Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ATỌ

Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ

Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ

1, 2. (a) Olee nsogbu Jona kpataara onwe ya na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ mmiri? (b) Olee otú akụkọ Jona nwere ike isi nyere anyị aka?

Ọ DỊ Jona ka ya bụrụ na ọ ga-akwụsịli oké mkpọtụ a na-emenụ. Nsogbu ya abụghị naanị oké ifufe nke na-ebugharị ụdọ ndị ji ákwà ụgbọ mmiri ahụ, ọ bụghịkwanụ ebili mmiri nke na-enugharị ụgbọ ahụ ma na-eme ka osisi e ji rụọ ya na-eme mkpọtụ. Ihe kacha enye ya nsogbu bụ mkpu onyeisi ụgbọ ahụ na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ na-eti ka ha na-agbalịsi ike ime ka ụgbọ ahụ ghara ikpu. Jona ewerela ya na ha niile na-aga ịnwụ n’ihi ihe o metara.

2 Gịnị mere Jona ji banye n’ụdị nsogbu a? O mejọrọ Chineke ya, bụ́ Jehova, nke ukwuu. Gịnị ka o mere? Ya na Chineke hà ga-emecha dị ná mma? Azịza ajụjụ ndị a nwere ike ịkụziri anyị ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, akụkọ ndụ Jona na-akụziri anyị na ndị nwere okwukwe nwedịrị ike imejọ ihe. Ọ na-akụzikwara anyị otú ha nwere ike isi mezie ihe ndị ha mejọrọ.

Onye Amụma Si Galili

3-5. (a) Gịnị na-agbatakarị ndị mmadụ n’obi ma e kwute okwu Jona? (b) Gịnị bụ ihe ole na ole Baịbụl kọọrọ anyị banyere Jona? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.) (ch) Gịnị mere na ọ dịrịghị Jona mfe ịbụ onye amụma n’oge ahụ?

3 Ihe na-agbatakarị ndị mmadụ n’obi ma e kwuwe okwu Jona bụ àgwà na-adịghị mma ndị ọ kpara. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike icheta otú o si nupụ isi ma ọ bụkwanụ otú o si mee isi ike. Ma, e nwekwara ọtụtụ ihe ọma ndị Jona mere. Cheta na ọ bụ Jehova Chineke họọrọ Jona ka ọ bụrụ onye amụma ya. Jehova agaraghị ahọrọ ya ka ọ rụwara ya nnukwu ọrụ a ma a sị na ọ bụghị ezigbo mmadụ.

Ma, e nwekwara ọtụtụ ihe ọma ndị Jona mere

4 Ihe anyị ma banyere Jona bụ ihe ole na ole Baịbụl kọọrọ anyị. (Gụọ 2 Ndị Eze 14:25.) Baịbụl sịrị na ọ bụ onye Gat-hifa. Obodo  Gat-hifa dị kilomita anọ ma e si Nazaret gawa ya. Nazaret a bụ obodo Jizọs Kraịst nọ tolite mgbe ihe dị ka narị afọ asatọ gafere. * Jona buru amụma n’oge Eze Jeroboam nke Abụọ na-achị alaeze ebo iri nke Izrel. Ịlaịja anwụọla tupu oge ahụ. Ịlaịsha onye nọchiri ya anwụọkwala n’oge nna Jeroboam na-achị. Ọ bụ eziokwu na Jehova ji Ịlaịja na Ịlaịsha mee ka ndị Izrel kwụsị ife Bel, ndị Izrel kpachaara anya mejọwakwa Chineke. Eze na-achị ha mgbe ahụ nọ “na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.” (2 Eze 14:24) N’ihi ya, ọ gaghị adịrị Jona mfe ibu amụma n’oge ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ rụrụ ọrụ ya nke ọma.

5 Ma otu ụbọchị, e nwere ihe dị mkpa mere ná ndụ Jona. Jehova nyere Jona ọrụ Jona chere na ọ tara ezigbo akpụ. Gịnị ka Jehova gwara ya mee?

