Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE MBỤ

‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’

‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’

1. Gịnị mere na ezinụlọ Adam na Iv enweghị ike ịbanye n’ogige Iden, gịnịkwa ka Ebel chọsiri ike?

KA EBEL nọ na-elekọta ìgwè atụrụ ya ndị na-ata ahịhịa n’akụkụ ugwu, ọ ga-abụ na o lepụrụ anya hụ otu ihe na-egbuke ka ọkụ. Ọ ma na e nwere mma agha na-egbukepụ ọkụ n’ebe ahụ. Mma agha a na-echigharị echigharị n’onwe ya ka a ghara inwe onye ga-abanye n’ogige Iden. Nne na nna ya bibu ebe ahụ. Ma, ha na ụmụ ha enwezighị ike ịbanye ebe ahụ. Were ya na ị na-ahụ ebe ikuku mgbede nọ na-ekusasị ntutu isi Ebel mgbe o leliri anya na-eche banyere Onye kere ya. O nwere ike ịbụ na ọ na-eche ma mmadụ na Chineke hà ga-emecha dịrị ná mma. Obi ga-atọ Ebel ezigbo ụtọ ma nke a mee.

2-4. Olee otú Ebel si na-agwa anyị okwu taa?

2 Ebel na-agwa gị okwu taa. Ị̀ na-anụ ihe ọ na-agwa gị? I nwere ike ikwu na nke a emekataghị mee. A sị ka e kwuwe, Ebel bụ nwa nke abụọ Adam mụrụ, ọ nwụọkwala kemgbe. O rekasịchaala ma ghọọ ájá kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ isii gara aga. Baịbụl kwukwara na ndị nwụrụ anwụ “amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekli. 9:5, 10) Ihe ọzọkwa bụ na e nweghị otu mkpụrụ okwu Ebel kwuru nke e dere na Baịbụl. Ebe ọ dị otú ahụ, oleezi otú o si agwa anyị okwu?

3 Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee banyere Ebel, sị: “O sitekwara na ya na-ekwu okwu, ọ bụ ezie na ọ nwụrụ anwụ.” (Gụọ Ndị Hibru 11:4.) Gịnị ka Ebel si na ya na-ekwu okwu? O si n’okwukwe ya. Ebel bụ mmadụ mbụ nwere okwukwe na Chineke. Okwukwe Ebel siri ezigbo ike nke na n’agbanyeghị na ọ nwụọla, a ka ji ya ama atụ, ọ bụkwa ụdị okwukwe ahụ ka anyị kwesịrị inwe taa. Ọ bụrụ na anyị amụta ihe n’okwukwe Ebel ma gbalịa inwe ụdị okwukwe o nwere, e nweziri ike ikwu na Ebel na-agwa anyị okwu taa.

4 Oleekwanụ ihe anyị nwere ike ịmụta banyere Ebel ebe ọ bụ na Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe banyere ya? Ka anyị hụ.

Mgbe Ebel Bụ Nwata

5. Mgbe Jizọs kwuru na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa,” gịnị ka o bu n’obi? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala.)

5 Ebel so ná ndị mbụ dịrị ndụ n’ụwa n’ihi na a mụrụ ya obere  oge Chineke kechara mmadụ. Jizọs mechara kwuo na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa.” (Gụọ Luk 11:50, 51.) O doro anya na ụwa Jizọs kwuru okwu ya n’amaokwu a bụ ụmụ mmadụ ndị nwere olileanya na a ga-agbapụta ha ná mmehie. Ọ bụ eziokwu na Ebel bụ onye nke anọ dịrị ndụ n’ụwa, ma ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ onye mbụ Chineke weere na e nwere ike ịgbapụta ná mmehie. * O doro anya na nne na nna Ebel na nwanne ya Ken ejighị Chineke kpọrọ ihe, n’ihi ya, o nweghị ezigbo ihe Ebel nwere ike ịmụta n’aka ha.

