Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ABỤỌ

O “So Ezi Chineke Jee Ije”

O “So Ezi Chineke Jee Ije”

1, 2. Olee ọrụ Noa na ndị ezinụlọ ya nọ na-arụ, oleekwa nsogbu ụfọdụ ha nwere mgbe ha na-arụ ya?

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ Noa ka ọ na-agbatị onwe ya n’ihi ọrụ ọ na-arụ kemgbe. Mgbe ọ gbatịchara onwe ya, ọ nọdụrụ ọdụ n’otu nnukwu plank na-ezurutụ ike. Ka ọ na-ezu ike, ọ nọkwa na-elegharị anya ná nnukwu ụgbọ ahụ ya na ezinụlọ ya na-arụ. Ísì korota ha ji na-etechisi ụgbọ ahụ na-esi ebe niile. Ọ na-anụ mkpọtụ ngwá ọrụ na osisi e ji na-arụ ụgbọ ahụ na-eme. Noa nọkwa ebe ahụ na-ahụ ụmụ ya ndị nwoke ka ha nọ n’ebe dị iche iche n’ụgbọ ahụ na-arụsi ọrụ ike. Ya na ụmụ ya na ndị nwunye ha nakwa nwunye nke ya ọ hụrụ n’anya arụọla ọrụ n’ụgbọ ahụ ọtụtụ afọ. Ha arụmiela ụgbọ ahụ, ma ọrụ a ka ga-arụ na ya buru ibu.

2 Ndị mmadụ weere ha ka ndị iberiibe. Ka ha na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ, ndị ọzọ nọ na-achị ha ọchị, na-asị na o nweghị otú iju mmiri ga-esi abịa tochie ụwa niile. Iju mmiri ahụ Noa nọ na-agwa ha kemgbe na ọ ga-abịa dị ha ka ihe na-enweghị ike ime ime. Ọ na-eju ha anya na dimkpa hà ka Noa nakwa ndị ezinụlọ ya ga na-arụ ọrụ na-enweghị isi kama iji ndụ ha mewe ihe bara uru. Ma Jehova Chineke, bụ́ Onye Noa na-efe, ewereghị Noa ka onye iberiibe.

3. Olee otú o si bụrụ na Noa so Chineke jee ije?

3 Baịbụl kwuru, sị: “Noa so ezi Chineke jee ije.” (Gụọ Jenesis 6:9.) Gịnị ka ihe a Baịbụl kwuru pụtara? Ọ pụtaghị na Chineke bịara n’ụwa, ya na Noa esoro na-agagharị. Ọ pụtakwanụghị na Noa gara eluigwe, ya na Chineke ana-agagharị n’ebe ahụ. Ihe ọ pụtara bụ na Noa rubeere Chineke isi ma hụ ya n’anya nke na o yiri ka ya na Chineke hà so na-eje ije otú enyi na enyi si eme. Mgbe ọtụtụ puku afọ gafere, Baịbụl kwuru banyere Noa, sị: ‘O sitere n’okwukwe ya maa ụwa ikpe.’ (Hib. 11:7) Olee otú o si mee nke ahụ? Oleekwa ihe okwukwe ya na-akụziri anyị taa?

Nwoke Ezi Omume nke Bi n’Ụwa Ajọ Omume

4, 5. Gịnị mere ihe ọjọọ ji ka njọ n’ụwa n’oge Noa?

4 N’oge Noa dịrị ndụ, ụwa nọ na-ajọ njọ n’ike n’ike. Ụwa jọkwara njọ n’oge nna nna ya Inọk dịrị ndụ. Inọk bụkwa onye ezi omume nke ya na Chineke so jee ije. N’oge ahụ, Inọk buru amụma na oge na-abịa  mgbe Chineke ga-ama ndị ajọ omume nọ n’ụwa ikpe. Ma ihe akaziela njọ n’oge Noa. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’anya Jehova, ụwa abụrụla ihe e bibiri ebibi, ime ihe ike jukwara ebe niile. (Jen. 5:22; 6:11; Jud 14, 15) Gịnị meziri ihe ọjọọ ji karịa akarị?

