Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

Okwu Mmechi

Okwu Mmechi

“Bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.”—NDỊ HIBRU 6:12.

1, 2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike? Mee ihe atụ.

MMADỤ inwe okwukwe amaka. Ma mgbe ọ bụla anyị nụrụ okwu a bụ́ okwukwe, e nwere ihe kwesịrị ịgbata anyị n’obi. Ihe ahụ bụ “Ime ihe ngwa ngwa.” Ihe mere ọ ga-eji gbata anyị n’obi bụ na ọ bụrụ na anyị enweghị okwukwe, anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa ka anyị nwee ya. Ọ bụrụkwa na anyị nwere okwukwe, anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mee otú ahụ?

2 Weregodị ya na ị na-aga ije ná nnukwu ọzara. Mmiri na-agụsi gị ike. Ọ bụrụ na e nwee otú i si nweta mmiri, ị ga-eme ihe niile i nwere ike ime ka anwụ ghara ịmịkọrọ ya. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịgbanyekwu mmiri n’ihe i ji agbara mmiri ka mmiri ghara ịkọ gị ruo mgbe i ruru ebe ị na-aga. E nwere ike iji ezigbo okwukwe tụnyere mmiri ahụ nke dị ụkọ n’ọzara. Mmadụ inwe ezigbo okwukwe n’ụwa a adịghị mfe. Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe ngwa ngwa ka okwukwe anyị sikwuo ike, okwukwe anyị nwere ike ịnyụ ka ọkụ. Okwukwe dị anyị ezigbo mkpa otú mmiri dị anyị mkpa. Ọ bụrụ na anyị akwụsị ịṅụ mmiri, anyị ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na anyị enweghị okwukwe, anyị na Jehova agaghịzi adị ná mma.—Rom 1:17.

3. Olee ihe Jehova merela nke ga-enyere anyị aka inwe okwukwe, oleekwa ihe abụọ anyị kwesịrị icheta?

3 Jehova ma na anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa ka anyị nwee okwukwe. Ọ makwa na ọ naghị adịrị ụmụ mmadụ mfe inwe okwukwe n’oge a nakwa ime ka okwukwe ha ghara ịnyụ ọkụ. Ọ bụ ya mere o ji mee ka anyị nwee ndị anyị ga na-eṅomi okwukwe ha. Jehova mere ka Pọl onyeozi jiri ike mmụọ nsọ ya dee, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.” (Hib. 6:12) Ọ bụkwa ya mere nzukọ Jehova ji na-agwa anyị ka anyị gbalịsie ike ṅomie okwukwe nke ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe, dị ka ndị ahụ anyị mụrụ gbasara ha n’akwụkwọ a. Ma, olee ihe anyị ga-eme ugbu a? E nwere ihe abụọ anyị kwesịrị icheta. Ha bụ: (1) Anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị na-esikwu ike; (2) anyị kwesịrị ịna-echeta ihe ndị anyị na-atụ anya ha.

4. Olee otú o si bụrụ na Setan achọghị ka anyị nwee okwukwe, ma gịnị mere na nke a ekwesịghị ime ka obi daa anyị mbà?

4 Na-eme ka okwukwe gị sikwuo ike. Ọ dị otu onye iro nke na-achọghị ka anyị nwee okwukwe. Aha ya bụ Setan. Ọ bụ ya na-achị ụwa a. O meekwala ka ọ ghara ịdịrị ndị mmadụ mfe inwe okwukwe. Ọ ka anyị ike. Ma nke a ò kwesịrị ime ka obi daa anyị mbà, anyị echewe na anyị agaghị enweli okwukwe ma ọ bụ na anyị agaghị emeli ka okwukwe anyị sikwuo ike? Mba. Jehova bụ ezigbo Enyi nke ndị niile chọrọ inwe ezigbo okwukwe. Ọ gwara anyị na ebe ọ bụ na ya kwụ anyị n’azụ, anyị ga-eguzogideli Ekwensu, ya  agbapụkwa n’ebe anyị nọ. (Jems 4:7) Anyị na-eguzogide ya ma ọ bụrụ na anyị na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike kwa ụbọchị. Ma olee otú anyị ga-esi eme ka ọ na-esikwu ike?

