Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ISII

Guzosie Ike n’Ezi Ofufe

Guzosie Ike n’Ezi Ofufe

Gịnị ka Bible na-akụzi banyere iji ihe oyiyi efe ofufe nakwa ife ndị nna ochie?

Olee otú Ndị Kraịst si ele ememe okpukpe anya?

Olee otú ị pụrụ isi kọwaara ndị ọzọ nkwenkwe gị n’akpasughị ha iwe?

KA E were ya na ị chọpụtara na e metọwo ógbè unu. Mmadụ anọwo na-ezoro ezoro ekpofu ihe na-egbu egbu n’ógbè ahụ, ugbu a kwa, nke ahụ etinyewo ndụ ọtụtụ ndị n’ihe ize ndụ. Gịnị ka ị ga-eme? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-akwaga ebe ọzọ ma ọ bụrụ na ị ga-enwe ike ime otú ahụ. Ma, mgbe i mesịrị nke ahụ, ị ka nwere ike ịnọ na-eche sị: ‘Èkuruwo m ihe ga-akpatara m ọrịa?’

2 E nwere ọnọdụ yiri ya n’ihe metụtara okpukpe ụgha. Bible na-akụzi na e jiwo ozizi nakwa ememe ndị na-adịghị ọcha metọọ ofufe dị otú ahụ. (2 Ndị Kọrint 6:17) Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka i si na “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, pụta. (Mkpughe 18:2, 4) Ì mewo nke ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, e kwesịrị ịja gị mma. Ma, ikewapụ onwe gị n’okpukpe ụgha ma ọ bụ idegara ha akwụkwọ na ị bụghịzi onye òtù ha abụghị ebe okwu biri. Mgbe i mesịrị nke ahụ, ị ghaghị ịjụ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ dị ihe ọ bụla metụtara okpukpe ụgha m na-ahapụbeghị?’ Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

IHE OYIYI NA IFE NDỊ NNA OCHIE OFUFE

Ofufe dị iche iche a na-efe gburugburu ụwa

3 Ụfọdụ enwewo ihe oyiyi ma ọ bụ ihu arụsị n’ụlọ ha ruo ọtụtụ afọ. Ọ̀ dị nke i nwere? Ya bụrụ otú ahụ, ị pụrụ iche na o kwesịghị ekwesị ma ọ bụ na ọ dị njọ ikpegara Chineke ekpere n’ejighị ihe ndị dị otú ahụ a na-ahụ anya. Ị pụrụ ọbụna inwe mmasị dị ukwuu n’ụfọdụ n’ime ihe ndị a. Ma, ọ bụ Chineke ga-ekwu otú e kwesịrị isi fee ya, Bible na-akụzikwa na ọ chọghị ka anyị jiri ihe oyiyi na-eme ihe. (Ọpụpụ 20:4, 5; Abụ Ọma 115:4-8; Aịsaịa 42:8; 1 Jọn 5:21) N’ihi ya, ị pụrụ iguzosi ike n’ezi ofufe site n’ibibi ihe ọ bụla i nwere, bụ́ nke e ji eme ihe n’ofufe ụgha. Gbalịa ile ha anya otú Jehova si ele ha—dị ka “ihe arụ.”—Deuterọnọmi 27:15.

4 N’ọtụtụ okpukpe ụgha kwa, a na-efekarị ndị nna ochie ofufe. Tupu ụfọdụ anata eziokwu Bible, ha kweere na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ n’ala mmụọ nakwa na ha pụrụ inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ merụọ ha ahụ́. Ikekwe, ị na-etinyebu mgbalị dị ukwuu iji mee ka obi jụrụ ndị nna nna gị nwụrụ anwụ. Ma dị ka ị mụtara n’Isi nke 6 nke akwụkwọ a, ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ n’ebe ọ bụla. N’ihi ya, ịgbalị iso ha kwurịta okwu abaghị uru. Ozi ọ bụla yiri ka ò sitere n’aka onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ n’ezie. N’ihi ya, Jehova machibidoro ụmụ Izrel ịgbalị iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu ma ọ bụ ikere òkè n’ụdị mgbaasị ọ bụla ọzọ.—Deuterọnọmi 18:10-12.

5 Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị na-ejibu ihe oyiyi efe ofufe ma ọ bụ na-efebu ndị nna ochie ofufe? Gụọ ma tụgharịa uche n’akụkụ Bible ndị na-egosi otú Chineke si ele ihe ndị a anya. Na-ekpegara Jehova ekpere kwa ụbọchị banyere mmasị i nwere iguzosi ike n’ezi ofufe, na-arịọkwa ya ka o nyere gị aka iche echiche otú o si eche.—Aịsaịa 55:9.

