Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Chineke Ya Kasiri Ya Obi

Chineke Ya Kasiri Ya Obi

1, 2. Olee njinji jiri otu ụbọchị n’oge Ịlaịja?

ỊLAỊJA bu mmiri na-ezonụ na-agba ọsọ. Eluigwe ka na-agbajikwu. Jezril ahụ ọ gba na-aga ka dịkwa ezigbo anya. Ihe ọzọ bụ na Ịlaịja abụzighị nwa okorobịa. N’agbanyeghị nke ahụ, ike agwụghị ya n’ihi na “aka Jehova” dị n’ahụ́ ya. O doro anya na o nwetụbeghị mgbe ume dị ya n’ahụ́ otú ọ dị ya ugbu a. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike ịgbafe ụgbọ ịnyịnya bu Eze Ehab.—Gụọ 1 Ndị Eze 18:46.

2 Ugbu a, Ịlaịja nọzi naanị ya n’okporo ụzọ ahụ. Ma ọ gawabedịghị aga. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ịlaịja bu mmiri ahụ na-ezonụ na-agba ọsọ, ya ana-echetakwa njinji jiri n’ụbọchị ahụ. O doro anya na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Ịlaịja na ndị na-efe ya meriri Bel na ndị na-efe ya n’ụbọchị ahụ. Ugbu a, Ịlaịja agbamiela. Ọ naghịzi ahụ Ugwu Kamel, bụ́ ebe Jehova nọ rụọ ọrụ ebube ahụ mere ka Ịlaịja gosi na ofufe Bel bụ ofufe ụgha. Ihe mere n’ụbọchị ahụ gosiri na ndị amụma Bel bụ ndị amụma ụgha, e gbukwara ọtụtụ n’ime ha n’ihi na ha kwesịrị ọnwụ. Mgbe e gbuchara ha, Ịlaịja kpeziri ekpere ka Jehova mee ka mmiri na-ezobeghị kemgbe afọ atọ na ọkara zoo. Mmiri zokwara.—1 Eze 18:18-45.

3, 4. (a) Gịnị mere Ịlaịja ga-eji chee na ihe niile adịla mma mgbe ọ gba ọsọ na-aga Jezril? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya?

3 Ka Ịlaịja ji ọsọ na-aga Jezril, bụ́ ebe dị kilomita iri atọ ma e si n’Ugwu Kamel gawa ya, o nwere ike na-eche na ihe ga-agbanwezi n’Izrel. Ehab ga-agbanwerịrị. Ugbu a ọ hụchara ihe mere ndị amụma Bel, o doro anya na ọ ga-akwụsị ife Bel ma mee ka nwunye ya, bụ́ Jezibel, kwụsị ihe ọjọọ ọ na-eme, meekwa ka a kwụsị ịkpagbu ndị na-efe Jehova.

‘Ịlaịja wee buru Ehab ụzọ gbaruo Jezril’

4 Ọ bụrụ na o yiri ka ihe ọ̀ gawala otú anyị chọrọ, obi na-adị anyị mma. Anyị nweziri ike chewe na ihe ga-adịrị mma gawa, ma ọ bụdị chewe na nsogbu anyị agwụla. Ọ bụrụ na Ịlaịja chere na nsogbu ya agwụla, o kwesịghị iju anyị anya n’ihi na o “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) Ma nke bụ́ eziokwu bụ na nsogbu Ịlaịja ka na-amalite amalite. N’ime awa ole na ole, oké ụjọ ga-ejide Ịlaịja nke na ike ụwa ga-agwụ ya, ya achọwa ka ọnwụ bịa  gbuo ya. Olee ihe ndị merenụ? Oleekwa otú Jehova si gbaa onye amụma a ume ma mee ka obi sie ya ike? Ka anyị hụ.

