Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE MBỤ

Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?

Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?

Chineke ọ̀ na-eche banyere gị n’ezie?

Olee ụdị onye Chineke bụ? Ò nwere aha?

À pụrụ ịbịaru Chineke nso?

Ị̀ HỤTỤLA ebe ụmụaka na-ajụ ajụjụ? Ọtụtụ n’ime ha na-amalite ịjụ ajụjụ ozugbo ha malitere ikwu okwu. Ha na-elegide gị nnọọ anya ka ha na-ajụ ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere eluigwe ji acha anụnụ anụnụ? Gịnị ka e ji mee kpakpando? Ònye kụziiri ụmụ nnụnụ ịbụ abụ? Ị pụrụ ịgbalịsi ike ịza ha, ma ọ naghị adịcha mfe. Ọbụna azịza kasị mma i nyere pụrụ ịkpali ha ịjụ gị ajụjụ ọzọ, bụ́: N’ihi gịnịkwanụ?

2 Ọ bụghị nanị ụmụaka na-ajụ ajụjụ. Ka anyị na-etolite, anyị na-anọgide na-ajụ ajụjụ. Anyị na-eme nke a iji mata ụzọ, iji mata ihe ize ndụ ndị ọ dị mkpa ka anyị zere, ma ọ bụ iji chọpụta ihe. Ma o yiri ka ụfọdụ ndị hà na-akwụsị ịjụ ajụjụ, karịsịa ajụjụ ndị kasị mkpa. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ha na-akwụsị ịchọ azịza.

Nwatakịrị na-ajụ ajụjụ

3 Cheedị banyere ajụjụ ahụ dị n’ihu akwụkwọ a, ajụjụ ndị a jụrụ n’okwu mmalite ya, ma ọ bụ ndị dị ná mmalite isiakwụkwọ a. Ha bụ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị kasị mkpa ị pụrụ ịjụ. Ma, ọtụtụ ndị anaghịzi agbalị ịchọta azịza ha. N’ihi gịnị? Bible ò nwere azịza ha? Ụfọdụ na-eche na azịza ndị ọ na-enye siri nnọọ ike nghọta. Ndị ọzọ na-eche na ịjụ ajụjụ pụrụ imenye ha ihere. Ụfọdụ ndị na-ekpebikwa na ọ kasị mma ịhapụrụ ndị ndú okpukpe na ndị nkụzi ajụjụ ndị dị otú ahụ. Gịnị ka i chere?

4 Ma eleghị anya, ọ ga-amasị gị inweta azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mgbe ụfọdụ ị na-eche, sị: ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ? Ndụ nke a ọ̀ bụ nanị ndụ dịnụ? Olee ụdị onye Chineke bụ n’ezie?’ Ọ dị mma ịjụ ajụjụ ndị dị otú ahụ, ọ dịkwa mkpa ka ị ghara ịkwụsị ịjụ ha ruo mgbe ị chọtara azịza ndị na-eju afọ ma zie ezie. Onye ozizi ahụ a ma ama, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru, sị: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu.”—Matiu 7:7.

5 Ọ bụrụ na ị ‘nọgide na-achọ’ azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa, ị ga-achọpụta na ime otú ahụ na-akwụghachi nnọọ ụgwọ. (Ilu 2:1-5) N’agbanyeghị ihe ndị ọzọ pụrụ ịgwawo gị, e nwere azịza, ị pụkwara ịchọta ha—n’ime Bible. Azịza ha esighị oké ike nghọta. Nke kakwarị mma, ha na-eme ka e nwee olileanya na obi ụtọ. Ha pụkwara inyere gị aka ibi ndụ na-eju afọ ugbu a. Iji malite, ka anyị tụlee ajụjụ nke nyeworo ọtụtụ ndị nsogbu.

CHINEKE Ọ̀ BỤ ONYE NA-ENWEGHỊ MMETỤTA NKE OBI TARA MMIRI?

6 Ọtụtụ ndị na-eche na azịza nke ajụjụ ahụ bụ ee. ‘Ọ bụrụ na Chineke na-eche banyere anyị,’ ka ha na-atụgharị n’uche, ‘ụwa ọ́ garaghị abụ ebe dị nnọọ iche?’ Ebe ọ bụla anyị lere anya n’ụwa, ihe anyị na-ahụ bụ agha, ịkpọasị, na nhụjuanya. Anyị nile kwa n’otu n’otu na-ada ọrịa, na-ata ahụhụ, ndị anyị hụrụ n’anya na-anwụnahụkwa anyị. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ekwu, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke na-eche banyere anyị na nsogbu anyị, ọ́ garaghị egbochi ihe ndị dị otú ahụ ime?’

