Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ISII

Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru

Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru

1-3. (a) Olee otú obi dị Esta mgbe ọ na-agaru nso n’ocheeze di ya? (b) Gịnị ka eze mere mgbe Esta rutewere n’ebe ọ nọ?

ESTA ji nwayọọ nwayọọ na-agaru nso n’ebe eze nọ n’ocheeze ya. Obi nọ na-akụ ya kpum kpum ka ọ na-aga. Ebe niile dara jụụ n’obí eze ndị Peshia ahụ dị na Shushan. Naanị ihe Esta na-anụ bụ ụda ụkwụ ya na mkpọtụ uwe ya na-eme. Uche ya niile dị n’ebe ahụ ọ na-aga. Ọ ma na ihe a abụghị oge ọ ga-eji kiriwe obí eze ahụ mara mma, ọmarịcha ogidi ndị e ji rụọ ya, nakwa osisi sida ndị e ji chọọ elu ya mma bụ́ ndị e si Lebanọn bute. Anya ya dị naanị n’ebe ahụ eze nọ n’ihi na ọ ma na ọnwụ ya na ndụ ya dị eze n’aka.

2 Eze nọ na-ele Esta ka ọ na-abịa, o setịkwaara ya mkpanaka ọlaedo ya. O nwere ike ịdị ka ihe a eze mere abụghị oké ihe. Ma a sị na o meghị ya, a gaara egbu Esta n’ihi na eze akpọghị ya akpọ tupu ya abata n’obí ya. Mgbe Esta rutere n’ebe ahụ eze nọ, o metụrụ aka n’isi mkpanaka ahụ eze ji. Aka a o metụrụ ya gosiri na obi dị ya ụtọ na di ya azọọla ya ndụ.—Esta 5:1, 2.

Esta gosiri na obi dị ya ụtọ na di ya meere ya ebere

3 Naanị anya i lere Eze Ahazuirọs, ị ga-amata na ọ bụ oké mmadụ nke bara ọgaranya. E kwuru na uwe ndị eze Peshia na-eyi ga-eru ọtụtụ nde naịra n’oge a. Mgbe Esta lere di ya anya n’ihu, ihu di ya gosiri ya na ihe ya dị ya mma, di ya gosikwara ya na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ sịrị ya: “Ọ̀ bụ gịnị, Esta nwunye m, gịnịkwa ka ị chọrọ ka m meere gị? Ọ bụrụgodị ọkara alaeze m, a ga-enye gị ya!”—Esta 5:3.

4. Olee ihe ndị ọ dị mkpa ka Esta mee?

4 Ebe ọ bụ na Esta agaala n’ihu eze ka ọ gbachitere ndị obodo ya, o gosila na ya nwere ezigbo okwukwe, gosikwa na obi kara ya. Ọ bụ eziokwu na eze anabatala Esta, ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Ọ dị mkpa ka o mee ka eze a onwe ya na-ebu isi mata na onye ndụmọdụ ya ọ tụkwasịrị obi abụghị ezigbo mmadụ, nakwa na ọ ghọgburu ya mgbe ọ gwara ya ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ ka e gbuchapụ ndị obodo Esta. Olee otú ọ ga-esi mee ka eze kweta ihe ndị a, oleekwa ihe okwukwe Esta na-akụziri anyị?

Ọ Chọtara ‘Oge Dị Mma Ikwu Okwu’

5, 6. (a) Olee otú Esta si mee ihe e kwuru n’Ekliziastis 3:1, 7? (b) Olee otú ihe Esta mere si gosi na ọ maara ihe?

5 Esta ọ̀ ga-akọrọ eze ihe ahụ ọ chọrọ ịkọrọ ya n’ihu ndị ha na eze nọ? O mee otú ahụ, ọ ga-emechu eze ihu, meekwa ka Heman nwee ohere ọ ga-eji gọwa agọ. Gịnị ka Esta meziri? Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Sọlọmọn bụ́ eze maara ihe si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:1, 7) O doro anya na mgbe Esta na-eto, Mọdekaị, bụ́ nwoke na-atụ egwu Chineke, kụziiri ya ihe a Sọlọmọn kwuru. O dokwara anya na Esta ghọtara na ọ dị mkpa ka mmadụ mara ‘oge o kwesịrị ikwu okwu.’

