Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI ABỤỌ NA ATỌ

Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie

Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie

1. Olee ụbọchị o nwere ike ịbụ ya kacha njọ ná ndụ Pita?

PITA emekataghị chefuo otú obi si jọọ ya njọ mgbe anya ya na anya Jizọs kụkọtara. N’oge ahụ, ihu Jizọs ò gosiri na ọ na-ewere Pita iwe ma ọ bụ na ihe ya adịkwaghị ya mma? Anyị amaghị. Naanị ihe Baịbụl kwuru bụ na ‘Onyenwe anyị tụgharịrị legide Pita anya.’ (Luk 22:61) Ma, anya ahụ Jizọs lere Pita mere ka Pita ghọta na ihe ahụ o mere jọgburu onwe ya. Pita ghọtara na ya emeela ihe ahụ Jizọs gwara ya na ọ ga-eme, bụ́kwanụ ihe Pita turu ọnụ na ya emekataghị mee. Ọ gọnahụla nna ya ukwu ọ hụrụ n’anya. Obi jọrọ Pita njọ n’ụbọchị ahụ. O nwere ike ịbụ na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị obi kacha jọọ ya njọ ná ndụ ya.

2. Olee ihe Pita kwesịrị ịmụta ihe na ya, oleekwa otú akụkọ ya nwere ike isi baara anyị uru?

2 Ma, olileanya ka dị. Ebe ọ bụ na Pita nwere ezigbo okwukwe, o nwere ohere ichegharị ma mụta otu n’ime ihe ndị kacha mkpa Jizọs kụziiri ndị mmadụ banyere ịgbaghara mmehie. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịmụtakwa ihe ahụ. N’ihi ya, ka anyị hụ otú Pita si mụta ihe na ya.

Pita Nwere Ọtụtụ Ihe Ọ Ga-amụta

3, 4. (a) Olee ajụjụ Pita jụrụ Jizọs, oleekwa ihe Pita nwere ike ịna-eche? (b) Olee ihe Jizọs kwuru nke gosiri na Pita na-eṅomi ndị oge ya?

3 N’ihe dị ka ọnwa isii tupu mgbe ahụ, Pita bịakwutere Jizọs na Kapaniọm ma jụọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie m, mụ agbaghara ya? Ọ̀ bụ ruo ugboro asaa?” O nwere ike ịbụ na Pita chere na ya dị obiọma. A sị ka e kwuwe, ndị isi okpukpe oge ahụ na-akụzi na mmadụ kwesịrị ịgbaghara mmadụ ibe ya naanị ugboro atọ. Jizọs zara Pita, sị: “Ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.”—Mat. 18:21, 22.

4 Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ ka Pita gụkọwa ihe ọjọọ mmadụ mere ya? Mba. Mgbe Jizọs sịrị na asaa ahụ Pita kwuru kwesịrị ịbụ iri asaa na asaa, ihe ọ na-ekwu bụ na o nweghị ugboro ole ọ ga-abụ mmadụ mehie anyị anyị aghara ịgbaghara ya. (1 Kọr. 13:4, 5) Jizọs gosiri na Pita na-eṅomi ndị oge ya, bụ́ ndị na-anaghị emere mmadụ ibe  ha ebere, ha anaghịkwa agbaghara ndị ọzọ mmehie ha. Ma, Chineke chọrọ ka anyị na-agbaghara ndị mmadụ n’agụkọghị ugboro ole ha mehiere anyị.—Gụọ 1 Jọn 1:7-9.

5. Olee mgbe anyị na-akacha amụta na anyị kwesịrị ịgbaghara ndị ọzọ?

5 Pita arụghị Jizọs ụka. Ma, ihe ahụ Jizọs kụziri ò ruru ya n’obi? Mgbe anyị na-akacha aghọta ihe bụ́ ịgbaghara ndị ọzọ mmehie bụ mgbe anyị chọrọ ka ha gbaghara anyị. N’ihi ya, ka anyị gaghachi n’ihe ndị mere tupu Jizọs anwụọ. N’oge ahụ, Pita mere ọtụtụ ihe mere o ji dị mkpa ka Nna ya ukwu gbaghara ya.

