Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA OTU

O Cheere Jehova

O Cheere Jehova

1, 2. Gịnị ka Ịlaịja katara obi mee, oleekwa otú ya na Ehab si dị iche?

ỊLAỊJA chọrọ ịnọrọ naanị ya ka o kpegara Nna ya nke eluigwe ekpere. Ma, ọ dịbeghị anya ìgwè mmadụ ya na ha nọ hụrụ ka ezigbo onye amụma a kpere ekpere, ọkụ esi n’eluigwe daa. Ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ha chọwaziri ka ha na ya dịrị ná mma. Tupu Ịlaịja agbagoo n’elu Ugwu Kamel kpegara Jehova Chineke ekpere, o nwere ihe ọ katara obi mee. Ọ gara gwa Eze Ehab okwu.

2 Ehab na Ịlaịja dị iche. Ehab yi uwe mara mma ndị eze na-eyi. Ọ bụ onye anyaukwu nke na-anaghị ekpebiliri onwe ya ihe ọ na-eme. Ọ kwụsịkwala ife Jehova. Ma, Ịlaịja yi uwe ndị amụma. A chọghị uwe ya mma. O nwere ike ịbụ na e ji akpụkpọ anụ ma ọ bụ ajị kamel ma ọ bụ ajị ewu kwee ya. Ịlaịja nwere obi ike na okwukwe, jirikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ emeela ka a mata ụdị mmadụ ha abụọ bụ.

3, 4. (a) Gịnị mere ụbọchị ahụ ji bụụrụ Ehab na ndị ọzọ na-efe Bel ụbọchị ọjọọ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya?

3 Ụbọchị ahụ bụụrụ Ehab na ndị ọzọ na-efe Bel ụbọchị ọjọọ. E gosila na ofufe Bel nke Ehab na nwunye ya, bụ́ Jezibel, bu n’isi n’alaeze ebo iri nke Izrel bụ ofufe ụgha. Ofufe Bel akụọla afọ n’ala. Chi ahụ na-adịghị ndụ enwelighị ike izite ọkụ nkịtị mgbe ndị amụma ya ji ike ha niile na-arịọ ya arịrịọ, na-agba egwú ma jiri mma na-ebekasị onwe ha ahụ́. O melighị ka a ghara igbu narị mmadụ anọ na iri ise ahụ kwesịrị ọnwụ. Ma, o nwekwara ihe ọzọ chi ụgha a na-emelighị nke anyị ga-amata n’oge na-adịghị anya. Kemgbe ihe karịrị afọ atọ, ndị amụma Bel nọ na-arịọ Bel ka o mee ka oké ọkọchị kọrọ n’ala ha kwụsị, ma Bel emelighị ya. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-egosi na ya bụ ezi Chineke mgbe ọ ga-eme ka oké ọkọchị ahụ kwụsị.—1 Eze 16:30–17:1; 18:1-40.

4 Ma, oleekwanụ mgbe Jehova ga-eme ihe? Olee ihe Ịlaịja ga na-eme tupu Jehova emee ihe? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’aka  nwoke a nwere okwukwe? Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’ihe Baịbụl kwuru, anyị ga-achọpụta.—Gụọ 1 Ndị Eze 18:41-46.

Ọ Na-ekpe Ekpere Mgbe Niile

5. Gịnị ka Ịlaịja gwara Ehab mee, ì chere na Ehab mụtara ihe n’ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ?

5 Ịlaịja gakwuuru Ehab wee sị ya: “Lawa, rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; n’ihi na ụda nke mkpọtụ oké mmiri ozuzo na-ada.” Eze arụrụala a ọ̀ mụtara ihe n’ihe mere n’ụbọchị ahụ? Baịbụl ekwughị otú ahụ. O nwekwanụghị ihe amaokwu a kwuru nke gosiri na o chegharịala. Amaokwu a ekwughịkwa na ọ rịọrọ onye amụma ahụ ka o kpegara Jehova ekpere rịọ ya ka ọ gbaghara ya. Naanị ihe Ehab mere bụ ‘ịla gaa rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.’ (1 Eze 18:41, 42) Oleekwanụ ihe Ịlaịja mere?