6. Olee ụdị mmadụ nne na nna Ebel bụ?

6 N’agbanyeghị na ọ dịbeghị anya ụmụ mmadụ malitere ịdị ndụ n’ụwa, ha amalitela ịta ahụhụ. Ọ ga-abụ na Adam na Iv, bụ́ nne na nna Ebel, mara ezigbo mma, gbasiekwa ike. Ma, ha ma na ha adịghịzi otú ha dịbu. Ha zuburu okè, nweekwa olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma ha nupụụrụ Jehova Chineke isi, ya achụpụ ha n’ebe obibi ha bụ́ paradaịs nke dị n’ogige Iden. Ebe ọ bụ na ihe ka Adam na Iv mkpa bụ ime ihe dị hanwa mma, ha egeghị Chineke ntị n’agbanyeghị nsogbu nnupụisi ha ga-akpatara ụmụ ha. Ọ bụ otú ahụ ka ha si ghọọ ndị na-ezughị okè, gharazie inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Jen. 2:15–3:24.

7, 8. Gịnị ka Iv kwuru mgbe ọ mụrụ Ken, gịnịkwa nwere ike ịbụ ihe o bu n’obi kwuo ya?

7 Chineke chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden, ha amalitezie ịtagbu onwe ha n’ahụhụ. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ha mụrụ nwa  mbụ ha, ha kpọrọ ya Ken ma ọ bụ “Onye A Mụrụ Amụ.” Iv kwuru, sị: “Amụtawo m nwoke site n’enyemaka Jehova.” Ihe a o kwuru gosiri na ọ ga-abụ nkwa Jehova kwere n’ogige Iden ka o bu n’obi gụọ nwa ya aha ahụ. Jehova kwere nkwa n’oge ahụ na a ga-enwe otu nwaanyị nke a ga-esi n’aka ya nweta otu “mkpụrụ” nke ga-emecha bibie ajọ onye ahụ nke duhiere Adam na Iv. (Jen. 3:15; 4:1) Ọ̀ ga-abụ na Iv chere na ọ bụ ya bụ nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya n’amụma ahụ, Ken abụrụ “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa?

8 Ọ bụrụ ihe ahụ ka Iv chere, ọ dara ya. Ọ bụrụkwa ihe ahụ ka ya na Adam kụziiri Ken mgbe ọ na-eto, o nweghị aka ha nyeere ya. Kama nke ahụ, ha mere ka isi buwe ya. Iv mechakwara mụta nwa nwoke ọzọ, ma ha agụghị ya oké aha otú ahụ ha gụrụ Ken. Ha gụrụ ya Ebel. Ọ ga-abụ na ihe aha a pụtara bụ “Ume E Kupụrụ Ekupụ” ma ọ bụ “Ihe Efu.” (Jen. 4:2) Ọ̀ ga-abụ na aha a ha gụrụ Ebel gosiri na ha chere na Ken ga-aka ya baa uru? Anyị amaghị.

9. Gịnị ka ndị nne na nna taa nwere ike ịmụta n’ihe Adam na Iv mere?

9 Ndị nne na nna nwere ike ịmụta ihe n’ihe ahụ Adam na Iv mere. Otú unu si akpa àgwà na ihe unu na-ekwu hà na-eme ka ụmụ unu bụrụ ndị mpako, ndị nwere oké ọchịchọ ma ọ bụ ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru? Ka unu na-akụziri ha ka ha hụ Jehova Chineke n’anya ma na-agbalị ka ha na ya dịrị ná mma? Ọ dị mwute na Adam na Iv emeghị otú ahụ. Ma, ụmụ ha ka nwere olileanya.

Ihe Nyeere Ebel Aka Inwe Okwukwe na Chineke

10, 11. Olee ọrụ Ken na Ebel malitere ịrụ, oleekwa ihe Ebel mere ka ọtụtụ afọ na-agafe?

10 Mgbe Ken na Ebel na-etolite, ọ ga-abụ na Adam kụziiri ha ọrụ ha ga na-arụ ka ezinụlọ ha nweta ihe ha ga-eri. Ken ghọrọ onye ọrụ ubi, Ebel aghọọ onye na-azụ atụrụ.

