Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI

Ọ Gbachiteere Ofufe Chineke

Ọ Gbachiteere Ofufe Chineke

1, 2. (a) Olee nsogbu ndị Izrel nọ na ya n’oge Ịlaịja? (b) Olee ndị bụ́ ndị iro Ịlaịja mgbe ọ nọ n’Ugwu Kamel?

ỊLAỊJA lepụrụ anya hụ ka ìgwè mmadụ na-agbagote n’Ugwu Kamel ka ndị ike ụwa gwụrụ. Ọ bụ eziokwu na mgbe ahụ ka bụ isi ụtụtụ, i lee ha anya, ị ga-ahụ na ụnwụ akpaala ha aka ọjọọ. Mmiri na-ezobeghị n’ala ha kemgbe afọ atọ na ọkara emesiela ha ike.

2 Ndị amụma Bel so ná ndị ahụ na-agbagote n’Ugwu Kamel. Ha dị narị mmadụ anọ na iri ise. Nganga juru ha isi, ha kpọkwara Ịlaịja onye amụma Jehova asị. Jezibel bụ́ nwunye eze egbuola ọtụtụ ndị na-efe Jehova, ma Ịlaịja ka kwụ ebe ọ kwụ. Ọ ka na-agbalị ka ụmụ Izrel kwụsị ife Bel. Ọ̀ ga na-agbalị ruo mgbe ole? O nwere ike ịbụ na ndị nchụàjà Bel chere na ike ga-agwụ Ịlaịja maka na o nweghị otú otu onye ga-esi merie ha niile. (1 Eze 18:4, 19, 20) Eze Ehab gbaara ụgbọ ịnyịnya ya bịa. Yanwakwa ahụghị Ịlaịja n’anya.

3, 4. (a) Gịnị mere ụjọ nwere ike iji jide Ịlaịja n’ụbọchị ahụ a ga-amata mbe abụọ nke bụ́ oké? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya?

3 Ụbọchị a ga-abụrụ onye amụma a naanị ya kwụ ụbọchị pụrụ iche. Ịlaịja nọ na-ekiri ìgwè mmadụ ahụ na-agbagotenụ. Ọ ma na n’oge na-adịghị anya, a ga-amata mbe abụọ nke bụ́ oké, ya bụ, a ga-amata ma Chineke ọ̀ ka ndị ajọ omume ike ka ọ̀ bụ ndị ajọ omume ka ya ike. Olee otú obi dị Ịlaịja n’ụbọchị ahụ? Anyị agaghị asị na ụjọ ejighị ya n’ihi na o “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Gụọ Jems 5:17.) Ma, otu ihe doro anya bụ na ọ dị Ịlaịja ka ọ̀ bụ naanị ya kwụ n’ihi na ebe ọ bụla o lere anya n’ugwu ahụ, naanị ndị ọ na-ahụ bụ ndị Izrel na-enwekwaghị okwukwe, ndị nchụàjà Bel bụ́ ndị chọrọ otú ha si egbu ya, nakwa Eze Ehab bụ́ onye kwụsịrịla ife Chineke.—1 Eze 18:22.

4 Ma, gịnị kpataara ndị Izrel nsogbu ha nọ na ya? Olee otú akụkọ a si gbasa gị? Ka anyị leba anya n’otú Ịlaịja si gosi na ya nwere okwukwe nakwa otú okwukwe ya nwere ike isi baara anyị uru taa.

Ugo Eberela ná Mgbagbu

5, 6. (a) Olee otú ndị Izrel si were ofufe Chineke n’oge Ehab? (b) Olee otú Ehab si nupụrụ Jehova isi?

5 Kemgbe ọtụtụ afọ, Ịlaịja nọ na-ele n’anya n’anya ka e ji ofufe  Chineke, bụ́ ihe kacha mkpa n’obodo ya, mere ihe egwuri egwu. N’eziokwu, ndị na-efe arụsị na-ama ndị na-efe Chineke aka. Ọtụtụ ndị Izrel ahapụkwala ife Jehova bụ́ Chineke ha fewezie arụsị otú mba ndị gbara ha gburugburu na-efe. Ma ihe bịaziri ka njọ n’oge Ịlaịja.