6 Esta sịrị: ‘Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka eze na Heman bịa taa n’oriri m kwadebeere eze.’ (Esta 5:4) Eze kwetara na ya ga-abịa, gwakwa Heman ka ọ bịa. Ị̀ hụrụ otú Esta si gosi na ya maara ihe? O mechughị di ya ihu, kama ọ chọrọ ka e nwee oge ga-adaba adaba ọ ga-eji kọọrọ di ya mkpa ya.—Gụọ Ilu 10:19.

7, 8. Olee otú ihe si gaa n’oriri mbụ Esta kpọrọ eze na Heman, oleekwa ihe mere na ọ gwaghị di ya nsogbu ya mgbe ahụ?

 7 O doro anya na Esta sara anya na mmiri kwadebe oriri ahụ. Ihe ndị ọ kwadebere bụ ihe ọ ma ga-amasị di ya. O nyekwara ha mmanya dị ụtọ ka obi tọọ ha ụtọ. (Ọma 104:15) Ahazuirọs rijuru afọ, ya ajụọ Esta ihe ọ chọrọ ka o meere ya. Ọ̀ bụ ugbu a ka Esta ga-agwa ya ihe ahụ?

8 Mba, Esta achọbeghị ikwu ihe ahụ ugbu a. Kama nke ahụ, ọ gwara eze na ya ga-achọ ka ya na Heman bịakwa oriri ọzọ n’echi ya. (Esta 5:7, 8) Ma, gịnị mere Esta agwaghị di ya ihe ahụ mgbe ahụ? Cheta na a na-achọ igbukpọ ndị obodo Esta ebe ọ bụ na eze enyela Heman ikike ka o mee otú ahụ. Ma, ebe ọ bụ na okwu a bụ okwu ọnwụ na ndụ, Esta kwesịrị ịgwa eze ihe ahụ mgbe ọ ma na obi dị eze ezigbo ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji nwee ndidi ma kpọọ di ya oriri ọzọ iji gosi di ya na ya ejighị ya egwu egwu.

9. Olee uru inwe ndidi bara, oleekwa otú anyị ga-esi ṅomie Esta n’inwe ndidi?

9 Inwe ndidi amaka. Ma, ọtụtụ ndị anaghị enwe ndidi.  N’agbanyeghị na e nwere ihe na-enye Esta nsogbu n’obi, ya ana-achọkwa otú ọ ga-esi akọrọ ya di ya, o nwere ndidi, na-eche oge ga-adaba adaba. E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta na ndidi a Esta nwere. O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe anyị hụrụ ihe a na-emetaghị nke ọma, nke anyị chere na e kwesịrị imezi. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka onye nọ n’isi mezie ihe ahụ, anyị kwesịrị inwe ndidi otú ahụ Esta nwere. Ilu 25:15 sịrị: “Ndidi ka a na-eji akpali ọchịagha ime ihe, ire dị nro pụkwara ịgbaji ọkpụkpụ.” Ọ bụrụ na anyị enwee ndidi, ma chọta oge ga-adaba adaba anyị ga-eji kwuo ihe dị anyị n’obi, jirikwa olu ọma kwuo ya ka Esta, ndị na-emegide anyị nwedịrị ike ịkwụsị imegide anyị, otú ọ sọkwara obi kpọọ ha nkụ. Chineke Esta, bụ́ Jehova, ọ̀ gọziri ya maka ndidi ya na amamihe ya?

Ndidi Esta Nwere Rụpụtara Ihe Ọma

10, 11. Gịnị mere obi ji jọọ Heman njọ mgbe o si oriri a kpọrọ ya na-ala, gịnịkwa ka nwunye ya na ndị enyi ya gwara ya mee?

10 Ndidi ahụ Esta nwere mechara baa ezigbo uru. Heman ji “ọṅụ na obi ụtọ” laa n’ụbọchị mbụ ahụ eze na nwunye ya kpọrọ ya oriri.  Ma, ka Heman na-agafe n’ọnụ ụzọ ámá obí eze, ọ hụrụ Mọdekaị, bụ́ onye Juu na-anaghị ekwe akpọrọ ya isiala. Isiokwu bu nke a ụzọ kwuru na ihe mere Mọdekaị na-anaghị akpọrọ ya isiala abụghị na ọ chọghị ịkwanyere ya ùgwù, kama ọ bụ na ọ chọghị ihe ga-eme ka akọnuche ya pịawa ya ụtarị, ọ chọghịkwa ime ihe ga-ewe Jehova Chineke iwe. Ma, ‘ọnụma juru Heman obi ozugbo ahụ.’—Esta 5:9.

