Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ASAA

“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

1, 2. (a) Olee otú otu onye ọbịa si kelee Meri? (b) Olee ihe na-eme ná ndụ Meri n’oge ahụ onye ọbịa ahụ bịakwutere ya?

Ọ TỤRỤ Meri n’anya mgbe otu onye ọbịa bịara n’ụlọ ya. Onye ọbịa ahụ ajụghị ya maka nne ya ma ọ bụ nna ya. Ọ bụ yanwa ka ọ bịara ịhụ. O doro Meri anya na onye a abụghị onye Nazaret. N’obodo nta dị ka Nazaret, ọ naghị esi ike ịmata onye bụ́ ọbịa. Ma, o nwekwanụghị ebe onye ọbịa nke a ga-aga, a ghara ịma na ọ bụ ọbịa. Ekele o kelere Meri dị iche n’otú ndị mmadụ si ekele ibe ha. Ọ sịrị Meri: “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu, Jehova nọnyeere gị.”—Gụọ Luk 1:26-28.

2 Ọ bụ ihe a bụ ihe mbụ Baịbụl kọọrọ anyị banyere Meri. Meri bụ nwa Hilaị, onye Nazaret nke dị na Galili. Akụkọ Meri malitere n’oge Meri na-abịa ime mkpebi dị mkpa ná ndụ ya. Ya na Josef onye ọkwa nkà kwere ibe ha nkwa ọlụlụ. Josef abụghị ọgaranya, ma o nwere okwukwe. N’ihi ya, o yiri ka Meri ọ̀ matala otú ihe ga-adịrị ya, ya bụ, na ọ gaghị abụ onye ukwu. Kama, ọ ga-aghọ nwunye Josef. Ọ ga-enyekwara di ya aka ịzụ ụmụ ha ga-amụ. Ma tupu ya amara ihe na-emenụ, onye ọbịa ahụ gwara ya ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ, bụ́ nke ga-agbanwe ndụ ya.

3, 4. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata onye Meri bụ, olee ihe ndị anyị kwesịrị iwepụ obi na ya, oleekwa ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya?

3 Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya na Baịbụl akọrọghị anyị ọtụtụ ihe banyere Meri. O nweghị oké ihe Baịbụl kwuru banyere otú e si zụlite ya, àgwà ya, na otú ọ dị n’anya. Ma, ihe ole na ole Baịbụl kwuru banyere ya bara ezigbo uru.

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata onye Meri bụ, anyị kwesịrị iwepụ obi anyị n’ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu a na-akụzi banyere ya n’okpukpe dị iche iche. N’ihi ya, ka anyị hapụgodị otú ọtụtụ ndị sirila see ya, tụọ ya, ma ọ bụ kpụọ ya n’ebe dị iche iche. Ka anyị hapụkwa ozizi dị mgbagwoju anya ndị okpukpe na-ezi nke mere ha ji akpọ nwaanyị a dị umeala n’obi oké aha ndị dị ka: “Nne nke Chukwu” na “Eze Nwaanyị nke Eluigwe.” Ka anyị lekwasị anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere ya. Ọ ga-eme ka anyị ghọta ihe mere okwukwe ya ji sie ike na otú anyị nwere ike isi ṅomie ya.

Mmụọ Ozi Bịara n’Ụlọ Ya

5. (a) Gịnị ka ihe mere mgbe Gebriel kelere Meri na-akụziri anyị banyere Meri? (b) Olee ihe dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’aka Meri?

5 Onye ahụ bịara n’ụlọ Meri abụghị mmadụ. Ọ bụ mmụọ ozi a na-akpọ Gebriel. Mgbe ọ kpọrọ Meri “onye e meere amara dị ukwuu,” ihe o kwuru ‘nyere Meri nsogbu nke ukwuu,’ ya echewe ihe ekele a pụtara. (Luk 1:29) Ònye meere ya amara a? Meri atụghị anya ka a kwanyere ya ùgwù pụrụ iche. Ma, ihe mmụọ ozi ahụ na-ekwu bụ amara Jehova bụ́ Chineke meere Meri. Nke ahụ dị Meri mkpa. Ma, ebe ọ bụ na ọ dịghị mpako, o wereghị onwe ya ka onye Chineke meere amara. Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ka Chineke meere anyị amara, ma ghara iji nganga na-eche na e meerela anyị amara, anyị ga-amụta ihe dị mkpa Meri mụtara. Ihe ọ mụtara bụ na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ hụrụ ndị wedara onwe ha ala na ndị dị umeala n’obi n’anya, ọ na-enyekwara ha aka.—Jems 4:6.