7 Nke ka njọ, ndị nkụzi okpukpe na-eme mgbe ụfọdụ ka ndị mmadụ chewe na Chineke bụ onye obi tara mmiri. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe e nwere ọdachi, ha na-ekwu na ọ bụ uche Chineke. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ndị nkụzi dị otú ahụ na-ata Chineke ụta maka ihe ọjọọ ndị na-emenụ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka Chineke dị n’ezie? Gịnị ka Bible na-akụzi n’ezie? Jems 1:13 na-aza, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” N’ihi ya, ọ bụtụghị Chineke na-akpata ajọ omume ị na-ahụ gburugburu ụwa. (Job 34:10-12) N’eziokwu, ọ na-ekwe ka ihe ọjọọ na-eme. Ma, e nwere nnukwute ọdịiche dị n’etiti ikwe ka ihe mee na ịkpata ihe.

8 Dị ka ihe atụ, chee banyere nna maara ihe, nke na-ahụ n’anya, bụ́ onye nwere nwa nwoke toworo eto nke ya na nne na nna ya ka bi. Mgbe nwa ya nwoke ahụ malitere inupụ isi ma kpebie ịhapụ ụlọ, nna ya adịghị egbochi ya. Nwa ya nwoke ahụ ebiwe ụdị ndụ na-adịghị mma ma banye ná nsogbu. Ọ̀ bụ nna ahụ kpatara nsogbu nwa ya nwoke? Ee e. (Luk 15:11-13) N’otu aka ahụ, Chineke adịghị egbochi ndị mmadụ mgbe ha họọrọ ibi ndụ ọjọọ, ma ọ bụghị ya kpatara nsogbu ndị siworo na ya pụta. Mgbe ahụ, ọ gaghị adị mma n’ezie ịta Chineke ụta maka nsogbu nile ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe.

9 Ọ dị ezi ihe ndị mere Chineke ji kwere ka ihe a kpọrọ mmadụ na-agbaso ụzọ ọjọọ. Dị ka Onye Okike anyị dị ike, nke makwaara ihe, ọ bụghị iwu na ọ ga-akọrọ anyị ihe ndị mere o ji mee otú ahụ. Otú ọ dị, n’ihi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ, ọ na-akọrọ anyị. Ị ga-amatakwu banyere ihe ndị a n’Isi nke 11 nke akwụkwọ a. Ma jide n’aka na ọ bụghị Chineke na-akpata nsogbu ndị anyị na-eche ihu. Kama nke ahụ, ọ na-enye anyị olileanya e nwere nanị ya maka ihe ngwọta!—Aịsaịa 33:2.

10 Ọzọkwa, Chineke dị nsọ. (Aịsaịa 6:3) Nke a pụtara na ọ dị ọcha. Ọ dịghị eme ajọ omume. N’ihi ya, anyị pụrụ ịtụkwasị ya obi kpamkpam. Anyị apụghị ikwu nke ahụ banyere ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu mgbe ụfọdụ. Ọbụna onye ọchịchị kasị eme ihe n’eziokwu adịghị enwecha ike imezi ihe ndị ọjọọ mebiri. Ma ike Chineke karịrị ike nile. Ọ pụrụ iwepụ nsogbu nile ajọ omume wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-emekwa otú ahụ. Mgbe Chineke ga-eme ihe, ọ ga-eme ya n’ụzọ ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 37:9-11.

OLEE MMETỤTA CHINEKE NA-ENWE BANYERE IKPE NA-EZIGHỊ EZI NDỊ ANYỊ NA-ECHE IHU?

11 Ka ọ dịgodị, olee mmetụta Chineke na-enwe banyere ihe ndị na-eme n’ụwa nakwa ná ndụ gị? Nke mbụ, Bible na-akụzi na Chineke “na-ahụ ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) N’ihi ya, ọ na-enwe mmetụta miri emi banyere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọ kpọrọ ikpe na-ezighị ezi nile asị. Bible na-ekwu na Chineke nwere ‘mwute n’obi Ya’ mgbe ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa n’oge gara aga. (Jenesis 6:5, 6) Chineke agbanwebeghị. (Malakaị 3:6) Nhụjuanya a na-enwe n’ụwa nile ka na-ewute ya. Chineke adịghị achọ ịhụ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. “Ọ na-eche banyere unu,” ka Bible na-ekwu.—1 Pita 5:7.