“Bilie, Gaa Ninive”

6. Olee ozi Jehova dunyere Jona, oleekwa ihe ndị mere ozi ahụ e dunyere ya nwere ike iji tụọ ya ụjọ?

6 Jehova gwara Jona, sị: “Bilie, gaa Ninive bụ́ obodo ukwu ma kwusaara ya na ihe ọjọọ ha erutewo n’ihu m.” (Jona 1:2) E nwere ọtụtụ ihe mere ọrụ ahụ nwere ike iji tụọ Jona ụjọ. Ninive dị ihe dị ka narị kilomita asatọ ma e si n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Izrel gawa ya. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ụkwụ gawa ya, ọ ga-ewe ya ihe dị ka otu ọnwa. Iji ụkwụ aga ya adịghị mfe. Ma, o yiri ka ọ bụghị ya bụ nsogbu Jona. Ọ bụrụ na Jona eruo Ninive, ndị ọ ga-agwa ihe Jehova kpebiri ime bụ ndị Asiria obi tara mmiri, bụ́kwanụ ndị e ji ime ihe ike mara. Ebe ọ bụ na ndị Izrel, bụ́ ndị na-efe Chineke, egechaghị Jona ntị, ọ̀ bụzi ndị Ninive na-ekpere arụsị ga-ege ya ntị? Olee otú ụwa ga-adị ya n’obodo ukwu ahụ bụ́ Ninive, bụ́ nke e mechara kpọọ “obodo na-awụfu ọbara”?—Nehọ. 3:1, 7.

7, 8. (a) Gịnị gosiri na Jona kpebisiri ike na ya agaghị aga ozi ahụ Jehova dunyere ya? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwu na Jona bụ onye ụjọ?

7 Ọ̀ ga-abụ na Jona nọ na-eche ihe ndị a n’obi ya? Anyị amaghị. Naanị ihe anyị ma bụ na o riri mbọ mbọ. Jehova gwara Jona ka ọ gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ma, Jona tinyere isi n’ebe ngwụcha ngwụcha ọdịda anyanwụ. Ọ gawara n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’obodo Jọpa. N’ebe ahụ, o nwetara ụgbọ mmiri na-aga Tashish. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na Tashish dị na Spen. Ya bụrụ eziokwu, ihe  ọ pụtara bụ na ebe Jona na-aga dị puku kilomita atọ na narị ise ma e si Ninive gawa ya. Ọ gaara ewe Jona otu afọ tupu ya eruo ná ngwụcha Osimiri Ukwu ahụ, ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian. Nke a gosiri na Jona kpebisiri ike na ya agaghị aga ozi ahụ Jehova dunyere ya.—Gụọ Jona 1:3.

8 Ọ̀ pụtaziri na Jona bụ onye ụjọ? Anyị ekwesịghị ikwu otú ahụ. Anyị ga-emecha hụ na Jona bụ nwoke nwere ezigbo obi ike. Ma, Jona ezughị okè otú anyị niile na-ezughị okè. O nwekwara ọtụtụ ihe ọ na-emezighị emezi otú anyị niile nwere ọtụtụ ihe anyị na-anaghị emezi emezi. (Ọma 51:5) Ò nwere onye n’ime anyị na-enwetụbeghị mgbe ụjọ tụrụ ya?

9. Olee otú ihe Jehova gwara anyị mee nwere ike ịdị anyị mgbe ụfọdụ, oleekwa ihe dị mkpa Jizọs kwuru nke anyị kwesịrị icheta mgbe ahụ?

9 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka ihe Chineke gwara anyị mee ọ̀ tara akpụ ma ọ bụdị dị anyị ka ànyị agaghị emeli ya. O nwekwara ike ịna-esiri anyị ike ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, bụ́ nke a gwara Ndị Kraịst ka ha na-ekwusa. (Mat. 24:14) Ọtụtụ mgbe, anyị na-echefu otu ihe dị mkpa Jizọs kwuru. O kwuru na “ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Ọ bụrụ na anyị na-echefu ya mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịghọta ihe bụ́ nsogbu Jona. Ma, olee nsogbu ọsọ ahụ Jona gbara kpatara?

Jehova Dọrọ Jona Aka ná Ntị

10, 11. (a) Olee ihe Jona nwere ike iche mgbe ụgbọ ha kwọpụrụ? (b) Olee nsogbu ndị nọ n’ụgbọ ahụ na ụgbọ ha nwere?