6 Eze Ehab nupụụrụ Jehova isi. Ọ lụrụ Jezibel, bụ́ ada eze ndị Saịdọn. Jezibel fooro ntutu taa na ya ga-eme ka ndị Izrel niile hapụ ife Jehova fewezie Bel. Obere oge, Ehab mewere ihe ọ bụla nwunye ya kwuru. Ọ bụ ya mere o ji wuoro Bel ụlọ na ebe ịchụàjà n’Izrel. O mechakwara buru ofufe Bel n’isi.—1 Eze 16:30-33.

7. (a) Gịnị mere ofufe Bel ji jọgbuo onwe ya? (b) Olee ihe mere obi ji sie anyị ike na ebe niile Baịbụl kwuru afọ ole mmiri na-ezoghị n’Izrel n’oge Ịlaịja adịghị iche n’ibe ya? (Jiri ihe e dere n’igbe zaa ajụjụ a.)

7 Gịnị mere ofufe Bel ji jọgbuo onwe ya? Ọ bụ n’ihi na o duhiere ndị Izrel ma mee ka ha kwụsị ife ezi Chineke. Ihe ọzọ bụ na ọ bụ ofufe rụrụ arụ, obi takwara ndị na-efe Bel mmiri. Ha na-enwe ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị ha. Ọ na-abụ ha fewe Bel, ha na-enwe mmekọahụ aghara aghara, na-achụkwa ụmụaka n’àjà. Nke a mere ka Jehova ziga Ịlaịja ka ọ gakwuru Ehab gwa ya na mmiri agaghị ezokwa ruo mgbe yanwa bụ́ onye amụma Chineke kwuru ka o zoo. (1 Eze 17:1) Afọ ole na ole gafere tupu Ịlaịja ahụ Ehab ọzọ. Mgbe ọ hụrụ ya, ọ gwara ya ka ọ kpọkọọ ụmụ Izrel na ndị amụma Bel n’Ugwu Kamel. *

E nwere ike ikwu na ihe ndị e ji mara ofufe Bel ka juru ebe niile taa

8. Olee uru ihe Baịbụl kọrọ banyere ofufe Bel baara anyị taa?

8 Olee ihe aka ahụ ndị na-efe Bel mara ndị na-efe Jehova na-akụziri anyị taa? Ụfọdụ nwere ike iche na akụkọ banyere ofufe Bel abaraghị anyị uru n’oge a ebe ọ bụ na e nwezighị ụlọ nsọ Bel na ebe ịchụàjà ya. Ma, akụkọ a abụghị ihe mere n’oge ochie nke na-agbasaghị anyị. (Rom 15:4) Okwu ahụ bụ́ “Bel” pụtara “onyenwe” ma ọ bụ “nna ukwu.” Jehova gwara ndị ya ka ha were ya ka “bel” ha, ya bụ, di nwe ha. (Aịza. 54:5) Ọ́ bụghị eziokwu na ndị mmadụ taa ka na-efe ọtụtụ ihe ha ji mere nna ha ukwu kama ife Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile? N’eziokwu, mgbe ndị mmadụ ji ndụ ha niile na-achụ ego, na-arụ ọrụ ha, na-atụrụ ndụ, na-enwe mmekọahụ ma ọ bụ na-efe chi dị iche iche kama ife Jehova, ọ pụtara na ha ji ihe ndị ahụ mere nna ha ukwu. (Mat. 6:24; gụọ Ndị Rom 6:16.) E nwere ike ikwu na ihe ndị e ji mara ofufe Bel ka juru ebe niile taa. Ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma banyere aka ahụ ndị  na-efe Bel mara ndị na-efe Jehova n’oge ochie, ọ ga-enyere anyị aka ịmata onye anyị kwesịrị ife.

Olee Otú Ha Si “Na-enwe Echiche Abụọ”?

9. (a) Olee ihe mere Ugwu Kamel ji dị mma ịnọ na ya gosi na ofufe Bel bụ ofufe ụgha? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.) (b) Olee ihe Ịlaịja gwara ìgwè mmadụ ahụ?