12 Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Chineke adịghị achọ ịhụ ka a na-ata ahụhụ? Lee ihe àmà ọzọ. Bible na-akụzi na e mere mmadụ n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26) N’ihi ya, anyị nwere àgwà ọma n’ihi na Chineke nwere agwa ọma. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-ewute gị ịhụ ka ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ? Ọ bụrụ na ikpe na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ na-ewute gị, jide n’aka na ha na-ewute Chineke ọbụna karị.

13 Otu n’ime ihe ndị kasị mma mmadụ nwere bụ ikike nke ịhụ n’anya. Nke ahụ bụkwa àgwà Chineke. Bible na-akụzi na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Anyị na-ahụ n’anya n’ihi na Chineke na-ahụ n’anya. Ịhụnanya ọ̀ ga-akpali gị ịkwụsị nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi ị na-ahụ n’ụwa? Ọ bụrụ na i nwere ikike ime otú ahụ, ị̀ ga-eme ya? Ee, ị ga-eme ya! Obi kwesịkwara isi gị ike na Chineke ga-eweta nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi ná njedebe. Nkwa ndị e kwuru banyere ha n’okwu mmalite nke akwụkwọ a abụghị nrọ nkịtị ma ọ bụ olileanya ndị a na-ejighị n’aka. Nkwa Chineke ga-emezurịrị! Otú ọ dị, iji nwee okwukwe ná nkwa ndị dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka ị matakwuo Chineke nke kwere ha.

CHINEKE CHỌRỌ KA Ị MARA ONYE Ọ BỤ

14 Ọ bụrụ na ị chọọ ka mmadụ mata gị, gịnị ka ị pụrụ ime? Ị́ gaghị agwa onye ahụ aha gị? Chineke ò nwere aha? Ọtụtụ okpukpe na-ekwu na aha ya bụ “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe anyị,” ma aha ndị a abụghị ezigbo aha ya. Ha bụ utu aha, dị nnọọ ka “eze” na “onyeisi ala” bụ utu aha. Bible na-akụzi na Chineke nwere ọtụtụ utu aha. “Chineke” na “Onyenwe anyị” so na ha. Otú ọ dị, Bible na-akụzikwa na e nwere ihe bụ́ ezigbo aha Chineke: Jehova. Abụ Ọma 83:18 na-ekwu, sị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Ọ bụrụ na aha ahụ adịghị ná nsụgharị Bible gị, ị pụrụ ịga n’Ihe Odide Ntụkwasị dị n’akwụkwọ a iji mata ihe mere o ji dị otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na aha Chineke pụtara ọtụtụ puku ugboro n’ihe odide oge ochie nke Bible. N’ihi ya, Jehova chọrọ ka ị mata aha ya ma jiri ya na-eme ihe. A pụrụ ikwu na ọ na-akọwara gị onwe ya n’ime Bible.

Nwaanyị na-akọwa onwe ya

Mgbe ị chọrọ ka mmadụ mata gị, ị́ dịghị agwa yaaha gị? Chinekena-agwa anyị aha ya n’ime Bible

15 Chineke nyere onwe ya aha nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara. Aha ya, bụ́ Jehova, pụtara na Chineke pụrụ imezu nkwa ọ bụla o kwere nakwa na ọ pụrụ imezu ihe ọ bụla o zubere.* Aha Chineke pụrụ iche, o nweghị oyiri. Ọ bụ nanị ya nwe ya. N’ọtụtụ ụzọ, Jehova pụrụ iche. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu?

16 Anyị hụrụ na Abụ Ọma 83:18 kwuru banyere Jehova, sị: ‘Nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu.’ N’otu aka ahụ, ọ bụ nanị Jehova ka a na-akpọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” Mkpughe 15:3 na-ekwu, sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube, Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ụzọ gị bụ nke ezi omume na nke eziokwu, Eze mgbe ebighị ebi.” Utu aha ahụ bụ́ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” na-akụziri anyị na Jehova bụ onye kasị ike. Ọ dịghị onye ike ya na ya ha; ike ya kasị ike nile. Utu aha bụ́ “Eze mgbe ebighị ebi” na-echetakwara anyị na Jehova pụrụ iche n’ụzọ ọzọ. Nanị ya bụ onye dịworo adị mgbe nile. Abụ Ọma 90:2 na-ekwu, sị: “Ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, Gị onwe gị bụ Chineke.” Iche nke ahụ n’echiche na-emenye egwu, ọ́ bụghị eziokwu?