10 Weregodị ya na ị na-ahụ ka Jona banyere n’ụgbọ mmiri ahụ gaa chọọ otu ebe nọrọ. Ọ ga-abụ na ụgbọ ahụ bụ ụgbọ ndị Finishia ji ebu ngwá ahịa. Ọ nọ na-ekiri ka onyeisi ụgbọ ahụ na ndị ọzọ na-arụ ọrụ na ya nọ na-arụsi ọrụ ike ka ha nwee ike gawa agawa. Mgbe ụgbọ ahụ ji nwayọọ kwọpụ ma gamie, Jona nwere ike iche na ya agbaarala nsogbu na-atụ ya ụjọ ọsọ. Ma na mberede, ihu ígwé gbanwere.

11 Oké ifufe mere ka ebili mmiri dị egwu malite ibugharị oké osimiri ahụ. O nwere ike ịbụ na ebili mmiri ahụ dị elu karịa ụgbọ mmiri ndị a na-arụ n’oge a. Ò were oge tupu ụgbọ ahụ e ji osisi rụọ emewe ka ọ̀ chọrọ ịnyakasị, ya eyiekwa ka ebili mmiri ahụ ekpuchiela ya? N’oge ahụ, Jona ọ̀ ma ihe ahụ o mechara dee na Baịbụl, ya bụ, na ọ bụ ‘Jehova mere ka oké ifufe fekwasị oké osimiri ahụ’? Anyị amaghị. Ma, Jona hụrụ na onye ọ bụla n’ime ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ malitere ịkpọku chi ya, ọ makwa na chi ha agaghị enyere ha aka. (Lev. 19:4) O mechara dee, sị: “Ụgbọ mmiri ahụ wee chọwa ikpu ihu.” (Jona 1:4) Ma ebe ọ bụ na Jona na-agbara Chineke ya ọsọ, oleekwanụ ọnụ ọ ga-eji kpegara ya ekpere?

12. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịta Jona ụta maka na ụra buuru ya mgbe ahụ ebili mmiri na-ebugharị ụgbọ ahụ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.) (b) Olee otú Jehova si mee ka a mata onye kpatara nsogbu ahụ?

 12 Ebe Jona ma na o nweghị aka ya ga-enyeliri ha, ọ gara n’ala ala ụgbọ mmiri ahụ chọrọ otu ebe dinara ala. Ezigbo ụra buuru ya n’ebe ahụ. * Onyeisi ụgbọ mmiri ahụ hụrụ Jona, kpọtee ya ma gwa ya ka o kpegara chi ya ekpere otú ndị ibe ya na-eme. Ebe ndị na-akwọ ụgbọ ahụ kwetasiri ike na oké ifufe ahụ agbaghị aka, ha fere nzà ka ha mara onye ọ ga-abụ ya kpataara ha nsogbu ahụ n’ime ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ. Ọ ga-abụ na obi wụnyere Jona n’afọ mgbe nzà na-amaghị ndị niile ọzọ nọ n’ụgbọ ahụ. O teghị aka, eziokwu apụta ìhè. Ọ bụ n’ihi Jona ka Jehova ji mee ka oké ifufe ahụ na-efe. Ọ bụkwa ya ka o mere ka nzà ahụ ma.—Gụọ Jona 1:5-7.

13. (a) Olee ihe Jona kọọrọ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ? (b) Gịnị ka Jona gwara ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ ka ha mee ya, gịnịkwa mere o ji gwa ha mee otú ahụ?

13 Jona kọọrọ ndị na-akwọ ụgbọ ahụ ihe niile merenụ, gwakwa ha na ya bụ ohu Chineke pụrụ ime ihe niile, bụ́ Jehova. Ọ gwara ha na ọ bụ Chineke a ka ya mejọrọ ma na-agbara ọsọ, nakwa na ọ bụ nke a mere ha niile ji banye n’oké nsogbu a. Ihe niile a ọ gwara ha juru ha niile anya. Jona hụkwara na ezigbo ụjọ ji ha. Ha jụrụ ya ihe ha ga-eme ya ka ha na ụgbọ ha ghara ịla n’iyi. Gịnị ka ọ zara ha? Ọ ga-abụ na akpata oyi wụrụ Jona mgbe o chere echiche otú oké osimiri ahụ na-eme mkpatụ ma jụọ oyi ga-esi rie ya. Ma, olee otú ọ ga-esi kpatara mmadụ niile ahụ ọnwụ mgbe ọ ma na ya nwere ike ịzọ ha ndụ? N’ihi ya, ọ sịrị: “Bulienụ m tụba n’ime oké osimiri, oké osimiri a ga-adakwara unu jụụ; n’ihi na m maara na ọ bụ n’ihi m ka oké ifufe a ji efekwasị unu.”—Jona 1:12.