O Nwere Ọtụtụ Ihe A Ka Ga-agbaghara Ya

6. Olee ihe Pita mere mgbe Jizọs chọrọ ịkụziri ndịozi ya ka ha dịrị umeala n’obi, oleekwa otú Jizọs si kpaso ya àgwà?

6 Abalị ahụ dị oké mkpa n’ihi na ọ bụ abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Jizọs ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-akụziri ndịozi ya. Otu n’ime ihe ọ ga-akụziri ha bụ gbasara ịdị umeala n’obi. Jizọs gosiri ha na ya dị umeala n’obi. Ọ sara ụkwụ ndịozi ya. Ọrụ a bụ ọrụ a na-ekenyekarị ndị ohu ọ na-enwechaghị ihe e ji ha kpọrọ. Ná mmalite, Pita jụrụ Jizọs ma ọ̀ na-achọ ịsa ya ụkwụ. Pita gwaziri Jizọs na ọ gaghị asa ya ụkwụ. Ma, o mechara gwa Jizọs ka ọ saa ya ma ụkwụ ma aka ma isi. Jizọs ewesaghị Pita iwe, kama o ji nwayọọ kọwaara ndịozi ya ihe ụkwụ ahụ ọ na-asa ha pụtara na ihe mere o ji dị mkpa.—Jọn 13:1-17.

7, 8. (a) Olee ihe ndị ọzọ Pita mere nke nwere ike ịkpasu Jizọs iwe? (b) Olee otú Jizọs si gosi na ya dị obiọma ma na-agbaghara mmehie?

7 Obere oge ihe a mechara, Pita mekwara ihe ọzọ nwere ike iwe Jizọs iwe. Ndịozi Jizọs malitere ise okwu banyere onye kacha ukwuu n’etiti ha. O doro anya na Pita so kpaa àgwà iberiibe ahụ ha kpara n’ihi mpako. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs ji olu ọma nye ha ndụmọdụ. Ọ jadịrị ha mma maka ebe ha mere nke ọma, ya bụ, na ha kwụsiri ike n’ebe ọ nọ. Ma, ọ gwara ha na ha niile ga-ahapụ ya. Pita gwara Jizọs na ya ga-esogide ya ruo ọnwụ. Ma, Jizọs gwara ya na tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, na ọ ga-agọnahụ ya ugboro atọ n’abalị ahụ. Pita kwuru na ya agaghị agọnahụ ya. O tukwara ọnụ na ọ bụrụgodị na ndịozi ibe ya ahapụ Jizọs, na ya emekataghị hapụ ya.—Mat. 26:31-35; Mak 14:27-31; Luk 22:24-28; Jọn 13:36-38.

8 Ike Pita ọ̀ gwụwala Jizọs? Mba. N’oge niile ahụ, Jizọs nọ na-achọ ebe ndịozi ya na-ezughị okè na-eme nke ọma. Ọ ma na Pita ga-agọnahụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ sịrị: “Arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.” (Luk 22:32) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na obi siri ya ike na Pita ga-emezi ihe o mejọrọ ma maliteghachi ijere Chineke ozi. Nke a gosiri na Jizọs nwere obiọma ma na-agbaghara mmehie.

9, 10. (a) Olee ndụmọdụ Jizọs nyere Pita mgbe ya na ndịozi ibe ya nọ n’ogige Getsemeni? (b) Gịnị ka ihe ndị Pita mere na-echetara anyị?

 9 Mgbe Jizọs na ndịozi ya mechara gaa n’ogige Getsemeni, Pita mekwara ihe ndị mere ka Jizọs nye ya ndụmọdụ. Jizọs gwara ya na Jems na Jọn ka ha na-eche nche, ka ya gaa kpee ekpere. Jizọs nọ n’oké mwute ma chọọ onye ga-agba ya ume. Ma ụra buuru Pita na ndị nke ọzọ ugboro ugboro. Jizọs kwuru okwu na-egosi na o nwere ọmịiko ma na-agbaghara mmehie. Ọ sịrị: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Mak 14:32-41.