11 Mgbe Heman gwara nwunye ya na ndị enyi ya na Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isiala, ha gwara ya ka ọ rụọ nnukwu osisi dị mita iri abụọ na abụọ n’ogologo, gwakwa ya ka ọ gwa eze ka o nye ya ikike ka ọ kwụgbuo Mọdekaị n’elu ya. Ihe a ha gwara Heman dị ya mma, ya ekwuokwa ozugbo ka a rụọ osisi ahụ.—Esta 5:12-14.

12. Olee ihe mere eze ji kwuo ka a gụọrọ ya akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’alaeze Peshia, oleekwa ihe ọ chọpụtara?

12 Ma ihe na-anabughị eme eze mere ya n’abalị ụbọchị ahụ. Baịbụl sịrị: “N’abalị ahụ, ụra gbafuru eze n’anya.” Nke a mere ka o kwuo ka a gụọrọ ya akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge gara aga n’alaeze Peshia. Mgbe a nọ na-agụ ya, a hụrụ ebe e dere nkata a kpara igbu ya. Ahazuirọs chetara mgbe ihe ahụ mere, chetakwa na e jidere ndị ahụ kpara nkata ahụ gbuo. Eze jụziri ndị na-ejere ya ozi ihe e meere Mọdekaị, bụ́ onye mere ka a mata nkata ahụ a kpara igbu ya. Ha gwara ya na o nwebeghị ihe e meere ya.—Gụọ Esta 6:1-3.

13, 14. (a) Olee otú ihe si malite imebiri Heman? (b) Oleekwa ihe nwunye Heman na ndị enyi ya gwara ya?

13 Ihe a were eze iwe, ya ajụọ ndị na-ejere ya ozi ma è nwere onye ọ bụla n’ime ndị o mere ndị isi nọ nso. Ọ dabara na ọ bụ Heman nọ nso. O yikwara ka ihe mere o ji bịa n’isi ụtụtụ ahụ ọ̀ bụ ka ọ nata eze ikike ịkwụgbu Mọdekaị. Ma tupu Heman agwa eze ihe mere o ji bịa, eze jụrụ ya ihe a ga-emere nwoke nke ihe ya masịrị eze. Heman chere na ọ bụ ya ka eze bu n’obi. N’ihi ya, o kwuru ihe dị iche iche a ga-emere onye ahụ. Ọ sịrị na e kwesịrị iyiwe onye ahụ uwe eze na-eyi, ya anọkwasịkwa n’ịnyịnya eze. Ọ sịkwara na a ga-agwa otu n’ime ndị isi a ma ama ka ọ kpọgharịa nwoke ahụ n’obodo Shushan, onye ahụ ga na-etokwa nwoke ahụ ka ndị mmadụ mara na ihe ya masịrị eze. Chegodị otú ihu dị Heman mgbe eze gwara ya na ọ bụ Mọdekaị ka a ga-emere ihe a niile! Ònyekwanụ ka eze gwara ka o meere Mọdekaị ihe ndị ahụ? Ọ bụ Heman.—Esta 6:4-10.

14 Heman jisiri ike gaa mee ihe ahụ eze gwara ya, ma gbara lawa ozugbo. Nwunye ya na ndị enyi ya gwara ya na ihe a merenụ gosiri na ihe ọjọọ na-aga ime ya, nakwa na o nweghị ihe ọ ga-emeli Mọdekaị onye Juu.—Esta 6:12, 13.

15. (a) Olee uru ndidi Esta nwere bara? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ichere Jehova’?

 15 Otú ahụ Esta si nwee ndidi ma chere ka otu ụbọchị gafekwuo tupu ya agwa eze ihe ọ chọrọ ịgwa ya mere ka Heman jiri aka ya gbapuo onwe ya afọ. Í cheghị na ọ ga-abụ Jehova Chineke mere ka ụra pụọ eze n’anya n’abalị ahụ? (Ilu 21:1) Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘na-echere’ Jehova. (Gụọ Maịka 7:7.) Ọ bụrụ na anyị echere Chineke, anyị ga-achọpụta na otú ọ ga-esi doziere anyị nsogbu anyị ga-aka mma karịa otú anyịnwa gaara esi edozi ya.

Ọ Katara Obi Kwuo Okwu

16, 17. (a) Olee mgbe oge ruru ka Esta kwuo okwu? (b) Olee otú Esta si dị iche na Vashtaị, onye bụ́bu nwunye eze?