14, 15. (a) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie okwukwe Jona? (b) Olee ihe ndị ahụ na-akwọ ụgbọ mmiri mere mgbe Jona gwara ha ka ha tụba ya n’oké osimiri?

14 Ihe a Jona kwuru gosiri na ọ bụghị onye ụjọ. Ọ ga-abụ na obi tọrọ Jehova ụtọ mgbe ọ hụrụ na obi kara Jona, ya ekweta ịnwụ kama ndị ọzọ ga-anwụ. Ihe a Jona mere gosiri na okwukwe ya siri ezigbo ike. Anyị nwere ike iṅomi Jona taa ma ọ bụrụ na mkpa ndị mmadụ ana-echu anyị ụra karịa mkpa nke onwe anyị. (Jọn 13:34, 35) Ọ bụrụ na anyị ahụ onye nọ ná mkpa, ma ọ bụ onye ihe na-enye nsogbu n’obi, ma ọ bụ onye e kwesịrị inyere aka ka ya na Chineke dịrị ná mma, ànyị na-ewepụta onwe anyị nyere onye ahụ aka? Obi ga-atọ Jehova ezigbo ụtọ ma anyị mee otú ahụ.

15 Ọ ga-abụ na ihe Jona gwara ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ ka ha mee ya metụrụ ha n’obi, n’ihi na ná mmalite, ha ekweghị eme ihe o kwuru. Kama nke ahụ, ha nwara ike ha niile ka ha kwọrọ ụgbọ ahụ na-aga. Ma, ihe niile ha mere enweghị isi. Ebili mmiri ahụ kakwuru njọ. N’ikpeazụ, ha hụrụ na o nweghị ihe ọzọ ha ga-eme. Ha kpọkuru Chineke Jona, bụ́ Jehova, ka o meere ha ebere. Ha ebulizie Jona tụba ya n’ime oké osimiri ahụ.—Jona 1:13-15.

Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ buliri Jona tụba ya n’oké osimiri mgbe Jona gwara ha mee otú ahụ

E Meere Jona Ebere ma Napụta Ya

16, 17. Kọwaa ihe mere Jona mgbe a tụbara ya n’oké osimiri. (Lee foto dị n’ala.)

16 Jona dakpuru n’oké osimiri ahụ na-eme mkpatụ. Ọ ga-abụ na ọ gbalịrị setụ n’elu mmiri ahụ ma hụ ụfụfụ mmiri ahụ na-agbọ nke gosiri ya na ụgbọ mmiri ahụ ji ọsọ na-aga. Ma, ebili mmiri nubara ya n’ala ala oké osimiri ahụ. Ka ọ na-emikpu n’ike n’ike, obi ya gwara ya na nke ọ na-eme agwụla.

17 Jona mechara kwuo otú obi dị ya mgbe ahụ. O nweghị ihe na-agbataghị ya n’obi. O wutere ya na ya agaghịzi ahụ ọmarịcha ụlọ nsọ Jehova nke dị na Jeruselem. Ọ dị ya ka ọ̀ na-emikpu n’ogbu oké osimiri ahụ, ruo n’ala ala ugwu, bụ́ ebe ahịhịa ndị dị n’ala oké osimiri  hịkọtara ya n’ahụ́. O yiri ka ebe ahụ ọ̀ ga-abụ ili ya.—Gụọ Jona 2:2-6.

18, 19. Gịnị mere Jona n’ala ala oké osimiri ahụ, ònye kpatara ihe niile ahụ merenụ, oleekwa ụdị anụ loro ya? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

18 Ma, cheregodị! O nwere nnukwu ihe dị ndụ na-abịa ya nso. Ihe ahụ dị oji, o jikwa ike gaa n’ebe Jona nọ, meghee nnukwu ọnụ ya ma kpụrụ ya loo.