10 Obere oge, ìgwè mmadụ ji ọkụ, mma agha, na okpiri bịa. Ugbu a bụ oge ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịkpachapụ anya ma chee echiche tupu ha emee ihe ọ bụla. N’agbanyeghị nke ahụ, Pita mere ihe n’echeghị echiche. Ọ mịịrị mma agha ya gbuo Malkọs, bepụ ya ntị. Malkọs bụ ohu nnukwu onye nchụàjà. Jizọs medara obi nye Pita ndụmọdụ ma gwọọ nwoke ahụ. O kwuru na ndị niile bụ́ ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghị ime ihe ike. (Mat. 26:47-55; Luk 22:47-51; Jọn 18:10, 11) Pita emehiela ọtụtụ ugboro, Jizọs agbaghara ya. Ihe ndị Pita mere na-echetara anyị na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Gụọ Jems 3:2.) Ò nwere onye n’ime anyị ọ na-adịghị mkpa ka Chineke na-agbaghara ya kwa ụbọchị? Ma, a ka nwere ọtụtụ nsogbu ga-abịara Pita n’abalị ahụ. Nke kacha njọ ka ga-eme.

Mmehie Kacha Njọ Pita Mere

11, 12. (a) Olee otú Pita si gosi na ya nwetụrụ obi ike mgbe e jidechara Jizọs? (b) Olee otú o si bụrụ na Pita emeghị ihe o kwuru na ya ga-eme?

11 Jizọs gwara ìgwè mmadụ ahụ na ọ bụrụ yanwa ka ha na-achọ, ka ha hapụ ndịozi ya ka ha laa. Pita nọ na-ele n’anya n’anya ka ìgwè mmadụ ahụ na-eke Jizọs agbụ. Pita mechaziri gbaa ọsọ otú ndịozi ibe ya gbara.

12 Pita na Jọn gbatụrụ kwụsị. O nwere ike ịbụ na ha kwụsịrị mgbe ha rutewere n’ụlọ Anas. Anas bụbu nnukwu onye nchụàjà, ụlọ ya bụkwa ebe mbụ a kpọgara Jizọs ka a gbaa ya ajụjụ. Mgbe e si ebe ahụ kpọrọ Jizọs pụọ, Pita na Jọn nọ na-eso ha n’azụ “n’ebe dịtụ anya.” (Mat. 26:58; Jọn 18:12, 13) Pita abụghị onye ụjọ. O doro anya na o nwere obi ike. Ma ọ́ bụghị ya, ọ garaghị eso ha n’azụ. Ìgwè mmadụ ahụ ji ngwá ọgụ, Pita emerụọdịla otu n’ime ha ahụ́. N’agbanyeghị nke ahụ, ịhụnanya Pita erughị nke ime ihe o kwuru na ya ga-eme, ya bụ, na ya ga-esogide Jizọs ruo ọnwụ.—Mak 14:31.

13. Olee naanị otú anyị kwesịrị isi na-eso Kraịst?

13 Ọtụtụ ndị taa na-eso Kraịst n’azụ “n’ebe dịtụ anya” otú ahụ Pita mere, ya bụ, ha na-eso ya otú ọ na-enweghị onye ga-ahụ ha. Ma, Pita mechara dee na naanị otú anyị kwesịrị isi na-eso Kraịst bụ isochi ya anya otú anyị nwere ike. Nke a pụtara na anyị ga na-eṅomi  ya n’ihe niile, n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta.—Gụọ 1 Pita 2:21.

14. Olee ihe Pita nọ na-eme n’abalị ahụ a na-ekpe Jizọs ikpe?

14 Pita mechara jiri nwayọọ nwayọọ rute n’ọnụ ụzọ ámá nke otu n’ime ụlọ ndị kacha buo ibu ma maa mma na Jeruselem. Ọ bụ ụlọ Keyafas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà. Keyafas bụ ọgaranya a na-akwanyere ùgwù. A na-ewu ụdị ụlọ ya a ka o nwee ime èzí. Ọ na-enwekwa ọnụ ụzọ ámá. Pita rutere n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, ma e kweghị ya banye. Jọn, bụ́ onye banyerela abanye, bịara gwa onye nche ọnụ ụzọ ámá ahụ ka ọ kpọbata Pita n’ihi na Jọn ma nnukwu onye nchụàjà ahụ. Ọ ga-abụ na mgbe Pita banyere n’ogige ụlọ ahụ, ọ nọghị Jọn nso. Pita agbalịkwanụghị ka ọ banye n’ime ụlọ ebe Jizọs nọ ma gaa guzoro n’akụkụ ya. Kama, ọ nọ n’ime èzí, bụ́ ebe ndị ohu na ndị na-eje ozi guzo n’akụkụ ọkụ na-enwu nke ọma na-anya ọkụ n’abalị ahụ n’ihi na oyi na-atụ. Ha nọ na-ele ka ndị na-agbagide Jizọs akaebe ụgha na-abanye n’ime ụlọ ebe a nọ na-ekpe ya ikpe ma na-apụta.—Mak 14:54-57; Jọn 18:15, 16, 18.

