Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ISII

Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere

Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere

1, 2. (a) Gịnị mere na obi adịghị Hana mma mgbe ha na-akwado ịga Shaịlo? (b) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Hana?

HANA nọ na-agbakeri ala, na-akwado maka njem ha na-aga ime, na-agbalịkwa ichefu ụwa ya. Oge ahụ kwesịrị ịbụ oge obi ụtọ. Di ya Elkena na-akpọ ezinụlọ ya aga efe Jehova n’ụlọikwuu dị na Shaịlo otú Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha na-eme kwa afọ. Jehova chọrọ ka oge ahụ bụrụ oge aṅụrị. (Gụọ Diuterọnọmi 16:15.) O doro anya na kemgbe Hana bụ nwata, ọ na-atọ ya ụtọ ịga ememme ndị ahụ. Ma kemgbe afọ ole na ole ugbu a, egwú adagharịala.

2 Hana lụtara ezigbo di nke hụrụ ya n’anya. Ma, di ya Elkena nwere nwunye ọzọ. Aha ya bụ Penina. O yikwara ka mkpa Penina ọ̀ bụ imewa Hana obi. Penina bịadịrị na-eji oge ememme ndị a a na-eme kwa afọ akpatara Hana obi mgbawa. Olee otú o si eme ya? Oleekwa otú okwukwe Hana nwere na Jehova si nyere ya aka idi nsogbu ndị na-eyikarị ka ihe mmadụ na-agaghị edili? Ọ bụrụ na i nwere nsogbu ndị na-eme ka obi na-ajọ gị njọ, akụkọ Hana ga-enyere gị aka.

“Gịnịkwa Mere na Obi Adịghị Gị Mma?”

3, 4. Olee nnukwu nsogbu abụọ bịaara Hana, oleekwa ihe mere nke ọ bụla n’ime ha ji siere ya ike?

3 Baịbụl gwara anyị nnukwu nsogbu abụọ Hana nwere. O nweghị ezigbo ihe o nwere ike ime ka nsogbu ya nke mbụ kwụsị, o nwekwanụghị ihe ọ bụla o nwere ike ime ka nke abụọ kwụsị. Nke mbụ bụ na o nwere nwunye di, nwunye di ya kpọkwara ya asị. Nke abụọ abụrụ na ọ bụ nwaanyị aga. Nwaanyị ọ bụla ụdị ihe a dabaara ga-aghọta na ọ dịghị mfe, karịchaa, ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịmụ ụmụ. Ma n’oge Hana, obi na-agbawa nwaanyị ọ bụla bụ́ nwaanyị aga. Ọ bụ ụmụ na-eme ka obi sie di na nwunye ike na ámá ha agaghị echi. Ọ na-abụ ihe ihere na ihe nkọcha ma ọ bụrụ na nwaanyị amụtaghị nwa.

4 Nsogbu Hana agaraghị na-ewutecha ya ma a sị na ọ bụghị  ihe Penina na-eme ya. Ọ dịghị mgbe nsogbu na-anaghị adị n’ezinụlọ a lụrụ ihe karịrị otu nwaanyị. N’ụdị ezinụlọ a, ụmụ nwaanyị na-amarịta aka, na-ese okwu, obi anaghịkwa eru ha ala. Ma ihe Chineke mere mgbe o bidoro ezinụlọ mbụ n’ogige Iden gosiri na ọ chọrọ ka nwoke na-alụ naanị otu nwaanyị. (Jen. 2:24) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji mee ka anyị mara na mmadụ ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị adịghị mma. Ihe Baịbụl kọrọ banyere ezinụlọ Elkena gosikwara na nke a bụ eziokwu.

5. Olee ihe mere Penina ji chọọ imesi Hana ike, oleekwa otú o si mee ka obi gbawaa Hana?

5 Elkena hụrụ Hana n’anya karịa Penina. Ndị Juu na-ekwu na o bu ụzọ lụọ Hana. Mgbe afọ ole na ole gachara, ya alụọ Penina. Ma ebe Penina na-emere Hana anyaụfụ, ọ chọtara ọtụtụ ụzọ ọ ga-esi na-emesi nwunye di ya ike. Naanị ihe Penina nwere ike iji tuoro Hana ọnụ bụ na ya na-amụ ụmụ. Penina mụrụ ọtụtụ ụmụ, nwa nke ọ bụla ọ mụrụ mekwara ka isi buwekwuo ya. Kama imetere Hana ebere ma kasie ya obi n’ihi ihe ahụ dabaara ya, Penina ji ya na-eme ka obi na-ajọ ya njọ. Baịbụl kwuru na Penina kpasuru Hana iwe nke ukwuu “iji mee ka obi ghara iru ya ala.” (1 Sam. 1:6) Penina ma ụma na-emesi ya ike. Ọ chọrọ ka obi gbawaa Hana, o nwetakwara ihe ọ na-achọ.

