Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ASATỌ

Ọ Nọ Na-eche ‘Ihe Ihe Ndị ahụ Pụtara’

Ọ Nọ Na-eche ‘Ihe Ihe Ndị ahụ Pụtara’

1, 2. Olee ebe Meri na-aga, oleekwa ihe mere njem a adịrịghị ya mfe?

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ ka Meri gbalịrị ka ya nọzie n’elu obere ịnyịnya ibu bu ya. Ọ nọọla ọtụtụ awa n’elu ịnyịnya ahụ. Josef nọ n’ihu jiri ụkwụ na-aga. Ọ bụ ya du Meri na-aga n’okporo ụzọ a gara Betlehem, ụzọ ka dịkwa anya. Nwa Meri bu n’afọ megharịrị ahụ́ ọzọ.

2 Nwa ahụ o bu n’afọ akaala. Baịbụl kwuru hoo haa na ọ dị “ime ọmụmụ ugbu a.” (Luk 2:5) Ka Josef na Meri nọ na-agafe ubi dị iche iche, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị na-akọ ihe ma ọ bụ na-agha mkpụrụ n’ubi ndị ahụ nọ na-ele ha anya, na-eche ihe mere nwaanyị a afọ ya karala aka ga-eji gawa njem n’oge a. Gịnị mere Meri ji hapụ ebe o bi na Nazaret gawa ebe ahụ dị anya?

3. Olee ọrụ e nyere Meri, oleekwa ihe anyị ga-amụta banyere Meri?

3 Ihe niile a malitere n’ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, bụ́ mgbe e nyere nwa agbọghọ a bụ́ onye Juu ọrụ a na-enyetụbeghị mmadụ ọ bụla ọzọ n’ụwa. A gwara ya na ọ ga-amụ nwa nwoke, nakwa na nwa ahụ ga-aghọ Mesaya, bụ́ Ọkpara Chineke. (Luk 1:35) Mgbe oge ọ ga-amụ nwa ruwere, ọ bịara dị mkpa ka ha gaa ebe a ha na-aga. E nwere ọtụtụ ihe na-adịrịghị Meri mfe mere na njem a. Ka anyị hụ ihe ndị mere ka okwukwe ya sie ike n’agbanyeghị ihe ndị ahụ merenụ.

Ịga Betlehem

4, 5. (a) Gịnị mere Josef na Meri ji na-aga Betlehem? (b) Olee amụma nke iwu Siza nyere mere ka e mezuo?

4 Ọ bụghị naanị Josef na Meri na-aga njem n’oge ahụ. O tebeghị aka Siza Ọgọstọs nyere iwu ka mmadụ niile gaa n’ala a mụrụ ha deba aha ha n’akwụkwọ. Gịnị ka Josef mere? Baịbụl kwuru, sị: “Ya mere, Josef sikwa na Galili gawa, hapụ obodo Nazaret, banye Judia, n’obodo Devid, nke a na-akpọ Betlehem, n’ihi na o si n’ụlọ nakwa n’ezinụlọ Devid.”—Luk 2:1-4.

5 O nwere ihe mere iwu ahụ Siza nyere ji daba n’oge a. Otu amụma e buru n’ihe dị ka narị afọ asaa tupu ya enye iwu ahụ kwuru na  a ga-amụ Mesaya na Betlehem. Ọ dabara na e nwere obodo nta a na-akpọ Betlehem nke dị naanị kilomita iri na otu ma e si Nazaret gawa ya. Ma, amụma ahụ kwuru hoo haa na ọ bụ na “Betlehem Efrata” ka a ga-amụ Mesaya ahụ. (Gụọ Maịka 5:2.) Ọ bụrụ na mmadụ e si Nazaret gawa obere obodo a bụ́ Betlehem Efrata, ọ ga-esi ụzọ Sameria bụ́ ugwu ugwu gaa ya, ọ ga-agakwa ihe dị ka otu narị kilomita na iri atọ tupu ya eruo. Ọ bụ Betlehem a ka Josef gawara n’ihi na ọ bụ ya bụ obodo Eze Devid na ezinụlọ ya, Josef na nwaanyị a ọ lụrụ ọhụrụ sikwa n’ezinụlọ Devid.

