Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ITOOLU

O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ

O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ

1, 2. (a) Olee ihe Josef na ezinụlọ ya na-akwadebe ime ugbu a? (b) Olee ozi ọjọọ Josef ziri nwunye ya?

OTU ụbọchị na Betlehem, mgbe ndị mmadụ na-etetabeghị ụra, Josef bupụtara akpa ma dọkwasị ya n’elu ịnyịnya ibu ya. Weregodị ya na ị na-ahụ ya ka o legharịrị anya ma ò nwere onye na-ahụ ya. Mgbe ọ dọkwasịchara akpa ahụ, ọ hịatụrụ ịnyịnya ibu ahụ aka n’ahụ́. O doro anya na ebe uche ya dị bụ n’ebe dị anya ya na ezinụlọ ya chọrọ ịga. Ha chọrọ ịgbaga Ijipt. Ndị Ijipt na-asụ asụsụ dị iche na nke ha, otú ha si eme ihe dịkwa iche. Olee otú ihe ga-adịrị ha n’ebe ahụ?

2 Mgbe a gwara Josef na a chọrọ igbu nwa ha, ọ maghị otú ọ ga-esi akọrọ ya nwunye ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Meri. Ma ọ katara obi kọọrọ ya. Ọ kọọrọ ya ihe otu mmụọ ozi Chineke gwara ya ná nrọ. Mmụọ ozi ahụ sịrị na Eze Herọd chọrọ igbu obere nwa ha, gwakwa ya ka ọ kpọrọ nwunye ya na nwa ya gbapụ ozugbo. (Gụọ Matiu 2:13, 14.) Ụjọ jidere Meri. Ọ ghọtaghị ihe mere mmadụ ga-eji achọ igbu obere nwa ha na-enweghị onye o mejọrọ. Ihe a juru ma Meri ma Josef anya. Ma ebe ha tụkwasịrị Jehova obi, ha kwadowere ịgbapụ.

3. Kọwaa otú Josef na ezinụlọ ya si gbapụ na Betlehem. (Lee foto ha.)

3 Ndị bi na Betlehem ka na-arahụ ụra mgbe Josef na Meri kpọ Jizọs gbapụ. Ha chere ihu n’ebe ndịda Betlehem. Ka ha na-aga, ọ ga-abụ na Josef nọ na-eche otú ụwa ha ga-adị. Ọ nọ na-eche ma yanwa bụ́ ọkwá nkà ọ na-enweghị otú ọ hà ya ọ̀ ga-echebelikwa ndị ezinụlọ ya ka aka ghara ịkpara ha. Ọ nọkwa na-eche ma yà ga na-akpalikwa afọ ezinụlọ ya, ma yà ga-arụlikwa nnukwu ọrụ Jehova Chineke nyere ya, nke bụ́ ịzụ na ilekọta nwa a pụrụ iche? Ọrụ ndị a Josef ga-arụ abụghị obere ọrụ. Ka anyị na-eleba anya n’otú Josef si rụọ ọrụ niile ahụ, anyị ga-ahụ ihe mere o ji dị mkpa ka ndị bụ́ nna n’oge a, nakwa anyị niile, ṅomie okwukwe Josef.

Josef Chebere Ezinụlọ Ya

4, 5. (a) Olee otú ihe si gbanwee ná ndụ Josef? (b) Olee otú mmụọ ozi si gbaa Josef ume ka ọ rụọ ọrụ tara akpụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ?

4 Ọ bụ mgbe Josef nọ n’obodo ya bụ́ Nazaret ka ihe niile gbanwere ná ndụ ya, ya bụ, n’oge o kwere nkwa na ya ga-alụ ada Hilaị. O nwere ike ịbụ na o rubeghị afọ abụọ tupu ugbu a ha nọ n’ụzọ. Josef ma na Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke hụrụ Chineke n’anya. Ma Meri gwaziri ya na ya dị ime. Josef kpebiri na ya ga-agba ya alụkwaghịm na nzuzo ka ndị mmadụ ghara iji Meri mere ihe akụkọ. * Ma otu mmụọ ozi gwara ya okwu ná nrọ, kọwaara ya na ọ bụ mmụọ nsọ Jehova mere ka Meri dịrị ime. Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya na nwa Meri ga-amụ “ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.” Ọ gwakwara Josef okwu mere ka obi ruo Josef ala. Ọ sịrị ya: “Atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa.”—Mat. 1:18-21.