Obi na-ajọ Hana njọ maka na ọ mụtaghị nwa, Penina mekwara ihe niile o nwere ike ime ka obi gbawaa ya

6, 7. (a) Olee ihe ndị ọ ga-abụ ha mere ka Hana ghara ịkọchara Elkena nsogbu ya n’agbanyeghị na Elkena gbalịrị ịkasi ya obi? (b) Ihe mere Hana ji bụrụ nwaanyị aga ọ̀ bụ na Jehova na-ewesa ya iwe? Kọwaa. (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

6 O yiri ka oge Penina na-akacha akpasu Hana iwe ọ̀ bụ mgbe ha na-eji aga efe Chineke na Shaịlo kwa afọ. Elkena na-esi n’àjà ndị ọ chụụrụ Jehova ekenye ‘ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị niile’ Penina mụrụ òkè. Ma ebe Hana na-enweghị nwa, ọ na-enweta naanị otu òkè. Penina jizi nke a na-akpasu Hana iwe ma na-echetara ya na ọ bụ nwaanyị aga. Nke a na-eme ka Hana na-ebe ákwá ma jụ iri nri. Elkena hụrụ na Hana ọ hụrụ n’anya nọ ná mwute nakwa na o kweghị eri nri, n’ihi ya, ọ gbalịrị ịkasi ya obi. Ọ jụrụ ya, sị: “Hana, gịnị mere i ji na-akwa ákwá, gịnị mere na ị naghị eri nri, gịnịkwa mere na obi adịghị gị mma? N’ebe ị nọ, ọ̀ bụ na akaghị m ụmụ ndị ikom iri mma?”—1 Sam. 1:4-8.

7 E kwesịrị ịja Elkena mma na anya ruru ya ala nke mere o ji chọpụta na ihe na-ewute Hana bụ na ọ mụtaghị nwa. O dokwara  anya na obi dị Hana ụtọ na Elkena gwara ya na ya hụrụ ya n’anya. * Ma, Elkena ekwughị ihe ọ bụla banyere asị ahụ Penina kpọrọ Hana. Baịbụl ekwukwanụghị na Hana gwara ya maka ya. Ọ ga-abụ na Hana ghọtara na ọ bụrụ na ya agbaa omume nwunye di ya n’anwụ, ọ ga-eme ka nsogbu ya ka njọ. Elkena ọ̀ ga-emekwanụ ka nsogbu ya kwụsị? Nke ahụ ọ́ gaghị eme ka Penina kpọkwuo ya asị? Ọ̀ bụkwa na ụmụ Penina, bụ́ nwaanyị anyaụfụ, na ndị na-ejere ya ozi agaghị eso ya mesiwekwuo Hana ike? Ọ bụrụkwa na ihe ndị a emee, ọ ga-adịkwu Hana ka ọ̀ bụ onye a jụrụ ajụ n’ụlọ di ya.

Mgbe a na-emesi Hana ike n’ụlọ di ya, ọ kpọkuru Jehova ka ọ kasie ya obi

8. Ọ bụrụ na e nwere onye na-emesi gị ike, gịnị mere obi ga-eji ruo gị ala ma i cheta na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?

8 Ma Elkena ọ̀ maara ihe niile Penina na-eme Hana ma ọ̀ bụ na ọ maghị, Jehova Chineke maara ha niile. Baịbụl gwara anyị na Jehova hụrụ ihe niile merenụ. Onye ọ bụla nke na-emesi mmadụ ibe ya ike ma na-eche na ihe ọ na-eme adịghị njọ ga-amụta na ya kwesịrị ịkwụsị ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme. Obi kwesịkwara iru ndị dị ka Hana ala, bụ́ ndị aka ha dị ọcha na ndị na-achọghị nsogbu ebe ọ bụ na Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi ga-eme ka ihe niile dị mma n’oge ọ chọrọ nakwa otú ọ chọrọ. (Gụọ Diuterọnọmi 32:4.) Ọ ga-abụ na Hana maara nke ahụ n’ihi na ọ bụ Jehova ka o besaara ákwá ka o nyere ya aka.

“Ihu Ya Agbarụghịkwa Agbarụ Ọzọ”

9. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Hana si kpebie ịga Shaịlo n’agbanyeghị na ọ ma otú nwunye di ya ga-esi kpaso ya àgwà?