6, 7. Gịnị ka Ịlaịja kpere n’ekpere, gịnịkwa mere o ji kpee ya?

6 Baịbụl sịrị: “Ma Ịlaịja gbagooro n’elu ugwu Kamel wee hulata ala ma kpunye ihu ya n’agbata ikpere ya abụọ.” Mgbe Ehab gara iri nri, Ịlaịja ji ohere ahụ gaa kpegara Nna ya nke eluigwe ekpere. Otú a Ịlaịja si nọrọ gosiri na ọ dị umeala n’obi. O gburu ikpere n’ala, hulata isi ya ala nke na isi ya ruwere n’ikpere ya. Gịnị ka Ịlaịja nọ na-eme? Anyị ekwesịghị ichewe ya eche. Baịbụl  gwara anyị na Jems 5:18 na Ịlaịja kpere ekpere ka oké ọkọchị ahụ kwụsị. Ọ ga-abụ na ọ nọ n’elu Ugwu Kamel kpee ekpere ahụ.

Ekpere Ịlaịja kpere gosiri na ọ chọsiri ike ka uche Chineke mezuo

7 Jehova ebula ụzọ kwuo, sị: “Ekpebisiwo m ike ime ka mmiri zoo n’elu ala.” (1 Eze 18:1) Ihe Ịlaịja meziri bụ ikpe ekpere ka ihe ahụ Jehova kwuru mezuo. Mgbe ihe dị ka otu puku afọ gachara, Jizọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka uche Chineke mezuo.—Mat. 6:9, 10.

8. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka Ịlaịja banyere ekpere?

8 E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka Ịlaịja banyere ekpere. Ihe kacha Ịlaịja mkpa bụ ka uche Chineke mezuo. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, ọ dị mma ka anyị cheta na “ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ [Chineke] dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) O doro anya na anyị kwesịrị ịmara ihe bụ́ uche Chineke ka anyị nwee ike ikpe ekpere ọ ga-anụ. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka anyị na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ihe ọzọ mere Ịlaịja ji chọọ ka oké ọkọchị ahụ kwụsị bụ n’ihi ahụhụ niile ndị obodo ya nọ na-ata. Ọ ga-abụkwa na o kelere Chineke mgbe ọ hụrụ ọrụ ebube Jehova rụrụ n’ụbọchị ahụ. Anyị kwesịkwara isi n’ala ala obi anyị na-ekele Chineke ekele mgbe anyị na-ekpe ekpere ma na-arịọkwa ya ka o mee ka ihe dịrị ndị ọzọ ná mma.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:11; Ndị Filipaị 4:6.

Obi Siri Ya Ike, O Cheere Jehova

9. Gịnị ka Ịlaịja gwara onye na-ejere ya ozi ka o mee, oleekwa ihe abụọ anyị ga-amụta n’aka Ịlaịja?

9 O doro Ịlaịja anya na Jehova ga-eme ka oké ọkọchị ahụ kwụsị, ma ọ maghị mgbe Jehova ga-eme ya. Ma, gịnị ka onye amụma a nọ na-eme tupu Jehova emee ihe? Baịbụl sịrị: “O wee sị onye na-ejere ya ozi: ‘Biko, gbagoo. Lee anya ná mpaghara oké osimiri.’ Ya mere, ọ gbagooro lee anya wee sị: ‘Ọ dịghị ihe m hụrụ ma ọlị.’ O wee sị, ‘Gbagoo ọzọ,’ ruo ugboro asaa.” (1 Eze 18:43) Ma ó nweghị ihe ọzọ, e nwere ihe abụọ anyị ga-amụta n’aka Ịlaịja bụ́ ndị anyị ga-eleba anya. Nke mbụ bụ na onye amụma ahụ nwere obi ike. Nke abụọ abụrụ na o cheere Jehova.

