị anya na ọ ga-eme?

4 Ọtụtụ ihe Jizọs na-eme na-eju Pita anya. Ọtụtụ ugboro, Jizọs mere ihe ndị mmadụ na-atụghị anya na ọ ga-eme, kwuokwa ihe ndị mmadụ na-atụghị anya na ọ ga-ekwu. Ụnyaahụ ya, Jizọs rụrụ ọrụ ebube nke mere ka o nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ. Ọrụ ebube  a ọ rụrụ mere ka ìgwè mmadụ ahụ gbalịa ka ha mee ya eze. Ma, o meziri ihe tụrụ ọtụtụ ndị n’anya. Ọ hapụrụ ìgwè mmadụ ahụ gaa n’ugwu, gwakwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye n’ụgbọ gawa Kapaniọm. Ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwọ ụgbọ ha na-aga n’abalị ahụ, o mere ihe ọzọ tụrụ ha n’anya. Ọ gara ije n’elu Oké Osimiri Galili ahụ mgbe ebili mmiri na-enugharị mmiri ahụ. O jikwa ihe a o mere kụziere Pita na ọ dị mkpa ka o nwee okwukwe.

5 N’ụtụtụ ya, ha chọpụtara na ìgwè mmadụ ahụ achọrọkwala ha bịa n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ. Ma, o doro anya na ihe mere ha ji esogharị Jizọs bụ na ha chọrọ ka Jizọs rụọ ọrụ ebube ọzọ ka ha nweta nri ha ga-eri. Mkpa ha abụghị ka ha nụ okwu Chineke. Jizọs baara ha mba maka na ha na-achọ naanị ihe nke ụwa. (Jọn 6:25-27) Jizọs malitekwara ịgwa ìgwè mmadụ ahụ okwu n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm. Ọ nọ ebe ahụ kụziere ndị mmadụ ihe ha na-atụghị anya ya. Ihe ahụ ọ kụziiri ha siri ike nghọta, ma ọ dị ezigbo mkpa.

6. Olee ihe atụ Jizọs meere ndị ọ na-agwa okwu, oleekwa ihe ha mere?

6 Jizọs chọrọ ka ndị ahụ mata na ya abụghị onye na-enye ndị mmadụ ihe oriri nkịtị, kama na ya bụ onye Chineke ga-eji ndụ ya na ọnwụ ya mee ka ndị mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, o meere ha otu ihe atụ. N’ihe atụ ahụ, ọ sịrị na ya bụ mana. Mana bụ ihe oriri Chineke si n’eluigwe nye ndị Izrel n’oge Mozis. Mgbe ụfọdụ n’ime ndị ahụ ọ na-agwa okwu na-ekwetaghị ihe o kwuru, o meere ha ihe atụ ọzọ ma kwuo na ha kwesịrị iri anụ ahụ́ ya ma ṅụọ ọbara ya ka ha nwee ike inweta ndụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka iwe wesiwere ha ike. Ụfọdụ sịrị: “Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ ige ntị na ya?” Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịdịrị iso ya. *Jọn 6:48-60, 66.

7, 8. (a) Olee ihe Pita na-aghọtabeghị banyere Jizọs? (b) Olee ihe Pita zara mgbe Jizọs jụrụ ndịozi ya ajụjụ?

7 Olee ihe Pita ga-eme? Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs kwuru jukwara yanwa anya. Ọ ghọtabeghị na Jizọs ga-anwụ ka o nwee ike mezuo uche Chineke. Ma Pita ò chere echiche ịhapụ Nna ya ukwu otú ahụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mere n’ụbọchị ahụ? Mba. O nwere otu ihe mere Pita ji dị iche na ha. Olee ihe ọ bụ?

8 Jizọs leziri ndịozi ya anya ma sị ha: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” (Jọn 6:67) Ọ bụ ndịozi iri na abụọ ya ka ọ jụrụ ajụjụ a. Ma, ọ bụ Pita zara ya. Ọ na-abụkarị ya na-ebu ụzọ ekwu okwu maka na o nwere ike ịbụ ya tọchara ha. Ma ọ̀ bụ ya tọchara ha ma ọ bụ na ọ bụghị ya, ihe anyị ma bụ na ọ kacha ha ekwupụ okwu.  O yiri ka ọ naghị esiri Pita ike ikwu ihe dị ya n’obi. Na nke ugbu a, ihe dị ya n’obi o kwuru bụ: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” Ihe a o kwuru magburu onwe ya. A gaghị echefu ya echefu.—Jọn 6:68.

