Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

Okwu Mmalite

Okwu Mmalite

“Bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.”—NDỊ HIBRU 6:12.

1, 2. Olee otú otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị si were ndị nwere okwukwe a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, oleekwa ihe mere ha ga-eji abụrụ anyị ezigbo ndị enyi?

MGBE otu nwanna nwaanyị gechara okwu otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke merela agadi kwuru, ọ sịrị: “Ọ na-abụ ya kọwa akụkọ ụfọdụ ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl, ị ga-eche na ndị ahụ bụ ndị ya na ha kpawara kemgbe.” Ihe nwanna nwaanyị ahụ kwuru bụ eziokwu n’ihi na onye nlekọta ahụ agụọla Okwu Chineke ma jiri ya na-akụzi ihe kemgbe ọtụtụ afọ. Okwu Chineke doro ya anya nke na ọ dị ka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha hà bụ ndị enyi ya ya na ha kpawara kemgbe ndụ ya.

2 Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ma ọtụtụ n’ime ndị ahụ Baịbụl kọrọ akụkọ ha bụrụ ndị enyi anyị? Ndị ahụ hà na-adị gị ka ndị dịrị ndụ n’eziokwu? Chegodị echiche otú obi ga-adị gị ma gị na ụfọdụ n’ime ha, dị ka Noa, Ebreham, Rut, Ịlaịja, na Esta, nọrịa ma ọ bụ kparịta ụka, gị amatakwa ha nke ọma. Chegodị otú ha nwere ike isi mee ka ndụ gị ka mma ma ha gbaa gị ume ma nye gị ndụmọdụ ga-abara gị uru.—Gụọ Ilu 13:20.

3. (a) Olee uru ịmụ gbasara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe, bụ́ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, ga-abara anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya?

3 N’eziokwu, n’oge a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke . . . ndị ezi omume,” anyị na ha ga-aghọ ezigbo ndị enyi. (Ọrụ 24:15) Ma ihe anyị na-amụta na Baịbụl banyere ndị nwoke na ndị nwaanyị ahụ nwere okwukwe nwedịrị ike ịbara anyị uru ugbu a. Olee otú ọ ga-esi baara anyị uru? Pọl onyeozi zara ajụjụ a nke ọma. Ọ sịrị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.” (Hib. 6:12) Ugbu a anyị na-abịa ịmụ banyere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ahụ nwere okwukwe, ka anyị lebagodị anya n’ajụjụ ole na ole ihe ahụ Pọl kwuru nwere ike ime ka anyị jụọ. Ajụjụ ndị ahụ bụ: Gịnị bụ okwukwe, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị nwee ya? Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie ndị ahụ nwere okwukwe?

Ihe Bụ́ Okwukwe na Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Nwee Ya

4. Gịnị ka ndị mmadụ na-echekarị na okwukwe bụ, gịnịkwa mere na ihe ahụ ha na-eche abụghị eziokwu?

4 Okwukwe bụ àgwà magburu onwe ya. Ndị niile anyị ga-amụ banyere ha n’akwụkwọ a nwechara okwukwe. Ma ọtụtụ ndị taa enweghị ihe ha ji inwe okwukwe kpọrọ, ha chekwara na onye nwere okwukwe bụ onye na-ekwere ihe ọ bụla a gwara ya, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ. Ma, ihe a ha chere abụghị eziokwu. Mmadụ inwe okwukwe apụtaghị na onye ahụ ga-ekwere ihe ọ bụla a gwara ya n’ajụghị ase.  Okwukwe abụkwanụghị ihe ọ na-abụ ya bata mmadụ n’obi taa, echi ya apụọ. Mmadụ ikwere ihe ọ bụla a gwara ya n’ajụghị ase jọgburu onwe ya. Ihe ọzọkwa bụ na ihe Chineke chọrọ n’aka anyị abụghị naanị ka anyị kwere na ya. A sị ka e kwuwe, “ndị mmụọ ọjọọ kwekwara wee kụja.”—Jems 2:19.

5, 6. (a) Olee ihe abụọ a na-anaghị ahụ anya e ji amata ezigbo okwukwe? (b) Olee otú okwukwe anyị kwesịrị isiru ike? Mee ihe atụ.