Meri adịghị mpako, o wereghị onwe ya ka onye Chineke meere amara

6. Olee ọrụ pụrụ iche mmụọ ozi gwara Meri na ọ ga-arụ?

6 Meri kwesịrị ịdị umeala n’obi n’ihi na mmụọ ozi ahụ chọrọ ịgwa ya ọrụ na-enweghị atụ ọ ga-arụ. Ọ gwara ya na ọ ga-amụ nwa nke ga-aghọ onye kacha mkpa n’ụmụ mmadụ niile. Gebriel sịrị: “Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:32, 33) O doro anya na Meri maara nkwa Chineke kwere Devid ihe karịrị otu puku afọ tupu mgbe ahụ, ya bụ, na otu n’ime ụmụ ya ga-achị ruo mgbe ebighị ebi. (2 Sam. 7:12, 13) Nke a pụtara na nwa ya ga-abụ Mesaya, bụ́ onye ndị na-efe Chineke nọ na-atụ anya ya kemgbe ọtụtụ narị afọ.

Mmụọ ozi Gebriel gwara Meri ọrụ na-enweghị atụ Chineke nyere ya

7. (a) Olee ihe ajụjụ Meri jụrụ mmụọ ozi ahụ na-akụziri anyị banyere Meri? (b) Olee ihe ndị na-eto eto taa nwere ike ịmụta n’aka Meri?

7 Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya na ‘a ga-akpọ nwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu.’ Olee otú nwaanyị nkịtị ga-esi mụọ Ọkpara Chineke? Oleedị otú Meri ga-esi amụ nwa? Ya na Josef ka kwere ibe ha nkwa ọlụlụ, ma ha alụbeghị. Meri jụrụ mmụọ ozi ahụ n’ezoghị ọnụ, sị: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?” (Luk 1:34) Ị̀ hụrụ na ihere emeghị Meri ikwu na ya bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke? Kama nke ahụ, obi dị ya ụtọ na ya amaghị nwoke. Taa, ọ na-adị ọtụtụ ndị na-eto eto ọkụ n’ahụ́ ka ha nwee mmekọahụ, ha na-ejikwa ndị nke na-amabeghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị eme ihe ọchị. N’eziokwu, ụwa agbanweela. Ma, Jehova anaghị agbanwe agbanwe. (Mal. 3:6) N’oge a, Jehova hụrụ ndị  na-erubere iwu ya isi n’anya otú ahụ ọ hụrụ ha n’anya n’oge Meri.—Gụọ Ndị Hibru 13:4.

8. Olee otú Meri ga-esi amụ nwa zuru okè n’agbanyeghị na yanwa ezughị okè?

8 Ọ bụ eziokwu na Meri bụ ezigbo ohu Chineke, ma o zughị okè. Oleezi otú ọ ga-esi mụọ nwa zuru okè, bụ́ Ọkpara Chineke? Gebriel kwuru, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35) Ihe dị nsọ pụtara “ihe dị ọcha,” “ihe na-enweghị ntụpọ” ma ọ bụ “ihe na-arụghị arụ.” Ụmụ mmadụ na-ebufe ụmụ ha mmehie, ha aghọọ ndị na-adịghị ọcha. Ma, na nke Jizọs, Jehova ga-arụ ọrụ ebube pụrụ iche. Ọ ga-esi n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri ma jiri mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nke na-arụ ọrụ mgbe niile, ‘kpuchie’ Meri ma chebe nwa ahụ ka ọ ghara ibute mmehie. Meri ò kwetara ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya? Olee ihe o kwuru?

Ihe Meri Gwara Gebriel

9. (a) Gịnị mere na mmadụ ekwesịghị ikwu na Meri agaghị amụli nwa maka na ọ mabeghị nwoke? (b) Olee ihe ọzọ Gebriel kwuru nke mere ka okwukwe Meri sikwuo ike?

9 E nwere ọtụtụ ndị na-ekweghị na nwaanyị na-amaghị nwoke nwere ike ịmụ nwa. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọkà mmụta okpukpe, bụ́ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst. N’agbanyeghị akwụkwọ niile ha gụrụ, ha aghọtaghị otu ihe dị mfe nghọta nke Gebriel gwara Meri. Gebriel sịrị na “n’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.” (Luk 1:37) Meri kwetara na ihe Gebriel gwara ya bụ eziokwu n’ihi na ọ bụ nwa agbọghọ okwukwe ya siri ike. Ma, nke a apụtaghị na Meri na-ekwere ihe ọ bụla ọ nụrụ. Meri ga-achọ ịhụ ihe ga-eme ka o kweta ihe a gwara ya, otú mmadụ ọ bụla na-eche echiche ga-eme. Gebriel dịkwa njikere ịgwa ya ihe ọzọ mere ọ ga-eji ekweta. Ọ gwara ya banyere Elizabet bụ́ onye ikwu ya merela agadi. Onye ọ bụla ma na Elizabet bụ nwaanyị aga. Ma ọ gwara ya na Chineke emeela ka ọ tụrụ ime.

10. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na ọrụ ahụ e nyere Meri esirighị ya ike?

10 Olee ihe Meri ga-eme ugbu a? A gwala ya ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ, gwakwa ya ihe gosiri na Chineke ga-eme ihe niile Gebriel kwuru. Anyị ekwesịghị iche na ọrụ ọma a e nyere ya atụghị ya ụjọ ma ọ bụ na o sirighị ya ike. Otu ihe mere o ji siere ya ike bụ na ya na Josef kwere ibe ha nkwa ọlụlụ. Josef ọ̀ ka ga-ekwe alụ ya ma ọ chọpụta na ọ dị ime? Ihe ọzọ bụ na ọrụ ahụ e nyere ya abụghị obere ọrụ. Ọ ga-eburu ndụ nke onye kacha mkpa n’ihe niile Chineke kere eke n’afọ, ya bụ, ndụ Ọkpara Chineke. Ọ bụ Meri ga na-elekọta ya mgbe ọ dị obere, chebekwa ya ka ihe ghara ime ya n’ụwa ọjọọ a. N’eziokwu, ihe a abụghị obere ọrụ.

11, 12. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị na-efe Chineke mere mgbe Chineke nyere ha ọrụ siri ike? (b) Gịnị ka ihe Meri gwara Gebriel na-akụziri anyị?

 11 Baịbụl gosiri na o nweela mgbe ndị ikom na-efe Chineke na-ekwechaghị anara ọrụ siri ike Chineke nyere ha n’agbanyeghị na obi kara ha. Mozis kwuru na okwu anaghị aga ya were were n’ọnụ, na ya agaghị abụli ọnụ na-ekwuru Chineke. (Ọpụ. 4:10) Jeremaya kwuru na ya bụ “nwata,” ya bụ, na ya dị obere ịrụ ọrụ Chineke nyere ya. (Jer. 1:6) Jona gbara ọsọ n’ihi ọrụ Chineke nyere ya. (Jona 1:3) Oleekwanụ maka Meri?

12 Ndị nwere okwukwe na Chineke ka na-echeta okwu o kwuru bụ́ ndị gosiri na ọ dị umeala n’obi ma na-erube isi. Ọ gwara Gebriel, sị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova! Ka o mee dị ka i kwuru.” (Luk 1:38) Nwa agbọghọ bụ́ ohu bụ odibo kacha dị ala. Ndụ ya dị n’aka nna ya ukwu. Ọ bụ otú ahụ ka Meri si were onwe ya n’ebe Nna ya ukwu, bụ́ Jehova, nọ. Ọ ma na ebe ndụ ya dị n’aka Chineke, o nweghị ihe ga-eme ya n’ihi na ọ ma na Chineke anaghị ahapụ ndị ji obi ha niile na-efe ya. Ọ makwa na Chineke ga-agọzi ya ma ọ bụrụ na ya emee ihe niile ya nwere ike ime n’ọrụ ahụ siri ike o nyere ya.—Ọma 18:25.

Meri ma na ebe ndụ ya dị n’aka Chineke, o nweghị ihe ga-eme ya n’ihi na Chineke ya, bụ́ Jehova, anaghị ahapụ ndị ji obi ha niile na-efe ya

13. Ọ bụrụ na ihe Chineke gwara anyị mee eyie anyị ka ihe siri ike ma ọ bụkwanụ ihe na-agaghị ekwe anyị omume, olee otú ihe Meri mere ga-esi baara anyị uru?

13 Mgbe ụfọdụ, Chineke na-agwa anyị mee ihe anyị nwere ike iche na o siri ike ime, ma ọ bụkwanụ ihe yiri anyị ka ọ gaghị ekwe anyị omume. Ma, n’Okwu ya bụ́ Baịbụl, ọ gwara anyị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụkwasị ya obi otú ahụ Meri mere. (Ilu 3:5, 6) Ànyị ga-eme otú ahụ? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-agọzi anyị. Otú ọ ga-esi agọzi anyị bụ na ọ ga-eme ka okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike.

Meri Gara na nke Elizabet

14, 15. (a) Olee otú Jehova si gọzie Meri mgbe ọ gara n’ụlọ Elizabet na Zekaraya? (b) Gịnị ka ihe Meri kwuru na Luk 1:46-55 na-akụziri anyị banyere ya?