9 Ọ bụrụ na mmadụ anọrọ n’elu Ugwu Kamel lepụ anya, ọ ga-ahụ iyi ndagwurugwu Kaịshọn, hụkwa Osimiri Ukwu (ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian). Ọ ga-ahụkwa ugwu ndị dị na Lebanọn. * Ma mgbe anwụ wara n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, onye nọ n’ugwu ahụ ga-ahụ na o nwezighị ebe dị mma n’ala Izrel. Ahịhịa niile akpọnwụọla n’ala a na-emebu  nri nke Jehova nyere ụmụ Ebreham. Anwụ emeela ka ebe niile kpọọ nkụ n’ihi ihe ọjọọ ndị Izrel na-eme. Mgbe ìgwè mmadụ ahụ gbakọtara, Ịlaịja gakwuuru ha wee sị ha: “Ruo ole mgbe ka unu ga na-enwe echiche abụọ dị iche? Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke, sowenụ ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ Bel, sowenụ ya.”—1 Eze 18:21.

10. Olee otú o si bụrụ na ndị Izrel “na-enwe echiche abụọ” n’oge Ịlaịja, oleekwa ihe dị mkpa ha chefuru?

10 Gịnị ka Ịlaịja bu n’obi mgbe o kwuru na ha “na-enwe echiche abụọ”? Ndị ahụ aghọtaghị na ha kwesịrị ịhọrọ onye ha ga-efe. Ha kwesịrị ịhọrọ ife Jehova ma ọ bụkwanụ Bel. Ha chere na ha ga na-efe Bel, ma n’otu mgbe ahụ na-arịọ Jehova Chineke ka o meere ha amara. Ọ ga-abụ na ha chere na Bel ga na-agọzi ihe ndị ha kụrụ n’ubi na anụmanụ ha, “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ana-echebekwa ha n’agha. (1 Sam. 17:45) Ma, ha chefuru otu ihe dị mkpa, nke ọtụtụ ndị na-aghọtabeghị taa, ya bụ, na Jehova achọghị ka ndị na-efe ya na-efekwa chi ọ bụla ọzọ. Ihe ọ chọrọ bụ ofufe a na-ekewaghị ekewa. Ụdị ofufe a kwesịkwara ya. Chineke agaghị anabata ofufe mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ na-efe ya, na-efekwa chi ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. Ụdị ofufe a na-akpasukwa ya iwe.—Gụọ Ọpụpụ 20:5.

11. Olee uru i chere ihe ahụ Ịlaịja kwuru n’Ugwu Kamel nwere ike ịbara anyị?

11 E nwere ike ikwu na ndị Izrel ahụ yiri nwoke chọrọ ịga n’okporo ụzọ abụọ otu mgbe. Ọtụtụ ndị taa na-emekwa ihe yiri ya. Ha na-enwe “bel” ma ọ bụ nna ukwu dị iche iche ha na-efe, ya emezie ka ha ghara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị emee ihe a dị mkpa Ịlaịja kwuru, ya bụ, ịkwụsị inwe echiche abụọ, ọ ga-eme ka anyị lebagharịa anya n’ihe ndị anyị weere ka ihe kacha mkpa ná ndụ, lebagharịakwa anya n’otú anyị si efe Chineke.

Ịmata Mbe Abụọ nke Bụ́ Oké

12, 13. (a) Gịnị ka Ịlaịja gwara ndị nchụàjà Bel na ya na ha ga-eme? (b) Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere okwukwe na Chineke ka Ịlaịja?

12 Ịlaịja gwaziri ndị na-efe Bel ihe ya na ha ga-eme ka a mara mbe abụọ nke bụ́ oké. Ihe a ha ga-eme esighị ike. Ọ gwara ndị nchụàjà Bel ka ha wuo ebe ịchụàjà ma dokwasị anụ ha ga-eji chụọrọ chi ha àjà n’elu ya. Ha ga-ekpegaziri chi ha ekpere ka o mee ka àjà ha nwuru ọkụ. Ịlaịja sịrị na ya ga-emekwa otu ihe ahụ. Ọ gwara ha na ‘ezi Chi nke ga-eji ọkụ za bụ ezi Chineke.’ Ịlaịja ma onye bụ́ ezi Chineke. Okwukwe ya siri ike nke na ọ gwara ndị amụma Bel ka ha buru ya ụzọ malite. N’ihi ya, ha họọrọ ehi ha ga-eji chụọ àjà, bidozie ịkpọku Bel. *1 Ndị Eze 18:24, 25.