NDỊ KRAỊST OGE MBỤ AGBAGHỊ KRISMAS

6 Okpukpe ụgha pụrụ iji ememe okpukpe ndị na-ewu ewu metọọ ofufe mmadụ na-efe. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Krismas. A sịrị na Krismas bụ ememe ncheta ọmụmụ Jizọs Kraịst, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile, bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst, na-agba ya. Ma, ọ dịghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ mere ememe dị otú ahụ. Akwụkwọ bụ́ Sacred Origins of Profound Things (Mmalite Dị Nsọ nke Ihe Ndị Dị Omimi) na-ekwu, sị: “Ruo narị afọ abụọ mgbe a mụsịrị Kraịst, ọ dịghị onye maara kpọmkwem mgbe a mụrụ ya, ọ bụkwa mmadụ ole na ole chọdịrị ịma.”

7 Ọ bụrụgodị na ndị na-eso ụzọ Jizọs maara kpọmkwem ụbọchị a mụrụ ya, ha agaraghị eme ememe banyere ụbọchị ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na, dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, Ndị Kraịst oge mbụ “lere ime ememe ụbọchị ọmụmụ mmadụ anya dị ka omenala ndị ọgọ mmụọ.” Nanị ememe ụbọchị ọmụmụ ndị a kpọtụrụ aha na Bible bụ nke ndị ọchịchị abụọ na-efeghị Jehova. (Jenesis 40:20; Mak 6:21) E mekwaara arụsị dị iche iche ememe ụbọchị ọmụmụ. Dị ka ihe atụ, na May 24 ndị Rom na-eme ememe ụbọchị ọmụmụ nke chi nwanyị bụ́ Daịana. N’ụbọchị na-eso ya, ha na-eme ememe ụbọchị ọmụmụ chi anyanwụ ha, bụ́ Apolo. N’ihi ya, e jikọtara ememe ụbọchị ọmụmụ na ikpere arụsị, ọ bụghị Iso Ụzọ Kraịst.

8 E nwekwara ihe ọzọ mere Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-agaraghị eji mee ememe ụbọchị ọmụmụ Jizọs. O yikarịrị ka ndị na-eso ụzọ ya hà maara na ọ dị ihe jikọrọ ememe ụbọchị ọmụmụ na nkwenkwe ụgha. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị Gris na ndị Rom oge ochie kweere na ọ dị mmụọ na-abịa mgbe ọ bụla a mụrụ mmadụ ma na-echebe onye ahụ n’oge ndụ ya nile. “Mmụọ a sooro chi a mụrụ onye ahụ n’ụbọchị ọmụmụ ya nwee mmekọrịta n’ụzọ ụfọdụ dị omimi,” ka akwụkwọ bụ́ The Lore of Birthdays (Nkụzi Omenala Banyere Ụbọchị Ọmụmụ) na-ekwu. N’ezie, ememe ọ bụla ga-ejikọta Jizọs na nkwenkwe ụgha agaghị amasị Jehova. (Aịsaịa 65:11, 12) N’ihi ya, oleezi otú ọtụtụ ndị si malite ịgba Krismas?

OTÚ KRISMAS SI MALITE

9 Ọ bụ mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị kemgbe Jizọs bisịrị n’ụwa ka ndị mmadụ malitere ime ememe ncheta ọmụmụ ya na December 25. Ma ọ bụghị n’ụbọchị ahụ ka a mụrụ Jizọs, n’ihi na ihe àmà na-egosi na a mụrụ ya n’October.* Gịnịzi mere e ji họrọ December 25? O yiri ka ụfọdụ ndị mesịrị zọrọ na ha bụ Ndị Kraịst hà bịara “chọọ ka ụbọchị ahụ dabaa n’ụbọchị ememe ndị Rom na-ekpere arụsị ji echeta ‘ụbọchị ọmụmụ nke anyanwụ a na-emerighị emeri.’ ” (The New Encyclopædia Britannica) N’oge oyi, bụ́ mgbe o yiri ka anyanwụ adịghị nnọọ achasi ike, ndị ọgọ mmụọ na-eme ememe iji mee ka ihe a nke na-enye okpomọkụ, nke na-enyekwa ìhè si n’ebe dị anya ọ gara lọta. E chere na ọ bụ na December 25 ka anyanwụ ahụ lọtawara. Iji nwaa ịtọghata ndị ọgọ mmụọ, ndị ndú okpukpe nabatara ememe a ma gbalịa ime ka o yie “nke Ndị Kraịst.”#