5 Ebe ọ bụ na Josef na-erubere Chineke isi ma bụrụ onye ezi omume, o mere ihe mmụọ ozi gwara ya. Ọ malitere ịrụ nnukwu ọrụ ahụ Chineke nyere ya, ya bụ, ilekọta na ịzụ nwa na-abụghị nke ya, bụ́ onye Chineke kacha hụ n’anya. Josef mechara kpọrọ nwunye ya ahụ dị ime gaa Betlehem n’ihi na Siza Ọgọstọs nyere iwu ka onye ọ bụla gaa n’obodo a mụrụ ya deba aha ya n’akwụkwọ. Ọ bụ na Betlehem ka Meri nọzi mụọ nwa ahụ.

6-8. (a) Gịnị mere ka ihe gbanwee ọzọ n’ezinụlọ Josef? (b) Olee ihe gosiri na ọ bụ Setan zitere kpakpando ahụ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

6 Josef akpọrọghị ezinụlọ ya laghachi Nazaret, kama ha nọwaziri na Betlehem, bụ́ ebe na-adịghị anya na Jeruselem. Josef na ezinụlọ ya bụ ndị ogbenye, ma o mere ihe niile o nwere ike ime ka Meri na Jizọs ghara ịta ahụhụ. Ha mechara nweta obere ụlọ ma birizie na ya. Otu ụbọchị, mgbe Jizọs na-abụghịzi nwa ọhụrụ, mgbe ọ ga-abụ na ọ karịala otu afọ, ihe gbanwekwara ọzọ n’ezinụlọ ha na mberede.

7 E nwere ụmụ nwoke si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa na nke ha. O nwere ike ịbụ na ha si Babịlọn. Ha bụ ndị na-agụ kpakpando. Ha so otu kpakpando rute n’ụlọ Josef na Meri. Ha kwuru na ha na-achọ otu nwatakịrị nke ga-aghọ eze ndị Juu ka ha wee kwanyere ya ùgwù.

8 Ma ụmụ nwoke ahụ hà ma ma ọ bụ na ha amaghị, ije a ha bịara nwere ike ịkpatara Jizọs ọnwụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na kpakpando ahụ bu ụzọ duga ha Jeruselem, na nke Eze Herọd, kama iduru ha gawa Betlehem. * Ha gwara Herọd a bụ́ eze ọjọọ na ha na-achọ nwa ga-aghọ eze ndị Juu. Ihe a ha kwuru mere ka eze ahụ mewere nwa ahụ anyaụfụ ma chọọ igbu ya.

9-11. (a) Olee otú o si bụrụ na ezinụlọ Josef nwere onye na-enyere ha aka bụ́ onye ka Herọd na Setan ike? (b) Olee ihe dị iche n’otú Josef na Meri si gaa Ijipt na ihe a kọrọ n’ụfọdụ akwụkwọ apọkrịfa?

 9 Ma e nwere onye ka Herọd na Setan ike. Onye a na-enyere ezinụlọ Josef aka. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Mgbe ndị ahụ bịara ịhụ nwa ahụ hụrụ ya na mama ya, ha nyere ha onyinye buru ibu. Ha nyere ha “ọlaedo na frankinsens na mea.” O doro anya na o juru Josef na Meri anya na e nyere ha onyinye ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ndị ahụ na-agụ kpakpando bu n’obi ịgaghachi kọọrọ Eze Herọd ebe ha hụrụ nwa ahụ, ma Jehova ekweghị ka ha gaa. O si ná nrọ gwa ha ka ha si ụzọ ọzọ laa.—Gụọ Matiu 2:1-12.