5 Ụfọdụ ndị mmụọ ozi mere ihe ha na-ekwesịghị ime. Otu n’ime ha nupụụrụ Jehova isi, ghọọ Setan bụ́ Ekwensu. Ọ ghagidere Chineke ụgha ma mee ka Adam na Iv mehie. Ma n’oge Noa, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ bidoro isoro Setan na-enupụrụ Jehova isi. Ha hapụrụ eluigwe bụ́ ebe ha bi, bịa n’ụwa ghọọ mmadụ ma lụrụ ụmụ nwaanyị ndị mara ezigbo mma. Ndị mmụọ ozi ahụ dị mpako, na-achọkwa ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Ọ bụ ha mere ka ụmụ mmadụ mewekwuo ihe ọjọọ.—Jen. 6:1, 2; Jud 6, 7.

6. Olee otú ndị Nefilim si mee ka ihe ọjọọ karịa akarị n’ụwa, oleekwa ihe Jehova kpebiri ime?

6 Ihe ọzọkwa bụ na ndị mmụọ ozi ahụ na ndị nwunye ha mụtara ụmụ ndị gbara ajọ dimkpa ma sie ezigbo ike. Baịbụl kpọrọ ụmụ ha ahụ ndị Nefilim. Nefilim pụtara “Ndị Ntigbu.” Ebe ndị Nefilim ahụ na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ, ha mere ka ihe ọjọọ karịa akarị n’ụwa. Ka a sịkwa ihe mere o ji bụrụ na n’anya Chineke, ‘ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa, ihe niile obi ya na-eche mgbe niile bụkwa naanị ihe ọjọọ.’ Jehova kpebiziri na ya ga-ebibi ndị ajọ omume ahụ bi n’ụwa n’ime otu narị afọ na iri abụọ.—Gụọ Jenesis 6:3-5.

7. Gịnị mere na ọ dịrịghị Noa na nwunye ya mfe ịzụ ụmụ ha ka ha ghara iso ndị ọzọ mewe ihe ọjọọ?

7 Ì chere na ọ ga-adị mfe mmadụ ịnọ n’ụwa dị otú ahụ mụọ ụmụ ma zụọ ha? Ma Noa mere otú ahụ. Ọ lụtara ezigbo nwaanyị. Mgbe Noa gbara narị afọ ise, nwunye ya mụtaara ya ụmụ nwoke atọ. Aha ha bụ  Shem, Ham, na Jefet. * Noa na nwunye ya gbakọrọ aka zụọ ụmụ ha ka ha ghara iso ndị ọzọ mewe ihe ọjọọ. Ọ na-atọkarị ụmụaka ụtọ ikiri “ndị dike” na “ndị ikom a ma ama.” N’ihi ya, ọ ga na-atọ ụmụaka ụtọ ikiri ihe ndị Nefilim ahụ na-eme. Noa na nwunye ya agaghị emechili ụmụ ha ntị ka ha ghara ịnụ akụkọ ihe ọjọọ ndị ahụ na-eme. Ma ha nwere ike ịkụziri ha banyere Jehova Chineke bụ́ onye kpọrọ ajọ omume asị. N’ihi ya, ha nyeere ụmụ ha aka ịghọta na ihe ike na nnupụisi juru n’ụwa n’oge ahụ na-ewute Jehova.—Jen. 6:6.

Noa na nwunye ya zụrụ ụmụ ha ka ha ghara iso ndị ọzọ mewe ihe ọjọọ

8. Olee otú ndị nne na nna taa maara ihe nwere ike isi ṅomie Noa na nwunye ya?

8 Ndị nne na nna taa ga-aghọta na ọ dịrịghị Noa na nwunye ya mfe ịzụ ụmụ ha n’oge ahụ. Ime ihe ike na nnupụisi jukwara ebe niile n’oge anyị a. N’ọtụtụ obodo, e nwere ọtụtụ ụmụ okoro na agbọghọ ndị nọ n’òtù ọjọọ dị iche iche. Ime ihe ike judịrị eju na fim ndị a na-emepụtara ụmụaka nakwa n’ihe ndị ọzọ ụmụaka ji egwuri egwu. Ndị nne na nna maara ihe na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ụmụ ha ghara ịga nso n’ihe ọ bụla ga-emebi ha. Ha na-akụziri ụmụ ha banyere Chineke nke udo, bụ́ Jehova, onye ga-emecha kwụsị ihe ike a na-eme n’ụwa. (Ọma 11:5; 37:10, 11) N’agbanyeghị ihe ọjọọ juru n’ụwa, ndị nne na nne nwere ike ịzụ ụmụ ha ka ha na-akpa àgwà ọma. Noa na nwunye ya zụrụ ụmụ ha, ha etoo ghọọ ndị ezi omume. Ha lụkwara ụmụ nwaanyị ndị o doro anya na ha weere ife ezi Chineke, bụ́ Jehova, ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha.