9. Olee otú Pita si gosi na ya kwụsiri ike n’ebe Jizọs nọ?

9 Ihe a Pita kwuru ọ́ metụghị gị n’obi? Okwukwe Pita nwere na Jizọs enyerela ya aka ịkwụsi ike n’ebe Jizọs nọ. Ihe a o mere magburu onwe ya. Pita ghọtara nke ọma na Jizọs bụ naanị Onye nzọpụta Jehova nyere ụmụ mmadụ, ghọtakwa na Jizọs ga-esi n’okwu ọnụ ya, ya bụ, ihe ọ na-akụzi banyere Alaeze Chineke, zọpụta ndị mmadụ. Pita ma na a sịgodị na e nwere ihe ụfọdụ gbagwojuru ya anya, ọ dịghị ebe ọzọ ya ga-aga ma ọ bụrụ na ya chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ma nweta ndụ ebighị ebi.

Anyị kwesịrị ịnabata ihe Jizọs na-akụziri anyị, ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ha ma ọ bụ na ha dị iche n’ihe anyị tụrụ anya ha ma ọ bụ n’ihe anyị chọrọ

10. Olee otú anyị ga-esi kwụsie ike n’ebe Jizọs nọ otú ahụ Pita mere?

10 Ọ̀ bụ otú ahụ Pita si were Jizọs ka i si were ya? Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị taa na-ekwu na ha hụrụ Jizọs n’anya, ma ha anaghị akwụsi ike n’ebe Jizọs nọ. Otú anyị ga-esi egosi na anyị kwụsiri ike n’ebe Jizọs nọ bụ iwere ihe ndị Jizọs kụziri otú ahụ Pita si were ha. Anyị kwesịrị ịmụ ha amụ, ghọta ha nke ọma ma na-eme ha eme, ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ha ma ọ bụ na ha dị iche n’ihe anyị tụrụ anya ha ma ọ bụ n’ihe anyị chọrọ. Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee olileanya inweta ndụ ebighị ebi ahụ Jizọs chọrọ ka anyị nweta bụ ịkwụsi ike n’ebe ọ nọ.Gụọ Abụ Ọma 97:10.

Ọ Kwụsiri Ike Mgbe E Nyere Ya Ndụmọdụ

11. Olee ebe Jizọs kpọ ndị na-eso ụzọ ya gaa? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

11 Mgbe obere oge gafere, Jizọs kpọ ndịozi ya na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya chee ihu n’ebe ugwu ala Izrel. Ha ji ụkwụ gaa ije ogologo oge. Mgbe ụfọdụ, a na-anọ n’Oké Osimiri Galili ahụ Ugwu Hemọn. Snoo na-ekpuchikarị elu ugwu a. Ugwu a dị ná ngwụcha ngwụcha ebe ugwu Ala Nkwa ahụ. Ka Jizọs na ndị ya na ha so nọ na-aga n’obodo ndị dị nso na Sesaria Filipaị, ha rutekwuru ugwu ahụ nso. * Ọ bụ n’ebe ahụ mara mma ka Jizọs nọ jụọ ndị na-eso ụzọ ya otu ajụjụ dị mkpa.

12, 13. (a) Gịnị mere Jizọs ji jụọ ndị na-eso ụzọ ya onye ndị mmadụ chere na ya bụ? (b) Olee ihe Pita zara Jizọs nke gosiri na o nwere ezigbo okwukwe?

12 Ọ jụrụ ha, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?” Weregodị ya na ị na-ahụ ka Pita legidere Nna ya ukwu anya mgbe ọ na-eche ka ha zaa ya ajụjụ ahụ. Ọ hụkwara ọzọ na Nna ya ukwu a dị obiọma ma mara ihe. Jizọs chọrọ ịma onye ndị mmadụ chere na ya bụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs zara ya ajụjụ ahụ. Ha gwara ya na ụfọdụ  na-ekwu na ọ bụ onye a, ndị ọzọ ana-ekwu na ọ bụ onye ọzọ. Ma, o nwere ihe ọzọ Jizọs chọrọ ịmata. Ọ chọrọ ịmata ma ihe ahụ ndị ọzọ chere ọ̀ bụ ihe ndị na-eso ụzọ ya a chere. N’ihi ya, ọ jụrụ ha, sị: “Ma, unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?”—Luk 9:18-20.