16 Esta agaghị anwa anwa hapụkwa ịgwa eze ihe ahụ ọ chọrọ ịgwa ya n’oriri nke abụọ a ọ kpọrọ ya. Ma olee otú ọ ga-esi agwa ya ihe ahụ? Ọ dabara na eze jụkwara ya ọzọ ihe ọ chọrọ ka e meere ya. (Esta 7:2) Oge eruola ka Esta kwuo okwu.

17 Weregodị ya na ị na-ahụ ka Esta bu ụzọ kpee ekpere n’obi ya, gwazie eze, sị: “Ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, eze, ọ bụrụkwa na ọ dị eze mma, m na-arịọ ka e nye m mkpụrụ obi m, m na-arịọkwa ka e nye m ndị m.” (Esta 7:3) Ị̀ hụrụ na o mere ka eze mara na ya ma na eze ga-eme ihe ziri ezi? Esta gosiri na ya adịghị ka Vashtaị, onye bụ́bu nwunye eze, onye kpachaara anya menye eze ihere. (Esta 1:10-12) Ihe ọzọ bụ na Esta abịaghị tawa eze ụta maka na o weere Heman ka ezigbo mmadụ. Kama, ọ rịọrọ eze ka o mee ka a ghara igbu ya.

18. Olee otú Esta si kọọrọ eze nsogbu ya?

18 O doro anya na ihe ahụ Esta rịọrọ juru eze anya ma metụ  ya n’obi. Olee onye ga-anwa anwa chọọ igbu nwunye eze? Esta gwakwara eze, sị: “E rewo anyị, mụ na ndị m, ka a laa anyị n’iyi, gbuo anyị ma bibie anyị. A sị na e rere anyị ka anyị ghọọ ndị ikom na-agba ohu na ndị inyom na-eje ozi, m gaara agbachi nkịtị. Ma ọdachi a ekwesịghị ekwesị ma ọ bụrụ na o mebiere eze ihe.” (Esta 7:4) Ị̀ hụrụ na Esta gwara eze hoo haa ihe bụ́ nsogbu ya, ma o kwukwara na ya gaara agbachi nkịtị ma a sị na ihe e kwuru bụ na ha ga-aghọ ndị ohu. Ọ bụrụ na eze agbachi nkịtị e gbukpọọ ndị Juu, ọ ga-emebiri ya ihe.

19. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Esta banyere ịgwa mmadụ okwu ga-eru ya n’obi?

19 Otú Esta si kwuo okwu na-akụziri anyị otú anyị nwere ike isi gwa mmadụ okwu ya eruo ya n’obi. Ọ bụrụ na e nwere nsogbu ị chọrọ ịkọrọ onye ị hụrụ n’anya ma ọ bụ onye nọ n’isi ka o leba ya anya, ihe ga-enyere gị aka bụ inwe ndidi, ịkwanyere onye ahụ ùgwù na ịgwa ya hoo haa ihe dị gị n’obi.—Ilu 16:21, 23.

20, 21. (a) Olee otú Esta si gbapuo Heman afọ, oleekwa ihe nke a mere ka eze mee? (b) Olee ihe Heman mere mgbe Esta mere ka eze mata na ọ bụ Heman kpara nkata ọjọọ ahụ?

20 Ahazuirọs jụrụ nwunye ya, sị: “Ònye bụ onye ahụ, oleekwa ebe onye obi kara ime otú ahụ nọ?” Weregodị ya na ị na-ahụ ka Esta tụrụ Heman aka ma sị: “Nwoke ahụ, onye mmegide ahụ na onye iro ahụ, bụ Heman ọjọọ a.” Mgbe Esta kwuru ihe a, ebe niile dara jụụ. Ezigbo ụjọ jidere Heman. Olee otú i chere ihu dị eze ahụ, bụ́ onye na-ewe iwe ọkụ, mgbe ọ chọpụtara na onye ndụmọdụ ya ọ tụkwasịrị obi ghọgburu ya, ya abịanye aka n’akwụkwọ ka e gbuo nwunye ya ọ hụrụ n’anya? Ihe a were eze ezigbo iwe nke na o si n’ebe ahụ pụọ gaa n’ubi dị n’obí ya ka obi ya jụrụ.—Esta 7:5-7.