5 Ezigbo okwukwe abụghị mmadụ ikweta ihe ọ bụla a gwara ya. Ì chetara otú Baịbụl si kọwaa ihe bụ́ okwukwe? (Gụọ Ndị Hibru 11:1.) Pọl kwuru na e nwere ihe abụọ a na-anaghị ahụ anya e ji amata ezigbo okwukwe. Nke mbụ bụ ihe ndị “a na-adịghị ahụ anya” dị adị ugbu a. Anyị enweghị ike iji anya anyị ahụ ndị nọ n’eluigwe na ihe ndị na-eme n’ebe ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị enweghị ike ịhụ Jehova Chineke, Ọkpara ya ma ọ bụ Alaeze ya nke na-achị ugbu a n’eluigwe. Nke abụọ abụrụ “ihe ndị a na-ele anya ha,” ya bụ, ihe ndị ka ga-eme eme. Anyị ahụwabeghị ụwa ọhụrụ ahụ nke Alaeze Chineke ga-eweta n’oge na-adịghị anya. Nke a ọ̀ pụtara na o nweghị ihe na-egosi na ihe ndị ahụ anyị nwere okwukwe na ha ga-enwe isi?

6 Mbanụ! Pọl kwuru na onye nwere ezigbo okwukwe nwere ezigbo ihe mere o ji nwee okwukwe. Mgbe Pọl na-akọwa ihe bụ́ okwukwe, ọ sịrị na ọ bụ “atụmanya e ji n’aka.” Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ihe a o kwuru bụ na okwukwe dị ka “akwụkwọ ala” ma ọ bụ “akwụkwọ ụlọ.” Weregodị ya na mmadụ chọrọ inye gị ụlọ. O nwere ike inye gị akwụkwọ ụlọ ahụ ma sị gị, “Ihe a bụ ụlọ ọhụrụ gị.” Ihe a ọ gwara gị apụtaghị na ọ bụ n’akwụkwọ ahụ ka ị ga-ebi. Kama ihe ọ pụtara bụ na akwụkwọ ahụ o nyere gị aghọọla ihe akaebe iwu kwadoro nke na-egosi na ụlọ ahụ bụzi nke gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa okwukwe. E nwere ihe akaebe ma ọ bụ ezigbo ihe mere anyị ji nwee okwukwe. Ihe ahụ kara anyị obi nke na e nwere ike ikwu na ọ bụ ya bụ okwukwe ahụ anyị nwere.

7. Olee ihe ndị na-eme ka mmadụ nwee ezigbo okwukwe?

7 Nke a gosiri na ihe na-eme ka mmadụ nwee ezigbo okwukwe bụ ihe ndị merela eme bụ́ ndị mere ka obi sie onye ahụ ike, ya edookwa ya anya na Jehova Chineke ga-emezu ihe niile o kwuru. Okwukwe na-eme ka anyị were Jehova ka Nna anyị nke hụrụ anyị n’anya. Ma, e nwekwara ihe ọzọ ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo okwukwe. Okwukwe yiri ihe a kụrụ n’ubi. A ga na-agba ya mmiri ka ọ ghara ịkpọnwụ. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji na-eme ihe gosiri na anyị nwere okwukwe, ma ọ́ bụghị ya, okwukwe anyị ga-aghọ okwukwe nwụrụ anwụ.—Jems 2:26.

8. Gịnị mere okwukwe ji dị ezigbo mkpa?

8 Gịnị mere okwukwe ji dị ezigbo mkpa? Pọl gwara anyị ihe mere o ji dị mkpa. (Gụọ Ndị Hibru 11:6.) Anyị agaghị enweli ike ikpegara Jehova ekpere ma ọ bụ mee ihe dị ya mma ma ọ bụrụ na anyị enweghị okwukwe. Nke a gosiri na anyị ga-enwerịrị ezigbo okwukwe ma ọ bụrụ na anyị ga-eme ihe kacha  mkpa mere Jehova bụ́ Nna anyị bi n’eluigwe ji kee anyị. O kere anyị ka anyị na ya dịrị ná mma, anyị ana-enyekwa ya otuto.