13 Pita zara ajụjụ a ọsọ ọsọ otú ọ na-eme. O kwuru ihe dị ọtụtụ n’ime ha n’obi, o kwukwara ya otú onye ọ bụla ga-aghọta ya. Ọ sịrị: “Ị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.” Weregodị ya na ị na-ahụ ka Jizọs mụmụrụ ọnụ ọchị ma jaa Pita mma. Jizọs gwaziri Pita na ọ bụ Jehova Chineke mere ka ndị nwere ezigbo okwukwe mata eziokwu a o kwuru, ọ bụghị mmadụ. Ọ bụ Jehova mere ka Pita ghọta otu n’ime eziokwu kacha mkpa Jehova metụrụla ka ụmụ mmadụ mata mgbe ahụ, ya bụ, onye Mesaya ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa bụ.—Gụọ Matiu 16:16, 17.

14. Olee ọrụ dị mkpa Jizọs nyekwuru Pita?

14 Amụma e buru n’oge ochie kwuru na ọ bụ Kraịst a bụ nkume ndị na-ewu ụlọ ga-ajụ. (Ọma 118:22; Luk 20:17) Ọ bụ amụma a ka Jizọs bu n’obi kwuzie na Jehova ga-ewukwasị ọgbakọ ya n’elu nkume a, ya bụ, n’elu Kraịst ahụ Pita ka kwupụrụ okwu ya. Jizọs nyeziri Pita ọrụ ndị dị mkpa ọ ga-arụ n’ọgbakọ a. O meghị Pita onyeisi nke ndịozi ibe ya otú ụfọdụ ndị chere, kama ihe o mere bụ inyekwu ya ọrụ ọ ga-arụ. O nyere Pita “mkpịsị ugodi nke alaeze.” (Mat. 16:19) Ọ bụ Pita ga-eme ka ụzọ ndị atọ nwee olileanya ịbanye n’Alaeze Chineke. Ndị nke mbụ ọ ga-emere ya bụ ndị Juu, ndị nke abụọ abụrụ ndị Sameria, ndị ikpeazụ abụrụ ndị Jentaịl ma ọ bụ ndị na-abụghị ndị Juu.

15. Gịnị mere Pita ji baara Jizọs mba, gịnịkwa ka ọ gwara ya?

15 Ma, Jizọs mechara kwuo na ọ bụrụ na e nyere mmadụ ihe dị ukwuu, a ga-achọ ihe dị ukwuu n’aka ya. Ihe a Jizọs kwuru mechara mezuo n’isi Pita. (Luk 12:48) Jizọs nọgidere na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe ndị ga-emezu n’isi Mesaya ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ na ọ ga-ata ahụhụ na Jeruselem ma nwụọ. Ihe a Jizọs kwuru wutere Pita. Ọ kpọpụrụ Jizọs iche ma malite ịbara ya mba, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.”—Mat. 16:21, 22.

16. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere Pita, oleekwa uru o nwere ike ịbara anyị niile?

16 O doro anya na Pita ebughị ihe ọjọọ n’obi kwuo ihe  o kwuru. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ihe Jizọs gwara ya juru ya anya. Ọ gbakụtara Pita azụ, lee ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ anya. O nwere ike ịbụ na otú obi dị Pita ka ọ dịkwa ha. Ma Jizọs gwaziri Pita: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.” (Mat. 16:23; Mak 8:32, 33) Ndụmọdụ a Jizọs nyere Pita baara anyị niile uru. Ọ na-adịrị anyị mfe ile ihe anya otú mmadụ si ele ihe anya kama ile ihe anya otú Chineke si ele ya. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya otú mmadụ si ele ya, o nwere ike anyị agaghị ama ụma gwa ndị mmadụ ka ha mee ihe ọ ga-abụ ha mechaa, ya amasị Setan, kama ịmasị Chineke. Ma, olee ihe Pita mere mgbe Jizọs gwara ya ihe a?