6, 7. (a) Gịnị mere na ọ gaghị adịrị Meri mfe ịga Betlehem? (b) Olee ihe dị iche n’otú Meri si ekpebibu ihe ndị ọ na-eme na otú o si ekpebi ha ugbu a ọ ghọrọla nwunye Josef? (Jiri ihe e dere n’ala ala zaa ya.)

6 Meri ò kwetara iso Josef ebe ọ bụ na Josef ekpebiela na ha ga-aga? A sị ka e kwuwe, ọ ga-esiri ya ike ịga. Ihe a ga-abụ mbido ọnwa Ọktoba, n’ihi ya, mmiri nwere ike izo ebe ọ bụ na oge ọkọchị ha akwụsịwala. Ihe ọzọkwa bụ na Betlehem dị n’ugwu. Ihe ọ pụtara bụ na onye si Nazaret na-aga ebe ahụ ga-aga ije ọtụtụ ụbọchị, ya rutewe, ya abịazie rịwa ugwu. O nwekwara ike iwekwu ha oge n’ihi na ha ga na-ezurutụ ike n’ụzọ n’ihi Meri. Nwa agbọghọ ọ bụla dị ime ọmụmụ ga-achọ ịnọ nso n’ụlọ ya, bụ́ ebe ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya nọ, ka ha wee nyere ya aka mgbe ime ga-amalite ime ya. O doro anya na Meri ga-akatagodị obi tupu ya agawa ebe a ha na-aga.

Ịga Betlehem adịghị mfe

 7 Luk dere na Josef gara “ka e wee deba aha ya na Meri n’akwụkwọ.” O kwukwara na Josef ‘alụwo’ Meri. (Luk 2:4, 5) Ihe so mee ka Meri kweta ịga bụ na ọ ghọọla nwunye Josef. Ọ ma na di ya bụ isi ya, ọ nabatakwara ọrụ Chineke nyere ya, nke bụ́ na ọ ga-abụ onye inyeaka di ya. Nke a pụtara na ọ ga na-enyere di ya aka ka ihe di ya kpebiri ime gazie agazie. * Meri rubeere di ya isi, o sikwa otú ahụ gosi na ya nwere okwukwe.

8. (a) Olee ihe ọzọ nwere ike iso mee ka Meri kweta iso Josef gaa Betlehem? (b) Olee otú ihe Meri mere nwere ike isi baara ndị na-atụ egwu Chineke uru taa?

8 Olee ihe ọzọ mere ka Meri rubere Josef isi? Ọ̀ ga-abụ na ọ ma na e buru amụma na ọ bụ na Betlehem ka a ga-amụ Mesaya? Baịbụl agwaghị anyị. O nwere ike ịbụ na ọ ma, n’ihi na ma ndị isi okpukpe ha ma onye ukwu ma onye nta ma na a ga-amụ ya n’ebe ahụ. (Mat. 2:1-7; Jọn 7:40-42) Ihe ọzọkwa bụ na Meri ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. (Luk 1:46-55) Ma ihe mere Meri ji kweta ịga ọ̀ bụ ka o rubere di ya isi ma ọ bụ ka o rubere ndị ọchịchị isi ma ọ bụ n’ihi amụma Jehova buru ma ọ bụkwanụ n’ihi ụzọ ihe atọ a, anyị kwesịrị iṅomi ihe a o mere. Jehova anaghị eji onye dị umeala n’obi ma na-erube  isi egwu egwu, ma onye ahụ ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. N’oge anyị a ọtụtụ ndị na-anaghị erube isi, ndị na-atụ egwu Chineke n’ebe niile n’ụwa kwesịrị ịna-erube isi ka Meri.

Ọmụmụ Kraịst

9, 10. (a) Gịnị nwere ike ịgbata Meri na Josef n’obi mgbe ha rutewere Betlehem? (b) Olee ebe Josef na Meri nọrọ mgbe ha rutere Betlehem, oleekwa ihe kpatara ya?