11 Ma, Ebel mere ihe dị mkpa karịa ịzụ atụrụ. Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ọ bịara nwee okwukwe na Chineke. Pọl mechara dee banyere okwukwe ahụ Ebel nwere. Chebagodịrị ihe a echiche. O nweghị mmadụ nọ n’oge ahụ Ebel nwere ike isi n’aka ya mụta ezigbo ihe. Oleezi otú o si nwee okwukwe na Jehova Chineke? Ka anyị leba anya n’ihe atọ nyeere Ebel aka inwe okwukwe na Chineke.

12, 13. Olee otú o nwere ike isi bụrụ na ikiri ihe ndị Jehova kere eke mere ka okwukwe Ebel sikwuo ike?

12 Ihe ndị Jehova kere. Jehova bụrụ ala ọnụ, ya emee ka ịkọ ihe n’ala ghara ịdị mfe n’ihi ogwu na uke ndị juru na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ala ka na-emepụta ihe Adam na Iv na ụmụ ha na-eri. Jehova abụghịkwa anụmanụ, nnụnụ na azụ̀ ọnụ, o nwekwanụghị ọnụ ọ bụrụ ọdọ mmiri, oké osimiri, mbara ígwé, ígwé ojii, anyanwụ, ọnwa na kpakpando. Ebe ọ bụla Ebel lere anya, ọ na-ahụ ihe ndị gosiri na  Jehova Chineke, bụ́ onye kere ihe niile, nwere amamihe, na-emekwara ihe ndị o kere eke ihe ọma ma hụ ụmụ mmadụ n’anya. (Gụọ Ndị Rom 1:20.) Mgbe Ebel chebaara ihe ndị ahụ echiche, ha mere ka okwukwe ya sikwuo ike.

Ihe e kere eke ndị Ebel hụrụ mere ka okwukwe ya sie ike

13 Ọ ga-abụ na Ebel wepụtara oge chebara ụdị onye Jehova bụ echiche. Were ya na ị na-ahụ ya ka ọ na-azụ atụrụ ya. Onye ọzụzụ atụrụ anaghị anọ otu ebe. Ọ na-akpọrọ atụrụ ndị ọ na-azụ rịa ugwu, gafee ndagwurugwu na iyi ma gaa n’ebe ahịhịa ndụ juru eju nakwa n’ebe ha ga-aṅụju mmiri afọ. Ọ na-akpọkwa ha aga n’ebe ndị dị mma ha ga-anọ zuru ike. A bịa n’ụmụ anụmanụ niile Chineke kere, ọ dị ka ọ̀ bụ atụrụ kacha bụrụ nke na-agbasighị ike, ka à ga-asị na Chineke kere ha ka mmadụ na-elekọta ha ma na-echebe ha. Ọ̀ ga-abụ na Ebel ghọtara na yanwa kwesịkwara inwe Onye karịrị mmadụ, nke kakwa mmadụ mara ihe, ga na-eduzi ya, na-echebe ya ma na-elekọta ya? Ọ ga-abụ na o kpere ekpere banyere ihe ndị a, ekpere ahụ mekwara ka okwukwe ya sikwuo ike.

14, 15. Olee nkwa ndị Jehova kwere bụ́ ndị o doro anya na Ebel chebaara echiche?

14 Nkwa ndị Jehova kwere. O doro anya na Adam na Iv kọọrọ ụmụ ha ihe ha mere n’ogige Iden nke mere Jehova ji chụpụ ha. N’ihi ya, Ebel nwere ọtụtụ ihe ọ ga-echebara echiche.

15 Jehova kwuru na ya abụọla ala ọnụ. Ebel ji anya ya hụ na ihe Jehova kwuru emezuola n’ihi na ọ na-ahụ ka ogwu na uke na-epupụta n’ala. Jehova kwukwara na Iv ga-enwe ihe mgbu mgbe ọ dị ime na mgbe ọ na-amụ nwa. Ọ bụrụ na Ebel hụrụ mama ya ka ọ na-amụ nwa, o doro anya na ọ ga-aghọta na ihe Jehova kwuru bụ eziokwu. Jehova gwara Iv na ọ ga na-agụgbu ya agụgbu ka di ya hụ ya n’anya ma na-elebara ya anya. Ọ gwakwara ya na Adam ga na-achị ya. Ebel hụkwara ihe na-aga n’etiti mama ya na papa ya ma mara na ihe Jehova gwara Iv emezuola. Ebel chọpụtara na ihe niile Jehova kwuru mezuchara. Ihe ndị ahụ mere ka Ebel kwetasie ike na nkwa ahụ Jehova kwere banyere mkpụrụ ahụ nke ga-abịanụ ga-emezurịrị. Otu ụbọchị, “mkpụrụ” ahụ ga-edozi nsogbu niile nnupụisi Adam na Iv kpatara.—Jen. 3:15-19.