 13 Oge anyị a abụghị oge ọrụ ebube. Ma, Jehova agbanwebeghị, n’ihi ya, anyị nwere ike inwe okwukwe na Jehova otú ahụ Ịlaịja nwere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na ndị mmadụ na-ekwu okwu, ya bụrụ na ha ekwetaghị ihe Baịbụl kwuru, anyị nwere ike ịhapụ ha ka ha buru anyị ụzọ kwuo ihe ha chọrọ ikwu. Anyị kwesịrị ịtụkwasị ezi Chineke obi na ọ ga-eme ka a mata nke bụ́ eziokwu, otú ahụ Ịlaịja tụkwasịrị ya obi. Ọ bụrụ na ihe niile anyị ga-ekwu esi n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke e dere iji “mee ka ihe guzozie,” anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi, kama ịtụkwasị onwe anyị obi.—2 Tim. 3:16.

Ịlaịja ma na ofufe Bel bụ ofufe ụgha, ọ chọkwara ka ndị Chineke ghọta na ọ bụ ofufe ụgha n’eziokwu

14. Olee otú Ịlaịja si kwaa ndị amụma Bel emo, oleekwa ihe mere o ji mee otú ahụ?

14 Ndị amụma Bel kwadebere ebe ịchụàjà ha wuru, dokwasị anụ ha ga-eji chụọ àjà, malitezie ịkpọku chi ha. Ha tiri mkpu ugboro ugboro, sị, “Bel, za anyị!” Ha tigidere mkpu a ruo ọtụtụ awa. Baịbụl sịrị: “Ma a nụghị olu ọ bụla, ọ dịghịkwa onye na-azaghachi.” N’ehihie, Ịlaịja malitere ịkwa ha emo, na-asị na ọ ga-abụ na ọ dị ihe Bel na-eme nke mere na ọ zabeghị ha, na ọ ga-abụ na ọ gara mposi ma ọ bụ na ọ na-ehi ụra, na e kwesịrị ịkpọte ya. Ịlaịja gwara ndị aghụghọ ahụ ka ha ‘kpọkusie Bel ike.’ O doro anya na ọ ma na ofufe Bel bụ ofufe ụgha, ọ chọkwara ka ndị Chineke ghọta na ọ bụ ofufe ụgha n’eziokwu.—1 Eze 18:26, 27.

15. Olee otú ihe mere ndị nchụàjà Bel si gosi na onye hapụrụ Jehova fewe nna ukwu ọzọ mere iberiibe?

15 Ndị nchụàjà Bel meweziri ara ara. Baịbụl kwuru na ha malitere “ịkpọkusi [Bel] ike, jirikwa daga na ube na-amakasị onwe ha dị ka omenala ha si dị, ruo mgbe ha mere ka ọbara na-agba ha n’ahụ́.” Ma ihe a niile ha mere enweghị isi. Baịbụl kwuru, sị: “A nụghị olu ọ bụla, ọ dịghịkwa onye na-azaghachi, ọ dịghịkwa onye na-aṅa ntị.” (1 Eze 18:28, 29) N’eziokwu, Bel adịghị adị. Ọ bụ Setan mere ka ndị mmadụ chee na Bel dị adị. O jikwa ya eme ka ndị mmadụ hapụ ife Jehova. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ Jehova fewe nna ukwu ọzọ, ihere ga-emerịrị onye ahụ.—Gụọ Abụ Ọma 25:3; 115:4-8.

Ezi Chineke Zara

16. (a) Gịnị ka otú Ịlaịja si rụzie ebe ịchụàjà Jehova n’Ugwu Kamel nwere ike ichetara ụmụ Izrel? (b) Olee ihe ndị ọzọ Ịlaịja mere bụ́ ndị gosiri na o nwere okwukwe na Chineke ya?