9 O doro anya na obi lọturu Meri mgbe ọ nọ n’ebe dị anya hụ Betlehem. Ka Meri na Josef nọ na-arị ugwu na-aga, na-ahụ mkpụrụ osisi oliv dị iche iche, nke so n’ihe ikpeazụ ndị ọrụ ubi na-ewere n’ubi ha, o nwere ike ịbụ na ha chetara ihe ndị merela n’obere obodo a. Obodo a dị ezigbo ntakịrị nke na a naghị agụnye ya ma a gụwa obodo ndị dị na Juda, dị ka Maịka onye amụma kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ na ya ka a mụrụ Boaz, Neomi, nakwa Devid n’ihe karịrị otu puku afọ tupu oge Josef na Meri.

10 Mgbe Meri na Josef rutere, ha hụrụ na ndị mmadụ jupụtara n’obodo a. Ndị ọzọ eburula ha ụzọ bịa ka e deba aha ha n’akwụkwọ. N’ihi ya, e nweghị ụlọ ndị njem fọdụrụnụ ha ga-anọ. * O nweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ́ bụghị ịnọrọ n’ụlọ anụ ka chi bọọ. Weregodị ya na ị na-ahụ Josef ka obi koro ya n’elu mgbe ọ hụrụ otú ahụ́ si na-egbu nwunye ya mgbu otú ọ na-egbutụbeghị ya, ya ahụkwa na ọ na-aka njọ. O nweghị ebe ọzọ ime malitere ime ya ma ọ́ bụghị n’ụlọ anụ.

11. (a) Gịnị mere ụmụ nwaanyị ga-eji aghọta na ọ dịrịghị Meri mfe n’oge ahụ ọ mụrụ nwa? (b) Olee otú Jizọs si bụrụ “nwa mbụ” na “onye e bu ụzọ mụọ”?

11 Ụmụ nwaanyị ga-aghọta na ọ dịrịghị Meri mfe n’oge ahụ. Ihe dị ka puku afọ anọ tupu oge Meri, Jehova buru amụma na ụmụ nwaanyị ga na-enwe ihe mgbu mgbe ha na-amụ nwa n’ihi mmehie anyị ketara n’aka Adam na Iv. (Jen. 3:16) O doro anya na Meri nwekwara ihe mgbu a. Luk akọghị otú o si nwee ihe mgbu mgbe ọ na-amụ nwa, naanị ihe o kwuru bụ: “O wee mụọ nwa ya nwoke, bụ́ nwa mbụ ya.” (Luk 2:7) N’eziokwu, nwa a Meri mụrụ bụ “nwa mbụ” ya, ya bụ, nwa mbụ ọ mụrụ tupu ya amụọ ụmụ ya ndị ọzọ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụmụ niile ọ mụrụ dị asaa. (Mak 6:3) Ma, nwa nke a pụrụ iche. Ihe ọ bụ abụghị naanị nwa mbụ Meri, ọ bụkwa onye Jehova “bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,” ya bụ, Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.—Kọl. 1:15.

12. Olee ebe Meri nyiwere nwa ya, oleekwa otú nke a si egosi na a na-etinye nnu na ose na fim nakwa n’akwụkwọ ndị e ji egosi ihe ndị mere mgbe a mụrụ Jizọs?

12 Luk kwuziri ihe ọzọ ọtụtụ ndị ma ugbu a. Ọ sịrị: “O wee jiri  ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.” (Luk 2:7) A na-etinyekarị nnu na ose na fim nakwa n’akwụkwọ ndị e ji egosi ihe ndị mere mgbe a mụrụ Jizọs. Ma, ka anyị lebagodị anya na nke bụ́ eziokwu. Ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri bụ efere satụrụ mbara anụmanụ na-etinye ọnụ na ya na-eri nri e debeere ha. Echefula na ọ bụ n’ụlọ anụ ka Josef na ezinụlọ ya nọbọrọ chi. Ụdị ebe a anaghị adị ọcha, ezigbo ikuku anaghịkwa abata na ya, ma n’oge ahụ ma n’oge anyị a. N’eziokwu, o nweghị nne na nna ga-ama ụma chọọ ka a mụọ nwa ha n’ụdị ebe ahụ ma ọ bụrụ na ọ dị ebe ọzọ e nwere ike ịnọ mụọ ya. Ọtụtụ nne na nna na-achọ imere ụmụ ha ihe kacha mma ha nwere ike imere ha. Meri na Josef chọkwara imere Ọkpara Chineke otu ihe ahụ.