17 Jehova pụkwara iche n’ụdị na ọ bụ nanị ya bụ Onye Okike. Mkpughe 4:11 na-agụ, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” Ihe nile ị pụrụ iche n’echiche—site ná ndị bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya, bụ́ ndị nọ n’eluigwe ruo na kpakpando ndị na-ejupụta n’igwe n’abalị na mkpụrụ osisi ndị osisi na-amịpụta nakwa azụ ndị na-egwugharị n’ime oké osimiri—ha nile dị adị n’ihi na Jehova bụ Onye Okike!

Ị̀ PỤRỤ ỊNỌ JEHOVA NSO?

18 Ịgụ banyere àgwà ndị dị ịtụnanya nke Jehova na-eme ka ụfọdụ ndị tụọ egwu. Ha na-atụ egwu na Chineke dị nnọọ elu nke na ha apụghị ịbịaru ya nso ma ọ bụ na ọ dịghị ihe ọ bụla ha bụ n’anya Chineke nke dị elu otú ahụ. Ma, echiche a ò ziri ezi? Bible na-akụzi nnọọ ihe megidere nke ahụ. Ọ na-ekwu banyere Jehova, sị: “N’eziokwu, ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27) Ọbụna Bible na-agba anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

Bible na-akụzi na Jehova bụ Onye Okike nke eluigwe na ala nke na-ahụ n’anya

Ihe ndị Chineke kere

19 Olee otú ị pụrụ isi bịaruo Chineke nso? Nke mbụ, nọgide na-eme ihe ị na-eme ugbu a—ịmụ banyere Chineke. Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ee, Bible na-akụzi na ịmụ banyere Jehova na Jizọs na-eduga ná “ndụ ebighị ebi”! Dị ka e kwuworo, “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:16) Jehova nwekwara ọtụtụ àgwà ndị ọzọ magburu onwe ha, bụ́ ndị na-adọrọ mmasị. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu na Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) Chineke ‘dị mma, na-agbaghara mmehie.’ (Abụ Ọma 86:5) O nwere ndidi. (2 Pita 3:9) Ọ na-eguzosi ike n’ihe. (Mkpughe 15:4) Ka ị na-agụkwu Bible, ị ga-ahụ otú Jehova siworo gosi na ya nwere àgwà ndị a na-adọrọ mmasị na ọtụtụ àgwà ndị ọzọ.

20 N’eziokwu, ị pụghị ịhụ Chineke anya n’ihi na ọ bụ mmụọ a na-apụghị ịhụ anya. (Jọn 1:18; 4:24; 1 Timoti 1:17) Otú ọ dị, site n’ịmụ banyere ya n’ime Bible, ị pụrụ ịmata ya dị ka onye. Dị ka ọbụ abụ ahụ kwuru, ị pụrụ “ịhụ ịdị ụtọ Jehova.” (Abụ Ọma 27:4; Rom 1:20) Ka ị na-amụkwu banyere Jehova, otú ahụ ka ọ ga-abụwanye onye dị adị nye gị, otú ahụkwa ka ị ga-enwekwu ihe mere ị ga-eji hụ ya n’anya ma bịaruo ya nso.

Nna na nwa ya nwoke

Ịhụnanya nke ezigbo nna nwere n’ebe ụmụ ya nọ na-egosipụta ịhụnanya ka ukwuu nke Nna anyị nke eluigwe nwere n’ebe anyị nọ

21 Ị ga-eji nke nta nke nta ghọta ihe mere Bible ji na-akụziri anyị iwere Jehova dị ka Nna anyị. (Matiu 6:9) Ọ bụghị nanị na ọ bụ ya nyere anyị ndụ kamakwa ọ chọrọ ka anyị bie ndụ kasị mma—dị ka nna ọ bụla na-ahụ n’anya ga-achọ ka ụmụ ya bie. (Abụ Ọma 36:9) Bible na-akụzikwa na ụmụ mmadụ pụrụ ịghọ ndị enyi Jehova. (Jems 2:23) Leenụ—ị pụrụ ịghọ enyi Onye Okike nke eluigwe na ala!

22 Ka ị na-amụtakwu ihe na Bible, ị pụrụ ịchọpụta na ndị ụfọdụ, bụ́ ndị na-ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi, ga-agba gị ume ka ị kwụsị ọmụmụ ihe dị otú ahụ. Ha pụrụ inwe nchegbu na ị ga-agbanwe nkwenkwe gị. Ma ekwela ka onye ọ bụla gbochie gị imete enyi a na-enweghị atụ.