Jehova mere “ka otu nnukwu azụ̀ loo” Jona

19 Jona chere na ọnwụ ya eruola. Ma, e nwere ihe dị ịtụnanya ọ chọpụtara. Ọ chọpụtara na ya ka dị ndụ. Ihe ahụ loro ya atapịaghị ya ma ọ bụ mee ka ọ kwụsị iku ume. Jona agbarighịkwa n’ime afọ ya. Kama nke ahụ, Jona ka na-eku ume, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ebe kwesịrị ịbụ ili ya. Akpata oyi bịaziri wụọ Jona n’ahụ́. O doro Jona anya na ọ bụ Chineke ya, bụ́ Jehova, mere “ka otu nnukwu azụ̀ loo” ya. *Jona 1:17.

20. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta banyere Jona n’ekpere ahụ ọ nọ n’afọ azụ̀ kpee?

20 Jona nọrọ ọtụtụ awa n’afọ azụ̀ ahụ. Ọ nọ n’ebe ahụ gbara oké ọchịchịrị chee echiche nke ọma ma kpegara Jehova Chineke ekpere. O nwere ihe ndị anyị ga-amụta banyere Jona n’ekpere ahụ o kpere nke e dere n’isi nke abụọ nke akwụkwọ Jona. Ekpere ahụ gosiri na Jona ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma n’ihi na ọtụtụ ugboro, o kwuru ihe ndị e dere n’akwụkwọ Abụ Ọma. O gosikwara na Jona nwere otu àgwà mara mma, ya bụ, na ọ naghị echefu ikele Chineke maka ihe ọma o meere ya. Otú Jona si mechie ekpere ya bụ: “Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà. M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa. Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”—Jona 2:9.

21. Gịnị ka Jona mụtara banyere nzọpụta, oleekwa ihe ndị anyị na-ekwesịghị ichefu?

21 Jona nọ “n’afọ azụ̀ ahụ” mụta na Jehova nwere ike ịzọpụta onye ọ bụla ọ chọrọ ịzọpụta n’oge ọ bụla ọ chọrọ, n’agbanyeghị ebe onye ahụ nọ. Jehova gbataara ya ọsọ enyemaka ma zọpụta ya n’ebe ahụ ọ nọ. (Jona 1:17) Ọ bụ naanị Jehova nwere ike ime  ka mmadụ dịrị ndụ n’afọ azụ̀ ruo ụbọchị atọ, ehihie na abalị, n’enweghị ihe ọ bụla mere ya. Taa, ọ dị mma ka anyị cheta na ọ bụ Jehova bụ ‘Chineke onye ume ndụ anyị dị n’aka.’ (Dan. 5:23) Ọ bụ ya nwe ume anyị na-eku na ndụ anyị dị. Ànyị na-ekele ya maka ihe ndị a? Ọ̀ bụ na ihe ndị a ekwesịghị ime ka anyị na-erubere Jehova isi?

22, 23. (a) Olee ihe Jehova gwara Jona nke ga-egosi ma obi ọ̀ dị ya ụtọ maka ihe ndị Jehova meere ya? (b) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jona mgbe anyị mejọrọ ihe?

22 Jona kwanụ? Ò rubeere Jehova isi ma si otú ahụ kelee ya maka ihe ndị o meere ya? O mere otú ahụ. Mgbe ụbọchị atọ, ehihie na abalị, gachara, azụ̀ ahụ buuru Jona pụta n’ikpere mmiri ma ‘gbọpụta ya n’ala akọrọ.’ (Jona 2:10) Ị̀ hụrụ na n’agbanyeghị ihe a niile merenụ, Jona ejighị aka ya gwuru mmiri pụta? Ma, ọ bụ ya ga-eji aka ya si n’ikpere mmiri ahụ gawa ebe ọ chọrọ ịga. O teghị aka, oge ruru ka Jona gosi ma ọ̀ ga-eji obi ya dum kelee Chineke maka ihe ndị o meere ya. Jona 3:1, 2, sịrị: “Okwu Jehova wee ruo Jona ntị nke ugboro abụọ, sị: ‘Bilie, gaa Ninive bụ́ obodo ukwu, kwusaara ya okwu m na-agwa gị.’” Olee ihe Jona ga-eme?