13. (a) Olee otú Meri na Josef si meere nwa ha ihe niile ha nwere ike imere ya? (b) Olee otú ezigbo ndị nne na nna taa ga-esi eme ka Josef na Meri?

13 Ma, ha ekweghị ka iwe wee ha maka na ha enwetaghị ebe ka mma ha ga-anọ mụọ nwa ha. Ihe ha mere bụ ihe ha nwere ike ime. Dị ka ihe atụ, Meri lekọtara nwa ahụ nke ọma. Ọ fụrụ ya ákwà nke ọma ma nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri ka o hie ụra. Ihe mere o ji mee nke a bụ ka ahụ́ kporo nwa ahụ ọkụ nakwa ka a ghara inwe ihe ga-eme ya. Meri ekweghị ka ebe ahụ ha nọ mee ka o chegbuwe onwe ya ma gharazie ilekọta nwa ya nke ọma. Ya na Josef makwa na ihe kacha mkpa ha nwere ike imere nwa ahụ bụ ịkụziri ya otú ọ ga-esi ahụ Jehova n’anya. (Gụọ Diuterọnọmi 6:6-8.) N’oge anyị a, ezigbo ndị nne na nna ma na ihe kacha mkpa ha ga-emere ụmụ ha bụ ịzụ ha ka ha jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ndị mmadụ enweghị ihe ha ji ife Chineke kpọrọ.

A Bịara Gbaa Ha Ume

14, 15. (a) Gịnị mere ndị ọzụzụ atụrụ ji nuru bịa ka ha hụ nwa ahụ? (b) Olee ihe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ mere mgbe ha hụchara nwa ahụ n’ụlọ anụ?

14 Ndị ọzụzụ atụrụ meere mkpọtụ bata n’ebe ahụ Josef na Meri na nwa ha nọ. Ha nubatara n’ụlọ anụ ahụ ka ha hụ Josef na Meri, nke ka nke, nwa ha. Ọṅụ juru ndị ọzụzụ atụrụ ahụ obi, ihu ha gosikwara na obi dị ha ezigbo ụtọ. Ha si n’akụkụ ugwu ebe ha nọ na-azụ atụrụ ha gbara bịa. * Ka Josef na Meri nọ na-eche ihe mere ha ji bịa, ha gwaziri ha ihe dị ebube mere n’ihu ha. Ha kọọrọ Josef na Meri na otu mmụọ ozi pụtara n’ihu ha na mberede n’etiti abalị n’ebe ha nọ na-eche atụrụ ha nche. Ha kwuru na ìhè nke ebube Jehova nwuru gburugburu ha, mmụọ ozi ahụ agwa ha na a mụọla Kraịst,  ma ọ bụ Mesaya, na Betlehem, gwakwa ha na ha ga-ahụ nwa ahụ ebe a fụrụ ya ákwà ma nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kwuziri ihe ọzọ dị ịtụnanya merenụ. Ha sịrị na ọtụtụ ndị mmụọ ozi pụtara n’ihu ha na-abụku Chineke abụ otuto.—Luk 2:8-14.

15 Ka a sịkwa ihe mere ndị ikom ahụ ji jiri ọsọ bịa Betlehem. O doro anya na obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha hụrụ nwa ọhụrụ ahụ ka o dina n’ebe ahụ mmụọ ozi kwuru. Ha kọkwaara ndị ọzọ akụkọ ọma a. “Ha mere ka a mara ihe a gwara ha . . . Ihe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọọrọ ha jukwara ndị niile nụrụ ya anya.” (Luk 2:17, 18) N’oge ahụ, ndị isi okpukpe enweghị ihe ha ji ndị ọzụzụ atụrụ kpọrọ. Ma, o doro anya na Jehova ejighị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ dị umeala n’obi ma na-erubere ya isi egwu egwu. Oleekwanụ uru ọbịbịa ha bịara baara Meri?