15, 16. Kọwaa otú ihe Jizọs gwara Pita, nke bụ́ na ọ ga-agọnahụ ya ugboro atọ, si mezuo.

15 Mgbe ha nọ na-anya ọkụ, nwa agbọghọ ahụ kpọbatara Pita hụrụ ya nke ọma ma mata ya. Ọ sịrị Pita: “Gị onwe gị na Jizọs onye Galili na-anọ!” Pita atụghị anya na nwa agbọghọ ahụ ga-amata ya. Nke a mere ka ọ gọọ agọ na ya amaghị Jizọs. Ọ gwadịrị nwa agbọghọ ahụ na ya aghọtaghị ihe ọ na-ekwu. Pita gaziri guzoro n’ebe dị nso n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, na-eme ka a ghara ịmata ya. Ma, nwa agbọghọ ọzọ hụrụ ya ma kwuo otu ihe ahụ, sị: “Nwoke a na Jizọs onye Nazaret nọrọ.” Pita ṅụrụ iyi, sị: “Amaghị m nwoke ahụ!” (Mat. 26:69-72; Mak 14:66-68) Ọ ga-abụ mgbe Pita gọnahụchara Jizọs nke ugboro abụọ a ka ọ nụrụ ka oké ọkpa na-akwa. Ma, ihe ndị na-emenụ megharịrị ya anya nke na o chetaghị ihe Jizọs gwara ya awa ole na ole tupu mgbe ahụ.

16 Mgbe obere oge gachara, Pita ka na-agbalị ka ndị mmadụ ghara ịmata ya. Ma, ndị guzo n’ime èzí ahụ bịakwutere ya. Otu n’ime ha bụ onye ikwu Malkọs, onye Pita bepụrụ ntị. Ọ sịrị Pita: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?” Pita gbasiri mbọ ike ka o mee ka ha kweta na ihe ha kwuru abụghị eziokwu. N’ihi ya, ọ ṅụụrụ ha iyi. Ọ ga-abụ na ihe Pita na-ekwu n’iyi a ọ ṅụụrụ ha bụ ka ihe ọjọọ mee ya ma ọ bụrụ na ya na-agha ụgha. Nke ahụ bụ nke ugboro atọ Pita na-agọnahụ Jizọs. Ozugbo ọ gọchara agọ ahụ, oké ọkpa kwara. Nke a bụ nke ugboro abụọ Pita nụrụ n’abalị ahụ.—Jon 18:26, 27; Mak 14:71, 72.

‘Onyenwe anyị tụgharịrị legide Pita anya’

17, 18. (a) Gịnị ka Pita mere mgbe ọ ghọtara na ya emejọọla Jizọs? (b) Olee ihe ọ ga-abụ na Pita nọ na-eche?

17 Ọ dịbeghị anya Jizọs si n’ime ụlọ pụta na veranda. Veranda a  chere ihu n’ime èzí. Ọ bụ n’oge ahụ ka anya ya na Pita kụkọtara otú a kọrọ ná mmalite isiokwu a. Anya meghere Pita, ya aghọta na ya emejọọla Jizọs. Pita hapụrụ ime èzí ahụ n’ihi na ihe ahụ o mere wutere ya nke ukwuu. Ọ banyere n’okporo ámá ndị dị n’obodo ahụ. N’oge ahụ, ọnwa alakpuwela. Anya mmiri rujuru ya n’anya. O jitelighị onwe ya, ya ebido bewa ezigbo ákwá.—Mak 14:72; Luk 22:61, 62.