9 N’isi ụtụtụ, ndị ezinụlọ Elkena nọ na-agbakeri ala. Mmadụ niile nọ na-akwado maka njem ahụ, ma ụmụaka. Ezinụlọ a ga-aga ihe ruru kilomita iri atọ n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu tupu ha eruo Shaịlo. * Ebe ọ bụ na ha ga-eji ụkwụ, ọ ga-ewe ha otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Hana ma ihe nwunye di ya ga-eme. Ma, Hana asịghị ka ya nọrọ n’ụlọ. Ndị na-efe Chineke taa kwesịrị ịmụta ihe n’ihe a Hana mere. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọjọọ ndị ọzọ na-eme mee ka anyị kwụsị ife Chineke. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka nke ahụ mee, anyị agaghị enweta ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi.

10, 11. (a) Gịnị mere Hana ji gawa n’ụlọikwuu ozugbo o nwetatụrụ ohere? (b) Olee otú Hana si gwa Nna ya nke eluigwe ihe dị ya n’obi?

10 Ezinụlọ Elkena si n’okporo ụzọ bụ́ ugwu ugwu nke dịkwa rịgọ rịgọ gagide ije ruo mgbe ha rutewere Shaịlo. Ha hụrụ obodo  ahụ n’elu ugwu. E nwekwara ugwu ndị ọzọ ka ya elu ndị gbara ya gburugburu. Ka ha na-erute nso, o nwere ike ịbụ na Hana chere ezigbo echiche banyere ihe ọ ga-agwa Jehova n’ekpere. Ozugbo ha rutere, ha riri nri. Hana hapụrụ ha ozugbo o nwetatụrụ ohere ma gaa n’ụlọikwuu Jehova. Nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Ilaị nọ n’ebe ahụ. Ọ nọ ọdụ n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ahụ. Ma, ebe uche Hana dị bụ n’ebe Chineke ya nọ. Obi siri ya ike na Chineke ga-anụ ekpere ya n’ụlọikwuu a. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ọzọ ga-aghọtali nsogbu ya, Nna ya nke eluigwe ga-aghọta ya. N’ihi otú nsogbu ya si na-ewute ya, ọ malitere ibe ákwá.

11 Ka ahụ́ nọ na-ama Hana jijiji n’ihi ákwá ahụ ọ na-ebe, ọ gwawara Jehova okwu n’obi ya. Egbugbere ọnụ ya nọ na-emegharị emegharị ka ọ na-agwa Jehova ihe na-anyịgbu ya. O kpekwara ekpere ahụ ogologo oge. Ma, ihe ọ gwara Chineke abụghị naanị ihe ahụ na-anyịgbu ya, ya bụ, ka ya mụta nwa. Mkpa Hana abụghị naanị inweta ihe n’aka Chineke, kama, ọ chọkwara inye Chineke ihe o nwere ike inye ya. O kwere nkwa na ọ bụrụ na ya amụta nwa nwoke, na ya ga-enye ya Jehova ka o jiri ndụ ya jeere ya ozi.—1 Sam. 1:9-11.

12. A bịa n’okwu gbasara ekpere, olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi nke ekpere ahụ Hana kpere na-akụzikwara anyị?

12 Ihe a Hana mere bụ ihe ndị niile na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme. Jehova na-agwa ndị na-efe ya ka ha na-agwa ya ihe niile dị ha n’obi otú nwatakịrị nke tụkwasịrị nna ya obi na-eme. (Gụọ Abụ Ọma 62:8; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17.) Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee ihe a ga-akasi anyị obi banyere ikpegara Jehova ekpere: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita. 5:7.

13, 14. (a) Olee ihe na-adịghị mma Ilaị kwuru banyere Hana? (b) Olee ihe Hana mere mgbe ahụ nke gosiri na o nwere ezigbo okwukwe?

13 Ma, ụmụ mmadụ anaghị aghọta ihe ka Jehova, ha adịghịkwa ọmịiko ka ya. Ka Hana nọ na-ebe ákwá ma na-ekpe ekpere, otu olu mere ka ọ kụja. Ọ bụ olu Ilaị, nnukwu onye nchụàjà. Ọ nọ na-ele Hana kemgbe. Ilaị kwuru, sị: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-eme ka onye mmanya na-egbu? Mee ka mmanya pụọ gị n’anya.” Ilaị hụrụ mgbe ọnụ Hana na-emegharị, mgbe ọ na-ebe ákwá, na otú ihu si gbarụọ ya. Kama ịjụ ya ihe na-eme ya, o kwubiri na mmanya na-egbu ya.—1 Sam. 1:12-14.