17. Gịnị ka Jizọs na-ekwu mgbe ọ gwara Pita ka ọ ‘gaa ya n’azụ’?

17 Ọ ga-abụ na Pita ma na Jizọs anaghị ekwu na ya bụ Setan bụ́ Ekwensu. A sị ka e kwuwe, ihe Jizọs gwara Pita abụghị ihe ọ gwara Setan. Mgbe Jizọs gwara Setan okwu, ọ sịrị ya: “Si ebe a pụọ.” Ma ihe ọ gwara Pita bụ: “Gaa m n’azụ.” (Mat. 4:10) Jizọs ajụghị onyeozi ya a ọ ma na o nwere ọtụtụ àgwà ọma. Kama ihe o mere bụ inye ya ndụmọdụ nke ga-eme ka ọ mata na ihe ahụ o chere adịghị mma. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na Pita ekwesịghị ime ka ya ghara ime uche nna ya, kama na o kwesịrị ịna-agba ya ume.

Ọ bụrụ na anyị ewedata onwe anyị ala nabata ndụmọdụ e nyere anyị ma si na ya mụta ihe, ọ ga-eme ka anyị na Jizọs Kraịst na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, na-adịkwu ná mma

18. Olee otú Pita si gosi na ya kwụsiri ike n’ebe Jizọs nọ, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya?

18 Pita ọ̀ rụwara Jizọs ụka, wewe iwe ma ọ bụkwanụ kwụsịzie ịtụpụrụ Jizọs ọnụ? Mba. Ọ nabatara ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere ya. Ihe a o mere gosiri na ọ dị umeala n’obi ma kwụsie ike n’ebe Jizọs nọ. O nweghị Onye Kraịst ga-asị na e kwesịghị inye ya ndụmọdụ mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị eweda onwe anyị ala, nabata ndụmọdụ e nyere anyị ma si na ya mụta ihe, ọ ga-eme ka anyị na Jizọs Kraịst na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, na-adịkwu ná mma.—Gụọ Ilu 4:13.

Pita kwụsiri ike n’ebe Jizọs nọ n’agbanyeghị ndụmọdụ o nyere ya

A Gọziri Ya Maka na Ọ Kwụsiri Ike

19. Olee ihe Jizọs kwuru nke juru ndị mmadụ anya, oleekwa ihe Pita nwere ike ịna-eche?

19 Mgbe obere oge gafere, Jizọs kwuru ihe ọzọ juru ndị mmadụ anya. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha  bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.” (Mat. 16:28) O doro anya na Pita chọrọ ịmata ihe ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara. Olee ihe ọ ga-abụ ya mere Jizọs ji kwuo ihe ahụ? O nwere ike ịbụ na Pita nọ na-eche na ndụmọdụ ahụ Jizọs ka nyere ya ga-eme ka ọ ghara iso ná ndị ihe ahụ Jizọs kwuru ga-emezu n’isi ha.

20, 21. (a) Olee ọhụụ Pita so hụ? (b) Olee uru ihe Jizọs na ndị ahụ kwurịtara baara Pita?

20 Ma, mgbe ihe dị ka otu izu gachara, Jizọs kpọ Jems, Jọn, na Pita gbagoro “n’ugwu dị oké elu.” Ọ ga-abụ na ugwu a bụ Ugwu Hemọn maka na ọ dị naanị kilomita ole na ole ma e si n’ebe ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ gawa ya. O nwere ike ịbụ n’abalị ka ihe a mere, ebe ọ bụ na mmadụ atọ ahụ na ụra nọ na-alụ. Ma, mgbe Jizọs nọ na-ekpe ekpere, otu ihe mere nke mere ka ụra pụọ ha n’anya.—Mat. 17:1; Luk 9:28, 29, 32.