O doro anya na Jehova ejighị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ dị umeala n’obi ma na-erubere ya isi egwu egwu

16. Olee otú Meri si gosi na ọ na-eche echiche nke ọma, oleekwa ihe dị mkpa mere ka o nwee okwukwe?

16 Ọ bụ eziokwu na ike ga-agwụcha Meri n’ihi nsogbu dị n’ịmụ nwa, ma ọ tọrọ ntị n’ala nụ ihe niile ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kwuru. O nwekwara ihe ọzọ o mere. Baịbụl kwuru, sị: “Meri buuru okwu a niile n’obi ya, na-eche ihe ihe ndị a pụtara.” (Luk 2:19) N’eziokwu, nwaanyị a na-eche echiche nke ọma. Ọ ma na ozi ahụ mmụọ ozi ziri dị ezigbo mkpa. Chineke ya, bụ́ Jehova, chọrọ ka ọ mata onye nwa ya bụ, matakwa na nwa ya dị oké mkpa. Meri gere ntị n’ihe ha kwuru. O tinyekwara ihe niile ha kwuru n’obi ya ka o nwee ike ịna-echeta ya mgbe ọtụtụ ọnwa na ọtụtụ afọ gachara. Ihe a Meri mere so n’ihe dị mkpa mere ka o nwee okwukwe ná ndụ ya niile.—Gụọ Ndị Hibru 11:1.

Meri tọrọ ntị n’ala nụ ihe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kwuru ma buru ihe ha kwuru n’obi

17. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Meri mgbe anyị gụrụ Okwu Chineke?

17 Ị̀ ga-eme ka Meri? Jehova mere ka e dee eziokwu ndị bara uru n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Ma, eziokwu ndị ahụ agaghị abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ gee ntị ma nụ ha. Otú anyị si eme nke a bụ ịgụchi Baịbụl anya na iwere ya ka Okwu si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bụghị ịgụ ya ka à ga-asị na ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ nkịtị. (2 Tim. 3:16) Mgbe anyị gụrụ Okwu Chineke, anyị kwesịkwara itinye ihe anyị gụtara n’obi anyị, na-echebara ha echiche ka anyị mata ihe ha pụtara otú Meri mere. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ na Baịbụl, na-echekwa echiche otú anyị nwere ike isi na-emekwu ihe Jehova gwara anyị, ọ ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike.

Ihe Ndị Ọzọ Ọ Ga-etinye n’Obi Ya

18. (a) Olee otú Meri na Josef si mee ihe Iwu Mozis kwuru n’oge na-adịghị anya a mụchara Jizọs? (b) Gịnị mere Josef na Meri ji nye nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ?

18 Mgbe nwa ahụ ruru abalị asatọ, Meri na Josef biri ya úgwù otú Iwu Mozis kwuru, ha gụkwara ya Jizọs dị ka a gwara ha. (Luk 1:31) Mgbe nwa ahụ ruru abalị iri anọ, ha si Betlehem kuru ya gaa n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Jeruselem dị ihe dị ka kilomita iri ma e si Betlehem gawa ya. Mgbe ha ruru, ha nyere onyinye e ji eme ka mmadụ dị ọcha, nke Iwu Mozis kwuru ka ndị ogbenye na-enye, ya bụ, nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ. Ọ bụrụ na o nwere otú ihere si mewe ha maka na aka ha erughị inye ebule na otu kpalakwukwu ndị nne na nna ndị ọzọ na-enye, ha ekweghị ka nke ahụ nyewe ha nsogbu. Ma, a gbara ha ume nke ukwuu mgbe ha nọ n’ebe ahụ.—Luk 2:21-24.

19. (a) Gịnị ka Simiọn kwuru nke Meri tinyekwuru n’obi ya? (b) Gịnị ka Ana mere mgbe ọ hụrụ Jizọs?