14 Cheedị echiche otú ebubo a na-enweghị isi ga-esi ewute Hana n’oge a obi jọrọ ya njọ, ebe ọ bụ na onye boro ya ebubo a bụ onye a na-akwanyere ùgwù. N’agbanyeghị nke ahụ, Hana mekwara ihe gosiri na o nwere ezigbo okwukwe. O kweghị ka ihe a Ilaị mere mee ka ọ kwụsị ife Jehova n’ihi na ọ ma na Ilaị ezughị  okè. Ọ kwanyeere Ilaị ùgwù ma kọwaara ya ihe merenụ. Ọ ga-abụ na mgbe Ilaị ghọtara na ihe ya kwuru adịghị mma, o jizi olu ọma gwa Hana, sị: “Laa n’udo, ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.”—1 Sam. 1:15-17.

15, 16. (a) Olee uru Hana ritere mgbe ọ kọọrọ Jehova obi ya ma fee ya n’ụlọikwuu? (b) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Hana mgbe obi jọrọ anyị njọ?

15 Olee uru Hana ritere mgbe ọ kọọrọ Jehova obi ya ma fee ya n’ụlọikwuu ya? Baịbụl kwuru, sị: “Nwaanyị ahụ wee laa ma riwe ihe, ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” (1 Sam. 1:18) Obi bịara ruo Hana ala. E nwere ike ikwu na o bunyere Nna ya nke eluigwe, bụ́ onye ka ya ike, ibu ahụ na-anyịgbu ya. (Gụọ Abụ Ọma 55:22.) Ọ̀ dị nsogbu karịrị Jehova? O nwetụbeghị nke karịrị ya, a gakwanụghị enwe.

16 Mgbe ọ bụla ihe na-enye anyị nsogbu n’obi, ya adịkwa anyị ka anyị agaghị edili ya, ma ọ bụkwanụ mgbe obi jọrọ anyị njọ, anyị kwesịrị ime ka Hana ma jiri obi anyị niile gwa Onye Baịbụl kpọrọ “Onye na-anụ ekpere” okwu. (Ọma 65:2) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ ma nwee okwukwe, “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” ga-eme ka obi kwụsị ịjọ anyị njọ.—Fil. 4:6, 7.

“Ọ Dịghịkwa Oké Nkume nke Dị Ka Chineke Anyị”

17, 18. (a) Olee otú Elkena si gosi na ya kwadoro nkwa ahụ Hana kwere Chineke? (b) Olee ihe Penina na-enwezighị ike ime Hana?

17 N’ụtụtụ echi ya, Hana so Elkena gaghachi n’ụlọikwuu ahụ. Ọ ga-abụ na ọ kọọrọla ya ihe ọ rịọrọ Chineke na nkwa o kwere ya, n’ihi na Iwu Mozis kwuru na di nwere ike ịkagbu nkwa nwunye ya kwere ma ọ bụrụ na nwunye ya agwaghị ya agwa kwe nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 30:10-15) Ma, ebe ọ bụ na Elkena na-atụ egwu Chineke, ọ kagbughị nkwa ahụ. Kama nke ahụ, ya na Hana fere Jehova n’ụlọikwuu ahụ tupu ha alawa.

18 Olee mgbe Penina chọpụtara na ihe ọ na-eme anaghịzi akpasu Hana iwe? Baịbụl ekwughị. Ma okwu ahụ bụ́ na “ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ” na-egosi na obi jụụrụ Hana malite mgbe ahụ gawa. Ma, Penina chọpụtara n’oge na-adịghị anya na ihe ọ na-eme Hana anaghịzi ewute ya. Baịbụl akpọghị Penina aha ọzọ.

19. Olee otú Chineke si gọzie Hana, oleekwa otú o si gosi na ya ghọtara onye meere ya ihe ọma ahụ?

19 Mgbe ọnwa ole na ole gachara, obi tọwara Hana ezigbo ụtọ. Ọ dịla ime. N’oge a obi na-atọ ya ezigbo ụtọ, o chefughị onye mere ka ọ tụrụ ime. Mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, ọ gụrụ ya Samuel nke pụtara “Aha Chineke.” Ọ ga-abụ na nke a pụtara na ọ kpọkuru aha Chineke otú ahụ o mere tupu ya amụọ Samuel. N’afọ ahụ, Hana esoghị Elkena na ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ gaa Shaịlo. Ya na nwa ahụ nọrọ n’ụlọ afọ atọ, bụ́ mgbe ọ kwụsịrị ya ara. O ji oge ahụ na-akasi  onwe ya obi maka ụbọchị nwa ya ọ hụrụ n’anya ga-ahapụ ya.