23 Otú ọ dị, a ga-enwe ihe ndị ị na-agaghị aghọta ná mmalite. Ọ pụrụ ịchọ gị iwedata onwe gị ala iji rịọ maka enyemaka, ma alala azụ n’ihi ihere. Jizọs kwuru na ọ dị mma mmadụ iwedata onwe ya ala, dị ka nwatakịrị. (Matiu 18:2-4) Dị ka anyị makwaara, ụmụntakịrị na-ajụkarị ajụjụ. Chineke chọrọ ka ị chọta azịza ha. Bible na-aja ụfọdụ ndị chọsiri ike ịmụta banyere Chineke mma. Ha ji nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ iji jide n’aka na ihe ha na-amụta bụ eziokwu.—Ọrụ 17:11.

24 Ụzọ kasị mma isi mụta banyere Jehova bụ site n’inyocha Bible. Ọ dị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ. N’ụzọ dị aṅaa? Isiakwụkwọ na-esonụ ga-atụle isiokwu ahụ.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Chineke na-eche banyere gị.—1 Pita 5:7.
  • Ezigbo aha Chineke bụ Jehova. —Abụ Ọma 83:18.
  • Jehova na-akpọ gị ka ị bịaruo ya nso. —Jems 4:8.
  • Jehova na-ahụ n’anya, nweekwa obiọma na obi ebere.—Ọpụpụ 34:6; 1 Jọn 4:8,16.

*  E nwekwuru ihe ọmụma banyere ihe aha Chineke pụtara na otú e si akpọ ya n’Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. N’ihi gịnị ka o ji adịkarị mma ịjụ ajụjụ?

3. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji akwụsị ịgbalị ịchọta azịza nke ajụjụ ndị kasị mkpa?

4, 5. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị kasị mkpa anyị pụrụ ịjụ ná ndụ, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji chọọ azịza ha?

6. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji eche na nhụjuanya nke ụmụ mmadụ adịghị ewute Chineke?

7. (a) Olee otú ndị nkụzi okpukpe siworo mee ka ọtụtụ ndị chee na obi kpọrọ Chineke nkụ? (b) Gịnị ka Bible na-akụzi n’ezie banyere ọnwụnwa ndị pụrụ ịbịara anyị?

8, 9. (a) Olee otú ị pụrụ isi mee ihe atụ nke ọdịiche dị n’etiti ikwe ka ajọ omume dịrị na ịkpata ya? (b) N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị anyị ịkatọ mkpebi Chineke mere ikwe ka ihe a kpọrọ mmadụ gbasoo ụzọ ọjọọ?

10. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee ntụkwasị obi na Chineke ga-edozi nsogbu nile ajọ omume kpatara?

11. (a) Olee mmetụta Chineke na-enwe banyere ikpe na-ezighị ezi? (b) Olee mmetụta Chineke na-enwe banyere ahụhụ ị na-ata?

12, 13. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji nwee àgwà ọma ndị dị ka ịhụnanya, oleekwa otú ịhụnanya si emetụta otú anyị si ele ụwa anya? (b) N’ihi gịnị ka obi kwesịrị iji sie gị ike na Chineke ga-eme ihe n’ezie banyere nsogbu ndị e nwere n’ụwa?

14. Gịnị bụ aha Chineke, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị iji ya na-eme ihe?

15. Gịnị ka aha ahụ bụ́ Jehova pụtara?

16, 17. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere Jehova site n’utu aha ndị na-esonụ: (a) “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile”? (b) “Eze mgbe ebighị ebi”? (ch) “Onye Okike”?

18. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ji eche na ha apụghị ịbịaru Chineke nso, ma gịnị ka Bible na-akụzi?

19. (a) Olee otú anyị pụrụ isi malite ịbịaru Chineke nso, uru dịkwa aṅaa ka ime otú ahụ bara? (b) Olee àgwà Chineke ndị kasị adọrọ mmasị gị?

20-22. (a) Ọhụhụ anyị na-apụghị ịhụ Chineke anya ọ̀ ga-egbochi anyị ịbịaru ya nso? Kọwaa. (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị na-ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi ga-agba gị ume ka i mee, gịnịkwa ka i kwesịrị ime?

23, 24. (a) N’ihi gịnị ka i ji kwesị ịnọgide na-ajụ ajụjụ banyere ihe ị na-amụta? (b) Gịnị bụ isiokwu nke isiakwụkwọ na-esonụ?

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?