14 Ihe Gebriel gwara Meri banyere Elizabet baara Meri ezigbo uru. Ọ dịghị nwaanyị ọzọ nọ n’ụwa ga-aghọta otú obi dị Meri ka Elizabet. Meri jikeere ngwa ngwa gawa n’ógbè Juda bụ́ ugwu ugwu. Ịga na nke Elizabet nwere ike iwe ya ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ. Mgbe ọ banyere n’ụlọ Elizabet na Zekaraya bụ́ onye nchụàjà, Jehova mere ka Meri hụkwuo ihe ga-eme ka okwukwe ya sikwuo ike. Ozugbo  Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa Elizabet bu n’afọ maliri elu n’ihi ọṅụ. Mgbe ihe a mere, Elizabet jupụtara na mmụọ nsọ, ya akpọọ Meri “nne nke Onyenwe m.” Chineke eburula ụzọ mee ka Elizabet mara na nwa Meri ga-amụ ga-abụ Onyenwe ya, bụ́ Mesaya. Mmụọ nsọ mekwara ka ọ jaa Meri mma maka otú o si rube isi ma nwee okwukwe. Elizabet sịrị: “Obi ụtọ na-adịkwara nwaanyị nke kweere.” (Luk 1:39-45) N’eziokwu, ihe niile Jehova kwere Meri ná nkwa ga-emezu.

Enyi Meri na Elizabet bụ baara ha abụọ uru

15 Mgbe Elizabet kwuchara, Meri kwuru nke ya. E dere ihe Meri kwuru na Baịbụl. (Gụọ Luk 1:46-55.) Ihe a bụ okwu kacha ogologo n’okwu niile Meri kwuru e dere na Baịbụl. Ihe o kwuru na-emekwa  ka anyị mata ọtụtụ ihe banyere ya. Ọ na-eme ka anyị mata na Meri kelere Jehova nakwa na obi dị ya ụtọ maka otú Chineke si gọzie ya ma nye ya ọrụ ịbụ nne Mesaya. Ọ na-egosikwa anyị otú Meri nweruru okwukwe na Chineke n’ihi na o kwuru na Jehova na-eweda ndị mpako na ndị ukwu n’ala ma na-enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị ogbenye bụ́ ndị na-efe ya ofufe aka. Ihe Meri kwuru na-egosikwa anyị na Meri maruru Akwụkwọ Nsọ ala. Otu nchọpụta e mere gosiri na o kwuru ihe karịrị ihe iri abụọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. *

16, 17. (a) Olee ihe Meri na nwa ya mere nke anyị kwesịrị iṅomi? (b) Olee ihe bara uru anyị na-amụta n’otú Meri na Elizabet si nọrịa?

16 O doro anya na Meri chebaara Okwu Chineke echiche nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị umeala n’obi. Ọ bụ ya mere o ji kwuo ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, ọ bụghị ikwu echiche nke aka ya. Nwa ahụ ọ dị ime ya ga-emecha mee otú ahụ o mere. Nwa ahụ ga-emecha kwuo, sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù otú a? Ka ihe na-amasị m ọ̀ bụ echiche nke m na ozizi nke m?’ Ihe Meri mere doro anya.

17 Meri nọ na nke Elizabet ruo ihe dị ka ọnwa atọ. O doro anya na ha ji oge ahụ gbarịtaa ibe ha ume. (Luk 1:56) Ihe Baịbụl kwuru banyere ụmụ nwaanyị abụọ a na-echetara anyị uru mmadụ inwe ezigbo enyi bara. Ọ bụrụ na ndị anyị na-eme enyi bụ ndị hụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’anya, anyị na Chineke ga-adịkwu ná mma, anyị ga-abịarukwu ya nso. (Ilu 13:20) Oge mechara ruo ka Meri laa n’ụlọ ya. Gịnị ka Josef ga-ekwu ma ọ mata na Meri adịla ime?