10 Obere oge ha lawara, mmụọ ozi Jehova gwara Josef, sị: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya gbaga n’Ijipt, nọrọkwa n’ebe ahụ ruo mgbe m ga-enye gị iwu; n’ihi na Herọd ga-achọ nwatakịrị a ka o gbuo ya.” (Mat. 2:13) Dị ka anyị kwuru ná mmalite isiokwu a, Josef mere ihe a gwara ya ozugbo. Ọ kpọọrọ ezinụlọ ya gbaga Ijipt n’ihi na ọ chọghị ka ihe ọ bụla mee nwa ahụ. Ebe ọ bụ na ndị ahụ na-agụ kpakpando nyere ha onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa, ha enweela ihe ndị ha ga-esi na ha nweta ego ha ga-eji elekọta onwe ha n’Ijipt.

Josef mere ihe ozugbo ka o nwee ike ichebe nwa ya

11 E mechara nwee akwụkwọ apọkrịfa ndị tinyere nnu na ose n’akụkọ ha kọrọ banyere otú Josef na ezinụlọ ya si gaa Ijipt. Akụkọ ahụ kwuru na obere nwa ahụ bụ́ Jizọs rụrụ ọrụ ebube nke mere ka ha ruo Ijipt ngwa ngwa, meekwa ka ndị ọjọọ nọ n’ụzọ ghara ime ha ihe ọ bụla, nakwa ka osisi det dị iche iche hụlata ka nne ya ghọrọ mkpụrụ ha. * Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ịgaru Ijipt adịrịghị ha mfe, o wekwara ha ogologo oge.

N’agbanyeghị na ọ dịrịghị Josef mfe, ọ hapụrụ ọrụ ya na ihe ọ bụla ọzọ ma kpọrọ ezinụlọ ya gbapụ

12. Olee ihe ndị nne na nna na-azụ ụmụ ha n’ụwa ọjọọ a nwere ike ịmụta n’aka Josef?

12 E nwere ọtụtụ ihe ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’aka Josef. Mgbe a gwara ya ka ọ kpọrọ ezinụlọ ya gbapụ, n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe, ọ hapụrụ ọrụ ya na ihe ọ bụla ọzọ ma kpọrọ ha ozugbo gbapụ ka ihe ọ bụla ghara ime ha. O doro anya na o weere ilekọta ezinụlọ ya ka ọrụ dị nsọ Jehova nyere ya. Taa, ndị nne na nna na-azụ ụmụ ha n’ụwa jọgburu onwe ya. E nwekwara ọtụtụ ihe nwere ike imebi ụmụaka ma ọ bụdị kpatara ha ọnwụ. Ma, ọ dị mma na e nwere ndị nne na nna na-eme ka Josef. Ha na-agbalị ike  ha niile ịhụ na ha chebere ụmụ ha ka ihe ọjọọ ndị juru n’ụwa a ghara imebi ha.

Josef Gbooro Ezinụlọ Ya Mkpa Ha

13, 14. Olee otú Josef na Meri sizi gaa biri na Nazaret?

13 O yiri ka Josef na ezinụlọ ya anọteghị aka n’Ijipt n’ihi na mmụọ ozi mechara gwa ya na Herọd anwụọla. Josef kpọziiri ezinụlọ ya laghachi n’obodo ha. Otu amụma e buru n’oge ochie kwuru na Jehova ga-esi “n’Ijipt” kpọpụta nwa ya. (Mat. 2:15) Josef so mee ka amụma ahụ mezuo. Ma, oleekwanụ ebe ọ ga-akpọrọ ezinụlọ ya gawa?

14 Josef achọghị ka ihe ọ bụla mee ezinụlọ ya. Ebe ọ ma na ọ bụ Akeleyọs, nwa Herọd, bụzi eze, marakwa na ọ bụ eze ọjọọ ka nna ya, ọ tụrụ ụjọ ịlaghachi Betlehem. Chineke gwaziri ya ka ọ kpọrọ ezinụlọ ya gawa n’obodo ya bụ́ Nazaret nke dị na Galili n’ihi na nke a ga-eme ka ọ ghara ịnọ nso na Jeruselem bụ́ ebe ndị chọrọ igbu nwa ahụ nọ. Ọ bụzi na Nazaret ka ya na Meri nọ zụọ Jizọs.—Gụọ Matiu 2:19-23.