16 Mgbe o ruwere mgbede, Ịlaịja bidoro ịkwado àjà ọ ga-achụrụ  Jehova. Ọ rụziri ebe ịchụàjà Jehova. Ọ ga-abụ ndị na-achọghị iji anya ahụ ebe a na-efe Jehova kwaturu ya. O ji nkume iri na abụọ rụzie ya. Ọ ga-abụ na ọ chọrọ iji ya chetara ọtụtụ ndị si n’ebo iri nke mba Izrel na ha ka kwesịrị irube isi n’iwu Chineke nyere ebo iri na abụọ nke Izrel. Ịlaịja dokwasịrị anụ ọ ga-eji chụọrọ Jehova àjà n’elu ebe ịchụàjà ahụ, wụọkwa ebe niile ahụ mmiri nke ọma. O nwere ike ịbụ na e kutere mmiri ahụ n’Oké Osimiri Mediterenian nke dị nso n’ebe ahụ. O gwudịrị olulu gburugburu ebe ịchụàjà ahụ, gbajuokwa ya mmiri. Ọ bụ eziokwu na o mere ka ihe niile dịrị ndị amụma Bel mfe, ma o meghị ka nke ya dị otú ahụ n’ihi na o nwere okwukwe na Jehova.—1 Eze 18:30-35.

Ekpere Ịlaịja gosiri na ọ ka hụrụ ndị obodo ya n’anya, n’ihi na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ mgbe Jehova ga-eme ka “obi ha chigharịa”

17. Olee otú ekpere Ịlaịja si gosi ihe kacha ya mkpa ná ndụ, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya mgbe anyị na-ekpe ekpere?

17 Mgbe Ịlaịja mechara ihe niile ahụ, o kpere ekpere. Ekpere Ịlaịja adịghị ogologo, ma o gosiri ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Nke mbụ bụ na ọ chọrọ ime ka a mara na Jehova “bụ Chineke n’Izrel,” ọ bụghị Bel. Nke abụọ abụrụ na ọ chọrọ ka mmadụ niile mara na o nweghị ihe ọzọ ya bụ ma ọ́ bụghị ohu Jehova, nakwa na ọ bụ Chineke ka e kwesịrị inye otuto na nsọpụrụ niile. Nke ikpeazụ bụ na ọ ka hụrụ ndị obodo ya n’anya, n’ihi na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ mgbe Jehova ga-eme ka “obi ha chigharịa.” (1 Eze 18:36, 37) N’agbanyeghị nsogbu niile ha nwerela maka na ha enweghị okwukwe, Ịlaịja ka hụrụ ha n’anya. Mgbe anyị na-ekpegara Chineke ekpere, ọ́ gaghị adị mma ka anyị gosi na aha Chineke dị anyị mkpa, na anyị dị umeala n’obi, nakwa na anyị na-emetere ndị nọ ná mkpa ebere?

18, 19. (a) Olee otú Jehova si zaa ekpere Ịlaịja? (b) Gịnị ka Ịlaịja nyere ndị Izrel iwu ka ha mee, gịnịkwa mere na e kwesịghị imere ndị amụma Bel ebere?

18 Tupu Ịlaịja amalite ikpe ekpere, o nwere ike ịbụ na ìgwè mmadụ ahụ nọ na-eche ma Jehova ọ̀ ga-akụ afọ n’ala ka Bel. Ma mgbe o kpechara ekpere ahụ, ọ ga-abụ na ha kwụsịrị iche otú ahụ. Baịbụl sịrị: “Ọkụ nke Jehova wee daa repịa àjà nsure ọkụ ahụ na nkụ ahụ na nkume ndị ahụ na ájá, ọ mịkọkwaara mmiri dị n’olulu ahụ.” (1 Eze 18:38) Otú Jehova si zaa ekpere Ịlaịja dị egwu. Gịnị ka ìgwè mmadụ ahụ mere?

“Ọkụ nke Jehova wee daa”