Ịlaịja chọsiri ike ka ọ hụ ihe ga-egosi ya na oge Jehova ga-eme ihe eruwela

10, 11. (a) Olee otú Ịlaịja si gosi na obi siri ya ike na Jehova ga-emezu nkwa ya? (b) Gịnị mere obi ga-eji siekwa anyị ike otú ahụ o siri Ịlaịja?

10 Ebe ọ bụ na obi siri Ịlaịja ike na ihe Jehova kwuru ga-emezu, ọ chọsiri ike ka ọ hụ ihe ga-egosi ya na oge Jehova ga-eme ihe eruwela. O zigara onye na-ejere ya ozi ka ọ gbagoo n’elu elu  ugwu ahụ legharịa anya iji mara ma mmiri ọ̀ na-eru. Mgbe onye ahụ na-ejere Ịlaịja ozi lọtara, o ziri ya ozi na-adịchaghị ụtọ, sị: “Ọ dịghị ihe m hụrụ ma ọlị.” O doro anya na mmiri anaghị eru n’ihi na ihu ígwé gbachapụrụ agbachapụ. Ò nwere ihe dị iche ị chọpụtara? Cheta na ọ dịbeghị anya Ịlaịja gwara Eze Ehab na “ụda nke mkpọtụ oké mmiri ozuzo na-ada.” Olee otú ọ ga-esi kwuo ụdị ihe a mgbe ọ na-enweghị mmiri na-erunụ?

11 Ịlaịja ma na Jehova kwere nkwa na mmiri ga-ezo. Ebe ọ bụ onye amụma Jehova na onye na-anọchi anya ya, o doro ya anya na Chineke ya ga-emezu ihe o kwuru. Obi siri Ịlaịja ike nke na ọ dị ya ka à ga-asị na ọ nụwala ụda oké mmiri ozuzo. Nke a na-echetara anyị ihe Baịbụl kwuru banyere Mozis. Ọ sịrị: “O guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” Ì kwetasiri ike na Chineke dị adị otú ahụ Mozis kwetara? Chineke emeekwala ka anyị nwee ezigbo ihe mere anyị ga-eji nwee okwukwe na ya ma kweta na ọ ga-emezu nkwa ya niile.—Hib. 11:1, 27.

12. Olee otú Ịlaịja si gosi na ya cheere Jehova, oleekwa ihe o mere mgbe onye na-ejere ya ozi kọọrọ ya na ya hụrụ obere ígwé ojii?

12 Ihe ọzọ bụ na Ịlaịja cheere Jehova. Ọ gwara onye na-ejere ya ozi ka ọ gaghachi, ọ bụghị otu ugboro, ọ bụghị ugboro abụọ, kama ugboro asaa. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ike ịgaghachi ebe ahụ gwụrụ onye ahụ na-ejere ya ozi. Ma, Ịlaịja nọgidere na-atụ anya ka ya hụ ihe na-egosi na mmiri ga-ezo, ike agwụghịkwa ya. Mgbe onye ahụ na-ejere ya ozi gachara nke ugboro asaa, ọ gwara Ịlaịja, sị: “Lee! E nwere obere ígwé ojii dị ka ọbụ aka mmadụ nke si n’oké osimiri na-apụta.” Weregodị ya na ị na-ahụ onye ahụ na-ejere Ịlaịja ozi ka ọ matịrị aka na-egosi Ịlaịja otú ígwé ojii ahụ hà. O nwere ike ịbụ na o nweghị ihe onye ahụ na-ejere Ịlaịja ozi ji ígwé ojii ahụ kpọrọ. Ma, Ịlaịja ji ya kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere o ji gwa onye ahụ na-ejere ya ozi ihe ọ ga-eme ngwa ngwa. Ọ sịrị ya: “Gaa sị Ehab, ‘Kwadebe ụgbọ ịnyịnya gị! Gbadawakwa ka oké mmiri ozuzo ghara igbochi gị ịla!’”—1 Eze 18:44.