Meri na Josef

18. Olee ihe Meri gwara Josef, oleekwa ihe Josef mere?

18 Ọ ga-abụ na Meri echeweghị ka afọ ya buo tupu ya agwa Josef na ya dị ime. O doro anya na ọ gwara Josef. Tupu ya agakwuru Josef, ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche ihe nwoke a na-atụ egwu Chineke ga-eme mgbe ọ ga-anụ ihe ọ ga-agwa ya. Ma, ọ gakwuuru ya ma gwa ya ihe niile merenụ. Ihe ọ gwara Josef nyere Josef nsogbu n’obi nke ukwuu. Ọ chọrọ ikweta ihe nwa agbọghọ a ọ hụrụ n’anya kwuru, ma ihe ahụ ọ kọọrọ ya emetụbeghị mbụ. Baịbụl ekwughị ihe Josef nọ na-eche. Ma, ihe Baịbụl kwuru bụ na o kpebiri ịgba Meri alụkwaghịm n’ihi na n’oge ahụ, a na-ewere ndị kwere ibe ha nkwa ọlụlụ ka di na nwunye. Ma, Josef achọghị imenye ya ihere n’ihu ọha ma ọ bụ mee ka a taa ya ahụhụ, ọ bụ ya mere o ji chọọ ịhapụ ya na nzuzo. (Mat. 1:18, 19) Ọ ga-abụ na o wutere Meri ịhụ ka nwoke  obiọma a nọ na-echegbu onwe ya n’ihi ihe ahụ merenụ. Ma, Meri ghọtara na ụta adịrịghị Josef.

19. Olee otú Jehova si nyere Josef aka ka o mee ihe o kwesịrị ime?

19 Jehova ekweghị ka Josef mee ihe ahụ o chere kaara ya mma ime. Mmụọ ozi Chineke gwara ya ná nrọ na ime Meri dị bụ ọrụ ebube. O doro anya na ihe a a gwara ya mere ka obi ruo ya ala. Josef meziri ihe Meri mere ná mmalite, ya bụ, o rubeere Jehova isi. Ọ lụrụ Meri ma jikere ilekọta Ọkpara Jehova, bụ́ ọrụ pụrụ iche Jehova chọrọ ka ọ rụọ.—Mat. 1:20-24.

20, 21. Olee ihe ndị di na nwunye na ndị na-achọ ịlụ alụ nwere ike ịmụta n’aka Meri na Josef?

20 Ndị di na nwunye na ndị na-achọ ịlụ alụ kwesịrị ịmụta ihe n’aka Josef na Meri bụ́ ndị dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. Mgbe Josef hụrụ ka nwunye ọhụrụ ya na-arụ ọrụ e nyere ya ma na-elekọta nwa ahụ, o doro anya na obi tọrọ ya ụtọ na mmụọ ozi Jehova gwara ya ihe ọ ga-eme. Ọ ga-abụ na Josef mụtara na ọ bara uru ka mmadụ na-atụkwasị Jehova obi mgbe onye ahụ chọrọ ime mkpebi ndị dị mkpa. (Ọma 37:5; Ilu 18:13) Ebe ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ ya, o doro anya na o leziri anya mgbe ọ na-eme mkpebi ndị ọzọ n’ezinụlọ ya.

21 Oleekwanụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Meri ebe ọ bụ na o kwere ka Josef lụọ ya n’agbanyeghị na Josef ekwetabughị ihe ọ gwara ya? Ọ bụ eziokwu na o siiri Josef ike ikweta ihe Meri kọọrọ ya, Meri cheere ka onye a ga-abụ onyeisi ezinụlọ ya kpebie ihe ha ga-eme. N’eziokwu, Meri chọpụtara na inwe ndidi amaka. Ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst taa kwesịkwara ịmụta otu ihe ahụ. Ọ ga-abụ na ihe ndị ahụ merenụ kụziiri ma Josef ma Meri na ọ bara uru ka ndị di na nwunye na ndị chọrọ ịlụ alụ na-ekwurịta okwu nke ọma n’ezoghị ihe ọ bụla.—Gụọ Ilu 15:22.

22. Olee ihe mere o ji bụrụ na Josef na Meri malitere ọlụlụ ha otú kwesịrị ekwesị, oleekwa ihe chere ha ihu?

22 N’eziokwu, Josef na Meri malitere ọlụlụ ha otú kwesịrị ekwesị. Ha abụọ hụrụ Jehova bụ́ Chineke n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ, ha gbakwara mbọ ka ha mee ihe ga-atọ ya ụtọ. Ọ bụ ya mere ha ji jiri ọrụ ịzụ nwa ha kpọrọ ihe. Ma, ngọzi ha ka ga-enweta buru ibu, nsogbu ndị ka ga-abịara ha ka bukwara ibu. Ọrụ chere ha ihu bụ ịzụ Jizọs, bụ́ onye ga-eto ghọọ nwoke kacha ukwuu nke dịtụrụla ndụ n’ụwa.

^ para. 15 Ihe ndị so n’ihe Meri kwuru bụ ihe Hana bụ́ nwaanyị nwere okwukwe kwuburu. Jehova gọziri Hana ma mee ka ọ mụta nwa otú o meere Meri.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ, “Ekpere Abụọ Pụrụ Iche.” Ọ dị n’Isi nke 6.