16, 17. Olee ihe ọ ga-abụ na Ebel mụtara n’aka ndị cherọb ahụ?

 16 Ndị na-ejere Jehova ozi. N’eziokwu, o nweghị mmadụ nọ n’ụwa n’oge ahụ nke Ebel nwere ike isi n’aka ya mụta ezigbo ihe. Ma, e nwere ndị mmụọ ozi nọ n’ụwa mgbe ahụ ndị Ebel nwere ike isi n’aka ha mụta ihe. Mgbe Jehova chụpụchara Adam na Iv na paradaịs, Jehova mere ihe ga-eme ka Adam na Iv na ụmụ ha ghara ịbanye ebe ahụ. Jehova mere ka ndị cherọb na-eche ọnụ ụzọ ogige ahụ nche. Ndị cherọb bụ ndị mmụọ ozi ọkwá ha dị elu. Jehova debekwara mma agha na-egbukepụ ọkụ, nke na-echigharị mgbe niile n’ebe ahụ.—Gụọ Jenesis 3:24.

17 Chegodị otú obi dị Ebel mgbe ọ na-ahụ ndị cherọb ahụ n’oge ọ bụ nwata. Ebe ọ bụ na ndị cherọb ahụ nwoghara ma dịrị ka ụmụ mmadụ, otú ha dị n’anya ga-eme ka Ebel mara na ha siri ezigbo ike. “Mma agha” ahụ nke na-egbukepụ ọkụ ma na-echigharị mgbe niile mekwara ka Ebel na-atụ egwu Chineke. Ka Ebel na-eto, ò nwere mgbe ọ hụrụ ka ike ịnọ n’ọnụ ụzọ ogige ahụ gwụrụ ndị cherọb ahụ, ha esizie ebe ahụ pụọ? Mba. Ndị cherọb ahụ, bụ́ ndị ma ihe ma sie ezigbo ike, nọ ebe ahụ ma n’ụtụtụ ma n’abalị, site n’afọ ruo n’afọ. Ọ dịtụghị mgbe ha hapụrụ ebe ahụ Jehova sịrị ha nọrọ. Nke a mere ka Ebel mara na Jehova Chineke nwere ndị na-erubere ya isi, bụ́ ndị ji ọrụ o nyere ha kpọrọ ihe. Ebel ghọtara na ndị cherọb ahụ na-erubere Jehova isi ma kwụsie ike n’ebe Jehova nọ, ma o nweghị onye nọ n’ezinụlọ ha na-eme otú ahụ. O doro anya na àgwà ndị mmụọ ozi ahụ mere ka okwukwe Ebel sikwuo ike.

N’oge niile Ebel dịrị ndụ, ọ hụrụ na ndị cherọb ahụ rubeere Jehova isi

18. Olee ihe ndị nwere ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike?

18 Ebel chebaara ihe ndị Jehova kere eke echiche bụ́ ndị Jehova ji eme ka ụmụ mmadụ mata ụdị onye ọ bụ. O chebakwaara nkwa ndị Chineke kwere echiche, nakwa otú ndị cherọb ahụ si na-erubere Chineke isi. Ihe ndị a mere ka okwukwe Ebel sikwuo ike. O doro anya  na e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ya. Ndị na-eto eto nwedịrị ike ịmụta na ha ga-enweli ezigbo okwukwe na Jehova Chineke n’agbanyeghị ihe ndị ezinụlọ ha na-eme. Anyị nwekwara ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị mara mma Chineke kere, bụ́ ndị anyị na-ahụ ebe niile, na Okwu ya bụ́ Baịbụl, nakwa ọtụtụ ndị ohu Chineke ndị nwere okwukwe.