13, 14. (a) Olee otú anyị nwere ike isi nọrọ na nche ka Ịlaịja? (b) Gịnị mere anyị ji kweta na oge agwụla agwụ?

13 Ihe a Ịlaịja mere na-akụzikwara anyị ihe dị mkpa. Anyị bikwa mgbe ọ fọrọ obere oge ka Chineke mezuo uche ya. Ịlaịja cheere ruo mgbe oké ọkọchị ahụ kwụsịrị. Taa, ndị na-efe Chineke na-echere ka Chineke bibie ụwa a rụrụ arụ. (1 Jọn 2:17) Anyị kwesịrị ịnọ na nche otú ahụ Ịlaịja mere, ruo mgbe Jehova Chineke ga-eme ihe. Jizọs, Ọkpara Chineke, nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ a: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Mat. 24:42) Ihe a Jizọs kwuru  ọ̀ pụtara na ndị na-eso ụzọ ya agaghị ama na ha bi n’oge ọgwụgwụ? Mba. N’ihi na o kwuru ọtụtụ ihe ndị ga na-eme tupu ọgwụgwụ ahụ abịa. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịhụ ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge “ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Gụọ Matiu 24:3-7.

Ọ bụ naanị obere ígwé ojii mere ka obi sie Ịlaịja ike na Jehova achọwala ime ihe. Ma e nwere ọtụtụ ihe na-egosi anyị na oge ikpeazụ a agwụla agwụ nakwa na anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa

14 Nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ na-eme ka anyị kwetasie ike na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ọ̀ bụ na ihe ndị ahụ ezubeghị ime ka anyị mara na oge agwụla agwụ ma jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe? Ọ bụ naanị obere ígwé ojii mere ka obi sie Ịlaịja ike na Jehova achọwala ime ihe. Ma, ihe ahụ Ịlaịja tụrụ anya ya ò mezuru?

Jehova Gọziri Ya, Meekwa Ka Ahụ́ Ruo Ya Ala

15, 16. Olee ihe ndị maliteziri ime ọsọ ọsọ n’ụbọchị ahụ, oleekwa ihe ndị o nwere ike ịbụ na Ịlaịja nọ na-eche banyere Ehab?

15 Baịbụl gwara anyị, sị: “O wee ruo na mgbe nke a na-eme, ígwé ojii na ifufe mere ka eluigwe gbachie, nnukwu mmiri wee malite izo. Ehab nọkwa na-agba ụgbọ ịnyịnya wee ruo Jezril.” (1 Eze 18:45) Ihe niile maliteziri ime ọsọ ọsọ. Ka onye na-ejere Ịlaịja ozi nọ na-ezi Ehab ozi ahụ Ịlaịja ziri ya, obere ígwé ojii ahụ bịaziri dị ọtụtụ, kpuchie eluigwe, gbachiekwa ya. Oké ifufe fewere. Mmiri na-ezobeghị n’ala Izrel kemgbe afọ atọ na ọkara bidoziri zowe. Ala ahụ kpọrọ nkụ malitere ịmịkọrọ mmiri ahụ. Mgbe mmiri ahụ zosiwere ike, osimiri Kaịshọn toro. O doro anya na ọ sachapụrụ ọbara ndị amụma Bel ahụ e gburu egbu. Ihe a bụ ohere ụmụ Izrel nwere ike iji hapụ ofufe Bel ma fewezie Jehova.

“Nnukwu mmiri wee malite izo”

16 O doro anya na Ịlaịja chọrọ ka ha mee otú ahụ. O nwekwara ike ịbụ na ọ nọ na-eche ma ihe niile a na-emenụ hà ga-emetụ Ehab n’obi. Ihe niile a hà ga-eme ka Ehab chegharịa hapụ ofufe Bel? Ihe niile mere n’ụbọchị ahụ ezuola ime ka o chegharịa. N’eziokwu, anyị amaghị ihe Ehab na-eche mgbe ahụ. Naanị ihe Baịbụl gwara anyị bụ na eze ahụ ‘nọ na-agba ụgbọ ịnyịnya wee ruo Jezril.’ Ò nwere ihe ọ mụtara? Ò kpebiela na ya ga-agbanwe omume ya? Ihe ndị mechara mee gosiri na ọ ka kwụ ebe ọ kwụ. Ma, ọ ka nwere ihe ndị Ehab na Ịlaịja ga-eme n’ụbọchị ahụ.