“Rụọrọ Onwe Gị Ụgbọ”

9, 10. (a) Olee ihe Jehova gwara Noa nke gbanwere ndụ Noa? (b) Gịnị ka Jehova gwara Noa banyere otú ụgbọ ahụ ga-aha na ihe mere ọ ga-eji arụ ya?

9 Otu ụbọchị, ndụ Noa gbanwere kpamkpam. Jehova gwara ohu ya a ọ hụrụ n’anya ihe ọ chọrọ ime. Ọ gwara ya na ya chọrọ ibibi ụwa nke oge ahụ ma gwazie ya ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị ya: “Jiri osisi gofa rụọrọ onwe gị ụgbọ.”—Jen. 6:14.

10 Ụgbọ a abụghị ụdị ụgbọ mmiri a na-arụ n’oge a. Ndị nke a na-arụ n’oge a na-enwe ụmara, pịakwa ọnụ, ma n’ihu ma n’azụ. Ma ụgbọ ahụ a gwara Noa rụọ dị ka nnukwu igbe. Jehova gwara Noa otú ụgbọ ahụ ga-aha, ma n’elu ma n’ogologo ma n’obosara. Ọ gwakwara ya otú ọ ga-adị nakwa ka o were korota techie ya ime na azụ. Chineke gwakwara Noa ihe mere ọ ga-eji rụọ ụgbọ ahụ otú ahụ. Chineke sịrị: “Lee, m ga-eweta iju mmiri n’elu ụwa . . . Ihe ọ bụla dị n’ụwa ga-ekubi ume.” Ma, Jehova mere ka ọgbụgba ndụ ya dịrị n’etiti ya na Noa mgbe ọ sịrị ya: “Ị ga-abanyekwa n’ụgbọ ahụ, gị na ụmụ gị na nwunye gị na ndị nwunye ụmụ gị.” Noa ga-achịbatakwa ụfọdụ n’ime ụdị anụ ọ bụla n’ụgbọ  ahụ. Ọ bụ naanị ndị nọ n’ụgbọ ahụ ka iju mmiri na-agaghị egbu.—Jen. 6:17-20.

Noa na ezinụlọ ya gbakọrọ aka ọnụ mee ihe Chineke gwara ha

11, 12. Olee nnukwu ọrụ Chineke nyere Noa, oleekwa ihe Noa mere?

11 Ọrụ a e nyere Noa abụghị obere ọrụ. Ụgbọ ahụ ga-ebu ezigbo ibu. Ọ ga-adị otu narị mita na iri atọ na atọ n’ogologo, dịrị mita iri abụọ na abụọ n’obosara, dịrịkwa mita iri na atọ n’ịdị elu. O nweghị ụgbọ mmiri a rụrụ n’oge anyị a hà ka ya. Noa ọ̀ gbaara ọrụ a ọsọ ma ọ bụkwanụ kwuo na ọrụ dị na ya karịrị akarị? Ọ̀ rụrụ ọrụ ahụ otú ọ bụla masịrị ya ka o nwee ike rụchaa ya ngwa ngwa? Baịbụl zara, sị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.”—Jen. 6:22.

12 Ọrụ ahụ were ya ihe dị ka afọ iri anọ ma ọ bụ afọ iri ise. Ha ga-egbutusị osisi, buru ha gaa n’ebe ha ga-anọ arụ ụgbọ ahụ, waa ha, kpụchaa ha, ma kụkọta ha otú ha chọrọ. Ụgbọ ahụ ga-adị okpukpu atọ, a ga-ekebisịkwa ime ya ekebisị. Ọ ga-enwekwa ọnụ ụzọ n’otu akụkụ ya. O dokwara anya na ụgbọ ahụ nwegasịrị windo n’elu elu ya. A rụkwara ihe e ji kụchie elu ya otú mmiri na-agaghị adọ na ya.—Jen. 6:14-16.