20. Olee otú Hana na Elkena si mezuo nkwa ha kwere Jehova?

20 O doro anya na ọ dịrịghị Hana mfe ịhapụ nwa ya. Hana ma na a ga-elekọta Samuel nke ọma na Shaịlo. O nwekwara ike ịbụ ụmụ nwaanyị ndị na-eje ozi n’ụlọikwuu ga na-elekọta ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Hana gaara achọ ka ya na nwa ya nọrọ ebe ọ ka bụ nwata. Ma, Hana na Elkena ji obi ụtọ kpọta nwata ahụ n’ụlọikwuu. Ha chụrụ àjà n’ụlọ Chineke, nyefeekwa Ilaị Samuel ma chetara ya nkwa ahụ Hana kwere n’ebe ahụ.

Hana nyeere nwa ya Samuel ezigbo aka

21. Olee otú ekpere Hana kpegaara Jehova si gosi na okwukwe ya siri ike? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ekpere Abụọ Pụrụ Iche.”)

21 Hana kpeziri ekpere nke Chineke hụrụ na o kwesịrị ekwesị ka e tinye ya n’Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee. Ka ị na-agụ 1 Samuel 2:1-10, bụ́ ebe e dere ihe Hana kwuru, ị ga-achọpụta na ihe niile o kwuru gosiri na okwukwe ya siri ike. O kelere Jehova maka otú o si eji ike ya eme ihe ndị dị ịtụnanya, maka otú o si eweda ndị mpako ala, otú o si agọzi ndị a na-emegbu emegbu, otú o si egbu ndị ọjọọ na otú o si edebe ndị ezi omume ndụ. O toro Jehova maka ịdị nsọ ya, ikpe ziri ezi ya, na ikwesị ntụkwasị obi ya na-enweghị atụ. Hana nwere ezigbo ihe mere o ji kwuo, sị: “Ọ dịghịkwa oké nkume nke dị ka Chineke anyị.” Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ọ naghịkwa agbanwe agbanwe. Ọ bụkwaara ndị niile a na-emegbu emegbu na ndị niile e wedara n’ala, bụ́ ndị na-akpọku ya ka o nyere ha aka, ebe mgbaba.

22, 23. (a) Olee otú anyị si mara na mgbe Samuel na-eto na ọ ghọtara na nne na nna ya hụrụ ya n’anya? (b) Olee otú Jehova si gọzikwuo Hana?

22 Ọ dabaara obere nwa a bụ́ Samuel na o nwere ezigbo nne nwere okwukwe na Jehova. Ọ bụ eziokwu na mgbe ọ na-eto,  ọ na-agụ ya agụụ ka ya na nne ya na-anọ, ọ dịghị mgbe o chere na nne ya echefuola ya. Kwa afọ, Hana na-abịa Shaịlo ewetara ya uwe elu na-enweghị aka ọ ga-eji na-eje ozi n’ụlọikwuu. Uwe Hana ji aka ya na-adụrụ nwa ya gosiri na ọ hụrụ ya n’anya. (Gụọ 1 Samuel 2:19.) Weregodị ya na ị na-ahụ ebe Hana na-eyiwe nwatakịrị ahụ uwe ọhụrụ ọ dụụrụ ya, na-agbatị ya, ma jiri obi ụtọ na-ele nwata ahụ anya ma na-agwa ya okwu ga-agba ya ume. Ọ dabaara Samuel na o nwere ezigbo nne. Mgbe o toro, ọ baara ma nne na nna ya ma Izrel dum uru.

23 Jehova echefughị Hana. O mere ka ọ mụtakwuoro Elkena ụmụ ise ọzọ. (1 Sam. 2:21) Ma, ọ ga-abụ na ihe ọma kacha meere Hana bụ na ya na Nna ya, bụ́ Jehova, dị n’ezigbo mma. Ha nọ na-adịkwu ná mma ka afọ na-agafe. Ọ bụrụ na i ṅomie okwukwe Hana, gị na Jehova ga-adịkwa ná mma.

^ para. 7 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na Jehova ‘mechiri akpa nwa Hana,’ ọ dịghị ihe gosiri na Chineke na-ewesa ezigbo nwaanyị a dị umeala n’obi iwe. (1 Samuel 1:5) Mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-ekwu na Chineke mere ihe, ma ihe ọ pụtara bụ na ọ hapụrụ ihe ahụ ka o mee.

^ para. 9 Ihe mere o ji bụrụ na njem ahụ ga-ewe ihe dị ka kilomita iri atọ bụ na ọ dị ka ọ̀ bụ obodo Elkena bụ́ Rema ka a na-akpọzi Arimatia n’oge Jizọs.