9. Olee ihe Jehova mere bụ́ ndị gosiri na ọ ma na okwukwe dị anyị mkpa?

9 Jehova ma na okwukwe dị anyị ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere o ji mee ka e dee banyere ndị nwere okwukwe na Baịbụl ka anyị wee si n’aka ha mụta inwe okwukwe ma na-eme ihe gosiri na anyị nwere okwukwe. Jehova na-agọzikwa ọgbakọ Ndị Kraịst taa. Otú o si eme ya bụ na ọ na-eme ka e nwee ụmụ nwoke ndị nwere okwukwe bụ́ ndị na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst. Okwu Chineke sịrị: “Na-eṅominụ okwukwe ha.” (Hib. 13:7) O nwekwara ihe ọzọ o mere. Pọl dere na e nwere “oké ìgwè ndị àmà,” ya bụ, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị dịrị ndụ n’oge ochie bụ́ ndị e ji okwukwe ha ama atụ. (Hib. 12:1) Ná Ndị Hibru isi 11, Pọl dere aha ọtụtụ ndị nwere okwukwe. Ma, ọ bụghị ndị niile nwere okwukwe n’oge ochie ka o dere aha ha. Baịbụl kọrọ akụkọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwere okwukwe, ma ndị katara ahụ́ ma ndị na-akataghị ahụ́, ma ndị ukwu ma ndị nta. E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ha n’oge anyị a ọtụtụ ndị na-enweghị okwukwe.

Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Ṅomie Okwukwe Ndị Ọzọ?

10. Olee otú ịmụ ihe nwere ike isi nyere anyị aka iṅomi ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha?

10 Ị gaghị enwe ike iṅomi mmadụ ma ọ bụrụ na i bughị ụzọ mata onye ahụ nke ọma. Ka ị na-agụ akwụkwọ a, ị ga-achọpụta na e mere ezigbo nchọnchọ tupu e bipụta ya. Nke a ga-enyere gị aka ịmatakwu ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ahụ nwere okwukwe. Ọ ga-adị mma ka gịnwa meekwa nchọnchọ nke gị. Mgbe ị na-amụ ihe, jiri ihe ndị e ji eme nchọnchọ i nwere chọpụtakwuo ihe ndị ọzọ na Baịbụl. Mgbe ị na-echebara ihe ị na-amụ na Baịbụl echiche, chee echiche banyere oge ihe ndị ahụ mere na ebe ha mere. Mee ka ọ dị gị ka ị̀ na-ahụ mgbe ihe ndị ị na-agụ akụkọ ha na-eme ma na-anụ mkpọtụ ha na-eme na ụdị ísì na-esi n’ebe ahụ. Nke ka nke, gbalịa ka ị chọpụta otú obi dị ndị ahụ. Ọ bụrụ na ị ghọta otú obi dị ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ahụ nwere okwukwe, ha ga-adịkwu gị ka hà ka dị ndụ, ị ga-amatakwu ha, ụfọdụ n’ime ha ga-abịazi dị gị ka hà bụ ezigbo ndị enyi gị.

11, 12. (a) Olee ihe nwere ike ime ka ị matakwuo Ebram na Seraị? (b) Olee otú akụkọ Hana, Ịlaịja ma ọ bụkwanụ nke Samuel nwere ike isi nyere gị aka?

11 Ọ bụrụ na ị mata ha nke ọma, ị ga-achọ ka i ṅomie ha. Dị ka ihe atụ, weregodị ya na ị na-eche echiche ma ò nwere ihe ọhụrụ ị ga-eme n’ozi Jehova. Jehova esi n’aka nzukọ ya gwa gị na e nwere ụzọ ndị i nwere ike isi jekwuoro ya ozi. Ka e were ya na a gwara gị ka ị gaa n’ọgbakọ ebe a chọsiri ndị na-ekwusa ozi ọma ike ma ọ bụ ka i si ụzọ ọzọ na-amabeghị gị ahụ́ ma ọ bụ na-esiri gị ike kwusawa ozi ọma. Mgbe ị na-echebara nke a echiche ma tinye ya n’ekpere, ọ ga-adị mma ka i cheta otú Ebram si bie ndụ. Ya na Seraị kwetara ịhapụ  obodo Ọọ bụ́ ebe ahụ́ ruru ha ala. Jehova gọzikwara ha maka ihe a ha mere. Ọ bụrụ na i mee ka ha, ị ga-amata ha karịa otú ị mabu ha.