18 Ọ bụrụ na mmadụ emee ụdị mmehie a, ọ naghị esi ike onye ahụ echee na mmehie ya dị oké njọ nke na Chineke agakwaghị agbaghara ya. Ọ ga-abụ na Pita chekwara otú ahụ. Ma, à ga-agbagharanụ ya?

Mmehie Pita Ò Ruru Otú A Na-agakwaghị Agbaghara Ya?

19. Olee otú ọ ga-abụ na obi dị Pita mgbe ọ hụrụ ihe e mere Jizọs, oleekwa otú anyị si mara na nke ahụ emeghị ka o chee na nke ya agwụla?

19 O nwere ike ịbụ na ihe ahụ Pita mere wutekwuru ya mgbe chi bọrọ, ya ahụ ihe ndị e mere Jizọs. Ọ ga-abụkwa na ọ tara onwe ya ụta mgbe a tachara Jizọs ahụhụ ọtụtụ awa, e mechaa gbuo ya n’ehihie ya. O nwere ike ịbụ na obi jọrọ Pita njọ mgbe ọ bụla o chetara na ya so mee ihe wutere Jizọs n’ụbọchị ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa tupu ya anwụọ. Ọ bụ eziokwu na ihe ahụ merenụ wutere Pita, o cheghị na nke ọ na-eme agwụla. Otú anyị si mara bụ na obere oge ihe a mechara, ọ gakwughachiri ndịozi ibe ya. (Luk 24:33) O doro anya na ndịozi niile ahụ kwukwara na ihe ha mere n’abalị ahụ ebelebe gburu adịghị mma. Ma, ha kasirịtara ibe ha obi.

20. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otu n’ime ihe kacha mma Pita mere ná ndụ ya?

20 E nwere ike ikwu na ihe a Pita mere bụ otu n’ime ihe ndị kacha mma o mere ná ndụ ya. Ọ bụrụ na onye na-efe Chineke emee mmehie, Chineke ga-agbaghara ya ma ọ gbalịa ike ya niile ka ọ kwụsị mmehie ahụ, ọ sọgodị ya ya bụrụ na mmehie ahụ dị oké njọ. (Gụọ Ilu 24:16.) Pita gosiri na ya nwere ezigbo okwukwe. Otú o si mee ya bụ na ọ gakwuuru ndịozi ibe ya n’agbanyeghị na obi jọrọ ya njọ. Mgbe mmadụ nọ ná mwute, ihe onye ahụ na-emekarị bụ ịnọrọ onwe ya. Ma nke ahụ jọgburu onwe ya. (Ilu 18:1) Ihe onye ahụ kwesịrị ime bụ ịnọ ụmụnna ya bụ́ Ndị Kraịst nso ka ha gbaa ya ume ka o wee nọgide na-efe Chineke.—Hib. 10:24, 25.

21. Olee ihe Pita nụrụ mgbe ya na ndịozi ibe ya nọ?

21 Mgbe Pita na ndịozi ibe ya nọ, ọ nụrụ ihe na-awụ akpata oyi  n’ahụ́ nke bụ́ na ozu Jizọs adịkwaghị n’ili. Pita na Jọn gbagara n’ebe e liri Jizọs. E mechiburu ọnụ ụzọ ili ahụ emechi. Jọn bu Pita ụzọ gbaruo ebe ahụ. Ihe mere o ji buru ya ụzọ ruo bụ na o nwere ike ịbụ na Pita tọrọ ya. Mgbe Jọn hụrụ na ọnụ ụzọ ili ahụ ghere oghe, ọ kwụsịtụrụ. Ma, Pita emeghị otú ahụ. N’agbanyeghị na ọ ka na-eku ume ọkụ ọkụ, ọ banyere n’ili ahụ ozugbo ma hụ na ozu Jizọs adịghị na ya.—Jọn 20:3-9.