5. Olee otú ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha si nwee okwukwe? Kọwaa.

5 Anyị amụtala na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ahụ nwere okwukwe esighị n’afọ nne ha nwewe ya. Otú ha si bie ndụ gosiri na ọ bụ mmụọ nsọ Jehova na-eme ka mmadụ nwee okwukwe. (Gal. 5:22, 23) Ha kpegaara Jehova ekpere ka o nyere ha aka ka ha nwee okwukwe, Jehova zakwara ekpere ha ma mee ka okwukwe ha sikwuo ike. Anyị kwesịrị ime ka ha. Anyị ekwesịghị ichefu na ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ma na-eme ihe dabara n’ekpere anyị, ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Ma, ò nwere ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ime?

6. Olee ihe anyị ga-eme ka akụkọ nke ọtụtụ ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl baara anyị ezigbo uru?

6 Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere okwukwe ka anyị lebara akụkọ ha anya n’akwụkwọ a. A ka nwere ọtụtụ ndị ọzọ a na-akọghị akụkọ ha n’akwụkwọ a. (Gụọ Ndị Hibru 11:32.) Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere ma meda obi gụọ banyere onye nke ọ bụla n’ime ha, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na anyị agụọ akụkọ ha elu elu, okwukwe anyị agaghị esicha ike. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị na-agụ banyere ha baara anyị ezigbo uru, anyị kwesịrị iwepụta oge mee nchọnchọ ka anyị nwee ike ịghọtacha ihe Baịbụl kwuru banyere ha. Ọ bụrụ na anyị ana-echeta na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ahụ ezughị okè nakwa na ha “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe,” akụkọ ha ga-erukwu anyị n’obi. (Jems 5:17) Ọ bụrụkwa na ihe anyị na-agụ eruo anyị n’obi, anyị ga-aghọta otú obi dị ha mgbe ụdị nsogbu ndị na-abịara anyị taa bịaara ha.

7-9. (a) Olee otú i chere obi ga-adị ndị ahụ nwere okwukwe a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma a gwa ha ka ha fewe Jehova otú anyị si efe ya taa? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike?

7 Ihe ọzọ ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike bụ ihe ndị anyị na-eme. Ihe mere anyị ji kwuo ya bụ na “okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.” (Jems 2:26) Chegodị ụdị obi ụtọ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ a ga-enwe ma a sị na Jehova gwara ha ka ha rụọ ọrụ o nyere anyị ka anyị na-arụ n’oge a.

8 Dị ka ihe atụ, olee otú i chere obi ga-adị Ebreham ma ọ bụrụ na Jehova gwara ya ka ọ ghara ife ya n’ebe ịchụàjà ndị ahụ o ji nkume wuo n’ala ịkpa n’oge ochie, kama ka o soro ndị ya na ha na-efe Jehova fewe ya n’ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa ná mgbakọ dị iche iche a na-enwe ugbu a bụ́ ebe a na-anọ akọwa nkwa ndị ahụ Ebreham nọ “n’ebe dị anya” hụ? (Gụọ Ndị Hibru 11:13.) Olee otú i chere obi ga-adị Ịlaịja ma a sị na a gwara ya ka ọ ghara igbu ndị amụma Bel ahụ e nwere n’oge eze ọjọọ na-achị Izrel, kama ka ọ gaa na-ezisa ozi ga-akasi ndị mmadụ obi ma mee ka ha nwee olileanya? Ọ̀ bụ na ndị ahụ nwere okwukwe Baịbụl kọrọ akụkọ ha agaghị eji obi ụtọ kweta ife Jehova otú anyị si efe ya taa?