13. Olee ọrụ ọzọ Noa rụrụ nke nwedịrị ike isiri ya ike karịa ịrụ ụgbọ ahụ, oleekwa ihe ndị mmadụ nọ na-eme mgbe ọ na-arụ ya?

13 Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ọ ga-abụ na obi tọrọ Noa ụtọ mgbe ọ hụrụ na ụgbọ ahụ akwụrụwala, hụkwa na ndị ezinụlọ ya kwụ ya n’azụ. E nwekwara ọrụ ọzọ Noa na-arụ nke nwedịrị ike isiri ya ike karịa ịrụ ụgbọ ahụ. Baịbụl gwara anyị na Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume.” (Gụọ 2 Pita 2:5.) Nke a na-egosi na o ji obi ike na-agwa ndị ajọ omume na a ga-ebibi ha n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ na ha agbanweghị omume ha. Gịnị ka ha mere mgbe Noa na-agwa ha ihe a? Jizọs Kraịst mechara kwuo ihe mere n’oge ahụ. Ọ sịrị na ha “amaghịkwa.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ha kwere ka ihe ndị ha na-eme ná ndụ, dị ka iri ihe oriri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịlụ di na ịlụ nwunye, mee ka ha ghara ige Noa ntị. (Mat. 24:37-39) O doro anya na ọtụtụ n’ime ha chịrị Noa na ezinụlọ ya ọchị. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha yiri ya egwu ma ọ bụkwanụ megide ya. Ọ ga-abụkwa na ha gbalịrị ka ha mebie ụgbọ ahụ.

N’agbanyeghị ihe niile gosiri na Chineke na-agọzi Noa, ndị mmadụ chịrị ya ọchị ma jụ ime ihe ọ gwara ha

14. Gịnị ka ezinụlọ ọ bụla bụ́ Ndị Kraịst taa nwere ike ịmụta n’ihe Noa na ezinụlọ ya mere?

14 N’agbanyeghị nke ahụ, Noa na ezinụlọ ya akwụsịghị ọrụ ahụ. Ha nọgidere na-arụ ya n’agbanyeghị na ha bi n’ụwa ebe onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru nakwa ebe ndị mmadụ chere na ụgbọ ahụ ha na-arụ enweghị isi. Taa, e nwere ọtụtụ ihe ezinụlọ ọ bụla bụ́ Ndị Kraịst ga-amụta n’okwukwe Noa na nke ezinụlọ ya n’ihi na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ (2 Tim. 3:1) Jizọs kwuru na oge anyị a ga-adị ka oge ahụ Noa na-ewu ụgbọ. Ọ bụrụ na ndị anyị na-ekwusara ozi ọma Alaeze Chineke enweghị mmasị n’ihe anyị na-agwa ha ma ọ bụ chịa anyị ọchị ma ọ bụkwanụ kpagbuo anyị, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ otú ahụ ka e mere Noa. Anyị abụghị ndị mbụ e mere ụdị ihe ahụ.

 “Banye n’Ụgbọ Ahụ”

15. Olee nsogbu ndị dabaara Noa mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo narị afọ isii?

15 Noa arụọla ọrụ a ọtụtụ afọ, ọrụ ahụ agwụkwala agwụ. Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo narị afọ isii, nna ya Lemek nwụrụ. * Afọ ise Lemek nwụchara, nna nna Noa, bụ́ Metusela, nwụkwara. Metusela dị narị afọ itoolu na iri isii na itoolu mgbe ọ nwụrụ. Na Baịbụl, ọ bụ ya bụ onye kacha dịtee ndụ aka. (Jen. 5:27) Ma Metusela ma Lemek dịrị ndụ n’oge Adam dịrị ndụ.

16, 17. (a) Gịnị ka Chineke gwara Noa mgbe ọ gbara narị afọ isii? (b) Kọwagodị ihe dị egwu Noa na ezinụlọ ya hụrụ n’oge ahụ.

16 Mgbe Noa gbara narị afọ isii, Jehova Chineke gwara ya ihe ọzọ ọ ga-eme. Ọ sịrị ya: “Banye n’ụgbọ ahụ, gị na ezinụlọ gị dum.” Chineke gwakwara Noa ka ọ chịba ụdị anụmanụ dị iche iche n’ụgbọ ahụ. Ọ sịrị ya na anụmanụ ndị dị ọcha, ya bụ, ndị nke e nwere ike iji chụọ àjà, ga-adị asaa asaa, ebe anụmanụ ndị nke ọzọ ga-adị abụọ abụọ.—Jen. 7:1-3.