21 Jizọs malitere ịgbanwe n’anya ha. Ihu ya malitere igbukepụ egbukepụ, na-enwu gbaa ruo mgbe ọ chawara ka anyanwụ. Uwe ya  nọkwa na-enwu ọcha. Ihe yiri mmadụ abụọ pụtaziri n’akụkụ Jizọs, otu nọchiri anya Mozis, nke ọzọ anọchiekwa anya Ịlaịja. Ha na Jizọs kwurịtara banyere “ọlịla ya nke a kara aka na ọ ga-emezu na Jeruselem.” O nwere ike ịbụ na ọlịla ya a pụtara ọnwụ ya na mbilite n’ọnwụ ya. Ọ bịaziri doo Pita anya na ihe ahụ o kwuru ekwesịghị ekwesị, ya bụ, na Jizọs agaghị ata ahụhụ, ọ gakwanụghị anwụ.—Luk 9:30, 31.

22, 23. (a) Olee otú Pita si gosi na ya na-anụ ọkụ n’obi ma dịrị obiọma? (b) Oleekwa otú e si gọzikwuo Pita, Jems, na Jọn n’abalị ahụ?

22 Ọ dị Pita ọkụ n’ahụ́ ka o soro kwuo okwu n’ọhụụ a. O nwekwara ike ịbụ na Pita chọrọ ka ndị ahụ ha na-ahụ n’ọhụụ ahụ nọtụkwuo. Ma, o yiri ka Mozis na Ịlaịja hà na-achọ ịhapụ Jizọs. N’ihi ya, Pita gwara Jizọs, sị: “Onye Ozizi, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a, ya mere, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mozis, otu maka Ịlaịja.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ụlọikwuu adịghị ndị a ha hụrụ n’ọhụụ mkpa. Ndị a nọchiri anya ndị ohu Jehova abụọ nwụrụla kemgbe. O doro anya na Pita echeghị echiche nke ọma tupu ya ekwuo ihe ahụ o kwuru. Ma, otú Pita si eji obi ya niile eme ihe na otú o si dị obiọma ọ́ masịghị gị?—Luk 9:33.

Ọhụụ ahụ baara Jems, Jọn, na Pita uru

23 A gọzikwuru Pita, Jems, na Jọn n’abalị ahụ. Ígwé ojii gbachiri ma malite ikpuchi ha n’ugwu ahụ. Otu olu si n’ígwé ojii ahụ dapụta. Olu ahụ bụ olu Jehova Chineke. Ọ sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara. Geenụ ya ntị.” Ọhụụ ahụ gwụziri, ya afọdụzie ha na Jizọs n’elu ugwu ahụ.—Luk 9:34-36.

24. (a) Olee uru ọhụụ ahụ baara Pita? (b) Oleekwa ihe anyị ga-eme ka ọhụụ ahụ baara anyị uru?

24 Ọhụụ ahụ baara ma Pita ma anyịnwa uru. Mgbe ihe dị ka afọ iri atọ gachara, Pita dere banyere ihe ọma e meere ya n’abalị ahụ nke bụ́ iso ná “ndị ji anya ha hụ ịdị ebube” Jizọs na ndị ji anya ha hụpere otú ọ ga-esi dị ebube mgbe ọ ghọrọ eze n’eluigwe. Ọhụụ ahụ gosiri na amụma ndị e dere n’Okwu Chineke bụ eziokwu. O mekwara ka okwukwe Pita sie ike ka o nwee ike idi ọnwụnwa ndị ga-abịara ya n’ọdịnihu. (Gụọ 2 Pita 1:16-19.) Ọhụụ ahụ nwekwara ike imere anyị otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị akwụsie ike n’ebe Jizọs nọ, bụ́ onye Jehova mere onyeisi anyị, ma mụta ihe n’aka ya, nabata ndụmọdụ ọ na-enye anyị, jirikwa obi umeala na-eso ya mgbe niile.

^ para. 6 Ihe ìgwè mmadụ ahụ mere gosiri na ha anaghị akwụ otu ebe. Mgbe ha na Jizọs nọ ụnyaahụ ya, ha ji obi ha niile kwuo na Jizọs bụ onye amụma nke Chineke. Ma taa, ha na-ewesazi ya iwe.—Jọn 6:14.

^ para. 11 Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si n’ikpere Oké Osimiri Galili gaa kilomita iri ise ma gafee obodo ndị mara mma tupu ha erute ebe ha nọ ugbu a.