19 Otu agadi nwoke aha ya bụ Simiọn gakwuuru ha ma kwuo ọtụtụ ihe ọzọ Meri ga-etinye n’obi ya. E kwere Simiọn nkwa na tupu ya anwụọ, ọ ga-ahụ Mesaya ahụ. Mmụọ nsọ Jehova mekwara ka ọ mara na ọ bụ obere nwa a bụ́ Jizọs bụ Onye Nzọpụta ahụ e buru n’amụma. Simiọn kwukwara na otu ụbọchị, Meri ga-enwe ihe mgbu. Ọ gwara Meri na ọ ga-adị ya ka à manyere ya ogologo mma agha n’ahụ́. (Luk 2:25-35) N’agbanyeghị na ihe a Simiọn kwuru mere ka Meri mara na ebelebe ga-egbu otu ụbọchị, ọ ga-abụ na o nyeere Meri  aka idi nsogbu ndị mechara bịara ya mgbe ihe karịrị afọ iri atọ gafere. Mgbe Simiọn hụchara Jizọs, onye amụma nwaanyị aha ya bụ Ana hụkwara ya wee malite ịkọrọ ndị niile na-atụ anya mgbe a ga-anapụta Jeruselem banyere nwa ahụ.—Gụọ Luk 2:36-38.

A gbara Meri na Josef ume mgbe ha gara n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem

20. Gịnị mere o ji bụrụ na mbọ Josef na Meri gbara ịkpọta Jizọs n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem efughị ọhịa?

20 N’eziokwu, mbọ Josef na Meri gbara kpọrọ nwa ọhụrụ ha bịa n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem efughị ọhịa. Ha si otú a mee ka nwa ha malite ịga n’ụlọ nsọ Jehova. Nwa ha a mechakwara na-agachi ụlọ nsọ a anya ruo mgbe ọ nwụrụ. Mgbe ha nọ n’ụlọ nsọ a, ha nyere Jehova onyinye otú ike ha hà, a gbakwara ha ume ma mee ka ha mata ọtụtụ ihe banyere nwa ha. O doro anya na mgbe Meri si n’ụlọ nsọ ahụ lawa, okwukwe ya sikwuru ike, ya amatakwa ọtụtụ ihe dị mkpa ọ ga-echebara echiche ma kọọrọ ndị ọzọ.

21. Olee ihe anyị ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike ka nke Meri?

21 Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọtụtụ ndị nne na nna taa na-eme ihe ahụ Josef na Meri mere. Ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-akpọ ụmụ ha mgbe niile aga ọmụmụ ihe. Ndị nne na nna a na-emekwa ihe niile ha nwere ike ime iji gbaa Ndịàmà Jehova ibe ha ume. Mgbe ọ bụla ha gara ọmụmụ ihe lọta, okwukwe ha na-esikwu ike, obi na-atọkwu ha ụtọ, ha na-amụtakwa ihe ọma ndị ha ga-akọrọ ndị ọzọ. Iso ndị dị otú a zukọta ma mụọ Okwu Chineke na-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-agachi ọmụmụ ihe anya, anyị ga-achọpụta na okwukwe anyị ga na-esikwu ike ka nke Meri.

^ para. 7 E nwere ọdịiche dị n’ihe e kwuru n’amaokwu ndị ahụ na ihe e kwuru banyere oge Meri gara ịhụ Elizabet. Baịbụl sịrị: “Meri biliri . . . ma” gaa na nke Elizabet. (Luk 1:39) Ebe ọ bụ na Meri alụbeghị di n’oge ahụ, naanị nkwa ka Josef kwere ya na ọ ga-alụ ya, o nwere ike ịbụ na ọ gawara n’agwaghị Josef. Ma mgbe ha lụrụ, ọ bụ Josef kpebiri na ha ga-aga Betlehem, ọ bụghị Meri.

^ para. 10 N’oge ahụ, a na-enwe ọnụ ụlọ n’obodo dị iche iche bụ́ ebe ndị njem na ndị na-agafe agafe nwere ike ịnọbọ chi.

^ para. 14 Ebe ọ bụ na ndị ọzụzụ atụrụ ahụ bi n’ọhịa na-azụ atụrụ ha, anyị na-aghọta na ọ bụghị n’ọnwa Disemba ka a mụrụ Kraịst n’ihi na ọnwa Disemba bụ mgbe a na-edebe atụrụ nso n’ụlọ. Ọ ga-abụ ná mbido ọnwa Ọktoba ka a mụrụ ya n’ihi na ọnwa Ọktoba dabara n’oge Baịbụl na-egosi na a mụrụ Kraịst.