15, 16. Olee ọrụ ụfọdụ Josef rụrụ, oleekwa ihe ndị nwere ike iso ná ngwá ọrụ ya?

15 Ọ bụ eziokwu na ha bụ ndị ogbenye, ha konyere akpa ha n’ebe aka ha ga-eru. Baịbụl kwuru na Josef bụ ọkwá nkà. Ọrụ ndị ọkwá nkà na-arụ n’oge ahụ bụ igbutu osisi, ibupụta osisi n’ebe ha ga-eji ya rụọ ọrụ, na ịkwadebe osisi ndị ahụ maka iji ha rụọ ụlọ, ụgbọ mmiri, obere àkwà mmiri, trọk, na ihe ndị e ji arụ ọrụ ugbo. (Mat. 13:55) Ọrụ a bụ ọrụ e ji ọkpụkpụ aka arụ. Ndị ọkwá nkà e nwere n’oge Baịbụl na-anọkarị n’ihu ụlọ ha arụ ọrụ ha ma ọ bụ ha anọrọ n’ụlọ ọrụ ha rụrụ n’akụkụ ụlọ ha.

16 Josef nwere ọtụtụ ngwá ọrụ o ji arụ ọrụ, o nwekwara ike ịbụ nna ya hapụụrụ ya ụfọdụ n’ime ha. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ngwá ọrụ o ji rụọ ọrụ bụ: eriri e ji atụ̀ ihe, ihe e ji aka akara n’osisi, anyụike, mma nkwọ, hama, chịzụl, ihe e ji akpọpu osisi, mgbá e ji anyakọta osisi, nakwa ntu. Ngwá ọrụ ndị a na-adị oké ọnụ.

17, 18. (a) Olee ihe Jizọs mụtara n’aka Josef? (b) Gịnị mere Josef ga-eji rụsikwuo ọrụ ike?

17 Weregodị ya na ị na-ahụ Jizọs n’oge ọ dị obere ka ọ na-ekiri nna ya mgbe ọ na-arụ ọrụ. Ka ọ na-ele Josef anya, obi na-atọ ya ụtọ na nna ya dị ike ọrụ, marakwa ọrụ nke ọma. O nwere ike ịbụ na Josef bidoro mgbe nwa ya nwoke dị obere kụziwere ya ụmụ obere  ọrụ ọ ga-arụli, dị ka iji akpụkpọ azụ̀ kpọrọ nkụ akpụchasị osisi. Ọ ga-abụkwa na ọ kọwaara ya otú e si amata ụdị osisi ndị ha ji arụ ọrụ, dị ka osisi sịkamọ, osisi ook, osisi oliv, nakwa osisi ndị ọzọ.

Josef kụziiri nwa ya ọrụ ịkwa nkà

18 Jizọs chọpụtakwara na nna ya a bụkwa nwoke obiọma, onye hụrụ ya na nne ya na ụmụnne ya ndị ọzọ n’anya ma na-elekọta ha. N’eziokwu, Jizọs nwere ụmụnne. Josef na Meri mechara mụọ ụmụ isii ọzọ ma ọ bụkwanụ karịa. (Mat. 13:55, 56) Josef rụsikwuru ọrụ ike ka o nwee ike lekọta ndị ezinụlọ ya niile ma na-akpa afọ ha.