Esta katara obi mee ka a mata na Heman bụ onye ọjọọ

 21 Mgbe Heman hụrụ na a gbapuola ya afọ, ọ daara nwunye eze n’ala, na-arịọ ya ka ọ rịọ eze ka ọ gbaghara ya. Mgbe eze bataghachiri n’ime ụlọ, ọ hụrụ ka Heman nọ n’ebe nwunye ya dina na-arịọ ya arịrịọ. O jizi iwe ahụ bo Heman ebubo na ọ chọrọ ịnọ n’ụlọ ya dinaa nwunye ya n’ike. Ihe ahụ o kwuru gosiri na nke Heman agwụla. A kpọpụrụ Heman ozugbo ahụ, kpuchie ya ihu. Otu n’ime ndị na-ejere eze ozi gwaziri eze na e nwere nnukwu osisi Heman rụrụ nke ọ chọrọ iji kwụgbuo Mọdekaị. Ozugbo ahụ, Ahazuirọs nyere iwu ka a kwụgbuo Heman n’osisi ahụ.—Esta 7:8-10.

22. Gịnị ka ihe Esta mere na-akụziri anyị?

22 Ebe ọ bụ na ihe ọjọọ juru n’ụwa taa, o nwere ike ịdị anyị ka ihe agaghị emecha dị mma. Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ? O nweghị mgbe Esta weere ya na olileanya adịghịzi, o nweghịkwa mgbe ahụ́ gbakasịwara ya ma ọ bụ ya akwụsị inwe okwukwe na Chineke. Mgbe oge ruru, ọ katara obi kwuo okwu, obi sikwara ya ike na Jehova ga-eme ka ihe ka mma. Anyị kwesịrị ịmụta ime otú ahụ. Jehova agbanwebeghị. Ọ ka nwekwara ike ime ka ndị ajọ mmadụ daba n’olulu ha gwuuru ndị ọzọ, otú ahụ Heman dabara.—Gụọ Abụ Ọma 7:11-16.

Ọ Gbachiteere Jehova na Ndị Na-efe Ya

23. (a) Olee ihe eze meere Mọdekaị na Esta? (b) Olee otú amụma ahụ Jekọb nọ n’ọnụ ọnwụ buo banyere Benjamin si mezuo? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ha Mezuru Ihe E Buru n’Amụma.”)

23 Eze mechara chọpụta na ọ bụghị naanị na Mọdekaị mere ka a mata nkata a kpara igbu ya, ọ bụkwa ya zụrụ nwunye ya bụ́ Esta. Ahazuirọs nyeziri Mọdekaị ọkwá ahụ o nyeburu Heman. O nyekwara Esta ụlọ Heman na ihe niile Heman nwere. Esta nyefekwara Mọdekaị ihe ndị ahụ.—Esta 8:1, 2.

24, 25. (a) Gịnị mere na Esta agbachighị nkịtị mgbe o mechara ka eze mara na ọ bụ Heman kpara nkata ọjọọ ahụ? (b) Olee ihe Esta mere ọzọ nke nwere ike ime ka e gbuo ya?

24 Esta ọ̀ ga-agbachizi nkịtị ugbu a ihe dịịrịla ya na Mọdekaị mma? Ọ gaghị eme otú ahụ n’ihi na ọ naghị achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. A ka na-ezipụ akwụkwọ ozi ahụ Heman dere, nke kwuru na a ga-egbu ndị Juu bi n’ebe niile eze Ahazuirọs na-achị.  Heman fere nza, ma ọ bụ Pua, nke nwere ike ịbụ ịgba afa, iji mata oge ga-akacha mma a ga-eji egbu ndị Juu niile. (Esta 9:24-26) Ọ ka fọrọ ọtụtụ ọnwa tupu ụbọchị a ga-egbu ndị Juu eruo, ma ụbọchị ahụ ji ọsọ na-abịa. Ò nwere ihe a ka nwere ike ime ka a ghara igbu ndị Juu?

25 Esta gakwara n’ihu eze ọzọ mgbe eze na-akpọghị ya ka ọ bịa n’agbanyeghị na ọ ma na e nwere ike igbu ya. Na nke ugbu a, ọ bịaziri rịọ di ya ka ọ gbanwee iwu ahụ e tiri ka e gbuo ndị Juu. Ma, a naghị agbanwe iwu ọ bụla ndị eze Peshia bịanyere aka na ya. (Dan. 6:12, 15) N’ihi ya, eze nyere Esta na Mọdekaị ikike ka ha tie iwu ọhụrụ. Ha tiziri iwu ka ndị Juu lụso ndị ọ bụla bịara igbu ha ọgụ. E zipụkwara ndị na-agba ịnyịnya ka ha gaa zie ndị Juu ozi ahụ ga-eme ha obi ụtọ. Ozi a mekwara ka obi sie ndị Juu ike. (Esta 8:3-16) Weregodị ya na ị na-ahụ ndị Juu bi n’ebe niile Ahazuirọs na-achị ka ha bidoro kwadowe agha. O doro anya na ha agaraghị enwe ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na e tighị iwu ọhụrụ ahụ. Ma, ihe kazi mkpa ugbu a bụ ma “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ọ̀ ga-enyere ndị ya aka n’agha a?—1 Sam. 17:45.