10 Ọ dịwo anya a chọpụtara na Krismas sitere n’ememe ndị ọgọ mmụọ. Ebe ọ bụ na o sitere n’ememe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, a machibidoro Krismas iwu n’England nakwa n’ụfọdụ mba ndị ọzọ America chịrị na narị afọ nke 17. Ọbụna a na-eri onye ọ bụla ghara ọrụ n’ụbọchị Krismas nhá. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, omenala ochie ndị ahụ lọghachiri, a gbakwụnyekwara ụfọdụ ndị ọhụrụ. Krismas ghọghachiri nnukwu ememe, ọ ka dịkwa otú ahụ n’ọtụtụ ala. Ma ebe ọ bụ na ọ dị ihe jikọrọ Krismas na okpukpe ụgha, ndị chọrọ ime ihe na-amasị Chineke adịghị agba Krismas ma ọ bụ ememe ọ bụla ọzọ nke malitere n’ikpere arụsị.%

MMADỤ Ò KWESỊRỊ ICHEGBU ONWE YA BANYERE OTÚ EMEME SI MALITE?

Ị̀ ga-aracha swiit a tụtụtara na gọta?

Swiit dị na gọta

11 Ụfọdụ kweere na ememe ndị dị ka Krismas sitere n’ememe ndị ọgọ mmụọ ma ha ka na-eche na ọ dịghị njọ ịgba ha. A sị kwuwe, ihe ka n’ọtụtụ ndị adịghị eche banyere ofufe ụgha mgbe ha na-eme ememe okpukpe. Oge ndị a na-enyekwa ezinụlọ ohere ịbịakọta ọnụ. Ọ̀ bụ otú i si ele ya anya? Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụ ịhụnanya maka ndị ezinụlọ gị, ọ bụghị ịhụnanya maka okpukpe ụgha, na-eme ka iguzosi ike n’ezi ofufe yie ihe tara akpụ. Jide n’aka na Jehova, bụ́ onye malitere ezinụlọ, chọrọ ka gị na ndị ikwu gị dịrị ná mma. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ma, ị pụrụ isi n’ụzọ ndị dị Chineke mma mee ka nkekọ dị otú ahụ siwanye ike. Banyere ihe anyị kwesịrị iwere dị ka ihe kasị mkpa, Pọl onyeozi dere, sị: “Nọgidenụ na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma.”—Ndị Efesọs 5:10.

12 Eleghị anya, ị na-eche na ọ dịghị ihe jikọrọ otú ememe dị iche iche si malite na otú e si eme ha taa. Mmadụ ò kwesịrị ichegbu onwe ya banyere otú ememe si malite? Ee! Iji maa atụ: Ka e were ya na ị hụrụ swiit tọgbọ na gọta. Ị̀ ga-atụtụrụ ya rachaa? Mbanụ! Swiit ahụ eruola unyi. Dị ka swiit ahụ, ememe okpukpe pụrụ iyi ihe na-atọ ụtọ, ma a tụtụtara ha n’ebe ruru unyi. Iji guzosie ike n’ezi ofufe, ọ dị mkpa ka anyị na-ele ihe anya dị ka Aịzaịa onye amụma, bụ́ onye gwara ndị na-efe ezi ofufe, sị: “Unu emetụla ihe rụrụ arụ” aka.—Aịsaịa 52:11.

JIRI EZI UCHE NA-EMESO NDỊ ỌZỌ IHE

13 Ihe ịma aka pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na ị chọghị iso mee ememe. Dị ka ihe atụ, ndị ọrụ ibe gị pụrụ ịdị na-eche ihe mere na ị dịghị eme ememe ụfọdụ n’ebe ọrụ gị. Ọ bụrụkwanụ na e nye gị onyinye Krismas? Ọ̀ ga-adị njọ ịnara ya? Ọ bụrụkwanụ na di ma ọ bụ nwunye gị na-ekpe okpukpe ọzọ? Gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka ụmụ gị ghara iche na ọ dị ihe na-efunahụ ha n’ihi emeghị ememe okpukpe?