17, 18. (a) Gịnị mere mgbe Ịlaịja na-aga n’okporo ụzọ gara Jezril? (b) Gịnị mere isi n’Ugwu Kamel gbara ọsọ ruo Jezril ji bụrụ ihe ịtụnanya? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

 17 Ịlaịja jizi ụkwụ si n’ụzọ ahụ Ehab si na-ala lawakwa. Ọ ga-aga ogologo ije n’ụzọ ahụ bụ́ mmiri mmiri nke ọchịchịrị gbachiri tupu ya alaruo. Ma, ihe dị ịtụnanya mere.

18 Baịbụl kwuru, sị: “Aka Jehova dịkwasịrị Ịlaịja, o wee kee ájị̀ n’úkwù, buru Ehab ụzọ gbaruo Jezril.” (1 Eze 18:46) O doro anya na “aka Jehova” rụrụ ọrụ ebube n’ahụ́ Ịlaịja. Jezril dị ihe dị ka kilomita iri atọ ma e si n’ugwu ahụ gawa ya, Ịlaịja abụghịzikwa nwa okorobịa. * Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ịlaịja na-eyiri uwe mwụda ya, kegide ya n’úkwù ya ka ọ ghara inye ya nsogbu, ma gbawazie ọsọ n’okporo ụzọ ahụ bụ́ mmiri mmiri. Ọ gbasiri ọsọ ike nke na ọ gbakwuuru ụgbọ ịnyịnya ahụ bu eze ma gbafere ya.

19. (a) Olee amụma Baịbụl ndị ike na ume ahụ Chineke nyere Ịlaịja na-echetara anyị? (b) Olee ihe doro Ịlaịja anya mgbe ọ gba ọsọ na-aga Jezril?

19 O doro anya na Ịlaịja ghọtara na ọ bụ Jehova nyere ya ike o ji gbaa ọsọ ahụ. N’eziokwu, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ọ ga-abụkwa na ike ahụ o nyere ya karịrị nke o nwere mgbe ọ bụ okorobịa. Nke a na-echetara anyị amụma Baịbụl ndị kwuru na na paradaịs a ga-enwe n’ụwa, ahụ́ ga-ezu ndị na-efe Chineke okè, gbasiekwa ha ike. (Gụọ Aịzaya 35:6; Luk 23:43) Ka Ịlaịja nọ na-agba ọsọ n’okporo ụzọ ahụ bụ́ mmiri mmiri, o doro anya na ọ ma na Nna ya bụ́ Jehova, onye naanị ya bụ ezi Chineke, nwere mmasị n’ebe ọ nọ.

20. Olee ihe anyị ga-eme ka Jehova gọzie anyị?

20 Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ka ọ gọzie anyị. Anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ka ọ gọzie anyị n’ihi na onye ọ bụla ọ gọziri alaferela. Anyị kwesịrị ichere Jehova otú Ịlaịja mere ma na-agbalị ka uche anyị dịrị n’ihe ndị na-egosi na oge ọjọọ a agwụla agwụ nakwa na Jehova ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. Anyị nwere ezigbo ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova, bụ́ “Chineke nke eziokwu,” ga-emezu nkwa ndị o kwere.—Ọma 31:5.

^ para. 18 Ozugbo ihe a mechara, Jehova gwara Ịlaịja ka o bido ịzụ Ịlaịsha, bụ́ onye a ga-emecha kpọwa “onye wụsara mmiri n’aka Ịlaịja.” (2 Eze 3:11) Ịlaịsha jeere Ịlaịja ozi. O doro anya na o mere ihe niile o nwere ike ime ka o nyere Ịlaịja aka n’ihi na o meela agadi.