Esta na Mọdekaị zigaara ndị Juu bi n’ebe niile alaeze Peshia na-achị ozi

26, 27. (a) Olee ụdị mmeri Jehova mere ka ndị Juu merie ndị iro ha? (b) Olee amụma e mezuru mgbe e gburu ụmụ iri Heman?

26 Mgbe ụbọchị e kwuru na a ga-egbu ndị Juu ruru, ndị Juu  niile ejikerela. Ugbu a, ọtụtụ ndị isi ndị Peshia na-agbachitere ndị Juu n’ihi na ha nụrụ na e meela Mọdekaị, bụ́ onye Juu, onye na-esote eze. Jehova mere ka ndị ya merie n’agha ahụ. Jehova chebere ndị ya ma mee ka ha sụọ ndị iro ha akwụ, ka ndị iro ha gharakwa inye ha nsogbu ọzọ. *Esta 9:1-6.

27 E gbukwara ụmụ iri Heman n’ihi na ọ bụrụ na e gbughị ha, ha agaghị ekwe ka Mọdekaị were ihe nna ha. (Esta 9:7-10) Ihe a mezuru otu amụma Chineke buru na Baịbụl nke kwuru na a ga-egbuchapụ ndị Amalek, bụ́ ndị iro ndị Chineke. (Diut. 25:17-19) Ọ ga-abụ na ụmụ Heman bụ ndị Amalek ikpeazụ fọrọnụ.

28, 29. (a) Gịnị mere o ji bụrụ uche Jehova ka Esta na ndị Juu lụso ndị iro ha agha? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Esta taa?

28 N’agbanyeghị na Esta ka bụ nwa agbọghọ, ọ rụrụ nnukwu ọrụ, dị ka iso tie iwu gbasara otú a ga-esi lụso ndị iro Chineke agha ma gbuo ha. O doro anya na ihe ndị ahụ Esta mere adịghị mfe. Ma, Esta katara obi mee ha n’ihi na Jehova achọghị ka e bibie ndị ya bụ́ ndị Izrel. Ihe mere na ọ chọghị ka e bibie ha bụ maka na ọ bụ ná mba Izrel ka Mesaya ahụ e kwere ná nkwa ga-esi bịa. Ọ bụkwa Mesaya ahụ ga-azọpụta ụmụ mmadụ. (Jen. 22:18) Ndị na-efe Chineke taa nwere obi ụtọ na mgbe Mesaya ahụ, ya bụ, Jizọs, bịara n’ụwa, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ịlụ agha.—Mat. 26:52.

29 Ma, e nwere agha Ndị Kraịst na-alụ taa. Ha na-alụ agha a ka Setan ghara ime ka ha na Chineke kwụsị ịdị ná mma. Setan chọrọ ime ka anyị kwụsị inwe okwukwe na Jehova Chineke. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 10:3, 4.) Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere onye dị ka Esta, onye anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka ya. Ka anyị gbaa mbọ na-eme ka ya, ya bụ, ka anyị nwee okwukwe, na-akpa àgwà ka ndị maara ihe, na-enwe ndidi, na-agwa ndị ọzọ okwu otú ọ ga-eru ha n’obi, na-akata obi eme ihe, ma na-agbachitere ndị anyị na ha na-efe Chineke.

^ para. 26 Eze nyedịrị ndị Juu ikike ka ha lụkwuo agha otu ụbọchị ọzọ ka ha nwee ike gbuchaa ndị iro ha. (Esta 9:12-14) Ruo taa, ndị Juu ka na-echeta mmeri ahụ ha meriri ndị iro ha. Ha na-echeta ya n’afọ ọ bụla n’ọnwa ndị Juu na-akpọ Eda. Ememme a na-adaba ná ngwụcha ọnwa Febụwarị ma ọ bụ ná mmalite ọnwa Mach na kalenda oge a. Ha na-akpọkwa ememme ha ji echeta ya Purim. Ebe e si nweta okwu ahụ bụ́ Purim bụ na nza ahụ a na-akpọ Pua nke Heman fere mgbe ọ na-akpa nkata igbu ndị Izrel.