14 Ọ dị mkpa iji ezi uche na-eme ihe iji ghọta ihe e kwesịrị ime n’ọnọdụ nke ọ bụla. Ọ bụrụ na mmadụ ekelee gị otú e si ekele n’oge ememe, ị pụrụ nanị ịsị ya ndeewo. Ma, ka e were ya na onye ahụ bụ onye ị na-ahụ mgbe nile ma ọ bụ onye gị na ya na-arụkọ ọrụ mgbe nile. Ya bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịchọ ịgwakwu ya ihe ụfọdụ. N’ọnọdụ nile, jiri nkà mee ihe. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Lezie anya ka ị ghara ime ihe na-egosi enweghị nkwanye ùgwù. Kama nke ahụ, jiri nkà kọwaa ihe i kweere. Mee ka o doo anya na ihe ị na-ekwu abụghị na inye onyinye nakwa inwe mgbakọta dị njọ kama na ọ ga-akara gị mma ime ihe ndị a n’oge dị iche.

15 Oleekwanụ ma ọ bụrụ na mmadụ achọọ inye gị onyinye? Ọ bụ ọnọdụ e nwere ga-ekpebi ihe ị ga-eme. Onye ahụ pụrụ ikwu, sị: “Ama m na unu adịghị eme ememe a. Ma achọrọ m inye gị ihe a.” Ị pụrụ ikpebi na ịnara onyinye ahụ n’ọnọdụ ndị ahụ abụghị ikere òkè n’ememe ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ahụ amaghị banyere nkwenkwe gị, ị pụrụ ịgwa ya na ị dịghị eme ememe ahụ. Nke a pụrụ inye aka kọwaa ihe mere i ji na-anara onyinye ahụ ma ghara inye mmadụ onyinye n’oge ahụ. N’aka nke ọzọ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịghara ịnara onyinye ma ọ bụrụ na o doro anya na nzube e ji enye gị ya bụ iji gosi na ị dịghị akwụsi ike n’ihe ndị i kwere ma ọ bụkwanụ na ị ga-eme ihe ndị megidere nkwenkwe gị iji nweta onyinye.

OLEEKWANỤ BANYERE NDỊ EZINỤLỌ GỊ?

16 Oleekwanụ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ gị ekweghị n’ihe ndị i kweere? Na nke a kwa, jiri nkà mee ihe. Ọ baghị uru ịkpa isiokwu banyere omenala ma ọ bụ ememe ọ bụla ndị ikwu gị họọrọ ime. Kama nke ahụ, ghọta na ha nweere onwe ha ikwere ihe masịrị ha, dị nnọọ ka ị ga-achọ ka ha ghọta na i nweere onwe gị ikwere ihe ndị masịrị gị. (Matiu 7:12) Zere ime ihe ọ bụla ga-eme ka o yie ka ị na-ekere ókè n’ememe ahụ. Na-ejikwa ezi uche eme ihe mgbe a bịara n’ihe ndị na-abụghị ikere òkè kpọmkwem n’ememe ahụ. N’ezie, i kwesịrị ịdị na-eme omume n’ụzọ ga-eme ka i nwee ezi akọ na uche.—1 Timoti 1:18, 19.

17 Gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka ụmụ gị ghara iche na ọ dị ihe na-efunahụ ha n’ihi emeghị ememe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị? Ihe ị na-emere ha n’oge ndị ọzọ n’afọ ga-eme ka ha ghara iche otú ahụ. Ndị nne na nna ụfọdụ na-enwe oge ndị ha na-enye ụmụ ha onyinye. Otu n’ime onyinye ndị kasị mma ị pụrụ inye ụmụ gị bụ oge gị na nlebara anya ịhụnanya.

NA-EFE EZI OFUFE

Ezinụlọ na-efe Chineke

Ife ezi ofufe na-eweta ezi obi ụtọ

18 Iji mee ihe na-amasị Chineke, ị ghaghị ịjụ ofufe ụgha ma guzosie ike n’ezi ofufe. Gịnị ka nke ahụ na-agụnye? Bible na-ekwu, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ ndị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Nzukọ Ndị Kraịst bụ oge obi ụtọ, nke i kwesịrị iji fee Chineke n’ụzọ ọ na-anakwere. (Abụ Ọma 22:22; 122:1) Ná nzukọ ndị dị otú ahụ, Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ‘na-agbarịta ibe ha ume.’—Ndị Rom 1:12.