Ihe Mere Àjà Ebel Chụrụ Ji Dị Chineke Mma

19. Olee ihe dị mkpa Ebel mechara ghọta?

19 Ka Ebel na-enwekwu okwukwe na Jehova, ọ bịara chọwa ihe ọ ga-enye Jehova iji gosi na ya nwere okwukwe. Ma, oleekwanụ ihe mmadụ nkịtị ga-enye Onye kere eluigwe na ala? Nke bụ́ eziokwu bụ na enyemaka anyị adịghị Chineke mkpa, o nwekwanụghị ihe o ji onyinye anyị eme. Ma, Ebel mechara ghọta na ọ bụrụ na ya eburu ezigbo ihe n’obi nye Jehova ihe kacha mma o nwere, obi ga-atọ Jehova ụtọ.

Ebel ji okwukwe chụọrọ Chineke àjà, ma Ken emeghị otú ahụ

20, 21. Gịnị ka Ken na Ebel ji chụọrọ Jehova àjà, oleekwa ihe Jehova mere?

20 Ebel kpebiri na ya ga-achụrụ Chineke àjà. O si n’ìgwè ewu na atụrụ ya họta ụmụ atụrụ ndị kacha mma, bụ́ ndị e bu ụzọ mụọ. Ken chọkwara ka Chineke gọzie ya. N’ihi ya, o si n’ihe ubi ya weta mkpụrụ ọ ga-eji chụọrọ Chineke àjà. Ma ihe o bu n’obi chọọ ịchụrụ Chineke àjà dị iche n’ihe Ebel bu n’obi. Ihe merenụ mgbe ha abụọ chụụrụ Jehova àjà gosiri na ihe ha bu n’obi dị iche iche.

21 Ọ ga-abụ na ha dosara onyinye ha n’elu ebe ịchụàjà ma mụnye ha ọkụ. Ọ ga-abụkwa na ha nọ n’ebe ndị cherọb ahụ ga na-ahụ ha anya chụọrọ Jehova àjà ahụ. Nke ahụ bụ n’ihi na ọ bụ ndị cherọb ahụ bụ naanị ndị na-anọchite anya Jehova n’ụwa n’oge ahụ. Jehova mekwara ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova lere Ebel na onyinye ya anya ọma.” (Jen. 4:4) Baịbụl ekwughị ihe Jehova mere iji gosi na o lere onyinye Ebel anya ọma.

22, 23. Gịnị mere Jehova ji nabata àjà ahụ Ebel chụrụ?

22 Gịnị mere Chineke ji nabata onyinye Ebel? Ọ̀ bụ n’ihi ụdị onyinye Ebel nyere ya? Ebel ji ihe dị ndụ na-eku ume ma nwee ọbara chụọrọ Chineke àjà. Ọbara anụmanụ ndị ahụ nọchikwara anya ndụ ha. Ebel ọ̀ ma na ụdị àjà ahụ bara ezigbo uru? Ọtụtụ narị afọ Ebel chụchara àjà ahụ, Chineke ji àjà nke e ji nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ chụọ tụnyere àjà ọ ga-eji Ọkpara ya zuru okè chụọ. A kpọrọ Ọkpara ya ahụ “Nwa Atụrụ Chineke,” onye ga-awụpụ ọbara ya zuru okè. (Jọn 1:29; Ọpụ. 12:5-7) O doro anya na Ebel amaghị nke ahụ.

23 Ma otu ihe doro anyị anya bụ na Ebel nyere Chineke ihe kacha mma o nwere. Ihe mere Jehova ji nabata àjà Ebel abụghị naanị maka na o ji atụrụ chụọrọ ya àjà, kama, ọ bụ n’ihi ụdị mmadụ Ebel bụ. Ebel chụụrụ Jehova àjà n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya ma nwee ezigbo okwukwe na ya.

24. (a) Olee ihe mere anyị ga-eji kwuo na ihe Ken ji chụọrọ Chineke àjà adịghị njọ? (b) Olee otú àgwà Ken si yie nke ọtụtụ ndị taa?