Ihe Ọ Na-atụghị Anya Ya Mere

5. N’agbanyeghị ihe niile mere n’Ugwu Kamel, Ehab ọ̀ mụtara na ya kwesịrị ịsọpụkwuru Jehova, oleekwa otú anyị si mara?

5 Mgbe Ehab ruru n’obí ya na Jezril, ò mere ihe gosiri na o chegharịala? Baịbụl sịrị: “Ehab wee kọọrọ Jezibel ihe niile Ịlaịja mere na ihe niile banyere otú o si jiri mma agha gbuo ndị amụma ahụ niile.” (1 Eze 19:1) Ị̀ hụrụ na mgbe Ehab na-akọrọ nwunye ya ihe merenụ n’ụbọchị ahụ, o kwutedịghị okwu Jehova, bụ́ Chineke Ịlaịja? Ebe ọ bụ na o nweghị ihe Ehab ji ofufe Chineke kpọrọ, o weere ọrụ ebube niile Chineke rụrụ n’ụbọchị ahụ ka ihe mmadụ nkịtị rụrụ. Ọ bụ ya mere o ji sị na ọ bụ ‘ihe Ịlaịja mere.’ O doro anya na ọ mụtabeghị na ya kwesịrị ịsọpụrụ Jehova Chineke. Gịnịzi ka nwunye ọjọọ ya mere?

6. Olee ozi Jezibel zigaara Ịlaịja, oleekwa ihe ihe ahụ ọ gwara ya pụtara?

6 Iwe na ọnụma juru Jezibel obi, ya ezigara Ịlaịja ozi. Ọ sịrị ya: “Ka chi m mee otú ahụ, ka ha tụkwasịkwa ihe na ya, ma ọ bụrụ na n’ụdị ugbu a echi emeghị m ka mkpụrụ obi gị dị ka mkpụrụ obi onye nke ọ bụla n’ime ha!” (1 Eze 19:2) Jezibel ejighị ya n’egwuregwu. Ihe a Jezibel kwuru bụ na ya na-aṅụ iyi na kama Ịlaịja na-agaghị anwụ echi n’ihi ndị amụma Bel ahụ e gburu, ka yanwa nwụọ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka a kpọtere Ịlaịja n’ụra n’ebe ọ nọ na Jezril n’abalị ahụ mmiri zoro ma zie ya ozi ọjọọ a Jezibel ziri. Olee otú obi dị ya mgbe ọ nụrụ ozi a?

Ụjọ Jidere Ya

7. Olee otú obi dị Ịlaịja mgbe ọ nụrụ ozi Jezibel, oleekwa ihe o mere?

7 Ọ bụrụ na Ịlaịja chere na ofufe Bel anyụọla ka ọkụ n’Izrel, ozi ahụ e ziri ya emeela ka ọ mata na ihe a o chere abụghị eziokwu. Ike agwụbeghị Jezibel. O gbuola ọtụtụ ndị amụma Chineke. Ugbu a kwa, o yiri ka ò ruorola Ịlaịja. Olee otú obi dị Ịlaịja mgbe Jezibel ziri ya ozi a. Baịbụl gwara anyị, sị: ‘Egwu wee tụwa Ịlaịja.’ Ịlaịja ọ̀ nọ na-eche otú Jezibel ga-esi gbuo ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ ya mere ụjọ ji tụwa ya. Nke ọ bụla ọ bụ, Ịlaịja ‘biliri gbapụ n’ihi mkpụrụ obi ya,’ ya bụ, ọ gbara ọsọ ndụ.—Eze 18:4; 19:3.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụjọ ghara ịtụ anyị, anyị ekwesịghị ichewe ihe ndị ga-eme ka ụjọ tụwa anyị

8. (a) Olee otú ụjọ tụrụ Pita si yie nke tụrụ Ịlaịja? (b) Gịnị ka ihe ahụ mere Ịlaịja na Pita na-akụziri anyị?

8 Ịlaịja abụghị onye mbụ nwere okwukwe nke ụjọ jidetụrụla. O nwere mgbe ụjọ jidere Pita onyeozi. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs mere ka Pita soro ya gaa ije n’elu mmiri, Pita lere anya hụ  “oké ifufe ahụ,” ụjọ ejide ya, ya amalite imikpu. (Gụọ Matiu 14:30.) Ihe a mere Pita na Ịlaịja na-akụziri anyị otu ihe dị mkpa. Ọ na-akụziri anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụjọ ghara ịtụ anyị, anyị ekwesịghị ichewe ihe ndị ga-eme ka ụjọ tụwa anyị. Anyị kwesịrị ilekwasị Chineke anya bụ́ onye na-enye anyị ike ma na-agba anyị ume.

“O Zuwo!”

9. Kọwaa ije Ịlaịja gara nakwa otú obi dị ya mgbe ọ na-aga?

9 Ụjọ ahụ ji Ịlaịja mere ka ọ gbaga Bia-shiba. Bia-shiba dị nso n’ebe ndịda Juda. Isi Jezril ruo Bia-shiba dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise. Mgbe Ịlaịja ruru Bia-shiba, ọ hapụrụ onye na-ejere ya ozi n’ebe ahụ ma gawa n’ala ịkpa naanị ya. Baịbụl kwuru na ọ gara “njem otu ụbọchị.” Weregodị ya na ị na-ahụ mgbe ọ malitere njem ahụ n’ụtụtụ. O nwere ike ịbụ na o jighị ihe oriri ọ bụla gawa. Ụjọ ekweghị ya kwụsị, o jisiri ike na-aga n’ime ime ala ịkpa ahụ n’agbanyeghị oké anwụ na-achanụ. Mgbe chi jiwere, ike ịga ije adịkwaghị ya, ya anọdụzie ala n’okpuru otu osisi brum, nke bụ́ naanị ebe dịtụ mma o nwere ike ịnọ n’ala ịkpa ahụ.—1 Eze 19:4.

10, 11. (a) Olee ihe ekpere ahụ Ịlaịja kpere pụtara? (b) Jiri amaokwu Baịbụl ndị e dere na paragraf nke 11 kọwaa otú obi dị ndị ọzọ fere Chineke mgbe ike ụwa gwụrụ ha.

10 Ịlaịja kpere ekpere onye ike ụwa gwụrụla. Ọ rịọrọ Chineke ka ya nwụọ. O kwuru, sị: “Akaghị m nna nna m hà mma.” Ọ maara na nna nna ya hà erekasịchaala ma ghọọ ájá n’ebe e liri ha. Ọ makwa na ha enweghị ike inyere onye ọ bụla aka. (Ekli. 9:10) Ịlaịja weere na ya na ha bụzi otu. Ka a sịkwa ihe mere o ji sị: “O zuwo!” Nke a ọ̀ pụtara na o nweghịzi uru ndụ ọ dị baara ya?

11 Ò kwesịrị iju anyị anya na ike ụwa gwụrụ onye nke Chineke otú ahụ? O kwesịghị. E nwere ọtụtụ ndị ezi omume, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, bụ́ ndị Baịbụl kwuru na o nwere mgbe obi jọrọ ha njọ nke na ọ dị ha ka hà nwụọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ribeka, Jekọb, Mozis, na Job.—Jen. 25:22; 37:35; Ọnụ Ọgụ. 11:13-15; Job 14:13.

12. Ọ bụrụ na ike ụwa agwụ gị, olee ihe Ịlaịja mere nke i kwesịrị ime?

12 Taa, anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na mgbe ụfọdụ ike ụwa na-agwụ ọtụtụ ndị, ma ndị na-efe Chineke. (2 Tim. 3:1) Ọ bụrụ na e nwee  mgbe ike ụwa gwụrụ gị, mee ihe ahụ Ịlaịja mere, ya bụ, kọọrọ Chineke otú obi dị gị. A sị ka e kwuwe, Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi niile.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) Chineke ọ̀ kasiri Ịlaịja obi?

Jehova Nyeere Onye Amụma Ya Aka

13, 14. (a) Gịnị ka Jehova si n’aka otu mmụọ ozi meere Ịlaịja? (b) Olee ihe mere obi ga-eji na-atọ anyị ụtọ na Jehova ma onye nke ọ bụla n’ime anyị?

13 Olee otú i chere obi dị Jehova mgbe o si n’eluigwe lee anya hụ ka onye amụma ya ọ hụrụ n’anya tọgbọ n’okpuru osisi n’ala ịkpa na-arịọ ka ọnwụ bịa gburu ya? Anyị ekwesịghị ichewe ya echewe. Mgbe ezigbo ụra buuru Ịlaịja, Jehova zigaara ya otu mmụọ ozi. Mmụọ ozi ahụ ji nwayọọ metụ Ịlaịja aka, kpọtee ya ma sị ya: “Bilie rie ihe.” Ịlaịja biliri n’ihi na mmụọ ozi ahụ edeberela ya achịcha ka dị ọkụ ọ ga-eri na mmiri ọ ga-aṅụ. Ò kelekwaranụ mmụọ ozi ahụ? Naanị ihe Baịbụl gwara anyị bụ na onye amụma ahụ riri nri, ṅụọ mmiri ma dinarakwa rahụwa ụra. Ọ̀ bụ ike ọgwụgwụ mere na o kwughị okwu? Nke ọ bụla ọ bụ, mmụọ ozi ahụ kpọtere ya nke ugboro abụọ, o nwekwara ike ịbụ na chi abọọla mgbe ahụ. Ọ gwara Ịlaịja ọzọ, sị, “Bilie rie ihe,” gwakwa ya ihe a dị mkpa: “N’ihi na njem ị ga-eme dị ukwuu.”—1 Eze 19:5-7.

14 Ọ bụ Chineke mere ka mmụọ ozi ahụ mara ebe Ịlaịja na-aga. Ọ makwa na Ịlaịja agaghị agali ogologo ije ahụ n’ike onwe ya. Obi dị anyị ụtọ na Chineke anyị na-efe ma ihe ndị anyị chọrọ ime ná ndụ, marakwa otú ike anyị hà karịa otú anyị ma. (Gụọ Abụ Ọma 103:13, 14.) Ma olee uru nri ahụ Ịlaịja riri baara ya?

15, 16. (a) Olee uru ihe oriri ahụ Jehova nyere Ịlaịja baara ya? (b) Gịnị mere obi kwesịrị iji na-adị anyị ụtọ na Jehova na-enye ndị na-efe ya ihe ga-enye ha ike n’oge a?

15 Baịbụl kwuru, sị: “O wee bilie rie ihe, ṅụọkwa mmiri, o wee jiri ike ihe ahụ o riri na-aga ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, ruo n’ugwu nke ezi Chineke, bụ́ Horeb.” (1 Eze 19:8) Ịlaịja buru ọnụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, dị ka Mozis mere ihe dị ka narị afọ isii tupu mgbe ahụ. Ihe dị ka otu puku afọ Ịlaịja nwụchara, Jizọs bukwara ọnụ ụbọchị iri anọ. (Ọpụ. 34:28; Luk 4:1, 2) Nri ahụ Ịlaịja riri emeghị ka nsogbu ya niile gwụ, ma Chineke ji ya nye ya ike ọ ga-eji gaa ogologo ije ọ ga-aga. Weregodị ya na ị na-ahụ ka agadi nwoke ahụ nọ na-aga kwa ụbọchị n’ala ịkpa ahụ ruo ụbọchị iri anọ.

16 Jehova na-enyekwa ndị na-efe ya taa ihe ga-enye ha ike. Nke a apụtaghị na ọ na-esi n’eluigwe ebutere ha ihe oriri. Ma, ihe ọ na-enye ha karịrị ihe oriri nkịtị. Ọ na-enye ndị na-efe ya ụdị ihe oriri ga-eme ka ha na ya dịrị ná mma. (Mat. 4:4) Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Akwụkwọ Nsọ nakwa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, anyị  ga-amụta banyere Chineke, nke a ga-emekwa ka anyị nọgide na-efe Chineke. Ịmụ banyere Chineke agaghị eme ka nsogbu niile anyị nwere gwụ, ma o nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-agaraghị edi. Ọ ga-emekwa ka anyị nweta “ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:3.

17. Olee ebe Ịlaịja gara, oleekwa ihe ndị metụrụla n’ebe ahụ?

17 Ịlaịja gara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị kilomita atọ na iri abụọ. N’ikpeazụ, o ruru n’Ugwu Horeb. Ụmụ Izrel anaghị echefu ebe ahụ echefu n’ihi na ọ bụ n’ugwu ahụ ka Jehova Chineke si n’aka otu mmụọ ozi pụta ìhè n’ihu Mozis ogologo oge gara aga n’otu osisi ogwu na-enwu ọkụ. Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nọ nye ụmụ Izrel Iwu ọgbụgba ndụ ya na ha gbara. Ịlaịja banyere n’otu ọgba dị n’ebe ahụ nọrọ.

Otú Jehova Si Kasie Onye Amụma Ya Obi ma Gbaa Ya Ume

18, 19. (a) Olee ajụjụ mmụọ ozi Jehova jụrụ Ịlaịja, oleekwa ihe Ịlaịja zara? (b) Olee ihe atọ Ịlaịja kwuru mere ike ụwa ji gwụ ya?

18 Mgbe Ịlaịja nọ n’Ugwu Horeb, o yiri ka Jehova ò si n’ọnụ otu mmụọ ozi jụọ Ịlaịja ajụjụ a: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme n’ebe a?” Ọ ga-abụ na mmụọ ozi ahụ ji olu ọma jụọ ya ajụjụ ahụ, nke mere ka Ịlaịja kọọrọ ya otú obi dị ya. Ịlaịja sịrị ya: “Anọwo m na-ekworo Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha ekworo nke ukwuu; n’ihi na ụmụ Izrel ahapụwo ọgbụgba ndụ gị, ha etidawo ebe ịchụàjà gị, ha ejiriwokwa mma agha gbuo ndị amụma gị, nke mere na ọ fọdụrụ naanị m; ha wee malite ịchọ mkpụrụ obi m ka ha wepụ ya.” (1 Eze 19:9, 10) Ihe a Ịlaịja kwuru gosiri na, ma ó nweghị ihe ọzọ, ọ dị ụzọ ihe atọ mere ike ụwa ji gwụ ya.

19 Nke mbụ bụ na Ịlaịja chere na ọrụ ya niile bụ n’efu. N’agbanyeghị na Ịlaịja ‘na-ekworo ofufe Jehova ekworo nke ukwuu’ kemgbe ọtụtụ afọ, ya bụ, na o weere aha nsọ Chineke na ofufe ya ka ihe kacha mkpa ná ndụ ya, ọ dị ya ka ihe ọ̀ na-aka njọ. Ụmụ Izrel enwebeghị okwukwe na Chineke, ọtụtụ n’ime ha na-efezi arụsị. Nke abụọ bụ na Ịlaịja chere na ọ bụ naanị ya fọrọ. O kwuru, sị, “Ọ fọdụrụ naanị m.” Ọ dị ya ka ọ̀ bụ naanị ya bụ onye na-efe Jehova fọdụrụ n’Izrel. Nke atọ bụ na ụjọ ji Ịlaịja. E gbuola ọtụtụ ndị amụma ibe ya, o dokwara ya anya na ọ bụ ya bụ onye ọzọ a ga-egbu. O nwere ike isiri Ịlaịja ike ịkọrọ mmadụ ihe ndị a, ma o kweghị ka nganga ma ọ bụ ihere mee ka ọ ghara ikwu ha. Ndị niile ji obi ha na-efe Chineke nwere ike ịmụta ihe n’ihe a Ịlaịja mere. Ha kwesịrị ịna-agwa Chineke otú obi dị ha.—Ọma 62:8.

20, 21. (a) Kọwaa ihe Ịlaịja hụrụ mgbe ọ nọ n’ihu ọgba ahụ dị n’Ugwu Horeb. (b) Gịnị ka otú Jehova si gosi ike ya dị egwu kụziiri Ịlaịja?

20 Olee ihe Jehova mere ka ụjọ kwụsị ịtụ Ịlaịja nakwa ka ahụ́  ruo ya ala? Mmụọ ozi ahụ gwara Ịlaịja ka o guzoro n’ọnụ ọgba ahụ. Ịlaịja mere ihe a gwara ya n’agbanyeghị na ọ maghị ihe na-aga ime. Oké ifufe maliteziri ife. Ọ ga-abụ na ifufe ahụ mere mkpọtụ dị egwu n’ihi na ọ gbawasịrị ugwu na nkume ndị dị ebe ahụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ịlaịja ji otu aka kpuchie anya ya ma were aka nke ọzọ jide uwe ajị ajị o yi ka ifufe ahụ ghara iburu ya. Mgbe ifufe ahụ fechara, ala ọma jijiji malitere. Nke a mere ka Ịlaịja chọwa ihe ọ ga-eme ka ọ ghara ịda. Mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara, nnukwu ọkụ malitere ịgba nke mere ka Ịlaịja banye n’ime ọgba ahụ ka ọkụ ahụ ghara imerụ ya ahụ́.—1 Eze 19:11, 12.

Jehova ji ike ya na-enweghị atụ kasie Ịlaịja obi ma gbaa ya ume

21 Baịbụl kwuru na Jehova anọghị ma n’oké ifufe ahụ ma n’ala ọma jijiji ahụ ma n’ọkụ ahụ. Ịlaịja ma na Jehova abụghị chi nkịtị ka Bel, bụ́ chi ndị na-efe ya na-akpọ “chi na-achị ígwé ojii,” ma ọ bụ chi na-eweta mmiri ozuzo. Ọ bụ Jehova mere ka ifufe na mmiri na ihe ndị ọzọ na-akpa ike dị egwu. Ma, yanwa dị ike karịa ihe ọ bụla o kere eke. Eluigwe enwedịghị ike ịba ya. (1 Eze 8:27) Olee otú ihe niile a merenụ si nyere Ịlaịja aka? Cheta na ụjọ ji ya. Ma, ebe ọ bụ na Jehova, bụ́ onye nwere ike dị egwu, kwụ ya n’azụ, o kwesịghị ịtụwa Ehab na Jezibel ụjọ.—Gụọ Abụ Ọma 118:6.

22. (a) Olee otú “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ” si mee ka Ịlaịja mara na Jehova ka ji ya kpọrọ ihe? (b) Ònye ka o nwere ike ịbụ ya nwe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

22 Mgbe ọkụ ahụ nyụrụ, ebe niile adaakwa jụụ, Ịlaịja nụziri “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ.” Olu ahụ jụkwara Ịlaịja ajụjụ ahụ a jụrụ ya na mbụ. Nke a mere ka Ịlaịja kwuokwa otú obi dị ya ọzọ. * O nwere ike ịbụ na nke a mere ka ahụ́ rukwuo ya ala. Ma, o doro anya na ihe kadị gbaa Ịlaịja ume bụ ihe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’ gwaziri ya. Jehova mere ka o doo Ịlaịja anya na ya ka ji ya kpọrọ ihe. Olee otú o si mee nke a? Chineke gwara Ịlaịja ọtụtụ ihe ya ka ga-eme iji wepụ ofufe Bel n’Izrel. O doro anya na ọrụ Ịlaịja rụrụ abụghị n’efu n’ihi na ihe Chineke bu n’obi ime ga-emezurịrị. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ka chọrọ ka Ịlaịja soro mezuo ihe ahụ Jehova bu n’obi ime.  Ọ bụ ya mere o ji nyekwuo ya ọrụ, gwakwa ya otú ọ ga-esi rụọ ha.—1 Eze 19:12-17.