23 Jona mere ihe a gwara ya ozugbo. Baịbụl kwuru, sị: “Jona wee bilie gaa Ninive dị ka Jehova kwuru.” (Jona 3:3) O rubeere Chineke isi. O doro anya na ọ mụtala ihe n’ihe o mejọrọ. Anyị kwesịkwara iṅomi okwukwe Jona n’ihe a o mere. Anyị niile na-eme mmehie, na-emejọkwa ihe. (Rom 3:23) Ma, ànyị na-atọ ná mmehie anyị, ka ànyị na-amụta ihe na ya, laghachikwuru Chineke ma na-erubere ya isi?

24, 25. (a) Olee otú Jehova si gọzie Jona? (b) Oleekwa otú ọ ga-esi gọzikwuo ya n’ọdịnihu?

24 Jehova ọ̀ gọziri Jona maka irubere ya isi? Eenụ! Ọ gọziri ya. Otu ụzọ o si gọzie ya bụ na ọ ga-abụ na Jona mechara mata na ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ anwụghị. Ozugbo a tụbara Jona n’oké osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ kwụsịrị, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ maliteziri “tụwa egwu Jehova nke ukwuu,” ma chụọrọ ya àjà, kama ịchụrụ ya chi ha.—Jona 1:15, 16.

25 Jehova mechara gọzikwuo Jona. Jizọs kwuru na oge Jona nọrọ n’afọ nnukwu azụ̀ ahụ na-egosi oge yanwa ga-anọ n’ili, ma ọ bụ Shiol. (Gụọ Matiu 12:38-40.) Mgbe Jona ga-anụ banyere nke a n’oge a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ụwa, obi ga-atọ ya ezigbo ụtọ. (Jọn 5:28, 29) Jehova chọkwara ịgọzi gị. Ị̀ ga-amụta ihe n’ihe i mejọrọ, rube isi ma jiri obi gị dum na-ejere Chineke ozi ma na-emere ndị ọzọ ihe ọma, otú Jona mere?

^ para. 4 Mgbe ndị Farisii na-ekwu banyere Jizọs, o nwere ihe ha kwuru gbasara Galili bụ́ nke anyị na-ekwesịghị ilefuru anya ebe ọ bụ na Jona sikwa n’obodo dị na Galili. Ha turu ọnụ, sị: “Chọọ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na ọ dịghị onye amụma ga-esi na Galili.” (Jọn 7:52) Ọtụtụ ndị nsụgharị na ndị na-eme nnyocha kwuru na ọ ga-abụ na ndị Farisii ahụ na-ekwu na e nwetụbeghị onye amụma si na Galili ahụ ha na-eleda anya ma ọ bụkwanụ na e mekataghị nwee onye amụma ga-esi na ya. Ya bụrụ ihe ha na-ekwu, ihe ọ pụtara bụ na o nweghị ihe ndị Farisii ahụ ji amụma Baịbụl na ihe ndị mere n’oge gara aga kpọrọ.—Aịza. 9:1, 2.

^ para. 12 Baịbụl a na-akpọ Septuagint gosiri na ezigbo ụra buuru Jona. O kwudịrị na ọ nọ na-ekwo ụra. Ma, anyị ekwesịghị iche na ụra ahụ Jona hiri gosiri na ọ chọdịghị ịma ihe ga-eme ya na ndị ọzọ nọ n’ụgbọ ahụ. Anyị kwesịrị icheta na mgbe ụfọdụ, ụra na-eburukarị ndị ike ụwa gwụrụ. N’oge Jizọs nọ n’ogige Getsemeni, Pita, Jems na Jọn nọ “na-ero ụra n’ihi iru uju.”—Luk 22:45.

^ para. 19 N’asụsụ Grik, ihe a na-akpọ okwu Hibru a sụgharịrị “azụ̀” bụ “nnukwu anụ mmiri” ma ọ bụ “azụ̀ buru ibu.” Ọ bụ eziokwu na e nweghị otú a ga-esi amata ụdị anụ mmiri loro Jona, a chọpụtala na n’Oké Osimiri Mediterenian, e nwere azụ̀ shak ndị buru oké ibu nke na ha nwere ike ilo mmadụ. E nwekwara azụ̀ shak ndị ka ndị nke ahụ n’ebe ndị ọzọ. Azụ̀ shak a na-akpọ weel nwere ike iru mita iri na ise n’ogologo ma ọ bụkwanụ karịa.