Josef ghọtara na ihe kacha mkpa ọ ga-emere ndị ezinụlọ ya bụ ime ka ha na Chineke dịrị ná mma

19. Gịnị ka Josef na-eme ka ndị ezinụlọ ya na Chineke dịrị ná mma?

19 Ma, Josef ghọtara na ihe kacha mkpa ọ ga-emere ndị ezinụlọ ya bụ ime ka ha na Chineke dịrị ná mma. N’ihi ya, ọ na-ewepụta oge na-akụziri ụmụ ya banyere Jehova Chineke na iwu Ya. Ya na Meri na-akpọkarịkwa ụmụ ha aga n’ụlọ nzukọ ndị Juu e nwere n’obodo ha. N’ebe ahụ, a na-agụpụta iwu Jehova ma kọwaa ya. O nwere ike ịbụ na mgbe ọ bụla ha nụchara iwu Jehova, Jizọs na-ajụ ọtụtụ ajụjụ, Josef na-agbalịkwa ike ya ịza ha. Josef na-akpọkwa ezinụlọ ya aga ememme ndị a na-eme na Jeruselem, dị ka Ememme Ngabiga, nke a na-eme otu ugboro n’afọ. Ebe ọ bụ na Jeruselem dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri abụọ ma e si Nazaret gawa ya, o nwere ike ịbụ na ọ na-ewe ya na ezinụlọ ya izu abụọ iji garuo Jeruselem, mee ememme ahụ ma lọta.

Josef na-akpọ ndị ezinụlọ ya aga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem kwa afọ

20. Olee otú ndị nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ike isi na-eme ka Josef?

20 Taa, ndị nna bụ́ Ndị Kraịst na-emekwa ihe ndị ahụ Josef mere. Ha na-egboro ụmụ ha mkpa ha. Ma ihe ka ha mkpa bụ inyere ụmụ ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ha na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime ka ha na ụmụ ha na-agachi ọmụmụ ihe na mgbakọ Ndị Kraịst anya. Ha na-enwekwa ofufe ezinụlọ n’ụlọ ha. Ha na-eme ka Josef n’ihi na ha ma na o nweghị ihe karịrị mmadụ ịkụziri ụmụ ya banyere Jehova.

‘Ọ Chị Obi n’Aka’

21. Olee otú ihe na-adịrị ezinụlọ Josef n’oge Ememme Ngabiga, oleekwa mgbe Josef na Meri chọpụtara na Jizọs esoghị ha?

21 Mgbe Jizọs gbara afọ iri na abụọ, Josef kpọ ezinụlọ ya gawa Jeruselem otú ọ na-eme. Ha na-aga Ememme Ngabiga, ọtụtụ ezinụlọ sokwa na-aga. Ọ ga-abụ na mgbe ha ruwere Jeruselem, bụ́ nke dị n’ugwu, ọtụtụ n’ime ha bụwara abụ a na-akpọ abụ nrịgo. (Ọma 120-134) Ọtụtụ narị puku mmadụ na-anọ na Jeruselem n’oge a n’ihi  ememme ahụ. E mechaakwa ememme ahụ, mmadụ niile na-enuru lawa. Mgbe Josef na ezinụlọ ya na-ala, ya na Meri amaghị na Jizọs esoghị ha n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe na-emegharị ha anya. Ha chere na Jizọs so ìgwè mmadụ ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ soro ndị ikwu ha. Ọ bụzi mgbe ha gara njem otu ụbọchị ka ha chọpụtara na Jizọs esoghị ha.—Luk 2:41-44.

22, 23. Olee ihe Josef na Meri mere mgbe ha na-ahụghị nwa ha, oleekwa ihe Meri kwuru mgbe ha mechara chọta ya?

22 Obi gbafuru ha, ha achọrọ ya laghachiwa Jeruselem. Chegodị otú Jeruselem ga-adị ugbu a. Ebe niile akụọla owu ka ha na-agagharị n’okporo ámá, na-akpọ Jizọs òkù. Ebee ka nwa a nọ? Ebe ọ bụ na o ruola abalị atọ ha chọwara ya, ọ̀ ga-abụ na Josef bidoro iche  na ya arụtaghị ọrụ ahụ dị nsọ Jehova nyere ya? Ha mechara chọrọ ya banye n’ụlọ nsọ. Ha chọrọ ya ebe niile ruo mgbe ha rutere n’otu ọnụ ụlọ bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-akụzi Iwu Mozis nọ. Ha hụrụ Jizọs n’etiti ha. Obi ruziri Josef na Meri ala mgbe ahụ.—Luk 2:45, 46.