 24 Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị Ken. Jehova ‘eleghị Ken na onyinye ya anya ọma.’ (Jen. 4:5) Ọ bụghị na ihe ahụ Ken ji chụọrọ Jehova àjà adịghị mma. A sị ka e kwuwe, Chineke mechadịrị gwa ụmụ Izrel ka ha jiri ihe ndị ha wetara n’ubi na-achụrụ ya àjà. (Lev. 6:14, 15) Ma Baịbụl kwuru na ‘ọrụ Ken jọrọ njọ.’ (Gụọ 1 Jọn 3:12.) Ọ ga-abụ na Ken chere na ime ka à sịkwa na ọ na-efe Chineke ezuola, otú ahụ ọtụtụ ndị na-emekwa n’oge anyị a. Ihe o mere ozugbo ọ chụchaara Jehova àjà mere ka o doo anya na ọ hụghị Jehova n’anya nakwa na o nweghị okwukwe na ya.

25, 26. Olee ndụmọdụ Jehova nyere Ken, oleekwa ihe Ken mere?

25 Ò nwere ihe Ken mụtara n’aka Ebel mgbe Ken hụrụ na Jehova anabataghị àjà ọ chụrụ? Mba. Ọ bịadịrị kpọọ Ebel asị n’obi ya. Jehova hụrụ ihe dị n’obi Ken ma jiri obiọma gwa ya okwu. Ọ dọrọ Ken aka ná ntị na àgwà ya ga-eme ka o mee mmehie dị oké njọ. Ọ gwakwara Ken na ọ bụrụ na ọ gbanwee mewe ezi ihe, na ya ‘ga-ebuli ya elu.’—Jen. 4:6, 7.

26 Ken egeghị Chineke ntị. Kama ọ kpọrọ nwanne ya nwoke ka o soro ya gaa n’ọhịa. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Ken gburu nwanne ya Ebel. (Jen. 4:8) E nwere ike ikwu na Ebel bụ onye mbụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya. Ọ bụ eziokwu na Ebel anwụọla, a ka na-akọ akụkọ ya n’ebe niile.

27. (a) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Chineke ga-akpọlite Ebel n’ọnwụ? (b) Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na anyị ga-ahụ Ebel otu ụbọchị?

27 E nwere ike ikwu na ọbara Ebel na-ebesara Jehova Chineke ákwá, ya bụ, ọ na-agwa Chineke ka ọ bọọrọ ya ọbọ. Chineke mekwara otú ahụ. Ọ tara Ken ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ahụ Ken mere. (Jen. 4:9-12) Ihe kadị mkpa bụ na okwukwe Ebel na-akụziri anyị ihe taa. Ọ bụ eziokwu na Ebel adịteghị ndụ aka ma e jiri ihe dị ka otu narị afọ ọ dịrị ndụ tụnyere afọ ole ndị mmadụ na-adị ndụ n’oge ahụ, ma o ji ndụ ya mee ihe bara uru. Tupu Ebel anwụọ, ọ ma na Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, hụrụ ya n’anya. (Hib. 11:4) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ka na-echeta ya. Ọ ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. (Jọn 5:28, 29) Ị̀ ga-anọ na paradaịs mgbe a ga-akpọlite Ebel n’ọnwụ? I nwere ike ịnọ ya ma ọ bụrụ na i kpebisie ike na ị ga-ege ntị n’ihe Ebel na-agwa anyị ma nwee ụdị okwukwe o nwere.

^ para. 5 Ihe okwu Hibru a sụgharịrị ‘ịtọ ntọala ụwa’ pụtara bụ ịgha mkpụrụ, ya bụ, ịmụ nwa. N’ihi ya, ihe a na-ekwu okwu ya bụ mmadụ mbụ a mụrụ n’ụwa. Ma, ebe ọ bụ Ken bụ nwa mbụ Adam na Iv mụrụ, olee ihe mere Jizọs ji hapụ Ken kwuo na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa”? Ihe ndị Ken kpebiri ime na ihe ndị o mechara mee gosiri na ọ ma ụma nupụrụ Jehova Chineke isi. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na a gaghị azọpụta Ken ma ọ bụ kpọlite ya n’ọnwụ otú ahụ a na-agaghị akpọlite nne na nna ya, bụ́ Adam na Iv.