9 N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ka ihe anyị na-eme  kwa ụbọchị mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na anyị na-eṅomi okwukwe nke ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Baịbụl kọọrọ anyị akụkọ ha. Dị ka anyị kwuru n’Okwu Mmalite akwụkwọ a, ha ga-abịazi dị anyị ka hà bụ ezigbo ndị enyi anyị. Nke ka nke bụ na anyị na ha ga-aghọ ezigbo ndị enyi n’oge na-adịghị anya.

10. Olee ihe ga-eme anyị obi ụtọ na paradaịs?

10 Na-echeta ihe ndị ị na-atụ anya ha. Kemgbe ụwa, ọ bụ ihe ndị Chineke kwere ná nkwa, nke ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe na-atụ anya ha, na-eme ka okwukwe ha sie ike. Ihe ndị ị na-atụ anya ha hà na-eme ka okwukwe gị na-esikwu ike? Dị ka ihe atụ, chegodị echiche otú obi ga-adị gị mgbe ị ga-ahụ ndị ahụ fere Chineke a kpọlitere n’ọnwụ ná “mbilite n’ọnwụ nke . . . ndị ezi omume.” (Gụọ Ọrụ Ndị Ozi 24:15.) Olee ajụjụ ụfọdụ ị ga-achọ ịjụ ha?

11, 12. N’ụwa ọhụrụ, olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ (a) Ebel? (b) Noa? (ch) Ebreham? (d) Rut? (e) Abigel? (f) Esta?

11 Mgbe ị ga-ahụ Ebel, ọ̀ ga na-enu gị enu n’obi ịjụ ya otú nne na nna ya dị? I nwekwara ike jụọ ya, sị: “Ò nwere mgbe ị gwatụrụ ndị cherọb chere ụzọ ogige Iden nche okwu? Ò nwe ihe ha gwara gị?” Olee ajụjụ ndị ị ga-ajụ Noa? I nwere ike ịjụ ya, sị: “Ò nwere mgbe ndị Nefilim ahụ yiri gị egwu? Olee otú unu si lekọta anụmanụ niile n’oge ahụ unu nọrọ n’ime ụgbọ?” Ị hụ Ebreham, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ò nwere mgbe gị na Shem hụrụ? Ònye kụziiri gị banyere Jehova? Ò siiri gị ike ịhapụ obodo Ọọ?”

12 Ọ dịkwa mkpa ka i chee echiche banyere ajụjụ ụfọdụ ị ga-ajụ ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe a kpọlitere n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ, sị: “Rut, gịnị metụrụ gị n’obi mere i ji ghọọ onye na-efe Jehova?” “Abigel, ụjọ ọ̀ nọ na-atụ gị ịgwa Nebal otú i si nyere Devid aka?” “Esta, gịnị meziri gị na Mọdekaị mgbe ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gbasara unu mechara?”

13. (a) Olee ajụjụ ụfọdụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ nwere ike ịjụ gị? (b) Olee otú obi na-adị gị ma i cheta na ị ga-ahụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị fere Chineke n’oge ochie n’ọdịnihu?

13 Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ahụ nwere okwukwe nwekwara ọtụtụ ajụjụ ndị ha ga-ajụ gị. N’eziokwu, obi ga-atọ anyị ụtọ ịkọrọ ha ihe ndị mere n’oge ikpeazụ a na otú Jehova si gọzie ndị ya n’oge nsogbu. O doro anya na ọ ga-emetụ ha n’obi ma ha nụ otú Jehova si mezuo ihe niile o kwere ná nkwa. N’oge ahụ, anyị agazighị na-eche otú ndị ahụ Baịbụl kọrọ akụkọ ha dị n’ihi na anyị ga na-ahụ ha ihu na ihu. Anyị na ha ga-anọ na paradaịs. N’ihi ya, na-eme ihe niile i nwere ike ime ugbu a ka ndị ahụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl dị gị ka ndị dịrị ndụ n’eziokwu. Nọgide na-eṅomi okwukwe ha. Ka gị na ha nọgide na-abụ ezigbo ndị enyi ma na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi.