Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ITOOLU

Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche

Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche

1-3. (a) Gịnị mere ezinụlọ Abigel ji baa ná nsogbu? (b) Gịnị ka anyị ga-amụta banyere ezigbo nwaanyị a?

ABIGEL hụrụ na ụjọ ji nwa okorobịa na-agwa ya okwu. Ahụ́ na-ama nwa okorobịa ahụ ririri, o nwekwara ihe kpatara ya. Agwọ nọ n’akịrịka. Ka ha nọ na-ekwu okwu, ihe dị ka narị ndị dike anọ nọ na-abịa n’ụzọ, ha kpebikwara igbu nwoke ọ bụla nọ n’ụlọ Nebal, bụ́ di Abigel. N’ihi gịnị?

2 Ọ bụ Nebal kpatara ihe a niile. O nwere onye ọ kparịrị otú ọ na-eme. Ma, onye ọ kparịrị na nke ugbu a abụghị onye o kwesịrị ịkparị. Onye a bụ ọchịagha otu ìgwè ndị agha a zụrụ nke ọma, onye ndị òtù ya hụrụ n’anya ma tụkwasị obi. Ugbu a, otu n’ime ụmụ okorobịa na-arụrụ Nebal ọrụ bịakwutere Abigel. O nwere ike ịbụ na nwa okorobịa ahụ so ná ndị na-azụrụ Nebal atụrụ. Obi siri ya ike na Abigel ga-achọta otú ọ ga-esi zọọ ha ndụ. Ma, olee ihe otu nwaanyị ga-emeli ìgwè ndị agha?

Olee ihe otu nwaanyị ga-emeli ìgwè ndị agha?

3 Ka anyị burugodị ụzọ chọpụtakwuo ihe ụfọdụ banyere ezigbo nwaanyị a. Ònye bụ Abigel? Olee otú ndị ezinụlọ ya si banye ná nsogbu a? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’okwukwe ya?

O “Nwere Ezi Uche, Maakwa Mma Ile Anya”

4. Olee ụdị mmadụ Nebal bụ?

4 Àgwà Abigel na nke Nebal eyitụdịghị. Nebal lụtara ezigbo nwaanyị, ma Abigel chọpụtara na onye lụrụ ya bụ ajọ mmadụ. Ma, nwoke ahụ nwere ego. N’ihi ya, o chere na ya bụ onye ukwu. Ma, olee otú ndị ọzọ si were ya? O siri ike ịhụ onye ọzọ a kọrọ akụkọ ọjọọ banyere ya na Baịbụl otú a kọrọ banyere Nebal. Aha ya pụtadịrị “Nzuzu” ma ọ bụ “Iberiibe.” Ọ̀ bụ nne na nna ya gụrụ ya aha a mgbe ha mụrụ ya, ka ọ̀ bụ aha e mechara kpọwa ya n’ihi ụdị onye ọ bụ? Nke ọ bụla ọ bụ, ọ kpara àgwà otú aha ya dị. Baịbụl sịrị na Nebal “dị aka  ike, na-akpakwa agwa ọjọọ.” Ọ bụ onye obi ọjọọ na onye aṅụrụma, ọtụtụ ndị kpọkwara ya asị ma na-atụ ya ụjọ.—1 Sam. 25:2, 3, 17, 21, 25.

5, 6. (a) Olee àgwà ndị kacha mma i chere Abigel nwere? (b) Gịnị mere Abigel ji lụọ nwoke iberiibe ahụ bụ́ Nebal?

5 Abigel adịtụdịghị ka Nebal. Aha ya pụtara “Nna M Emeela Onwe Ya Obi Ụtọ.” Obi na-atọ ọtụtụ ndị nna ụtọ ma ha mụta nwa nwaanyị mara mma. Ma nna maara ihe na-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nwa ya nwaanyị nwere ezigbo àgwà. Ọtụtụ ndị mara mma amaghị na ha kwesịrị inwe ezi uche, amamihe, obi ike, na okwukwe. Abigel adịghị otú ahụ. Baịbụl kwuru na o nwere ezi uche, maakwa mma ile anya.—Gụọ 1 Samuel 25:3.

6 Ụfọdụ ndị taa nwere ike ịna-eche ihe mere nwa agbọghọ a ma ihe ga-eji lụọ nwoke iberiibe ahụ. Cheta na n’oge a na-ede Baịbụl, ọ na-abụkarị ndị nne na nna na-achọtara ụmụ ha ndị ha ga-alụ. Ọ bụrụgodị na ọ bụghị ha chọtaara nwa ha onye ọ ga-alụ, ha ga-ekweta tupu nwa ha alụọ onye ahụ. Ọ̀ ga-abụ na nne na nna Abigel kwetara ka Nebal lụọ Abigel, ka ọ̀ ga-abụ ha chọtaara ya Abigel maka na Nebal bụ ọgaranya na onye a ma ama? Ọ̀ ga-abụ maka na ha dara ogbenye? Nke ọ bụla ọ bụ, ego Nebal nwere emeghị ka ọ bụrụ ezigbo di.

7. (a) Gịnị na gịnị ka ndị nne na nna na-ekwesịghị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ụmụ ha ghara iji alụmdi na nwunye mere ihe egwuri egwu? (b) Gịnị ka Abigel kpebisiri ike ime?

7 Ndị nne na nna maara ihe na-akụziri ụmụ ha ka ha ghara iji alụmdi na nwunye mere ihe egwuri egwu. Ha anaghị amanye ụmụ ha ka ha lụọ mmadụ maka na onye ahụ nwere ego, ha anaghịkwa agwa ha ka ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị kpawa mgbe ha na-etorubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ mgbe ha na-agaghị arụli ọrụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịrụ. (1 Kọr. 7:36) Ma, ihe ndị a abụzighị ihe Abigel ga-echewe ugbu a ebe ọ bụ na ọ lụọla di alụọ. N’agbanyeghị ihe mere o ji lụọ Nebal, o kpebiri na mee elu mee ala, na ya ga-agbalị ike ya niile ka ha biri n’udo.

“Ọ Kpọrọ Ha Iyi”

8. Ònye ka Nebal kparịrị, gịnịkwa mere ị ga-eji kwuo na ihe o mere adịghị mma?

8 Nebal emeela ka ihe siere Abigel ike otú ọ na-esitụbereghị ya. Onye ahụ Nebal kparịrị bụ Devid. Devid bụ ezigbo ohu Jehova, onye Samuel onye amụma tere mmanụ. Mmanụ a o tere ya gosiri na Chineke ahọrọla ya ka ọ bụrụ eze ga-anọchi Sọl. (1 Sam. 16:1, 2, 11-13) Ebe ọ bụ na Eze Sọl na-emere Devid anyaụfụ ma na-achụgharị ya ka o gbuo ya, Devid na narị ndị dike isii ya, bụ́ ndị na-enyere ya aka, gara biri n’ala ịkpa.

9, 10. (a) Olee ihe mere na ọ dịrịghị Devid na ndị ikom ya mfe ịkpa afọ ha na ezinụlọ ha? (b) Gịnị mere Nebal ji kwesị ikele Devid na ndị ikom ya? (Gụọkwa ihe nke abụọ e dere n’ala ala peeji a.)

 9 Nebal bi n’obodo Meyọn. Ọ ga-abụ na o nwere ala na Kamel, * ọ na-arụkwa ọrụ n’ebe ahụ. Obodo Kamel dị nso na Meyọn. Obodo ndị ahụ nwere ugwu ndị ahịhịa juru na ha. Ha dịkwa mma ịnọ na ha azụ atụrụ. Nebal nwekwara atụrụ dị puku atọ n’ebe ndị ahụ. Ma, ebe ndị ọzọ n’obodo ndị ahụ bụ ọhịa ọhịa. Nnukwu ala ịkpa Peran dị n’ebe ndịda. Oké Osimiri Nnu dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Tupu mmadụ eruo n’Oké Osimiri Nnu ahụ, ọ ga-ahụ ala ndị na-adịghị eme nri. Ndagwurugwu na ọgba juru na ha. Ọ bụ n’ebe ndị a ka Devid na ndị ikom ya gara biri. Ha gbasiri mbọ ike ka ha chọta ihe ha na ndị ezinụlọ ha ga na-eri. Ihe adịrịghị ha mfe mgbe ha nọ n’ebe ndị ahụ. Ọtụtụ mgbe, ha na ụmụ okorobịa ndị na-azụrụ Nebal atụrụ na-ahụ.

10 Olee otú ndị agha Devid si mesoo ndị na-azụrụ Nebal atụrụ? Ọ gaara adịrị ha mfe ịkpụrụ atụrụ ha gbuo mgbe ọ bụla ha chọrọ, ma ha emeghị otú ahụ. Kama nke ahụ, ha chebere ìgwè atụrụ Nebal na ndị na-ejere ya ozi. (Gụọ 1 Samuel 25:15, 16.) Ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha na-enwe ọtụtụ nsogbu n’ọhịa. Anụ ndị na-eri ibe ha jukwara eju n’ọhịa. Ebe ahụ dịkwa nso n’ebe ala Izrel jedebere n’ebe ndịda. N’ihi ya, ndị ohi na-esikarị ná mba ọzọ abịa ezu ohi ma na-emesi ndị ọzụzụ atụrụ ike n’ebe ahụ. *

11, 12. (a) Olee otú Devid si kwanyere Nebal ùgwù? (b) Olee ihe dị njọ n’ihe Nebal mere mgbe ọ nụrụ ozi Devid ziri ya?

11 O doro anya na ọ gaghị adịrị Devid mfe inyeju ndị niile ahụ ya na ha bi n’ala ịkpa afọ. Otu ụbọchị, Devid zigara mmadụ iri ka ha gaa na nke Nebal rịọ ya ka o nye ha ihe oriri. Oge Devid zigara ha bụ oge kwesịrị ekwesị. Ọ bụ oge a na-akpacha ajị atụrụ. Ndị mmadụ na-eri oriri n’oge ahụ, ha na-enyekarịkwa ndị ọzọ onyinye. Devid chere echiche nke ọma gwa ndị ahụ o zigara ihe ha ga-agwa Nebal ka obi tọọ ya ụtọ. Ihe ndị ha ga-agwa ya gosiri na Devid na-akwanyere ya ùgwù. Devid gwadịrị ha ka ha gwa ya na ya bụ ‘nwa ya Devid.’ O nwere ike ịbụ na ihe a o kwuru gosiri na ọ ma na Nebal tọrọ ya atọ. Ma, gịnị ka Nebal mere?—1 Sam. 25:5-8.

12 O were ezigbo iwe. Mgbe nwa okorobịa ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite na-akọrọ Abigel ihe merenụ, o kwuru na Nebal “kpọrọ ha iyi.” Nebal, onye aka ntagide, kwuru na ndị ahụ bịara ka ya nye ha achịcha, mmiri, na anụ ya chọrọ inye ndị na-arụrụ ya ọrụ. Ọ kparịrị  Devid, sị na o nweghị uru ọ bara, sịkwa na ọ bụ ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu. O nwere ike ịbụ na otú Nebal si were Devid bụ otú Sọl sikwa were Devid. Sọl kpọrọ Devid asị. Ma Nebal ma Sọl ewereghị Devid otú Jehova si were ya. Chineke hụrụ Devid n’anya ma were ya ka eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu, ọ bụghị ka ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu.—1 Sam. 25:10, 11, 14.

13. (a) Olee ihe Devid mere mgbe ọ nụrụ otú Nebal si kparịa ya? (b) Olee ihe Jems 1:20 na-akụziri anyị banyere ihe ahụ Devid chọrọ ime?

13 Mgbe ndị ahụ Devid ziri ozi gwara ya ihe Nebal kwuru, iwe were Devid. O nyere ndị ikom ya iwu, sị: “Onye ọ bụla kee mma agha ya n’úkwù!” Devid jikeere ma duru narị ndị ikom anọ ya gawa ọgụ. Ọ ṅụrụ iyi na ya ga-egbu onye ọ bụla bụ́ nwoke n’ụlọ Nebal. (1 Sam. 25:12, 13, 21, 22) Iwe Devid were adịghị njọ, ma otú a ọ chọrọ isi gosi na iwe na-ewe ya adịghị mma. Baịbụl kwuru, sị: “Iwe mmadụ adịghị arụpụta ezi omume Chineke.” (Jems 1:20) Ma, olee otú Abigel ga-esi zọọ ezinụlọ ya ndụ?

“Ka Ezi Uche Gị Bụrụ Ihe A Gọziri Agọzi”

14. (a) Olee otú Abigel si malite ịgba mbọ ka o mezie ihe ọjọọ ahụ Nebal mere? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú ahụ Nebal na Abigel si dị iche? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

14 Anyị nwere ike ịsị na Abigel amalitela ịgba mbọ ka o mezie ihe ọjọọ ahụ di ya mere. Abigel emeghị ka di ya. Kama nke ahụ, o gere nwa okorobịa ahụ bịara ịgwa ya okwu ntị. Nwa okorobịa ahụ gwara Abigel ihe mere ya na-achọghị ịgwa Nebal okwu. Ọ sịrị: “Ọ bụ onye na-abaghị n’ihe nke na o siri ike ịgwa ya okwu.” * (1 Sam. 25:17) Ọ dị mwute na otú onwe Nebal si ebu ya isi mere na o nweghị onye ọ na-ege ntị. Ọtụtụ ndị taa na-emekwa okomoko ka Nebal. Ma, nwa okorobịa ahụ maara na Abigel adịghị otú ahụ. Ọ bụ ya mere o ji gaa kọsara ya nsogbu ahụ.

Abigel emeghị ka di ya. Kama nke ahụ, o gere nwa okorobịa ahụ bịara ịgwa ya okwu ntị

15, 16. (a) Olee otú Abigel si gosi na ya yiri ezigbo nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ilu? (b) Gịnị mere o ji bụrụ na ihe ahụ Abigel mere apụtaghị na ọ na-enupụrụ di ya isi?

15 Abigel chere echiche ọsọ ọsọ ma mee ihe ozugbo. Baịbụl sịrị: “N’egbughị oge, Abigel mere ngwa ngwa.” E kwuru ugboro anọ n’akụkọ a na nwaanyị a “mere ngwa ngwa.” Ọ kwadebere ọtụtụ ihe ọ ga-enye Devid na ndị ikom ya. Mmanya, atụrụ, ọka a ṅara n’ọkụ, achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị, na achịcha mkpụrụ fig so n’ihe ndị  ọ kwadebere. O doro anya na Abigel ma ihe o nwere n’ụlọ, marakwa ọrụ ya nke ọma. O yiri ezigbo nwaanyị ahụ e mechara kwuo okwu ya n’akwụkwọ Ilu. (Ilu 31:10-31) O zipụrụ ụfọdụ ndị na-ejere ya ozi ka ha buru ihe ndị ahụ gatụwa, naanị ya abịawazie n’azụ. Baịbụl sịrị: “Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ bụla.”—1 Sam. 25:18, 19.

16 Nke a ọ̀ pụtara na Abigel na-enupụrụ di ya isi? Mbanụ. Cheta na Nebal mesoro onye Jehova tere mmanụ omume ọjọọ. Ihe a o mere nwekwara ike ịkpatara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha nọ n’ezinụlọ Nebal ọnwụ. Ọ bụrụ na Abigel agba nkịtị, ọ̀ bụ na a gaghị asị na ọ bụ ya mere di ya ji mee ihe ahụ o mere? Ihe Abigel mere gosiri na irubere Chineke isi dị ya mkpa karịa irubere di ya isi.

17, 18. Olee ihe Abigel mere mgbe ọ hụrụ Devid, olee ihe ọ gwara Devid, oleekwa ihe mere ihe o kwuru ji baa uru?

17 Obere oge, Abigel na Devid na ndị ikom ya hụrụ. O mekwara ngwa ngwa ọzọ, si n’ịnyịnya ibu ya gbatuo ma gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala ma kpọọrọ Devid isiala. (1 Sam. 25:20, 23) Ọ maliteziri ịkọrọ Devid ihe dị ya n’obi. Ọ rịọsikwara Devid arịrịọ ike ka o meere di ya na ezinụlọ ya ebere. Olee ihe mere okwu ya ji ruo Devid n’obi?

“Biko, ka ohu gị nwaanyị kwuo okwu ná ntị gị”

18 O kwuru na ọ bụ ya kpatara nsogbu ahụ ma rịọ Devid ka ọ gbaghara ya. O kwetara na di ya bụ onye nzuzu otú ahụ ọ zara n’aha. O nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ na Devid akarịala ịga tawa nwoke dị otú ahụ ahụhụ. O kwuru na ya ma na Devid na-anọchi anya Jehova, nakwa na ọ bụ “agha Jehova” ka Devid na-alụ. O kwukwara ihe gosiri na ọ ma na Jehova kwere Devid nkwa ime ya eze, n’ihi na ọ sịrị: “Jehova . . . ga-ahọpụta gị ịbụ onye ndú Izrel.” Ọ rịọsikwara Devid arịrịọ ike ka ọ ghara ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka ikpe ọbara ma ya ma ọ bụ ihe ga-emecha ghọọrọ ya “ihe ịma jijiji.” O nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ ihe ga-eme ka obi Devid mawa ya ikpe. (Gụọ 1 Samuel 25:24-31.) N’eziokwu, okwu ọma ya ruru Devid n’obi.

19. Gịnị ka Devid kwuru mgbe Abigel gwachara ya okwu, gịnịkwa mere Devid ji jaa ya mma?

19 Oleekwanụ ihe Devid mere? Ọ naara Abigel ihe ndị ahụ o butere ma kwuo, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, bụ́ onye zitere gị taa ka ị bịakwute m, bụrụ onye a gọziri agọzi! Ka ezi uche gị bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka gị onwe gị, bụ́ onye gbochiri m taa ịba n’ikpe ọmụma ọbara . . . bụrụkwa onye a gọziri agọzi.” Devid toro ya maka otú o si kata obi mee ngwa ngwa bịakwute ya. Devid kwukwara na Abigel emeela ka ikpe ọbara ghara ịma ya. Ọ sịrị Abigel: “Laa n’ụlọ gị n’udo.” Devid jikwa olu ọma sị ya: “Egewo m ntị n’olu gị.”—1 Sam. 25:32-35.

“Lee Ohu Gị Nwaanyị”

20, 21. (a) Gịnị mere o ji bụrụ na e kwesịrị ịja Abigel mma na ọ laghachikwuuru di ya? (b) Olee otú Abigel si gosi na ya nwere ezi uche ma na-ejide onwe ya?

20 Mgbe Abigel lawara, ọ nọ na-eche ihe ahụ merenụ. Ọ chọpụtara  na Devid adịghị ka di ya bụ́ onye obi ọjọọ, kama na Devid dị obiọma ma na-atụ egwu Chineke. Ma, o wepụrụ ihe ahụ n’obi ya. Baịbụl kwuru, sị: “E mesịa, Abigel bịakwutere Nebal.” N’eziokwu, ọ laghachikwuuru di ya ma kpebisie ike na ya ga na-arụ ọrụ ya n’ụlọ di ya otú ya kwesịrị. Ma, ọ ga-agwanụ di ya banyere ihe ndị ahụ o nyere Devid na ndị ikom ya. Di ya kwesịrị ịma. O kwesịkwara ịgwa di ya otú ya si mee ka a ghara igbuchapụ ezinụlọ ha n’ihi na ọ ma na ezigbo ihere ga-eme di ya ma o si n’ọnụ onye ọzọ nụ ya. Ma, ọ chọghị ịgwa di ya ugbu a. Di ya nọ na-eri oriri ka eze, ọ ṅụrọkwara mmanya anya.—1 Sam. 25:36.

Abigel katara obi gwa Nebal ihe o mere nke zọrọ Nebal ndụ

21 Abigel gosikwara ọzọ na ya nwere ezi uche ma na-ejide onwe ya. Ọ bụ ya mere o ji chere ruo ụtụtụ echi ya bụ́ mgbe mmanya pụchara di ya n’anya, tupu ya agwawa ya ihe ọ bụla. Ugbu a mmanya pụchara ya n’anya, ọ ga-aghọta ihe Abigel na-ekwu. Ma, Nebal nwedịrị ike iwe iwe karị. N’agbanyeghị nke ahụ, Abigel gakwuuru ya ma kọọrọ ya ihe niile merenụ. O doro anya na ọ tụrụ anya na di ya ga-ewe ezigbo iwe. O nwekwara ike ịbụ na ọ tụrụ anya na ọ ga-akụ ya ihe. Kama nke ahụ, di ya nọọrọ duu. O megharịghị ahụ́.—1 Sam. 25:37.

22. Gịnị mere Nebal, gịnịkwa ka ihe a mere ya na-akụziri anyị banyere arụrụala ndị mmadụ na-arụsa di ha ma ọ bụ nwunye ha?

22 Gịnị mere Nebal ji nọrọ duu? Baịbụl kwuru na ‘obi kụchiri ya, ya onwe ya wee dị ka nkume.’ Ọ ga-abụ na ọrịa strok jidere ya. Ma mgbe ụbọchị iri gafere, ọ nwụrụ. Ọ bụkwanụghị ọrịa nkịtị gburu ya. Baịbụl kwuru na “Jehova tiri Nebal ihe, o wee nwụọ.” (1 Sam. 25:38) Mgbe Chineke gburu nwoke ọjọọ a, ahụhụ Abigel na-ata n’aka ya kwụsịrị. Ọ bụ eziokwu na Jehova anaghị etigbu ndị na-echi di ha ma ọ bụ nwunye ha ọnụ n’ala taa, akụkọ a na-akụziri anyị na Jehova na-ahụ arụrụala niile ndị mmadụ na-arụsa di ha ma ọ bụ nwunye ha. Mgbe oge ya ruru, ọ ga-eme ka arụrụala niile ahụ kwụsị.—Gụọ Luk 8:17.

23. Olee ihe ọma ọzọ meere Abigel, oleekwa otú o si gosi na isi abịaghị buwe ya maka na Devid chọrọ ịlụ ya?

23 Ihe ọma meere Abigel abụghị naanị na ọnwụ emeela ka ọ pụọ n’aka nwoke ọjọọ ahụ. Ma ọ ka nwere ihe ọma ọzọ ga-emere ya. Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, o dunyere ndị ozi ya ka ha gaa gwa Abigel na ya chọrọ ịlụ ya. Abigel gwara ndị ozi ahụ, sị: ‘Lee ohu gị nwaanyị, ka m bụrụ nwaanyị na-eje ozi nke ga na-asa ụkwụ nke ndị ohu onyenwe m.’ O doro anya na onwe ya abịaghị buwe ya isi maka na Devid chọrọ ịlụ ya. Kama nke ahụ, o sịdịrị na ya chọrọ ịbụ nwaanyị na-ejere ndị ohu Devid ozi. Baịbụl kwuru ọzọ na o mere  ngwa ngwa. Ma na nke ugbu a, ihe ọ na-emere ngwa ngwa bụ ka ọ kwadebe gakwuru Devid.—1 Sam. 25:39-42.

24. Olee nsogbu ndị bịaara Abigel mgbe Devid lụrụ ya, ma olee otú Devid na Chineke si were Abigel?

24 Ọ bụ eziokwu na Abigel ghọrọ nwunye Devid, ọ pụtaghị na ihe niile ga na-agara ya siriri werere otú ọ na-agara di na nwunye ndị a na-akọ n’akụkọ ifo. Devid alụọla nwaanyị aha ya bụ Ahinoam tupu ya alụọ Abigel. Ọ bụ eziokwu na Chineke hapụrụ ndị mmadụ ka ha na-alụ ihe karịrị otu nwaanyị n’oge ahụ, o doro anya na ime otú ahụ kpataara ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke ọtụtụ nsogbu. Devid aghọbekwanụghị eze mgbe ahụ. Ihe ka ga na-esiri ya ike ruo mgbe ọ ga-aghọ eze. Ma, Abigel nyeere Devid aka n’oge ndụ ya niile. O mechakwara mụtara Devid nwa nwoke. N’oge niile ahụ, ọ chọpụtara na di ya ejighị ya egwu egwu. Devid chebekwara ya. O nwedịrị mgbe Devid napụtara ya n’aka ndị ntọrọ. (1 Sam. 30:1-19) Ihe a Devid mere gosiri na o ṅomiri Jehova Chineke. Jehova hụrụ ụmụ nwaanyị ndị dị ka Abigel n’anya n’ihi na ha nwere ezi uche, nwee obi ike, ma na-atụ egwu ya. Jehova jikwa ha kpọrọ ihe.

^ para. 9 Kamel a abụghị Ugwu Kamel a ma ama nke dị n’ebe ugwu ala Izrel, bụ́ ebe Ịlaịja onye amụma mechara nọrọ gosi ndị amụma Bel na ndị ọzọ na Jehova bụ ezi Chineke. (Gụọ Isi nke 10.) Obodo Kamel anyị na-ekwu okwu ya n’ebe a dị n’akụkụ ala ịkpa e nwere n’ebe ndịda ala Izrel.

^ para. 10 Ọ ga-abụ na Devid weere ya na ichebe ndị obodo ahụ na atụrụ ha bụ ịrụrụ Jehova Chineke ọrụ. N’oge ahụ, Jehova chọrọ ka ụmụ ụmụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb biri n’ala ahụ. N’ihi ya, ichebe ha ka ndị ohi si mba ọzọ ghara imesi ha ike bụ ozi dị nsọ.

^ para. 14 Otú e si dee ihe ahụ nwa okorobịa ahụ kwuru n’asụsụ Hibru bụ “nwa bilial (onye na-abaghị n’ihe).” Mgbe Baịbụl ndị ọzọ na-asụgharị ahịrịokwu a, ha kwuru na Nebal bụ nwoke “na-anaghị ege onye ọ bụla ntị,” sịzie na “ọ baghị uru ịgwawa ya okwu.”