22. Gịnị mere Pita ji kwụsị inwe mwute na obi abụọ?

22 Pita ò kwetara na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ? O kwetaghị ná mmalite n’agbanyeghị na ụmụ nwaanyị a tụkwasịrị obi kwuru na ndị mmụọ ozi pụtara n’ihu ha ma gwa ha na Jizọs ebiliela n’ọnwụ. (Luk 23:55–24:11) Ma, tupu chi ejie n’ụbọchị ahụ, Pita akwụsịla inwe mwute na obi abụọ. N’eziokwu, Jizọs dị ndụ. Ọ bụzi mmụọ dị ike. Ọ pụtara n’ihu ndịozi ya niile. Ma, tupu Jizọs apụta n’ihu ndịozi ya niile, o bu ụzọ pụta n’ihu Pita. Baịbụl kwuru na ndịozi ahụ kwuru n’ụbọchị ahụ, sị: “N’ikwu eziokwu, a kpọlitere Onyenwe anyị, ọ pụtakwara n’ihu Saịmọn!” (Luk 24:34) Pọl onyeozi mechakwara dee ihe mere n’ụbọchị ahụ pụrụ iche. O dere na Jizọs “pụtakwara n’ihu Sifas, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndị ozi iri na abụọ ahụ.” (1 Kọr. 15:5) Sifas na Saịmọn bụ aha ndị ọzọ a na-akpọ Pita. Jizọs pụtara n’ihu ya n’ụbọchị ahụ, o nwekwara ike ịbụ mgbe ọ nọ naanị ya.

Pita mere ọtụtụ ihe wutere Jizọs. Ma ò nwere onye n’ime anyị ọ na-adịghị mkpa ka Chineke na-agbaghara ya kwa ụbọchị?

23. Olee ihe Ndị Kraịst mere mmehie kwesịrị icheta gbasara Pita?

23 Baịbụl akọrọghị anyị ihe niile mere n’oge ahụ Jizọs pụtara n’ihu Pita. Ọ bụ naanị Pita na Jizọs ma ihe niile mere n’oge ahụ. Naanị ihe anyị nwere ike ime bụ iji uche anyị hụ otú obi si tọọ Pita ụtọ mgbe ọ hụrụ na Onyenwe ya ọ hụrụ n’anya adịla ndụ ọzọ. Anyị nwekwara ike iji uche anyị hụ mgbe ọ na-akọrọ Jizọs otú ihe o mere si wute ya nakwa na ya echegharịala. Ihe kacha Pita mkpa n’oge ahụ bụ ka Jizọs gbaghara ya. O doro anya na Jizọs gbaghaara ya kpamkpam. Taa, Ndị Kraịst mere mmehie kwesịrị icheta Pita. Anyị ekwesịghị iche na mmehie anyị dị oké njọ nke na Chineke agaghị agbaghara anyị. Jizọs na-akpa àgwà ka Nna ya. Nna ya ‘na-agbaghara mmehie n’ụzọ dị ukwuu.’—Aịza. 55:7.

Ihe Ọzọ Gosiri na A Gbaghaara Ya

24, 25. (a) Kọwaa ihe mere n’otu abalị mgbe Pita gara igbu azụ̀ n’Oké Osimiri Galili. (b) Olee ihe Pita mere mgbe Jizọs mere ka ha gbute ọtụtụ azụ̀ mgbe chi bọrọ?

24 Jizọs gwara ndịozi ya ka ha gaa Galili, bụ́ ebe ya na ha ga-anọkọ ọzọ. Mgbe ha rutere, Pita gawara igbu azụ̀ n’Oké Osimiri Galili. Ụfọdụ n’ime ndịozi ibe ya so ya gaa. Pita gaghachiri na mmiri ahụ ọ na-agakarị egbu azụ̀ kemgbe ọ bụ okorobịa. Ihe ndị na-eme ugbu a ọ bịara igbu azụ̀ amarala ya ahụ́, ma mkpọtụ ụgbọ ya na ebili  mmiri na-eme ma otú ụgbụ ya si na-adụtụ ya ogwu n’aka. Ihe ndị a mekwara ya obi ụtọ. Ma, Pita na ndị ya na ha so egbuteghị azụ̀ ọ bụla n’abalị ahụ dum.—Mat. 26:32; Jọn 21:1-3.