23 Jizọs nọ na-ege ndị nkụzi ahụ ntị ma na-ajụ ha ajụjụ. O juru ndị ahụ anya otú nwata ahụ si mara ihe na otú o si na-asa ha ajụjụ. Ma, ihe Meri na Josef hụrụ riri ha ọnụ. Baịbụl gosiri na o nweghị ihe ọ bụla Josef kwuru n’oge ahụ. Ma Meri kwuchitere ọnụ ha abụọ. Ọ sịrị: “Nwa m, gịnị mere i ji meso anyị otú a? Lee, mụ na nna gị chị obi n’aka na-achọgharị gị.”—Luk 2:47, 48.

24. Olee otú ihe Meri kwuru si gosi na ịzụ ụmụ abụghị obere ọrụ?

24 Ihe a Meri kwuru gosiri na ịzụ nwa abụghị obere ọrụ, ọ sọkwa  ya ya bụrụ nwa zuru okè. Ịzụ ụmụ n’ụwa ọjọọ a nwere ike ime ka ndị mụrụ ụmụ ‘chịrị obi n’aka’ mgbe niile. Ma obi kwesịrị isi ndị nne na nna ike na Chineke ma na ịzụ ụmụ adịghị mfe.

25, 26. Olee ihe Jizọs zara ndị mụrụ ya, oleekwa otú i chere obi ga-adị Josef mgbe ọ nụrụ ihe Jizọs kwuru?

25 Ebe Jizọs nọ mgbe ahụ a na-achọgharị ya bụ ebe ga-eme ka ya na Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, dịkwuo ná mma n’ihi na ọ nọ ebe ahụ na-amụ Okwu Chineke. Ọ bụ ya mere o ji were olu ọma zaa ndị mụrụ ya, sị: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”—Luk 2:49.

26 O doro anya na Josef chebaara ihe a Jizọs kwuru echiche ọtụtụ ugboro. O nwekwara ike ịbụ na obi na-atọ ya ụtọ mgbe ọ bụla o chetara ya. A sị ka e kwuwe, ọ nọ kemgbe na-akụziri nwa ya ka o were ife Jehova Chineke ka ihe kacha mkpa. N’agbanyeghị na Jizọs ka bụ nwata, ọ matala na nna ya nke eluigwe hụrụ ya n’anya. Ihe nyeere ya aka ịmata nke a bụ otú Josef si zụọ ya.

27. Ọ bụrụ na ị bụ nna, olee ọrụ magburu onwe ya Chineke nyere gị, oleekwa ihe mere i kwesịrị iji cheta ihe Josef mere?

27 Ọ bụrụ na ị bụ nna, ị̀ ghọtara na Jehova nyere gị ọrụ magburu onwe ya nke bụ́ inyere ụmụ gị aka ka ha ghọta na Jehova bụ ezigbo nna nke hụrụ ha n’anya ma na-echebe ha? Ọ bụrụkwa na ọ bụghị gị mụrụ ụmụ gị na ha bi, cheta otú Josef si lekọta Jizọs, gbalịakwa ka i lekọta ha otú ahụ ma were onye ọ bụla n’ime ha ka nwa dị oké ọnụ ahịa. Nyere ha aka ka ha na-abịarukwu Nna ha nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, nso.—Gụọ Ndị Efesọs 6:4.

Josef Rubeere Chineke Isi Ruo Ọnwụ

28, 29. (a) Gịnị ka ihe e dere na Luk 2:51, 52 na-akụziri anyị banyere Josef? (b) Olee ihe Josef mere nke so mee ka Jizọs na-enwekwu amamihe?