17 Ihe mere mgbe ahụ dị egwu. Ọtụtụ puku ụmụ anụmanụ si ebe dị iche iche na-abịa n’ụgbọ ahụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, ma ndị na-eme nwayọọ nwayọọ ma ndị na-eme ike ike. Ụfọdụ jeere ije bịa, ụfọdụ feere efere, ụfọdụ rịịrị arịrị, ebe ndị ọzọ kpụụrụ akpụrụ ma ọ bụ wụụrụ awụrụ bịa n’ụgbọ ahụ. Anyị ekwesịghị iche na tupu anụmanụ ndị  ahụ abanye n’ụgbọ ahụ na ha nyere Noa nsogbu ma ọ bụkwanụ siere ya ọnwụ. Baịbụl kwuru na ha ‘bakwuuru Noa n’ime ụgbọ ahụ.’—Jen. 7:9.

18, 19. (a) Gịnị ka anyị nwere ike ịza ndị na-asị na ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru mere n’oge Noa emeghị eme? (b) Gịnị ka otú ahụ Jehova si chebe ụmụ anụmanụ na-akụziri anyị banyere amamihe ya?

18 Ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị: ‘Ihe a ọ̀ ga-ekweli omume? Olee otú anụmanụ niile ahụ ga-esi nọkọta otu ebe n’enweghị nke gburu ibe ya?’ Ma chegodị echiche: Ọ̀ bụ na Onye kere eluigwe na ụwa enweghị ike ime ka isi jụọ anụmanụ ndị na-akpa ike oyi ka a ghara inwe anụmanụ ga-emerụ ibe ya ahụ́? Cheta na ọ bụ Jehova Chineke kere anụmanụ ndị ahụ. Mgbe ọtụtụ afọ gafere, o mere ka Osimiri Uhie kewaa abụọ, meekwa ka anyanwụ kwụrụ otu ebe. Ọ̀ bụ na ọ gaghị emeli ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru mere n’oge Noa? O doro anya na ọ ga-emeli ha. O mekwara ha.

19 N’eziokwu, ọ bụrụ na Chineke chọrọ, ọ gaara esi ụzọ ọzọ chebe ụmụ anụmanụ. Ma otú a o si chebe ha na-echetara anyị ọrụ o nyere mmadụ mgbe o kere ụwa, nke bụ́ ka ha lekọtawa ihe niile dị ndụ n’ụwa. (Jen. 1:28) Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị nne na nna taa na-eji esi n’akụkọ Noa akụziri ụmụ ha na Jehova ji ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ kpọrọ ihe.

20. Mgbe ọ fọrọ ụbọchị asaa ka iju mmiri malite, olee ọrụ ndị ọ ga-abụ na Noa na ezinụlọ ya nọ na-arụ?

20 Jehova gwaziri Noa na ọ fọrọ ụbọchị asaa ka iju mmiri ahụ malite. Ọrụ ga-ezu Noa na ezinụlọ ya ahụ́ n’ime ụbọchị asaa ahụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ha na-ebuba ihe oriri ha na anụmanụ ndị ahụ ga-eri n’ime ụgbọ ahụ, na-edebe ihe oriri ndị ahụ na ngwongwo ha ndị  ọzọ n’ebe ha kwesịrị ịdị. Ọ ga-abụ na nwunye Noa, nwunye Shem, nwunye Ham, na nwunye Jefet nọ na-edozi ebe ha ga-ebi n’ime ụgbọ ahụ.

21, 22. (a) Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya na ndị oge Noa achọdịghị ịma ihe na-emenụ? (b) Olee mgbe ndị mmadụ kwụsịrị ịchị Noa na ndị ezinụlọ ya ọchị?