12 Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye gị na ya dị ná mma emee ihe wutere gị, ihe ahụ o mere emee ka ọ dị gị ka gị hapụ ịga ọmụmụ ihe? Ọ bụrụ na i chebara ihe Hana mere mgbe Penina na-akpasu ya iwe echiche, ọ ga-enyere gị aka ịma ihe i kwesịrị ime, ọ ga-emekwa ka i were Hana ka ezigbo enyi gị. Ọ bụrụkwa na ike ụwa agwụla gị n’ihi na ị na-eche na o nweghịzi uru ị bara, ịgụ akụkọ Ịlaịja ga-enyere gị aka n’ihi na ị ga-amata nsogbu o nwere na otú Jehova si kasie ya obi. Ihe Samuel mere mgbe ụmụ Ilaị na-eme ihe ọjọọ n’ụlọikwuu nwekwara ike ịbara ndị na-eto eto uru, bụ́ ndị ụmụ akwụkwọ ibe ha na-enye nsogbu ka ha soro ha mee ihe ọjọọ.

13. Ọ bụrụ na mmadụ eṅomie okwukwe nke onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, ọ̀ pụtara na okwukwe nke ya esichaghị ike? Kọwaa.

13 Ọ bụrụ na mmadụ eṅomie okwukwe nke ndị ahụ Baịbụl kọrọ akụkọ ha, ọ̀ pụtara na okwukwe onye ahụ esighị ike ma ọ bụ na okwukwe ya abaghị uru? Mbanụ! Cheta na Baịbụl gwara anyị ka anyị na-eṅomi ndị nwere okwukwe. (1 Kọr. 4:16; 11:1; 2 Tesa. 3:7, 9) Ihe ọzọkwa bụ na ụfọdụ ndị anyị ga-amụ gbasara ha n’akwụkwọ a ṅomikwara ndị nwere okwukwe bụ́ ndị dịrị ndụ tupu hanwa. Dị ka ihe atụ, anyị kwuru n’Isi nke 17 na ọ ga-abụ na Meri si n’ihe Hana kwuru nweta ihe yanwa kwuru. Nke a na-egosi na Meri ṅomiri Hana. Nke a ọ̀ pụtara na okwukwe Meri esichaghị ike? Mba. Kama nke ahụ, otú Hana si bie ndụ nyeere Meri aka inwe okwukwe, okwukwe Meri emezie ka Meri na Jehova Chineke dịrị n’ezigbo mma.

14, 15. Olee ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ a, oleekwa ihe anyị ga-eme ka akwụkwọ a baara anyị uru?

14 E bipụtara akwụkwọ a ka o nyere gị aka ka okwukwe gị sikwuo ike. E si n’isiokwu “Ṅomie Okwukwe Ha” bụ́ ndị gbarala n’Ụlọ Nche malite n’afọ 2008 ruo n’afọ 2013 weta isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ dị n’akwụkwọ a a na-ebipụtaghị n’Ụlọ Nche. Isiokwu nke ọ bụla nwere ajụjụ. Ha ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ mgbe a na-amụ akwụkwọ a, ha ga-emekwa ka anyị nwee ike ime ihe ndị anyị na-amụ eme. E nwekwara ọmarịcha foto ọhụrụ ndị dị n’akwụkwọ a bụ́ ndị na-adịghị n’Ụlọ Nche. E nwekwara ndị nke dị n’Ụlọ Nche, ma e meziri ka ha bukwuo ibu ma makwuo mma. E nwekwara ihe ndị ọzọ e tinyere n’akwụkwọ a, dị ka map na afọ ihe ndị a kọrọ akụkọ ha mere. E bipụtara akwụkwọ a bụ́ Ṅomie Okwukwe Ha ka mmadụ jiri ya mụọ ihe n’onwe ya nakwa ka ezinụlọ na ọgbakọ jiri ya mụọ ihe. Ọ bụrụ na ezinụlọ achọọ, ha nwere ike ịnọkọta ọnụ gụọ akụkọ ndị a kọrọ na ya n’ajụghị ajụjụ ndị e dere na ya.

15 Ka akwụkwọ a nyere gị aka iṅomi okwukwe nke ndị fere Jehova n’oge ochie. Ka o meekwa ka i nwekwuo okwukwe ka ị na-agbalị ka gị na Nna gị nke eluigwe, bụ́ Jehova, na-adịkwu ná mma!