19 Baịbụl kwuru na ha niile tiri mkpu, sị: “Ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke! Ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke!” (1 Eze 18:39) Ha emechaala mata mbe abụọ nke bụ́ oké. Ma ha egosibeghị na ha nwere okwukwe na  Chineke. N’eziokwu, na ha kwetara na Jehova bụ ezi Chineke maka na ha hụrụ ọkụ si n’eluigwe daa mgbe Ịlaịja kpechara ekpere abụghị naanị ihe ga-egosi na ha nwere okwukwe. N’ihi ya, Ịlaịja gwara ha ka ha gosi okwukwe ha n’ụzọ ọzọ. Ọ gwara ha ka ha mee ihe ha kwesịrịla ime kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ya bụ, ka ha rubere iwu Jehova isi. Iwu Chineke sịrị na e kwesịrị igbu ndị amụma ụgha na ndị na-ekpere arụsị. (Diut. 13:5-9) Ndị amụma Bel a bụ ndị iro Jehova Chineke, ha makwa ụma na-agba uche ya ụkwụ. È kwesịrị imere ha ebere? Hanwa hà meere ụmụaka niile ọ na-enweghị ihe ha mere ebere, bụ́ ndị ha surere n’ọkụ ná ndụ mgbe ha na-achụrụ Bel àjà? (Gụọ Ilu 21:13; Jere. 19:5) N’eziokwu, e kwesịghị imere ha ebere. Ịlaịja nyeziri iwu ka e gbuo ha, e wee gbuo ha.—1 Eze 18:40.

20. Gịnị mere na ọ dịghị mma iche na ndị okpukpe ha na-agba ara ga-egbuwe ndị okpukpe ọzọ maka na Ịlaịja gburu ndị amụma Bel?

20 Ụfọdụ ndị na-akatọ Baịbụl n’oge a nwere ike ikwu na ihe a mechara mee n’Ugwu Kamel adịghị mma. Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ndị okpukpe ha na-agba ara nwere ike ịkụgide aka n’ihe a Baịbụl kọrọ gbuwe ndị na-abụghị ndị okpukpe ha. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị okpukpe ha na-agba ara na-arụ ọtụtụ arụrụala taa. Ma, okpukpe Ịlaịja anaghị agba ya ara. Ọ bụ Jehova ka ọ rụụrụ ọrụ n’ihi na ọ bụ uche ya ka e gbuo ndị ahụ. Ndị ahụ e gburu kwesịkwara ọnwụ. Ma, ezigbo Ndị Kraịst ma na ha agaghị egbu ndị ajọ omume otú ahụ Ịlaịja gburu. Mgbe Kraịst nọ n’ụwa, ọ gwara Pita ihe ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme. Ọ sịrị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Mat. 26:52) Ọ bụ Jehova ga-esi n’aka Ọkpara ya bibie ndị ajọ omume niile n’ọdịnihu.

21. Olee ihe mere ezigbo Ndị Kraịst taa ji kwesị iṅomi Ịlaịja?

21 Ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ibi ndụ otú gosiri na o nwere okwukwe. (Jọn 3:16) Otu ụzọ o nwere ike isi mee nke a bụ ibi ndụ ka Ịlaịja na ndị ọzọ nwere okwukwe. Ịlaịja fere naanị Jehova, ọ gbakwara ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ. Ọ katara obi mee ka ndị mmadụ mata na ofufe Bel bụ ofufe ụgha nke Setan ji mee ka ndị Izrel hapụ ife Jehova. Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-eme ka ihe niile dị mma kama ịtụkwasị onwe ya obi na ime uche nke onwe ya. N’eziokwu, Ịlaịja gbachiteere ofufe Chineke. Ka anyị niile ṅomie okwukwe ya.

^ para. 9 A na-enwekarị ahịhịa ndụ n’Ugwu Kamel n’ihi na ikuku na-esi n’oké osimiri buru mmiri laa n’elu. Nke a na-eme ka mmiri na-ezo ná mkpọda ugwu ahụ, igirigi ana-edekwa ya. Ebe ọ bụ na a na-ekwu na ọ bụ Bel na-eme ka mmiri zoo, o yiri ka ndị na-efe Bel hà na-anọkarị n’ugwu a efe Bel. Ma ebe ọ bụ na Ugwu Kamel akpọọla nkụ, ọ bụ ebe dị mma ịnọ gosi na ofufe Bel enweghị isi.

^ para. 12 Ọ dị mma ịmara na Ịlaịja gwara ha, sị: ‘Unu agaghị etinye anụ ahụ unu ga-eji chụọ àjà ọkụ.’ Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na mgbe ụfọdụ, ndị na-efe Bel na-anọ n’ebe ịchụàjà nwere oghere zoro ezo n’okpuru ya achụrụ chi ha àjà. Ọ bụrụ na ha esi n’oghere ahụ tinye ọkụ n’àjà ha chọrọ ịchụ, ya eyie ka ọ̀ bụ chi ha tinyere ya.