21 Oleekwanụ maka ụmụ mmadụ ndị ọzọ? N’agbanyeghị ihe niile na-egosi na Jehova na-agọzi Noa na ọrụ niile ọ na-arụ, ha ka kwụ ebe ha kwụ, ha ‘achọghị ịma’ na e nwere ihe na-aga ime. Ha nọkwa na-ele n’anya n’anya ka anụmanụ ndị ahụ nuuru na-abanye n’ụgbọ. Ma o kwesịghị iju anyị anya na ha achọdịghị ịma ma ò nwere ihe na-emenụ. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị taa. Ndị mmadụ na-eme anya ka ọ̀ bụ na ha anaghị ahụ ọtụtụ ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ. Pita onyeozi kwukwara na ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa. Ọ bụ ya mere ha ji achị ndị na-eme ihe Chineke kwuru ọchị n’oge anyị a. (Gụọ 2 Pita 3:3-6.) O doro anya na ndị mmadụ chịkwara Noa na ezinụlọ ya ọchị.

22 Ma olee mgbe ha kwụsịrị ọchị ahụ? Baịbụl gwara anyị na ozugbo Noa chịbachara anụmanụ n’ụgbọ ahụ, kpọbakwa ezinụlọ ya, ‘Jehova mechiri ụzọ mgbe Noa banyere.’ Ọ bụrụ na ndị ahụ na-achị ha ọchị hụrụ mgbe Jehova mechiri ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ, ọnụ ga-emechi ha. Ọ bụrụkwa na ha emechighị ọnụ mgbe ahụ, ha mechiri ya mgbe mmiri bidoro izo. Mmiri ahụ zogidere ruo mgbe o kpuchiri ụwa, dị ka Jehova kwuru.—Jen. 7:16-21.

23. (a) Olee otú anyị si mara na ọnwụ ndị ajọ omume ahụ e gburu n’oge Noa atọghị Jehova ụtọ? (b) Gịnị mere o ji dị mma ka anyị ṅomie okwukwe Noa n’oge a?

23 Obi ọ̀ tọrọ Jehova ụtọ na ndị ajọ omume ahụ nwụrụ? Mbanụ! (Ezik. 33:11) Ọ bụ ya mere o ji nye ha ohere ka ha gbanwee àgwà ọjọọ ha ma mewe ezi ihe. Hà gaara agbanwe omume ọjọọ ha ma a sị na ha chọrọ? Otú Noa si bie ndụ gosiri na ha gaara agbanwe. Noa mere ihe niile Jehova gwara ya mee. Ebe ọ bụ na ọ nwụghị n’iju mmiri ahụ, ndị ahụ agakwaraghị anwụ ma a sị na ha mere ka ya. E nwere ike ikwu na okwukwe Noa mara ụwa nke oge ahụ ikpe, ya bụ, o gosiri na ọ bụrụ na ndị ajọ omume ahụ chọrọ ịgbanwe omume ọjọọ ha, ha gaara agbanwe ya. Ọ bụ okwukwe ya na ezinụlọ ya nwere mere ha ji dịrị ndụ. Ọ bụrụ na i nwee ụdị okwukwe Noa nwere, ọ ga-emekwa ka a zọpụta gị, zọpụtakwa ndị ị hụrụ n’anya. I nwere ike iso Jehova Chineke na-eje ije ma bụrụ enyi ya otú ahụ Noa mere. I mee otú ahụ, gị na Jehova nwere ike ịbụ enyi ruo mgbe ebighị ebi.

^ para. 7 N’oge ahụ, ndị mmadụ na-adịte ndụ aka karịa otú anyị na-adị taa. O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na oge ha dịrị ndụ dị nso n’oge Adam na Iv ka zuru okè ma gbasie ike.

^ para. 15 Ọ bụ Lemek gụrụ Noa aha. Ọ ga-abụ na ihe aha ahụ bụ́ Noa pụtara bụ “Ezumike” ma ọ bụ “Nkasi Obi.” Lemek bukwara amụma na Noa ga-emezu ihe aha ya pụtara nke bụ́ na ọ ga-arụ ọrụ ga-eme ka ụmụ mmadụ zuru ike ná ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ihi ọnụ Jehova bụrụ ala. (Jen. 5:28, 29) Lemek nwụrụ tupu amụma a emezuo. Ọ ga-abụ na nne Noa na ụmụnne Noa ndị nwoke na ndị nwaanyị so ná ndị nwụrụ n’iju mmiri ahụ.

GỤKWUO GBASARA YA

E Chebere Noa “na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”

Olee otú Chineke si chebe Noa na ezinụlọ ya n’oge o ji iju mmiri bibie ụwa?