19 Ụzọ ọzọ ị pụrụ isi guzosie ike n’ezi ofufe bụ site n’ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị ị mụtaworo site n’iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. N’ezie, ọtụtụ ndị “na-eze ume, na-asụkwa ude” n’ihi ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa taa. (Ezikiel 9:4) Ikekwe, ị ma ụfọdụ ndị na-eme otú ahụ. Gwa ha banyere olileanya dabeere na Bible bụ́ nke i nwere maka ọdịnihu. Ka ị na-eso ezi Ndị Kraịst na-akpakọrịta ma na-agwa ndị ọzọ banyere eziokwu dị ebube sitere na Bible, bụ́ nke ị mụtaworo, ị ga-achọpụta na mmasị ị ka pụrụ ịdị na-enwe n’ememe ofufe ụgha ga-eji nke nta nke nta kwụsị. Jide n’aka na ị ga-enwe nnọọ obi ụtọ, ị ga-enwetakwa ọtụtụ ngọzi ma ọ bụrụ na i guzosie ike n’ezi ofufe.—Malakaị 3:10.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ihe oyiyi nakwa ife ndị nna ochie ofufe ekwesịghị ịbata n’ezi ofufe.—Ọpụpụ 20:4, 5; Deuterọnọmi 18:10-12.
  • Ọ̀ dị njọ ikere òkè n’ememe ndị malitere n’aka ndị ọgọ mmụọ.—Ndị Efesọs 5:10.
  • Ezi Ndị Kraịst kwesịrị iji nkà na-eme ihe mgbe ha na-akọwara ndị ọzọ nkwenkwe ha.—Ndị Kọlọsi 4:6.

*  Lee Ihe Odide Ntụkwasị.

#  Ememe Saturnalia sokwa n’ihe ndị mere e ji họrọ December 25. A na-eme ememe a nke a na-emere chi ọrụ ubi nke ndị Rom na December 17-24. A na-enwe oriri na nkwari, na-enyerịtakwa onyinye n’oge ememe Saturnalia.

%  Iji nweta nkọwa banyere otú Ndị Kraịst na-esi ele ememe ndị na-ewu ewu anya, lee Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. Ajụjụ dị aṅaa ka ị na-aghaghị ịjụ onwe gị mgbe ị hapụsịrị okpukpe ụgha, oleekwa ihe mere i ji chee na nke a dị mkpa?

3. (a) Gịnị ka Bible kwuru banyere iji ihe oyiyi eme ihe, n’ihi gịnịkwa ka ọ pụrụ iji siere ụfọdụ ndị ike ịnakwere echiche Chineke? (b) Gịnị ka i kwesịrị ime ihe ọ bụla i nwere, bụ́ nke e ji eme ihe n’ofufe ụgha?

4. (a) Olee otú anyị si mara na ife ndị nna ochie abaghị uru? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji machibido ndị ya itinye aka n’ụdị mgbaasị ọ bụla?

5. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị na-ejibu ihe oyiyi efe ofufe ma ọ bụ na-efebu ndị nna ochie ofufe?

6, 7. (a) Gịnị ka a sịrị na a na-eji ememe Krismas echeta, ụmụazụ Jizọs nke narị afọ mbụ hà gbara ya? (b) Olee ihe ndị e jikọtara ha na ememe ụbọchị ọmụmụ mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge mbụ nọ n’ụwa?

8. Kọwaa ihe jikọrọ ememe ụbọchị ọmụmụ na nkwenkwe ụgha.

9. Olee otú e si bịa họrọ December 25 dị ka ụbọchị a ga na-eme ememe ọmụmụ Jizọs?

10. N’oge gara aga, gịnị mere na ụfọdụ ndị agbaghị Krismas?

11. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ji eme ememe okpukpe, ma olee ihe anyị kwesịrị ile anya dị ka ihe kasị mkpa?

12. Nye ihe atụ nke ihe mere anyị kwesịrị iji zere omenala na ememe ndị sitere n’ebe ndị ruru unyi.

13. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na ị dịghị eso eme ememe okpukpe?

14, 15. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na mmadụ ekelee gị otú e si ekele n’oge ememe ma ọ bụkwanụ ọ bụrụ na mmadụ achọọ inye gị onyinye?

16. Olee otú ị pụrụ isi jiri nkà na-eme ihe n’okwu ndị metụtara ememe okpukpe?

17. Olee otú ị pụrụ isi nyere ụmụ gị aka ịghara iche na ọ dị ihe na-efunahụ ha mgbe ha hụrụ na ndị ọzọ na-eme ememe?

18. Olee otú ịga nzukọ Ndị Kraịst pụrụ isi nyere gị aka iguzosi ike n’ezi ofufe?

19. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ị na-agwa ndị ọzọ banyere ihe ndị ị na-amụta na Bible?