23. Olee ihe abụọ Jehova mere iji nyere Ịlaịja aka mgbe Ịlaịja chere na ọ bụ naanị ya fọdụrụ ná ndị na-efe Jehova?

23 Ịlaịja chere na ọ bụ naanị ya fọdụrụ ná ndị na-efe Chineke. Gịnị ka Jehova mere iji nyere ya aka? O mere ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ na ọ gwara Ịlaịja ka ọ gaa tee Ịlaịsha mmanụ ka ọ ghọọ onye amụma ga-anọchi ya. Ịlaịsha ka bụ nwa okorobịa. Ya na Ịlaịja ga-arụkọ ọrụ, ọ ga-enyekwara Ịlaịja aka ruo ọtụtụ afọ. Nke a gbara Ịlaịja ezigbo ume. Nke abụọ bụ na Jehova ziri ya ozi a ga-eme ya obi ụtọ: “Emewokwa m ka puku mmadụ asaa fọdụ n’Izrel, bụ́ ikpere niile na-egbubereghị Bel n’ala, na ọnụ ọ bụla nke na-esusubeghị ya.” (1 Eze 19:18) N’eziokwu, ọ bụghị naanị Ịlaịja fọrọ. O doro anya na obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe ọ nụrụ na e nwere puku mmadụ asaa jụrụ ife Bel ma jiri obi ha niile na-efe Jehova. Ịlaịja ga-abara ha ezigbo uru. Ọ ga-enyere ha aka ịnọsi ike na-efe Jehova n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-enupụrụ Jehova isi n’oge ahụ. N’eziokwu, ihe ahụ Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi ya, bụ́ “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ,” gwa Ịlaịja ruru Ịlaịja n’obi.

E nwere ike ikwu na Baịbụl bụ ‘olu dị ala, dịkwa nwayọọ’ nke Jehova ji eduzi anyị taa

24, 25. (a) Olee otú anyị nwere ike isi nụ “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ” Jehova ji agwa anyị okwu taa? (b) Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Ịlaịja nabatara aka Jehova nyeere ya?

24 Otú ihe ndị Jehova kere eke si akpa ike nwere ike ime ka akpata oyi wụọ anyị n’ahụ́ otú ọ wụrụ Ịlaịja. Ma, o kwesịrị ịdị otú ahụ n’ihi na ihe ndị e kere eke na-egosi na Onye kere ihe niile nwere ike dị ukwuu. (Rom 1:20) Ọ ka na-amasị Jehova iji ike ya na-enweghị atụ na-enyere ndị ji obi ha niile na-efe ya aka. (2 Ihe 16:9) Ma, ihe Chineke kacha eji agwa anyị okwu bụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl. (Gụọ Aịzaya 30:21.) E nwere ike ikwu na Baịbụl bụ ‘olu dị ala, dịkwa nwayọọ’ nke Jehova ji eduzi anyị taa. Jehova na-eji ya agbazi anyị, na-agba anyị ume ma na-egosi anyị taa na ọ hụrụ anyị n’anya.

25 Ịlaịja ọ̀ nabatara aka ahụ Jehova nyeere ya n’Ugwu Horeb? À na-ajụkwa ajụ? N’oge na-adịghị anya, ọ maliteghachiri ọrụ ya. Ọ bịara nwee obi ike otú ọ na-enwebu, o kweghịkwa ka ndị na-efe arụsị ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile nabata okwu Chineke, nke bụ́ “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ,” anyị ga-eṅomi okwukwe Ịlaịja.—Rom 15:4.

^ para. 22 O nwere ike ịbụ mmụọ ozi ahụ nke e kwuru ná 1 Ndị Eze 19:9 na “okwu Jehova” si n’ọnụ ya ruo Ịlaịja ntị, nwe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ.’ N’amaokwu nke 15, a kpọrọ mmụọ ahụ “Jehova.” Nke a na-echetara anyị mmụọ ozi Jehova ji duo ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Chineke kwuru banyere mmụọ ozi ahụ, sị: “Aha m dị n’ime ya.” (Ọpụ. 23:21) Anyị agaghị asị na ọ ga-abụrịrị Jizọs nwe olu ahụ. Ma, ọ dị mma icheta na ọ bụ Jizọs bụ “Okwu ahụ” tupu ya abịa n’ụwa. Nke a pụtara na ọ bụ ya bụ Ọnụ Na-ekwuchitere Chineke, onye Jehova si n’aka ya zie ndị na-efe ya ozi.—Jọn 1:1.