Pita si n’ụgbọ ya mapụ ma gwuru mmiri ruo n’ikpere mmiri

25 Ma mgbe chi bọrọ, otu onye si n’ikpere mmiri ahụ kpọọ ha òkù ma gwa ha ka ha wụnye ụgbụ ha n’akụkụ nke ọzọ nke ụgbọ mmiri ahụ. Ha mere ihe onye ahụ kwuru ma dọpụta azụ̀ dị otu narị na iri ise na atọ. Pita ma onye onye ahụ bụ. O si n’ụgbọ ya mapụ ma gwuru mmiri ruo n’ikpere mmiri ahụ. N’ikpere mmiri ahụ, Jizọs nyere ha azụ̀ ọ mịrị n’icheku ọkụ. Ya elekwasịzie Pita anya.—Jọn 21:4-14.

26, 27. (a) Olee ihe Jizọs chọrọ ka Pita jiri ohere o nyere ya ugboro atọ mee? (b) Olee ihe Jizọs mere nke gosiri na ọ gbaghaara Pita kpamkpam?

 26 Jizọs jụrụ Pita ma ọ̀ hụrụ Onyenwe ya n’anya “karịa ihe ndị a.” O nwere ike ịbụ na mgbe Jizọs na-ajụ ya ajụjụ a, ọ tụụrụ ya aka n’ọtụtụ azụ̀ ahụ ha gbutere. Pita ọ̀ hụruru ọrụ ịkụ azụ̀ n’anya otú ọ hụrụ Jizọs? Ebe ọ bụ na Pita gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ, Jizọs nyere ya ohere ugboro atọ n’ihu ndịozi ibe ya ka o gosi na ọ hụrụ ya n’anya. Mgbe Pita na-eme nke a, Jizọs gwara ya otú ọ ga-esi gosi na ọ hụrụ ya n’anya. Jizọs kwuru na otú ọ ga-esi eme nke a bụ iji ozi ọ na-ejere Chineke kpọrọ ihe karịa ihe niile ọzọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ ga-azụ atụrụ Kraịst, ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst, na-elekọtakwa ha ma na-agba ha ume.—Luk 22:32; Jọn 21:15-17.

27 Ihe a Jizọs kwuru gosiri na Pita ka baara Jizọs na Nna ya uru. Pita ga-arụ ọrụ dị mkpa n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke Kraịst bụ onyeisi ya. Nke a gosiri na Jizọs agbagharala ya kpamkpam. O doro anya na obi tọrọ Pita ụtọ na Jizọs agbagharala ya. Pita mụtakwara ihe n’ihe ndị o mejọrọ.

28. Olee otú Pita si mezuo ihe aha a gụrụ ya pụtara?

28 Pita rụrụ ọrụ Jizọs nyere ya ruo ọtụtụ afọ. Ọ gbara ụmụnna ya ume otú Jizọs nyere ya iwu ka o mee n’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ. Pita ji obiọma na ndidi lekọta ndị na-eso ụzọ Kraịst ibe ya ma nye ha nri. Nwoke a a kpọrọ Saịmọn mezuru ihe aha ahụ Jizọs gụrụ ya pụtara, ya bụ, Pita ma ọ bụ Nkume. Otú o si mezuo ya bụ na ọ kwụsiri ike n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ndị ọzọ mụtakwara ihe n’aka ya. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ ihe ndị dị n’ọmarịcha akwụkwọ ozi abụọ o ji aka ya dee. Akwụkwọ ozi ndị ahụ mechara soro n’Akwụkwọ Nsọ. Akwụkwọ ozi ndị ahụ gosikwara na Pita echefughị ihe ọ mụtara n’aka Jizọs banyere ịgbaghara mmehie.—Gụọ 1 Pita 3:8, 9; 4:8.

29. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie okwukwe Pita, ṅomiekwa Jizọs, bụ́ onye na-eme ebere?

29 Anyị kwesịkwara ịmụta ihe ahụ Pita mụtara. Ànyị na-arịọ Chineke kwa ụbọchị ka ọ gbaghara anyị ọtụtụ mmehie anyị na-eme? Ànyị na-ekweta na a gbagharala anyị nakwa na e meela ka anyị dị ọcha? Ànyị na-agbaghakwara ndị mejọrọ anyị? Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ pụtara na anyị na-eṅomi okwukwe Pita, na-eṅomikwa Jizọs, bụ́ onye na-eme ebere.