28 O nwezighị oké ihe ọzọ Baịbụl kwuru banyere Josef. Ma anyị kwesịrị ileba anya na nke o kwuru ekwu. Baịbụl gwara anyị  na Jizọs “nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha,” ya bụ, n’okpuru ndị mụrụ ya. Baịbụl kwukwara na “Jizọs nọkwa na-eto, na-enwekwu amamihe na ihu ọma Chineke na nke ndị mmadụ.” (Gụọ Luk 2:51, 52.) Gịnị ka ihe ndị a Baịbụl kwuru na-akụziri anyị banyere Josef? Ha dị ọtụtụ. Ha na-akụziri anyị na Josef nọgidere na-abụ ezigbo onyeisi ezinụlọ. Otú anyị si mara nke a bụ na nwa ya ahụ zuru okè nọgidere na-erubere ya isi ma na-edo onwe ya n’okpuru ya.

29 Baịbụl kwukwara na Jizọs nọ na-enwekwu amamihe. O doro anya na ọ bụ ihe ndị Josef kụziiri ya so n’ihe mere o ji nwekwuo amamihe. N’oge ahụ, e nwere ilu ndị Juu na-atụkarị nke sịrị na ọ bụ naanị ndị ọgaranya ga-abụli ndị amamihe, ma ndị ike kete o rie, dị ka ndị ọkwá nkà, ndị ọrụ ugbo, na ndị na-akpụ ụ́zụ́, ‘enweghị ike ịkụziri mmadụ ihe dị mma, ha enweghịkwa ike ịtụ ilu na ikwu okwu amamihe.’ Mgbe Jizọs ghọrọ dimkpa, o gosiri na ilu ahụ abụghị eziokwu. O doro anya na mgbe ọ bụ nwata, nna ya bụ́ ọkwá nkà ọ na-enweghị ka ọ hà ya, kụziiri ya iwu Jehova ọtụtụ ugboro.

30. Olee ezigbo ihe ndị bụ́ nna nwere ike ịmụta n’aka Josef?

30 Baịbụl gosikwara na Josef so mee ka Jizọs topụta mmadụ. Otú o si lekọta Jizọs mgbe ọ bụ nwata mere ka Jizọs ghọọ dimkpa ahụ́ gbasiri ike. Josef kụzikwaara Jizọs ọrụ ịkwa nkà. Ndị mmadụ na-akpọ Jizọs nwa ọkwá nkà, na-akpọkwa ya “ọkwá nkà.” (Mak 6:3) Nke a gosiri na Jizọs mụtara ọrụ ahụ Josef kụziiri ya. Ọ ga-adị mma ka ndị bụ́ nna ṅomie Josef ma na-elekọta ụmụ ha nke ọma, gbalịakwa ka ụmụ ha mụta ihe ga-enyere ha aka igboro onwe ha mkpa ha mgbe ha toro.

31. (a) Olee otú anyị si mata mgbe ọ ga-abụ na Josef nwụrụ? (Jiri ihe e dere n’igbe zaa ya.) (b) Olee ezigbo ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Josef?

31 Mgbe Baịbụl kọchara otú e si mee Jizọs baptizim mgbe ọ dị afọ iri atọ, o nweghịzi ihe ọzọ o kwuru banyere Josef. O yiri ka Josef ọ̀ nwụọla mgbe Jizọs malitere ikwusa ozi ọma. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Olee Mgbe Josef Nwụrụ?”) N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Josef. Ọ bụ ezigbo nna nke chebere ezinụlọ ya, gbooro ha mkpa ha, ma rubere Chineke isi ruo ọnwụ. Ndị nna bụ́ Ndị Kraịst na Ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị iṅomi okwukwe Josef.

^ para. 4 N’oge ahụ, a na-ewere nwoke na nwaanyị kwere ibe ha nkwa ọlụlụ ka ndị lụrụla alụ.

^ para. 8 Kpakpando a apụtaghị n’onwe ya, ọ bụkwanụghị Chineke mere ka ọ pụta. O doro anya na ọ bụ Setan mere ka kpakpando ahụ pụta. O so n’ihe ndị o mere ka ọ hụ na e gburu Jizọs.

^ para. 11 Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụ mgbe e mechara Jizọs baptizim ka ọ rụrụ ọrụ ebube mbụ ya.—Jọn 2:1-11.